Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke
Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke
“E mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị; nke unu na-eme nke ọma n’ịṅa ntị ya.”—2 PITA 1:19.
1, 2. Olee ihe atụ ị pụrụ inye nke onye mesaịa ụgha?
RUO ọtụtụ narị afọ, ndị mesaịa ụgha anwawo ikwu ihe ọdịnihu ga-abụ. Na narị afọ nke ise O.A., otu nwoke nke kpọrọ onwe ya Moses mere ka ndị Juu nọ n’àgwàetiti Krit kweta na ya bụ mesaịa ahụ nakwa na ya ga-anapụta ha pụọ ná mmegbu. N’ụbọchị e kwuru na ha ga-enwere onwe ha, ha sooro ya ruo n’otu ebe dị elu a na-anọ eleda anya n’Osimiri Mediterranean. O kwuru na nanị ihe ha ga-eme bụ ịdaba n’osimiri ahụ, ọ ga-ekewakwa n’ihu ha. Mmiri riri ọnụ ọgụgụ dị ukwuu bụ́ ndị dabara na ya, mesaịa ụgha ahụ sikwa ebe ahụ gbafuo.
2 Na narị afọ nke 12, otu “mesaịa” pụtara na Yemen. Caliph, ma ọ bụ onye ọchịchị obodo ahụ, gwara ya ka o nye ihe àmà na-egosi na ọ bụ mesaịa. “Mesaịa” a tụrụ aro ka caliph ahụ mee ka e bepụ ya isi. O buru amụma banyere mbilite n’ọnwụ ya na-agaghị egbu oge bụ́ nke ga-abụ ihe àmà. Caliph ahụ kwetara n’atụmatụ ahụ—otú ahụ kwa ka nke “mesaịa” ahụ si gaa.
3. Ònye bụ ezigbo Mesaịa ahụ, gịnịkwa ka ozi ya gosipụtara?
3 Ndị Mesaịa ụgha na amụma ha na-adawa afọ, ma ịṅa ntị n’okwu amụma Chineke ewetatụbeghị ndakpọ olileanya. Ezigbo Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, mezuru ọtụtụ amụma Bible. Dị ka ihe atụ, n’ihota amụma Aịsaịa, onye ahụ so dee Oziọma ndị ahụ bụ́ Matiu dere, sị: “Ala Zebulun na ala Naftali, n’ụzọ oké osimiri, n’ofe Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ nke na-anọdụ n’ọchịchịrị hụrụ oké ìhè, ndị na-anọdụkwa n’ala na onyinyo ọnwụ, ndị a ka ìhè waliteere. Site na mgbe ahụ Jisọs malitere ikwusa, na ịsị, Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:15–17; Aịsaịa 9:1, 2) Jisọs bụ “oké ìhè” ahụ, ozi ya gosipụtakwara na ọ bụ ya bụ Onye Amụma ahụ Mosis buru n’amụma. A ga-ebibi ndị jụrụ ige Jisọs ntị.—Deuterọnọmi 18:18, 19; Ọrụ 3:22, 23.
4. Olee otú Jisọs si mezuo Aịsaịa 53:12?
4 Jisọs mezukwara okwu amụma ahụ dị n’Aịsaịa 53:12: “Ọ gbapụrụ mkpụrụ obi ya dị ka mmiri nye ọnwụ, ọ bụkwa ná ndị njehie ka a gụrụ ya: ma ya onwe ya bupụrụ mmehie ọtụtụ mmadụ, ọ bụkwa ndị njehie ka ọ na-arịọrọ arịrịọ.” N’ịbụ onye maara na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-enye ndụ mmadụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta, Jisọs wusiri okwukwe ndị na-eso ụzọ ya ike. (Mak 10:45) O mere nke a n’ụzọ dị ịrịba ama site ná nnwogha ya.
Nnwogha ahụ Na-ewulite Okwukwe
5. N’okwu nke aka gị, olee otú ị ga-esi akọwa nnwogha ahụ?
5 Nnwogha ahụ bụ ihe omume e buru n’amụma. Jisọs kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ gaje ịbịa n’ebube nke Nna Ya, Ya na ndị mmụọ ozi Ya . . . N’ezie asị m unu, Ụfọdụ dị n’etiti ndị guzoro n’ebe a, ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’alaeze Ya.” (Matiu 16:27, 28) Ụfọdụ n’ime ndị ozi ahụ hà hụrụ Jisọs n’ezie ka ọ na-abịa n’Alaeze ya? Matiu 17:1-7 na-ekwu, sị: “Mgbe ụbọchị isii gasịrị Jisọs chịịrị Pita, na Jemes, na Jọn nwanne ya, tinyere Onwe ya, O kuru ha rịgoo n’ugwu dị elu wee pụọ iche: O wee nwoghaa n’ihu ha.” Lee ihe omume na-akpali akpali ọ bụ! “Ihu Ya wee na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe Ya nile wee na-acha ọcha dị ka ìhè. Ma lee, e mee ka ha hụ Mosis na Elaịja ka ha na Ya na-ekwurịta okwu.” Ọzọ, “igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha,” ha nụkwara olu Chineke n’onwe ya ka ọ na-asị: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma; nụrụnụ okwu Ya. Mgbe ndị na-eso ụzọ Ya nụrụ ya, ha wee daa kpuchie ihu ha n’ala, tụọkwa egwu hie nne. Jisọs wee bịakwute ha, metụ ha aka, sị, Bilienụ, unu atụkwala egwu.”
6. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs ji kpọọ nnwogha ahụ ọhụụ? (b) Gịnị ka nnwogha ahụ mere ka a hụpete?
6 Ihe omume a na-atụ ụjọ yiri ka o weere ọnọdụ n’otu mpaghara nke Ugwu Heamọn, bụ́ ebe Jisọs na ndị ozi atọ ahụ nọbọrọ chi. Ihe àmà na-egosi na nnwogha ahụ weere ọnọdụ n’abalị, na-eme ka a hụ ya nke ọma karịsịa. Otu ihe mere Jisọs ji kpọọ ya ọhụụ bụ na Mosis na Elaịja, bụ́ ndị nwụworo kemgbe, anọghị n’ebe ahụ n’anụ ahụ. Ọ bụ nanị Kraịst nọ n’ebe ahụ n’ezie. (Matiu 17:8, 9, NW) Oké mgbukepụ dị otú ahụ mere ka Pita, Jemes, na Jọn hụpete n’ụzọ dị ịrịba ama ọnụnọ dị ebube nke Jisọs n’ike Alaeze. Mosis na Elaịja nọchiri anya ndị e tere mmanụ ha na Jisọs ga-eketakọ ihe, ọhụụ ahụ mesikwara nnọọ akaebe Jisọs gbara banyere Alaeze ahụ na ọbụbụeze ya n’ọdịnihu ike.
7. Olee otú anyị si mara na Pita chetara nnwogha ahụ nke ọma?
7 Nnwogha ahụ nyere aka iwusi okwukwe nke ndị ozi atọ ahụ ike bụ́ ndị gaje ikere òkè bụ́ isi n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ihu na-egbuke egbuke nke Kraịst, uwe ya na-egbukepụ egbukepụ, na olu Chineke n’onwe ya nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Ọ hụrụ n’anya, onye ha kwesịrị ịṅa ntị—ihe a nile mezuru nzube ha n’ụzọ kasị dị irè. Ma ndị ozi ahụ agajeghị ịkọrọ onye ọ bụla ọhụụ ahụ ruo mgbe a akpọlitere Jisọs n’ọnwụ. Ihe dị ka afọ 32 mgbe e mesịrị, Pita ka chetara ọhụụ a nke ọma. N’izo aka n’ebe ọ dị na n’ịdị mkpa ya, o dere, sị: “N’ihi na anyị esoghị akụkọ ifo nke e ji amamihe kọọ, mgbe anyị mere ka unu mara ike na [ọnụnọ, NW] nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ma e mere anyị ka anyị bụrụ ndị hụrụ ịdị ukwuu nke Onye ahụ. N’ihi na Ọ natara nsọpụrụ na ebube n’aka Chineke, bụ́ Nna, mgbe Ebube ahụ nke kwesịrị ịdị ukwuu mere ka olu dị otú a daara Ya, sị, Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị Mụ onwe m ezi mma: olu a ka anyị onwe anyị nụkwara ka ọ na-esi n’eluigwe daa, mgbe anyị na Ya nọ n’ugwu ahụ dị nsọ.”—2 Pita 1:16–18.
8. (a) Na gịnị ka nkwupụta Chineke mere banyere Ọkpara ya lekwasịrị anya? (b) Gịnị ka igwe ojii ahụ pụtara ná nnwogha ahụ na-egosi?
Matiu 24:3) N’ezie, ntụziaka Jisọs nyere ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla banyere ọhụụ ahụ ruo mgbe o biliworo n’ọnwụ na-egosi na ibuli ya elu na ime ka ọ dị ebube ga-ewere ọnọdụ mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ.
8 Ihe kasị mkpa bụ nkwupụta Chineke bụ́: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma; nụrụnụ okwu Ya.” Okwu a lekwasịrị anya n’ebe Jisọs nọ dị ka Eze Chineke mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, onye ihe nile e kere eke na-aghaghị irubere isi. Igwe ojii ahụ kpuchiri ha gosiri na mmezu nke ọhụụ a ga-abụ nke anya na-agaghị ahụ. Ndị matara “ihe ịrịba ama” nke ọnụnọ a na-adịghị ahụ anya nke Jisọs n’ike Alaeze ga-eji nanị anya nke nghọta hụ ya. (9. N’ihi gịnị ka nnwogha ahụ kwesịrị iji wusie okwukwe anyị ike?
9 Mgbe Pita zosịrị aka ná nnwogha ahụ, o kwuru, sị: “E mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị; nke unu na-eme nke ọma n’ịṅa ntị ya, dị ka oriọna mgbe ọ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọ, kpakpando chi ọbụbọ wee tiwe n’obi unu: ebe unu buru ụzọ mara nke a, na ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya. N’ihi na ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.” (2 Pita 1:19–21) Nnwogha ahụ na-emesi ike ndabere a pụrụ ịdabere n’okwu amụma nke Chineke. Anyị aghaghị ịṅa ntị n’okwu ahụ ọ bụghị ‘n’akụkọ ifo ndị e ji amamihe kọọ,’ bụ́ ndị Chineke na-akwadoghị ma ọ bụ nakwere. Nnwogha ahụ kwesịrị iwusi okwukwe anyị nwere n’okwu amụma ahụ ike n’ihi na ebube Jisọs ahụ na ike Alaeze ahụ a hụpetere n’ọhụụ abụrụwo ihe dị adị. Ee, anyị nwere ihe àmà a na-adịghị agbagha agbagha na Kraịst nọ taa dị ka Eze eluigwe dị ike.
Otú Kpakpando Chi Ọbụbọ ahụ Si Eti
10. Ònye ma ọ bụ gịnị bụ “kpakpando chi ọbụbọ” ahụ Pita kpọtụrụ aha, gịnịkwa mere i ji zaa otú ahụ?
10 Pita dere, sị: “Unu na-eme nke ọma n’ịṅa ntị [okwu amụma ahụ], dị ka oriọna mgbe ọ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọ, kpakpando chi ọbụbọ wee tiwe.” Ònye ma ọ bụ gịnị bụ “kpakpando chi ọbụbọ” ahụ? Okwu ahụ bụ́ “kpakpando chi ọbụbọ” pụtara nanị otu ugboro n’ime Bible, ihe ọ pụtara yikwara ihe “kpakpando ụtụtụ” pụtara. Mkpughe 22:16 na-akpọ Jisọs Kraịst “kpakpando na-enwu enwu, nke bụkwa kpakpando ụtụtụ.” N’oge ụfọdụ n’afọ, ụdị kpakpando ndị ahụ na-abụ ndị ikpeazụ na-eti n’ihu igwe nke ebe ọwụwa anyanwụ. Ha na-eti kpọmkwem tupu anyanwụ awaa, n’ụzọ dịkwa otú a, ha na-egosipụta ọbụbọ nke ụbọchị ọhụrụ. Pita ji okwu bụ́ “kpakpando chi ọbụbọ” mee ihe n’izo aka n’ebe Jisọs nọ mgbe Ọ natasịrị ike Alaeze. N’oge ahụ, Jisọs tiri n’eluigwe na ala dum! Dị ka Kpakpando Chi Ọbụbọ bụ́ Mesaịa, ọ na-egosipụta na ụbọchị, ma ọ bụ oge ọhụrụ, abọwarala ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi.
11. (a) Gịnị mere na 2 Pita 1:19 apụtaghị na “kpakpando chi ọbụbọ” na-eti n’obi nkịtị nke ụmụ mmadụ? (b) Olee otú ị ga-esi akọwa 2 Pita 1:19?
11 Ọtụtụ nsụgharị Bible na-akwalite echiche bụ́ na okwu Pita ndị e dekọrọ na 2 Pita 1:19 na-ezo aka n’obi nkịtị nke mmadụ. Obi onye toruworo ogo mmadụ na-adị nanị gram 250 ruo 300 n’ịdị arọ. Olee otú Jisọs Kraịst—onye bụ́ ugbu a mmụọ e kere eke na-adịghị anwụ anwụ n’eluigwe—ga-esi na-eti n’ime ntakịrị akụkụ ahụ ndị a nke ụmụ mmadụ? (1 Timoti 6:16) N’ezie, okwu a metụtara obi ihe atụ anyị, n’ihi na ọ bụ ha ka anyị ji aṅa ntị n’okwu amụma Chineke. Ma lee anya nke ọma na 2 Pita 1:19, ị ga-ahụkwa na New World Translation ji rịkọm kewapụ nkebi ahịrịokwu bụ́ “ruo mgbe chi ga-abọ, kpakpando chi ọbụbọ wee tiwe,” pụọ n’okwu ndị bu ụzọ n’amaokwu ahụ nakwa pụọ n’okwu bụ́ “n’obi unu.” A pụrụ ikwupụta amaokwu a n’ụzọ dị otú a: ‘E mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị; nke unu na-eme nke ọma ịṅa ntị na ya dị ka oriọna nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ya bụ, n’obi unu, ruo mgbe chi ga-abọ kpakpando chi ọbụbọ wee tiwe.’
12. Gịnị bụ ọnọdụ nke obi ụmụ mmadụ n’ozuzu ha, ma gịnị bụ eziokwu banyere ezi ndị Kraịst?
12 Gịnị bụ ọnọdụ nke obi ihe atụ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie n’ozuzu ha?
Leenụ, obi ha nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ! Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị bụ ezi ndị Kraịst, ọ dị ka a ga-asị na anyị nwere oriọna nke na-enwu n’obi anyị, bụ́ nke gaara agba ọchịchịrị ma e wezụga ya. Dị ka okwu Pita gosiri, ọ ga-abụ site n’ịṅa ntị n’okwu amụma Chineke nke na-enye ìhè ka ezi ndị Kraịst ga-esi nọrọ na nche ma mara mgbe chi ọhụrụ bọrọ. Ha ga-amara eziokwu ahụ bụ́ na Kpakpando Chi Ọbụbọ ahụ etiwela, ọ bụghị n’obi nkịtị nke mmadụ, kama n’ihu ihe nile e kere eke.13. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Kpakpando Chi Ọbụbọ ahụ etiwelarị? (b) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst pụrụ iji tachie obi n’ọnọdụ ndị ahụ tara akpụ Jisọs buru n’amụma maka oge anyị?
13 Kpakpando Chi Ọbụbọ ahụ etiwelarị! Anyị pụrụ ijide nke ahụ n’aka site n’ịṅa ntị n’amụma ukwu Jisọs buru banyere ọnụnọ ya. Taa, anyị na-ahụ mmezu ya n’ihe omume ndị dị ka agha ndị a na-enwetụbeghị ụdị ha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, na nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma ahụ. (Matiu 24:3–14) Ọ bụ ezie na ọnọdụ ndị tara akpụ nke Jisọs buru n’amụma na-emetụtakwa anyị dị ka ndị Kraịst, anyị na-enwe ike iji udo na ọṅụ nke obi na-atachi obi. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị na-aṅa ntị n’okwu amụma Chineke ma nwee okwukwe n’ihe o kwere ná nkwa banyere ọdịnihu. Anyị maara na anyị nọ nnọọ nso n’oge ndị kasị mma n’ihi na anyị nọ n’ime ime nke “mgbe ọgwụgwụ”! (Daniel 12:4) Ụwa nọ n’oké ihe isi ike ndị ahụ e buru n’amụma n’Aịsaịa 60:2: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche.” Olee otú mmadụ ọ bụla pụrụ isi hụ ụzọ n’ime ọchịchịrị a? Mmadụ aghaghị iji obi umeala ṅaa ntị n’okwu amụma Chineke ugbu a, tupu oge agafee. Ọ dị ndị nwere obi eziokwu mkpa ichigharịkwuru Jehova Chineke, bụ́ Isi Iyi nke ndụ na ìhè. (Abụ Ọma 36:9; Ọrụ 17:28) Ọ bụ nanị site n’ime nke a ka mmadụ ọ bụla pụrụ inwe ezi nghọta na olileanya nke ịnụ ụtọ ọdịnihu ahụ magburu onwe ya nke Chineke zubeworo maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi.—Mkpughe 21:1–5.
“Ìhè ahụ Abịawo n’Ụwa”
14. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji hụ mmezu nke nkwa ndị dị ebube nke Bible?
14 Akwụkwọ Nsọ na-eme ka o doo anya na Jọn 3:19–21.
Jisọs Kraịst na-achị ugbu a dị ka Eze. N’ihi mbanye ọ banyere n’ọchịchị na 1914, a ka ga-emezu amụma ndị dị ebube. Iji hụ mmezu ha, anyị aghaghị igosipụta na anyị bụ ndị dị nwayọọ n’obi bụ́ ndị na-egosipụta okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ, na-echegharị n’ọrụ mmehie na mmehie ndị anyị mere n’amaghị ama. N’ezie, ndị hụrụ ọchịchịrị n’anya agaghị enweta ndụ ebighị ebi. Jisọs kwuru, sị: “Nke a bụ ikpe ahụ, na Ìhè ahụ abịawo n’ụwa, ma mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya kama Ìhè ahụ; n’ihi na ọrụ ha jọrọ njọ. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe na-adịghị mma na-akpọ Ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwutekwa Ìhè ahụ, ka a ghara ịtụ ya ọrụ ya nile n’anya. Ma onye na-eme ihe bụ́ eziokwu na-abịakwute Ìhè ahụ, ka e wee mee ka ọrụ ya pụta ìhè, na a rụworo ha na Chineke.”—15. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị eleghara nzọpụta nke Chineke meworo ka anyị nwee ike inweta site n’aka Ọkpara ya, anya?
15 Ìhè ime mmụọ abatawo n’ime ụwa site n’aka Jisọs, ige ya ntị dịkwa mkpa. Pọl dere, sị: “Chineke, mgbe Ọ gwararịị nna anyị hà okwu n’oge ochie n’ime ndị amụma n’iberibe akwụkwọ dị iche iche na ụzọ dị iche iche, Ọ gwara anyị okwu n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a n’ime Ọkpara, Onye O doro onye nketa nke ihe nile.” (Ndị Hibru 1:1, 2) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ajụ nzọpụta Chineke meworo ka anyị nwee ike inweta site n’aka Ọkpara ya? Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “A sị na e mere okwu e kwuru site n’ọnụ ndị mmụọ ozi ka o guzosie ike, a sịkwa na njehie nile ọ bụla na aṅaghị ntị nile ọ bụla natara nnyeghachi nke ụgwọ ọrụ ziri ezi; anyị onwe anyị ga-esi aṅaa gbanahụ, ma ọ bụrụ na anyị lefuru oké nzọpụta dị otú a anya? bụ́ nzọpụta nke e buru ụzọ kwuo site n’ọnụ Onyenwe anyị, ndị nụrụ ya wee mee ka o guzosie ike ruo ebe anyị nọ; Chineke na-esokwa ha na-agbakọ àmà, site n’ihe ịrịba ama na ọrụ ebube dị iche iche, sitekwa n’ọrụ ike dị iche iche, sitekwa n’okike nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ nke aka Ya si dị.” (Ndị Hibru 2:2–4) Ee, Jisọs bụ ebe ikwusa okwu amụma ahụ hiwere isi.—Mkpughe 19:10.
16. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee okwukwe zuru ezu n’amụma nile Jehova Chineke buru?
16 Dị ka a rịbara ama, Pita kwuru, sị: “Ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya.” Ụmụ mmadụ apụghị ibu ezi amụma ọ bụla n’onwe ha, ma anyị pụrụ inwe okwukwe zuru ezu n’amụma nile nke Chineke. Ha sitere n’aka Jehova Chineke n’onwe ya. O jiriwo mmụọ nsọ mee ka ndị ohu ya nwee ike ịghọta otú amụma ndị e buru na Bible si na-emezu. N’ezie, anyị na-enwe ekele n’ebe Jehova nọ na anyị ahụwo mmezu nke ọtụtụ n’ime amụma ndị dị otú ahụ kemgbe afọ 1914. Anyị jikwa nnọọ n’aka na amụma ndị fọdụrụnụ banyere ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a ga-emezucha. Ọ dị mkpa ka anyị nọgide na-aṅa ntị n’amụma ndị sitere n’aka Chineke ka anyị na-eme ka ìhè anyị na-enwu. (Matiu 5:16) Lee ekele anyị nwere na Jehova na-eme ka ‘ìhè na-awara anyị n’ime oké ọchịchịrị’ nke kpuchiri ụwa taa!—Aịsaịa 58:10.
17. N’ihi gịnị ka ìhè ime mmụọ sitere n’aka Chineke ji dị anyị mkpa?
17 Ìhè nkịtị na-eme ka anyị nwee ike ịhụ ụzọ. Ọ na-emekwa ka ihe ọkụkụ ndị na-enye anyị nri dịgasị iche n’ụba nwee ike ito eto. Anyị apụghị ịdị ndụ ma e wezụga ìhè nkịtị. Gịnị banyere ìhè ime mmụọ? Ọ na-enye anyị nduzi, na-egosikwa anyị ihe ọdịnihu ga-abụ dị ka e buru n’amụma n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. (Abụ Ọma 119:105) Jehova Chineke ji ịhụnanya ‘na-ezipụta ìhè Ya na eziokwu Ya.’ (Abụ Ọma 43:3) N’ezie, anyị kwesịrị igosi ekele miri emi maka onyinye ndị dị otú ahụ. Ya mere, ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime iji na-enweta ìhè nke “ọmụma nke ebube nke Chineke,” ka o wee na-enye obi ihe atụ anyị ìhè.—2 Ndị Kọrint 4:6; Ndị Efesọs 1:18.
18. Gịnị ka Kpakpando Chi Ọbụbọ nke Jehova dị njikere ime ugbu a?
18 Lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi ịmara na, na 1914, Jisọs Kraịst, bụ́ Kpakpando Chi Ọbụbọ ahụ, tiwere n’eluigwe na ụwa dum ma malite imezu ọhụụ nnwogha ahụ! Kpakpando Chi Ọbụbọ nke Jehova apụtawo, dịrị njikere ime uche Chineke n’imezukwu nnwogha ahụ—“agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile.” (Mkpughe 16:14, 16) Mgbe e kpochapụsịworo usoro ihe ochie a, Jehova ga-emezu nkwa ya banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” bụ́ ebe anyị pụrụ ịnọ na-eto ya ruo mgbe ebighị ebi dị ka Eze Onyenwe eluigwe na ala na Chineke nke na-ebu ezi amụma. (2 Pita 3:13) Tupu ụbọchị ahụ dị ebube eruo, ka anyị nọgide na-eje ije n’ìhè nke Chineke site n’ịṅa ntị n’okwu amụma Ya.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Ị̀ ga-esi aṅaa kọwaa nnwogha Jisọs?
• Olee otú nnwogha ahụ si ewulite okwukwe?
• Ònye ma ọ bụ gịnị bụ Kpakpando Chi Ọbụbọ nke Jehova, oleekwa mgbe o tiwere?
• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịṅa ntị n’okwu amụma Chineke?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 13]
Ị̀ pụrụ ịkọwa ihe nnwogha ahụ pụtara?
[Foto dị na peeji nke 15]
Kpakpando Chi Ọbụbọ ahụ etiwelarị. Ị̀ maara otú o si eti na mgbe ọ na-eti?