Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible Ò Nwere Mkpụrụ Akwụkwọ Ndochianya Zoro Ezo?

Bible Ò Nwere Mkpụrụ Akwụkwọ Ndochianya Zoro Ezo?

Bible Ò Nwere Mkpụrụ Akwụkwọ Ndochianya Zoro Ezo?

IHE dị ka afọ abụọ mgbe e gbusịrị Praịm Minista Israel bụ́ Yitzhak Rabin na 1995, otu onye odeakụkọ zọọrọ na site n’enyemaka nkà na ụzụ kọmputa, na ya achọpụtawo otu amụma e buru banyere ihe omume ahụ bụ́ nke e zoro n’akụkụ ihe odide Bible Hibru mbụ. Odeakụkọ ahụ, bụ́ Michael Drosnin, dere na ya anwawo ịdọ praịm minista ahụ aka ná ntị ruo ihe karịrị otu afọ tupu ogbugbu ahụ ma o nweghị isi.

E bipụtawo akwụkwọ na isiokwu ndị ọzọ ugbu a bụ́ ndị na-azọrọ na mkpụrụ akwụkwọ ndochianya a zoro ezo na-agba akaebe zuru ezu na e dere Bible n’ike mmụọ nsọ Chineke. Mkpụrụ akwụkwọ ndochianya dị otú ahụ ọ̀ dị adị? Mkpụrụ akwụkwọ ndochianya zoro ezo ò kwesịrị ịbụ ihe ndabere iji kwere na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke?

Ọ̀ Bụ Echiche Ọhụrụ?

Echiche na e nwere mkpụrụ akwụkwọ ndochianya zoro ezo n’akụkụ Bible abụghị ihe ọhụrụ. Ọ bụ echiche bụ́ isi na Cabala, ma ọ bụ nkwenkwe nke ihe omimi nke ndị Juu. Dị ka ndị ozizi Cabala si kwuo, ihe bụ́ isi nke akụkụ ihe odide Bible pụtara abụghị ihe ọ pụtara n’ezie. Ha kwere na Chineke ji mkpụrụ akwụkwọ dị iche iche nke akụkụ ihe odide Bible Hibru mee ihe dị ka ihe atụ, bụ́ nke ọ bụrụ na a ghọta ha nke ọma ga-ekpughe eziokwu ka ukwuu. N’echiche ha, Chineke debere mkpụrụ akwụkwọ Hibru ọ bụla na ebe ọ dị n’akụkụ ihe odide Bible na-ebu otu nzube a kapịrị ọnụ n’uche.

Dị ka Jeffrey Satinover, bụ́ onye nchọpụta banyere mkpụrụ akwụkwọ ndochianya nke Bible si kwuo, ndị Juu a kwere n’ihe omimi kweere na mkpụrụ akwụkwọ Hibru ndị ahụ e ji mee ihe n’idekọ akụkọ banyere okike nke dị na Jenesis nwere ihe omimi ndị dị egwu ha pụtara. Ọ na-ede, sị: “Ná nchịkọta, Jenesis abụghị nkọwa nkịtị; ọ bụ kpọmkwem ngwá ọrụ nke nkà okike n’onwe ya, ụkpụrụ nke dị n’uche Chineke nke e ji ọdịdị a na-ahụ anya mee ka ọ pụta ìhè.”

Onye Cabala bụ́ onye rabai nke narị afọ nke 13, bụ́ Bachya ben Asher nke Saragossa, Spain, dere banyere otu ihe ọmụma zoro ezo nke e kpugheere ya site n’ịgụ mkpụrụ okwu nke 42 ọ bụla n’otu akụkụ nke Jenesis. Ọ bụ n’usoro a nke ịmafe mkpụrụ akwụkwọ dị iche iche na-eji otu usoro eme ya ná mgbalị ịchọta ozi ndị zoro ezo ka echiche nke oge a nke Bible inwe mkpụrụ akwụkwọ ndochianya dabeere.

Kọmputa “Ekpughee” Mkpụrụ Akwụkwọ Ndochianya Ahụ

Tupu e mepụta kọmputa, ikike mmadụ nwere inyocha akụkụ ihe odide Bible n’ụzọ dị otú a bụ nke a kpaara ókè. Otú ọ dị, n’August 1994, magazin bụ́ Statistical Science bipụtara otu isiokwu bụ́ nke Eliyahu Rips nke Mahadum Hibru dị na Jerusalem na ndị nchọpụta ibe ya kwuru ihe ụfọdụ na-ebu isi na ya. Ha kọwara na site n’iwepụcha oghere nile dị n’agbata mkpụrụ akwụkwọ dị iche iche ma jiri usoro hà nhata na-amafe n’agbata mkpụrụ akwụkwọ dị iche iche n’akụkụ ihe odide Hibru nke Jenesis, ha achọpụtawo aha ndị rabaị 34 a ma ama bụ́ ndị e ji mkpụrụ akwụkwọ ndochianya dee n’akụkụ ihe odide ahụ, gụnyere ihe ọmụma ndị ọzọ, dị ka ụbọchị a mụrụ ha ma ọ bụ ụbọchị ha nwụrụ, n’ebe dịdewere nnọọ aha ha nso. * Mgbe ha mesịrị nnwale ugboro ugboro, ndị nchọpụta ahụ bipụtara nkwubi ha na ihe ọmụma ahụ e ji mkpụrụ akwụkwọ ndochianya dee na Jenesis karịrị nnọọ ịbụ ihe ndabakọ—ihe akaebe banyere ihe ọmụma sitere n’ike mmụọ nsọ nke a ma ụma zobe na Jenesis n’ọdịdị nke mkpụrụ akwụkwọ ndochianya, ọtụtụ puku afọ gara aga.

N’ịdabere n’usoro a, odeakụkọ ahụ bụ́ Drosnin mere nnwale ndị nke ya, na-achọ ihe ọmụma zoro n’akwụkwọ ise mbụ nke Bible Hibru. Dị ka Drosnin si kwuo, ọ hụrụ aha Yitzhak Rabin n’akụkụ ihe odide Bible site n’ịmafe mkpụrụ akwụkwọ 4,772 ọ bụla. N’ịhazi akụkụ ihe odide Bible ahụ n’ahịrịokwu nke nke ọ bụla n’ime ha dị mkpụrụ akwụkwọ 4,772, ọ hụrụ na aha Rabin (nke a gụrụ site n’elu gbadaa n’ala) gabichiri otu ahịrịokwu (Deuterọnọmi 4:42, nke gara site n’aka ekpe gaa n’aka nri) nke Drosnin sụgharịrị ịbụ “ogbu mmadụ nke ga-egbu mmadụ.”

Deuterọnọmi 4:42 kwuru n’ezie banyere onye gbuworo mmadụ n’amaghị ama. N’ihi ya, ọtụtụ ndị akatọwo ụzọ mmadụ ime ihe otú o si dị ya mma nke Drosnin si soo ya, na-azọrọ na a pụrụ iji usoro ya nke na-ekwekọghị na nkà mmụta sayensị mee ihe n’ịchọpụta ozi ndị yiri nke ahụ n’akụkụ ihe odide ọ bụla. Ma Drosnin kwụ ebe ọ kwụ, na-ama aka a, sị: “Mgbe ndị na-akatọ m hụrụ ozi banyere ogbugbu nke onye Praịm Minista n’ime [akwụkwọ ọgụgụ] bụ́ Moby Dick, aga m ekwenyere ha.”

Ọ̀ Na-egosi na E Dere Ya n’Ike Mmụọ Nsọ?

Prọfesọ Brendan McKay, nke Ngalaba Sayensị Kọmputa na Mahadum Mba Australia, naara ịma aka Drosnin ma jiri kọmputa mee nnyocha sara mbara n’akụkụ ihe odide Bekee nke Moby Dick. * N’iji otu usoro ahụ Drosnin kọwara mee ihe, McKay na-azọrọ na ya hụrụ “amụma” banyere ogbugbu Indira Gandhi, Martin Luther King, Jr., John F. Kennedy, Abraham Lincoln, na ndị ọzọ. Dị ka McKay si kwuo, ọ chọpụtara na Moby Dick ‘bukwara amụma’ banyere ogbugbu Yitzhak Rabin.

N’ịlaghachi n’akụkụ akwụkwọ nsọ Hibru bụ́ Jenesis, Prọfesọ McKay na ndị ibe ya amawokwa ihe ndị si ná nnwale ndị Rips na ndị ibe ya mere pụta, aka. Ebubo ha bụ na ihe ndị a chọpụtara nwere ihe dị nta jikọrọ ha na ozi ndị sitere n’ike mmụọ nsọ nke e ji mkpụrụ akwụkwọ ndochianya dee karịa ka ọ dị n’usoro ndị nchọpụta ahụ gbasoro—ebe ihe ndekọ ahụ bụ nke dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’otú ndị nchọpụta ahụ si chọọ. Ndị ọkà mmụta ka na-arụ ụka n’isiokwu a.

Isiokwu ọzọ na-ebilite mgbe a zọọrọ na a ma ụma zoo ozi ndị dị otú ahụ e ji mkpụrụ akwụkwọ ndochianya dee n’akụkụ ihe odide Hibru “nke nlereanya” ma ọ bụ “nke mbụ” ahụ. Rips na ndị nchọpụta ibe ya na-ekwu na ha ji “akụkụ ihe odide Jenesis nke bụ́ ihe nlereanya na nke a nabatara n’ebe nile” mee nchọpụta ha. Drosnin na-ede, sị: “Mkpụrụ akwụkwọ ndị dị na Bible nile dị ugbu a n’asụsụ Hibru mbụ ahụ, bụ otu ihe.” Ma nke a ọ̀ bụ eziokwu? Kama inwe akụkụ ihe odide bụ́ “ihe nlereanya,” a na-eji mbipụta dị iche iche nke Bible Hibru eme ihe taa, bụ́ ndị dabeere n’ihe odide oge ochie dị iche iche. Ọ bụ ezie na ozi Bible adịgasịghị iche, mkpụrụ akwụkwọ nile nke ihe odide ndị ahụ n’otu n’otu abụghị otu ihe.

Ọtụtụ nsụgharị taa dabeere na Leningrad Codex—ihe odide ndị Masoret nke Hibru nke kasị ochie ma zuo ezuo—nke e depụtaghachiri n’ihe dị ka afọ 1000 O.A. Ma Rips na Drosnin ji akụkụ ihe odide dị iche mee ihe, nke bụ́ Koren. Shlomo Sternberg, rabaị ndị Ọtọdọks nakwa ọkà mgbakọ na mwepụ na Mahadum Harvard, na-akọwa na Leningrad Codex “dị iche n’ebe mbipụta Koren nke Drosnin ji mee ihe dị site ná mkpụrụ akwụkwọ 41 dị na Deuterọnọmi nanị.” Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ahụ nwere akụkụ ihe odide Bible ndị e deghachiri n’ihe karịrị afọ 2,000 gara aga. Otú e si sụpee okwu ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta ndị a na-adịkarị nnọọ iche n’otú e si sụpee akụkụ ihe odide ndị Masoret ndị e dere mgbe e mesịrị. N’akwụkwọ mpịakọta ụfọdụ, e tinyere mkpụrụ akwụkwọ ụfọdụ n’ụba iji gosi ụdaume, ebe ọ bụ na e nwebeghị akara ụdaume mgbe ahụ. N’akwụkwọ mpịakọta ndị ọzọ, e ji mkpụrụ akwụkwọ dị ole na ole karị, mee ihe. Ntụnyere e mere n’etiti ihe odide Bible nile dịnụ na-egosi na ihe akụkụ ihe odide Bible ahụ pụtara ka dị otú ọ dị. Ma, ọ na-egosikwa n’ụzọ doro anya na otú e si sụpee ha na ọnụ ọgụgụ mkpụrụ akwụkwọ ha dịgasị iche site n’otu akụkụ ihe odide gaa n’ọzọ.

Ọchịchọ a na-achọ ozi e zoro ezo e weere na ha bụ mkpụrụ akwụkwọ ndochianya na-adabere n’akụkụ ihe odide na-adịghị agbanwetụ agbanwe. Otu mkpụrụ akwụkwọ e degharịrị ga-agwagbu usoro—na ozi ya ma ọ bụrụ na e nwere nke dịnụ. Chineke echekwawo ozi ya site na Bible. Ma o chekwaghị mkpụrụ akwụkwọ ọ bụla ịdị otú ọ dịbu, dị ka a ga-asị na o ji ihe ndị na-abụghị oké ihe dị ka mgbanwe n’otú e si sụpee okwu kpọrọbiga ihe ókè, ka ọtụtụ afọ na-agafe. Nke a ọ́ dịghị egosi na o kpuchighị ozi zoro ezo n’ime Bible?—Aịsaịa 40:8; 1 Pita 1:24, 25.

Mkpụrụ Akwụkwọ Ndochianya Zoro Ezo Ọ̀ Dị Anyị Mkpa?

Pọl onyeozi dere nnọọ n’ụzọ doro anya na “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Ozi doro anya ma na-aga n’ihe kpọmkwem nke dị na Bible abụghị ihe siri oké ike nghọta ma ọ bụ itinye n’ọrụ, ma ọtụtụ ndị na-ahọrọ ileghara ya anya. (Deuterọnọmi 30:11-14) Amụma ndị e depụtara na Bible n’ụzọ pụtara ìhè na-enye ihe ndabere bụ́ ịgba maka ikwere na o sitere n’ike mmụọ nsọ. * N’adịghị ka mkpụrụ akwụkwọ ndochianya zoro ezo, e bughị amụma Bible dị ka o si masị onye, ‘a kọghịkwa ha site na nanị uche nke aka mmadụ.’—2 Pita 1:19-21.

Pita onyeozi dere na “anyị esoghị akụkọ ifo nke e ji amamihe kọọ, mgbe anyị mere ka unu mara ike na ọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (2 Pita 1:16) Echiche nke mkpụrụ akwụkwọ ndochianya Bible malitere na nkwenkwe nke ihe omimi ndị Juu, na-eji usoro ndị ‘e ji amamihe’ chepụta bụ́ ndị na-ezochi ma na-agwagbu ihe doro anya akụkụ Bible ndị e dere n’ike mmụọ nsọ pụtara. Akwụkwọ Nsọ Hibru n’onwe ya katọrọ n’ezoghị ọnụ, ụzọ ihe omimi ahụ ha gbasoro.—Deuterọnọmi 13:1-5; 18:9-13.

Lee obi ụtọ anyị nwere inwe ozi na ntụziaka doro anya nke Bible, bụ́ nke pụrụ inyere anyị aka ịmara Chineke! Nke a dị nnọọ mma karịa ịnwa ịmụta banyere Onye Okike anyị site n’ịchọ ozi ndị zoro ezo ndị sitere ná nkọwa onwe onye na echiche ndị kọmputa nyere aka chepụta.—Matiu 7:24, 25.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Na Hibru, a pụkwara iji mkpụrụ akwụkwọ dochie anya ọnụ ọgụgụ. Ya mere, e kpebiri akara ụbọchị ndị a site ná mkpụrụ akwụkwọ ndị dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ Hibru ọ bụghị site n’ọnụ ọgụgụ.

^ par. 13 Hibru bụ asụsụ na-enweghị ụdaume. Onye na-agụ ya na-etinye ụdaume n’ụzọ kwekọrọ n’ihe a na-ekwu banyere ya. Ọ bụrụ na e leghara ihe a na-ekwu banyere ya anya, a pụrụ ịgbanwe ihe okwu pụtara kpam kpam site n’itinye ụdị ụdaume ndị dị iche. Okwu Bekee nwere mkpụrụ akwụkwọ ụdaume a na-adịghị agbanwe agbanwe, na-eme ka ịchọ okwu ndị dị otú ahụ sikwuo nnọọ ike ma bụrụ nke a kpara ókè.

^ par. 19 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere odide e dere Bible n’ike mmụọ nsọ na amụma ndị o buru, lee broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.