Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ma Ghara Ịtụ Egwu n’Agbanyeghị Mmegbu Ndị Nazi

Ha Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ma Ghara Ịtụ Egwu n’Agbanyeghị Mmegbu Ndị Nazi

Ha Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ma Ghara Ịtụ Egwu n’Agbanyeghị Mmegbu Ndị Nazi

Na June 17, 1946, Eze Nwanyị Wilhelmina nke Netherlands zigaara otu ezinụlọ nke Ndịàmà Jehova bi n’Amsterdam ozi ọmịiko. Nzube ya bụ iji kwupụta mmasị o nwere n’ebe nwa nwoke nke ezinụlọ ahụ, bụ́ Jacob van Bennekom nọ, bụ́ onye ndị Nazi gburu n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. N’afọ ole na ole gara aga, kansụl obodo nke Doetinchem, bụ́ otu obodo dị n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Netherlands, kpebiri ịkpọ otu okporo ámá aha Bernard Polman, onye bụ́kwa otu n’ime Ndịàmà Jehova nke e gburu n’oge agha ahụ.

N’IHI gịnị ka ndị Nazi ji tụgharịa imegide Jacob, Bernard, na Ndịàmà Jehova ndị ọzọ bi na Netherlands n’oge Agha Ụwa nke Abụọ? Gịnịkwa mere ka Ndịàmà a nwee ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ nke mkpagbu obi ọjọọ ma mesịa nweta nkwanye ùgwù na mmasị nke ndị mba ha na eze nwanyị ha? Iji chọpụta, ka anyị tụleghachi ihe omume ụfọdụ ndị dugara ná mburịta agha yiri nke Devid na Gọlaịat n’etiti otu obere ìgwè Ndịàmà Jehova na ndị ọchịchị na usuu ndị agha dị ukwuu nke ndị Nazi.

A Machibidoro Ha Iwu—Ma Ha Dịkwuru Ike Karịa Mgbe Ọ Bụla Ọzọ

Na May 10, 1940, usuu ndị agha Nazi wakporo Netherlands na mberede. Ebe ọ bụ na akwụkwọ Ndịàmà Jehova ahụ kesara kpughere omume ọjọọ nke Ọchịchị Nazi ma kwadoo Alaeze Chineke, ndị Nazi egbughị oge ọ bụla n’ịnwa ịkwụsị ọrụ Ndịàmà ahụ. N’ihe na-erughị izu atọ mgbe ndị Nazi wakposịrị Netherlands, ha wepụtara iwu nzuzo nke machibidoro Ndịàmà Jehova. Na March 10, 1941, akụkọ ndị nta akụkọ bipụtara mere ka ọha na eze mara banyere mmachibido iwu ahụ, na-ebo Ndịàmà ahụ ebubo ime mkpọsa “megide ihe nile gọọmenti na chọọchị guzobere.” N’ihi ya, a chọwaziri Ndịàmà n’ike n’ike.

Ọ dị mma ịmara na n’agbanyeghị na ndị Gestapo, ma ọ bụ ndị uwe ojii nzuzo ahụ a na-adịghị ele anya ọma, nọ na-elegide chọọchị nile anya, ha kpagburu nanị otu njikọ ndị Kraịst n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. “Mkpagbu ruo ọnwụ,” ka otu onye Netherlands na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Dr. Louis de Jong na-ekwu, “bịaara nanị otu njikọ okpukpe—Ndịàmà Jehova.”—Het Koninkrijk der Nederlanden in de Tweede Wereldoorlog (Alaeze Netherlands n’Oge Agha Ụwa nke Abụọ).

Ndị Gestapo nwetara nkwado nke ndị uwe ojii Netherlands n’ịchọpụta na ijide Ndịàmà. Tụkwasị na nke a, otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị bụ́ onye ụjọ jidere o wee si n’ezi ofufe dapụ, nyere ndị Nazi ihe ọmụma banyere ndị ha na ya sobu bụrụ ndị kwere ekwe. Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke April 1941, e jidere Ndịàmà 113. Ajọ mwakpo a ò mere ka ọrụ nkwusa ahụ kwụsị?

A na-achọta azịza ya na Meldungen aus den Niederlanden (Akụkọ Si Netherlands), bụ́ akwụkwọ nwere ọtụtụ nkebi nke Sicherheitspolizei (Ndị Uwe Ojii Nchebe) nke Germany dekọrọ n’April 1941. Akụkọ ahụ kwuru banyere Ndịàmà Jehova, sị: “Ịrọ òtù a a machibidoro iwu na-arụ ọrụ siri ike n’ala a dum, na-enwe nzukọ ndị iwu na-akwadoghị, na-amapawakwa mpempe akwụkwọ ndị bu okwu ndị bụ́ ‘Ịkpagbu Ndịàmà Chineke bụ mpụ’ na ‘Jehova ga-eji mbibi ebighị ebi taa ndị mkpagbu ahụhụ.’” Izu abụọ mgbe e mesịrị, otu ndị ahụ kọrọ na “n’agbanyeghị nsiwanye ike nke ihe Ndị Uwe Ojii Nchebe na-eme megide ọrụ Ndị Mmụta Bible ahụ, ọrụ ha nọgidere na-esiwanye ike.” Ee, n’agbanyeghị ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e jidere, Ndịàmà ahụ nọgidere na-arụ ọrụ ha, na-enyefe ihe karịrị akwụkwọ 350,000 n’aka ọha na eze na 1941 nanị!

Gịnị nyere ìgwè nta ahụ na-eto eto nke narị Ndịàmà ole na ole mejupụtara obi ike iguzogide ndị iro ha na-eyi egwu? Dị ka Aịsaịa, bụ́ onye amụma oge ochie nke kwesịrị ntụkwasị obi, Ndịàmà ahụ tụrụ egwu Chineke, ọ bụghị mmadụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha kwenyesiri nnọọ ike n’okwu na-emesi obi ike ndị Jehova gwara Aịsaịa: “Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasi unu obi; ònye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu mmadụ ga-anwụ anwụ?”—Aịsaịa 51:12.

Atụghị Egwu Chọrọ Nkwanyere Ùgwù

Ka ọ na-erule ngwụsị 1941, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà e jiderela rịrị elu ruo 241. Otú ọ dị, ole na ole tụrụ egwu mmadụ. E hotara na Willy Lages, bụ́ onye a ma ama so ná ndị uwe ojii nzuzo nke Germany, kwuru na “pasent 90 nke Ndịàmà Jehova jụrụ ikpughe ihe ọ bụla, ebe ọ bụ nanị pasent dị nnọọ nta nke njikọ ndị ọzọ nwere ikike ịgbachi nkịtị.” Nchọpụta nke onye Netherlands bụ́ ụkọchukwu bụ́ Johannes J. Buskes, bụ́ onye a tụkọtara ya na ụfọdụ Ndịàmà ahụ mkpọrọ, kwadoro ihe Lages kwuru. Na 1951, Buskes dere, sị:

“Laa azụ n’oge ahụ, amalitere m inwe nkwanye ùgwù dị ukwuu n’ebe ha nọ n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ha na ike nke okwukwe ha. Agaghị m echefu ma ọlị nwa okorobịa ahụ—ọ pụghị ịkarịwo afọ 19—bụ́ onye kesaworo akwụkwọ nta nke buru amụma banyere ọdịda Hitler na Alaeze Ukwu nke Atọ ahụ. . . . A pụrụ ịtọhapụwo ya n’ime ọkara afọ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe nkwa ịkwụsị ọrụ dị otú ahụ. Nke a ka ọ jụwapụrụ isi ime, a makwara ya ikpe ịnọ n’ogige ọrụ mmanye dị na Germany ruo oge a na-akpọghị aha. Anyị maara nke ọma ihe nke ahụ pụtara. Mgbe a kpụụrụ ya pụọ n’echi ya, anyị asịkwa ya ka e mesịa, agwara m ya na anyị ga na-eche banyere ya, na-ekpekwara ya ekpere. Nanị ihe ọ zara bụ: ‘Unu echegbula onwe unu banyere m. Alaeze Chineke ga-abịarịrị.’ Ị gaghịnụ echefu ihe dị otú ahụ echefu, ya sọkwa ya ya bụrụ na i kwenyetụghị n’ozizi Ndịàmà Jehova a.”

N’agbanyeghị mmegide obi ọjọọ, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà ahụ nọgidere na-arị elu. Ọ bụ ezie na ha dị ihe dị ka 300, obere oge tupu agha ụwa nke abụọ, ọnụ ọgụgụ ahụ arịwo elu ruo 1,379 na 1943. N’ụzọ dị mwute, ka ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ ahụ, mmadụ 54 n’ime Ndịàmà 350 ahụ e jidere nwụrụ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Ka ọ na-erule 1944, e nwere Ndịàmà Jehova 141 si Netherlands a ka ji eji n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche.

Afọ Ikpeazụ nke Mkpagbu Ndị Nazi

Mgbe ụbọchị a kara aka, bụ́ June 6, 1944, gasịrị, mkpagbu nke Ndịàmà ahụ banyere n’afọ ikpeazụ ya. A na-aga imeri ndị Nazi na ndị na-adụnyere ha úkwù n’agha. Mmadụ ga-eche na n’ọnọdụ a, ndị Nazi ga-akwụsị ịchụgharị ndị Kraịst aka ha dị ọcha. Ma, n’afọ ahụ, e jidere Ndịàmà 48 ọzọ, 68 ndị ọzọ n’ime Ndịàmà ahụ a tụrụ mkpọrọ nwụkwara. Otu n’ime ha bụ Jacob van Bennekom, nke a kpọtụrụ aha na mbụ.

Jacob nke dị afọ 18 so n’ime mmadụ 580 e mere baptism dị ka Ndịàmà Jehova na 1941. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọ kwụsịrị otu ọrụ a na-akwụ ezigbo ego na ya n’ihi na ọrụ ahụ chọrọ ka o mebie nnọpụiche ya dị ka onye Kraịst. Ọ naara ọrụ dị ka odibo ma malite ije ozi dị ka onye ozi oge nile. E jidere ya ka o bu akwụkwọ e ji amụ Bible. N’August 1944, Jacob dị afọ 21 nọ n’ụlọ mkpọrọ dị n’obodo Rotterdam degaara ezinụlọ ya akwụkwọ, na-asị:

“Anọ m n’ọnọdụ dị nnọọ mma, ọṅụ jukwara m obi. . . . Ka ọ dị ugbu a, a gbawo m ajụjụ ugboro anọ. Ugboro abụọ mbụ kpụ nnọọ ọkụ n’ọnụ, a kụkwara m nnọọ ihe ebe ọ dị ukwuu, ma site n’ike na ebere Onyenwe anyị nke na-erughịrị mmadụ, ruo ugbu a, ekpughebeghị m ihe ọ bụla. . . . Enweela m rịị ike ikwu okwu n’ebe a, ugboro isii, ngụkọta nke mmadụ 102 gekwara ntị. Ụfọdụ n’ime ndị a na-egosipụta nnọọ mmasị, ha ekwewokwa nkwa na ozugbo a tọhapụrụ ha, ha ga-aga n’ihu.”

Na September 14, 1944, a kpọọrọ Jacob gaa n’ogige ịta ahụhụ dị n’otu obodo Netherlands bụ́ Amersfoort. Ọ nọgidere na-eme nkwusa ọbụna n’ebe ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Onye mkpọrọ ibe ya na-echeta, sị: “Ndị mkpọrọ na-atụtụkọrọ isi siga ndị nche tụfuru ma na-eji peji dị iche iche nke otu Bible emere akwụkwọ siga. Mgbe ụfọdụ, Jacob nwere ihe ịga nke ọma n’ịgụ okwu ole na ole n’ime peji Bible ndị a gaje iji fụchie siga. Ozugbo, ọ ga-eji okwu ndị ahụ mee ihe dị ka ihe ndabere maka ikwusara anyị ozi ọma. N’oge na-adịghị anya, anyị nyere Jacob utu aha bụ́ ‘Nwoke Bible.’”

N’October 1944, Jacob so n’ime otu ìgwè dị ukwuu nke ndị mkpọrọ bụ́ ndị e nyere iwu igwu olulu ndị a chọrọ ka ụgbọala ndị iro daba na ha. Jacob jụrụ ịrụ ọrụ ahụ n’ihi na akọ na uche ya agaghị ekwe ya ịkwado mgbalị agha ahụ. N’agbanyeghị na ndị nche ahụ nọgidere na-eyi ya egwu, ọ daghị mbà. N’October 13, otu ọfịsa kpọọrọ ya site n’ebe a kpọchiri nanị ya gaghachi n’ebe ọrụ ahụ. Ọzọkwa, Jacob kwụ ebe ọ kwụ. N’ikpeazụ, e nyere Jacob iwu ka o gwuo ili ya, a gbagbukwara ya.

Nchọgharị A Na-achọgharị Ndịàmà Agaa n’Ihu

Nguzo obi ike nke Jacob na ndị ọzọ kpasuru ndị Nazi iwe ma kpalite nchọgharị ọzọ a chọgharịrị Ndịàmà ahụ. Otu n’ime ndị ha lekwasịrị anya bụ Evert Kettelarij nke dị afọ 18. Na mbụ, Evert pụrụ gaa zoo, ma mgbe e mesịrị, a nwụchiri ya ma kụọ ya ihe n’ụzọ obi ọjọọ iji mee ka o nye ihe ọmụma banyere Ndịàmà ndị ọzọ. Ọ jụrụ, a kpọgakwara ya Germany ịrụ ọrụ mmanye.

N’otu ọnwa ahụ, bụ́ October 1944, ndị uwe ojii chọgharịwara ọgọ nwoke Evert, bụ́ Bernard Luimes. Mgbe ha hụrụ ya, ya na Ndịàmà abụọ nọ—Antonie Rehmeijer na Albertus Bos. Albertus anọworị n’otu ogige ịta ahụhụ ruo ọnwa 14. N’agbanyeghị nke ahụ, ozugbo a tọhapụsịrị ya, o ji ịnụ ọkụ n’obi maliteghachi ọrụ nkwusa ahụ. Na mbụ, ndị Nazi kụrụ ndị ikom atọ ahụ ihe n’emeghị ebere, e mesịakwa, ha gbagburu ha. Ọ bụ nanị mgbe agha ahụ bisịrị ka a chọtara ozu ha ma ligharịa ha. N’oge na-adịghị anya agha ahụ bisịrị, ọtụtụ akwụkwọ akụkọ ndị e dere n’ógbè ahụ kọrọ banyere ogbugbu a. Otu n’ime akwụkwọ akụkọ ndị ahụ dere na Ndịàmà atọ ahụ ajụwo ugboro ugboro ijere ndị Nazi ozi ndị megidere iwu Chineke ma gbakwụnye na “n’ihi nke a, ha aghaghị iji ndụ ha kwụọ ụgwọ.”

Ka ọ dịgodị, na November 10, 1944, e jidere Bernard Polman, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ ma ziga ya ịrụrụ ndị agha ọrụ. Nanị ya bụ Onyeàmà nọ n’etiti ndị ọrụ mmanye ahụ, nanị ya jụkwara ịrụ ọrụ a. Ndị nche ahụ nwalere ụzọ dị iche iche isi mee ka o kwenye. E nyeghị ya nri ọ bụla. E jikwa okpiri, shọvel, na isi égbè kụọ ya n’ụzọ obi ọjọọ. Tụkwasị na nke a, a manyere ya irufe otu mmiri jụrụ oyi nke na-eru n’ikpere, a kpọchikwara ya n’ime ụlọ dị n’okpuru ala bụ́ nke dị mmiri mmiri, bụ́ ebe ọ na-aghaghị iyi uwe ya mmiri dere nọrọ n’abalị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Bernard adaghị mbà.

N’oge ahụ, e kwere ka abụọ n’ime ụmụnne ndị inyom Bernard, bụ́ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, leta ya. Ha gbara ya ume ka ọ gbanwee obi ya, ma nke ahụ enutụghị ya n’ụzọ ọ bụla. Mgbe ha jụrụ Bernard ma ọ̀ dị ihe ha ga-emere ya, ọ tụrụ arọ ka ha laa ma mụọ Bible. Ndị na-akpagbu ya kweziri ka nwunye ya dị ime leta ya, na-enwe olileanya na ọ ga-eme ka ọ kwụsị ịkpọ ekwo nkụ. Ma ọnụnọ ọ nọ ebe ahụ na okwu obi ike ya jere ozi n’ime ka Bernard kpebisie ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. Na November 17, 1944, mmadụ ise n’ime ndị na-akpagbu Bernard gbagburu ya ka ndị ọrụ mmanye ndị ọzọ nile nọ na-ekiri. Ọbụna mgbe Bernard nwụsịrị, n’ịbụ onye a gbakasịrị mgbọ n’ahụ ya nile, iwe were nnọọ ọfịsa okwu ahụ dị n’aka nke na o buuru égbè ya ma gbaa Bernard n’anya ya abụọ.

N’agbanyeghị na mmeso arụrụala a wụrụ Ndịàmà ndị ọzọ nụrụ banyere ogbugbu ahụ akpata oyi n’ahụ, ha nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’atụghị egwu ma nọgide na-arụ ọrụ ha dị ka ndị Kraịst. Otu obere ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova, nke dị nso n’ebe e gburu Bernard, kọrọ n’oge na-adịghị anya e gbusịrị ya, sị: “N’ọnwa a, n’agbanyeghị ihu igwe na-adịghị nnọọ mma na ihe isi ike ndị Setan wetawooro anyị, anyị enwewo ike ịmụba ọrụ anyị. Ọnụ ọgụgụ awa e tinyere n’ubi rịrị elu site na 429 ruo 765. . . . Ka otu nwanna nwoke na-eme nkwusa, o zutere otu nwoke ọ gbaara ezigbo àmà. Nwoke ahụ jụrụ ma okpukpe a na nke nwoke ahụ a gbagburu agbagbu na-ekpe ọ̀ bụ otu ihe. Ozugbo ọ nụrụ na ọ bụ, nwoke ahụ kwupụrụ, sị: ‘Nwoke ahụ bụ ya, okwukwe ya bụ ya! Ọ bụ ihe ahụ ka m na-akpọ dike n’okwukwe!’”

Jehova Chetara Ha

Na May 1945, e meriri ndị Nazi, chụpụkwa ha na Netherlands. N’agbanyeghị mkpagbu a kpagburu Ndịàmà Jehova n’esepụghị aka n’oge agha ahụ, ọnụ ọgụgụ ha arịwo elu site na narị ole na ole ruo ihe karịrị 2,000. N’ikwu banyere Ndịàmà a nọ n’oge agha ahụ, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Dr. de Jong na-ekweta, sị: “Ọnụ ọgụgụ ka nnọọ ukwuu n’ime ha jụrụ ịgọnahụ okwukwe ha n’agbanyeghị iyi egwu na mmekpọ ọnụ.”

Ya mere, e nwere ezi ihe mere ndị ọchịchị ji cheta Ndịàmà Jehova maka nguzo obi ike ha mgbe ha chere ọchịchị ndị Nazi ihu. Otú ọ dị, nke ka mkpa, Jehova na Jisọs ga-echeta ihe ndị bụ́ ịgba Ndịàmà a nọ n’oge agha ahụ mere. (Ndị Hibru 6:10) N’oge Ọchịchị Puku Afọ Jisọs Kraịst bụ́ nke na-abịaru nso, a ga-esi n’ili ncheta kpọlite Ndịàmà a kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghịkwa atụ egwu bụ́ ndị nyere ndụ ha n’ozi Chineke, na-enwe olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs!—Jọn 5:28, 29.

[Foto dị na peeji nke 24]

Jacob van Bennekom

[Foto dị na peeji nke 26]

Ihe e si n’akwụkwọ akụkọ dọkapụta bụ́ nke bu iwu ahụ machibidoro Ndịàmà Jehova

[Foto dị na peeji nke 27]

N’aka nri: Bernard Luimes; n’okpuru: Albertus Bos (n’aka ekpe) na Antonie Rehmeijer; n’ala ala: Ụlọ ọrụ Society nke dị na Heemstede