Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Kwesịrị Ịmara Banyere Amoosu

Ihe I Kwesịrị Ịmara Banyere Amoosu

Ihe I Kwesịrị Ịmara Banyere Amoosu

AMOOSU nke oge a na-ara ahụ nkọwa. Nke a bụ n’ihi na ndị na-eme ya dịgasị iche n’ụzọ dị ukwuu. Ha enweghị otu onyeisi ma ọ bụ ozizi ma ọ bụ akwụkwọ dị nsọ iji mee ka nkwenkwe ha bụrụ otu. Ọdịnala, nhazi, ememe, na echiche ha banyere chi ndị ha ga-asọpụrụ dịgasịkwa iche. Otu onye edemede na-ekwu, sị: “Ndị òtù nzuzo na-eme ka mmadụ nwee ‘ọmà ahịa ebe o nweere onwe ya’ ịzụta echiche dị iche iche.” Onye ọzọ na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná Ndị Ọgọ Mmụọ Ọgbara Ọhụrụ adịghị ekwekọrịta n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ihe nile.”

Nye ọtụtụ ndị, enweghị nkwekọ ndị ahụ abụghị nsogbu. Otu akwụkwọ nduzi maka ndị amoosu na-achọ inweta ọkwá dị elu na-ekwu, sị: “Mgbe i nwetara ihe ọmụma ndị yiri ka ha na-emegiderịta onwe ha, nyochaa ihe ọmụma ndị ahụ ma mee mkpebi banyere nke ị ga-agbaso. Gee ihe gbabatara gị n’uche ntị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, nwere onwe gị ime nhọrọ n’ime ememe ndị ahụ e bipụtara ebipụta na akwụkwọ ọgụgụ banyere ememe iji kpebie ihe yiri ka o ziri ezi.”

Nye ndị matara ọdịdị nke eziokwu, enweghị nkwekọ ndị dị otú ahụ bụ nsogbu. Eziokwu bụ ihe e ji n’aka, ihe dị adị n’ezie. Ihe adịghị abụ eziokwu nanị n’ihi na mmadụ chere ma ọ bụ nwee olileanya ma ọ bụ kwere na ha bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, n’otu oge ndị dọkịta kweere na ha pụrụ ịgwọ oyi ịba n’ahụ site n’igbubi ọkụkọ dị ndụ abụọ ma were ha tụkwasị n’obi onye ọrịa ahụ. Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ ndị ọrịa ji ezi obi kwere na usoro ọgwụgwọ a ga-eme ka ha gbakee. Otú ọ dị, ihe ha kweere na olileanya ha ekwekọghị n’ihe bụ eziokwu—usoro dị otú ahụ adịghị agwọ oyi ịba n’ahụ. Ndị mmadụ adịghị emepụta eziokwu; ha na-agbalị ịghọta ya.

Bible na-azọrọ na ya na-ekwu eziokwu banyere ihe ime mmụọ. Mgbe Jisọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ gwara Nna ya n’ekpere, sị: “Okwu Gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” (2 Timoti 3:16) Ọtụtụ ndị amoosu ekwetaghị. Kama nke ahụ, ha na-achọ ihe mkpali na nduzi n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, n’okpukpe oge ochie, na ọbụna na sayensị e chepụtara echepụta. Otú ọ dị, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya, ma ọ dịghị ihe ọzọ ịtụle ihe ndị Bible na-ekwu? E kwuwerị, ọ fọrọ nke nta ka a mara ya n’ebe nile dị ka akwụkwọ dị nsọ. Ọ bụkwa otu n’ime ihe odide okpukpe kasị ochie ka dịnụ. E dere Bible ruo ihe karịrị ogologo oge nke afọ 1,600, n’agbanyeghị nke ahụ, ihe nile ọ na-akụzi kwekọrịtara. Ka anyị jiri ihe ndị Bible na-akụzi tụnyere nkwenkwe ụfọdụ zuru ebe nile nke ndị na-akwalite amoosu nwere ugbu a.

Ole Ndị Bi n’Ógbè Ndị Bụ́ Mmụọ?

Ajụjụ bụ́ isi n’ọchịchọ a na-achọ nghọta ime mmụọ bụ, Ole ndị bi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ? Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị amoosu nke oge a bụ ndị na-agbaso okwukwe nke ife ọtụtụ chi bụ́ nke dabeere n’okike, ụfọdụ na-efe nnukwu chi nne nwanyị, bụ́ nke a na-ele anya dị ka nke na-arụ ụzọ ọrụ atọ dị ka nwa agbọghọ, nne, nakwa agadi nwanyị, bụ́ ndị na-anọchite anya ogo ndị bụ́ isi nke ndụ. Enyi ya nwoke bụ otu chi nwere mpi. Ndị amoosu ndị ọzọ na-efekọta chi nwoke na chi nwanyị ọnụ. Otu onye edemede na-ekwu, sị: “A na-ahụ Chi Nwanyị na Chi Nwoke ndị ahụ dị ka ngosipụta nke ikike ebumpụta ụwa nke nwoke na nwanyị. Nke ọ bụla [nwere] njimara ndị pụrụ iche nke na ọ bụrụ na e jikọta ha, a na-enweta ndụ kwekọrọ ekwekọ.” Onye ọzọ na-ede, sị: “Otu n’ime nhọrọ ndị kasị mkpa n’Amoosu bụ nhọrọ ị ga-ahọrọ arụsị (Chi Ndị Nwoke/Chi Ndị Nwanyị) ị ga-eso na-arụkọ ọrụ. . . . Amoosu na-eme ka i nwere onwe gị ịhọrọ ma kwanyere Chi nke bụ́ ọchịchọ gị ùgwù.”

Bible adịghị akwado nke ọ bụla n’ime echiche ndị a. Jisọs Kraịst jere ozi ya nile n’ịkụziri ndị ọzọ banyere Jehova, “nke nanị [Ya] bụ ezi Chineke.” (Jọn 17:3) Bible na-ekwu, sị: “N’ihi Jehova dị ukwuu, bụrụkwa onye a na-eto nke ukwuu: onye a na-atụ egwu Ya ka Ọ bụkwa n’elu chi nile. N’ihi na chi nile nke ndị nile dị iche iche bụ ihe efu.”—1 Ihe E Mere 16:25, 26.

Gịnị banyere Ekwensu? Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary na-akọwa amoosu dị ka “iso ekwensu na-ekwurịta okwu.” Ọ ga-esi ike taa ịhụ onye amoosu nke ga-ekwenyere nkọwa a, n’ihi na ọtụtụ ha adịghịdị ekwenye na Setan bụ́ Ekwensu dị adị. Otu nwa agbọghọ, bụ́ onye a kọwara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Irish Times dị ka “onye amoosu nọ n’ọkwá dị elu nakwa onye ndú nke otu n’ime òtù ndị amoosu kasị pụta ìhè na Ireland,” si otú a tụgharịa uche: “Ikwere n’Ekwensu pụtara ịnakwere Iso Ụzọ Kraịst . . . [Ekwensu] apụghị ibi n’eluigwe na ala ebe Chineke na-adịghị.”

Bible na-akwado na Ekwensu dị adị, na-ekwukwa na ọ bụ ya kpatara ihe ka ukwuu ná nhụjuanya na oké ọgba aghara e nwere n’ụwa. (Mkpughe 12:12) Ọ bụghị nanị na Jisọs kụziri na Ekwensu dị adị kamakwa o gosiri na ọ bụ ihe kwere omume ime uche Ekwensu n’amaghị ama. Dị ka ihe atụ, ndị ndú okpukpe nke narị afọ mbụ bụ́ ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha zọọrọ na ha bụ, n’ụzọ ụfọdụ, ụmụ Chineke, kwerekwa na ha na-eme uche Chineke. Jisọs, bụ́ onye pụrụ ịmata ihe dị ha n’obi, maara na ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Ọ gwara ha hoo haa, sị: “Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime.” (Jọn 8:44) Ọzọkwa, akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-ekwu na Ekwensu “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.”—Mkpughe 12:9.

Majik Ụfọdụ Hà Dị Mma?

N’ezie, mgbe mgbe, e jikọwo majik na anwansi. Ọtụtụ mmadụ ma n’oge gboo ma n’oge a kweere na majik ndị amoosu na-eme bụ iji merụọ ndị ọzọ ahụ. A na-ekwu na ndị amoosu nwere ikike nke iji majik wetara ndị mmadụ oké ahụ mgbu ma ọ bụ ọbụna ọnwụ. Kemgbe ụwa, a tawo ndị amoosu ụta maka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ imerime ọdachi na-enweghị ọgwụgwụ, gụnyere ọrịa, ọnwụ, na ihe ọkụkụ emeghị nke ọma.

Taa, ndị amoosu na-agọnahụ ebubo ndị dị otú ahụ kpam kpam. Ọ bụ eziokwu na ha na-ekweta na amoosu aghụghọ nke na-agbaso ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ dị adị, ihe ka ọtụtụ nọgidere na-ekwu na ha ji majik ha eweta abamuru, ọ bụghị mmerụ ahụ. Ndị Wicca na-akụzi na ihe mmadụ mere na majik ga-alaghachitere ya okpukpu atọ ma na-ekwu na nke a bụ isi ihe na-egbochi ịkọcha mmadụ. Ihe atụ nke majik ndị a a sị na ha na-eweta ihe ọma gụnyere ịkọ ọgwụ iji chebe onwe gị, iji mee ka ụlọ gị dị ọcha pụọ n’ikike na-emerụ ahụ nke ndị bibu ebe ahụ hapụrụ, iji mee ka mmadụ hụ gị n’anya, iji kwalite ọgwụgwọ na ahụ ike, iji gbochie ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ, na iji kpakọba ego. N’ịbụ nke a sị na o nwere ikike dị ukwuu otú a, ọ bụghị ihe ijuanya na amoosu aghọọla nnọọ ihe na-ewu ewu.

Otú ọ dị, Bible egosighị ọdịiche ọ bụla n’etiti majik ọma na majik ọjọọ. N’Iwu ahụ o nyere Mosis, Chineke mere ka ebe ọ kwụ doo nnọọ anya. O kwuru, sị: “Unu ejikwala igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ.” (Levitikọs 19:26) Anyị na-agụkwa, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị . . . onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị, ma ọ bụ dibịa nrafu, ma ọ bụ onye na-ajụ mmụọ ihe.”—Deuterọnọmi 18:10, 11.

N’ihi gịnị ka Chineke ji kwuo nke ahụ? Ọ bụghị n’ihi na ọ chọrọ ịnapụ anyị ihe bara uru. Jehova nyere ndị ya iwu ndị a n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya, ọ chọghịkwa ka egwu na nkwenkwe ụgha jiri ha mere ohu. Kama nke ahụ, ọ na-akpọ ndị ohu ya ka ha bịakwute ya maka ihe ndị dị ha mkpa. Ọ bụ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè.” (Jemes 1:17) Jọn onyeozi mesiri ndị kwere ekwe ibe ya obi ike, sị: “Ihe ọ bụla anyị na-arịọkwa, anyị na-anata ya n’aka [Chineke], n’ihi na anyị na-edebe ihe nile O nyere n’iwu, anyị na-emekwa ihe nile na-atọ ụtọ n’ihu Ya.”—1 Jọn 3:22.

Gịnị Banyere Ndị Ajọ Mmụọ?

Ọtụtụ ndị amoosu kwenyeere Bible na nke a: Ndị ajọ mmụọ dị adị. N’otu edemede, otu onye na-akwalite amoosu dọrọ aka ná ntị, sị: “Onyinyo ndị ahụ dị n’ebe ahụ: Ha dị adị, n’ụwa nke anya na-adịghị ahụ bụ́ nke yiri nke anyị, ihe ndị e kere eke dị ndụ. . . . Okwu ndị bụ́ ‘nwa mmụọ,’ ‘ajọ mmụọ’ na ‘mmụọ ọjọọ’ zichara nnọọ ezi. Ha siri nnọọ ike. . . . Ndị kasị nwee ọgụgụ isi . . . nwere ike (ma ọ bụrụ na mmadụ enye nnọọ aka megheere ha ụzọ) ịbata n’ụwa anyị. . . . Ha pụrụ ịbanye n’ahụ gị . . . , ọbụna na-achịkwa gị ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Ee, nke a yiri kpọmkwem akụkọ ndị a na-akọ mgbe ochie banyere ndị mmụọ ọjọọ ijide mmadụ.”

N’oge Bible, ndị mmụọ ọjọọ jidere ma mekpọọ ọtụtụ ndị ọnụ n’ụzọ dịgasị iche. Ụfọdụ n’ime ndị ha jidere dara ogbi, ụfọdụ kpuru ìsì, ụfọdụ mere omume dị ka ndị isi mebiri, ụfọdụ nwekwara ikike karịrị nke mmadụ. (Matiu 9:32; 12:22; 17:15, 18; Mak 5:2-5; Luk 8:29; 9:42; 11:14; Ọrụ 19:16) Mgbe ụfọdụ oké ihe mgbu ahụ na-adịkwu njọ mgbe ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ jidere mmadụ n’otu oge. (Luk 8:2, 30) N’ezie, e nwere ezi ihe mere Jehova ji adọ ndị mmadụ aka ná ntị ịghara itinye aka n’amoosu na ihe omume anwansi ndị ọzọ.

Okpukpe nke Dabeere n’Eziokwu

A na-adọrọ ọtụtụ ndị taa gaa n’amoosu n’ihi na o yiri okpukpe na-adịghị emerụ ahụ, nke na-adịghị eyi ndụ egwu, na nke ebumpụta ụwa. A nabatawo ya n’ógbè ụfọdụ. A dịghị atụ ya egwu. Kama, e werewo ya mgbe mgbe dị ka ihe na-abụghị oké ihe. Na gburugburu ebe ikwe ibe nọrọ n’ụzọ okpukpe na-eduga ọtụtụ ndị ịnakwere ọbụna ihe jọgburu onwe ya, amoosu aghọwo ihe a na-akwanyere nnọọ ùgwù.

N’ezie, ógbè nke okpukpe aghọwo ọmà ahịa bụ́ ebe ndị mmadụ nweere onwe ha ịhọrọ ihe dị ha mkpa, dị nnọọ ka mmadụ si azụrụ akpụkpọ ụkwụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, Jisọs kwuru banyere nanị nhọrọ abụọ. O kwuru, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” (Matiu 7:13, 14) Dị ka o kwesịrị ịdị, anyị nweere onwe anyị ịhọrọ ụzọ nke anyị ga-eso. Ma ebe ọ bụ na ọdịmma ebighị ebi anyị dị n’ihe ize ndụ, nhọrọ ahụ dị nnọọ mkpa. Iji nweta ihe ọmụma ime mmụọ, anyị aghaghị ịgbaso ụzọ nke eziokwu—ụzọ ahụ a na-achọta nanị n’ime Okwu Chineke, bụ́ Bible.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọtụtụ ndị taa na-ele amoosu anya dị ka okpukpe ebumpụta ụwa nke na-adịghị emerụ ahụ

[Foto dị na peeji nke 6]

E jikọwo majik na òtù nzuzo mgbe nile

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndị amoosu hà na-eme uche Ekwensu n’amaghị ama?

[Foto dị na peeji nke 7]

Bible na-ekpughe ụzọ nke eziokwu