Ndị Na-alụso Chineke Ọgụ Agaghị Enwe Ihe Ịga nke Ọma!
Ndị Na-alụso Chineke Ọgụ Agaghị Enwe Ihe Ịga nke Ọma!
“Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha agaghị enwe ike imegide gị.”—JEREMAỊA 1:19.
1. Ọrụ dị aṅaa ka e nyere Jeremaịa, ogologo oge hàkwa aṅaa ka ọrụ ya dịruru?
JEHOVA nyere nwa okorobịa bụ́ Jeremaịa ọrụ ịbụ onye amụma nye mba nile. (Jeremaịa 1:5) Nke a mere n’oge ọchịchị nke ezigbo Eze Josaịa nke Juda. Ozi ibu amụma Jeremaịa dịgidere ruo oge ọgba aghara ahụ e nwere tupu mmeri Babilọn meriri Jerusalem ma banye n’oge a kpọọrọ ndị Chineke jee biri n’ala ọzọ.—Jeremaịa 1:1-3.
2. Olee otú Jehova si gbakwuo Jeremaịa ume, gịnịkwa ka ịlụso onye amụma ahụ ọgụ pụtara?
2 Ozi ikpe ọmụma ndị Jeremaịa gaje ịkpọsa aghaghị ịkpata mmegide. N’ihi ya, Chineke wusiri ya ike maka ihe ndị ga-emenụ. (Jeremaịa 1:8-10) Dị ka ihe atụ, onye amụma ahụ nwetakwuru agbamume site n’okwu bụ́: “Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha agaghị enwe ike imegide gị: n’ihi na gị ka M nọnyeere, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ịnapụta gị.” (Jeremaịa 1:19) Ịlụso Jeremaịa ọgụ ga-apụta ịlụso Chineke ọgụ. Taa, Jehova nwere otu ìgwè yiri ndị amụma bụ́ ndị na-ejere ya ozi, ndị ọrụ ha yiri nke Jeremaịa. Dị ka ya, ha ji nkwuwa okwu na-akpọsa okwu amụma Chineke. Ozi a na-emetụtakwa mmadụ nile na mba nile, n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ na-adịghị mma, na-adabere n’otú ha si meghachi omume na ya. Dị ka ọ dị n’oge Jeremaịa, e nwere ndị na-alụso Chineke ọgụ site n’imegide ndị ohu ya na ọrụ O nyere ha.
A Na-awakpo Ndị Ohu Jehova
3. N’ihi gịnị ka e jiworo na-awakpo ndị ohu Jehova?
3 A nọwo na-awakpo ndị Jehova kemgbe mmalite narị afọ nke 20. N’ọtụtụ ala, ndị bu ihe ọjọọ n’obi achọwo igbochi—ee, ịbịanyụ—mkpọsa nke ozi ọma Alaeze Chineke. Ha abụrụwo ndị Onye Iro anyị kasịnụ, bụ́ Ekwensu, kpaliri, bụ́ onye “dị ka ọdụm na-agbọ ụja, . . . na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Mgbe “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị na 1914, Chineke mere ka Ọkpara ya nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze ọhụrụ nke ụwa, na-enye ya iwu, sị: “Nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị.” (Luk 21:24; Abụ Ọma 110:2) N’iji ike ya mee ihe, Kraịst chụpụrụ Setan n’eluigwe ma chụdata ya n’ógbè nke ụwa. Ebe ọ maara na oge o nwere dị mkpirikpi, Ekwensu na-awụsa iwe ya n’ahụ ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị òtù ha. (Mkpughe 12:9, 17) Gịnị siworo ná mwakpo ndị a na-alụso Chineke ọgụ mere ugboro ugboro pụta?
4. Ule ndị dị aṅaa ka ndị Jehova nwetara n’oge Agha Ụgha Mbụ, ma gịnị mere na 1919 nakwa na 1922?
4 Ndị ohu Jehova e tere mmanụ zutere ọtụtụ ule nke okwukwe n’oge Agha Ụwa Mbụ. A kwara ha emo ma kwutọọ ha, ìgwè na-eme ihe ike chụgharịrị ha, e tikwara ha ihe. Dị ka Jisọs buworo n’amụma, “mba nile [kpọrọ ha] asị.” (Matiu 24:9) N’ọgba aghara nke agha, ndị iro nke Alaeze Chineke jiri otu ụzọ ime ihe nke e jiworo megide Jisọs Kraịst, mee ihe. Ha ji ụzọ ụgha kpọọ ndị Jehova ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru, ha kpakwara nzukọ Chineke a na-ahụ anya aka ọjọọ. Na May 1918, gọọmenti etiti nyere ikike ka e jide onyeisi oche Watch Tower Society, bụ́ J. F. Rutherford, na mmadụ asaa ndị ya na ha na-ejekọ ozi n’ụzọ chiri anya. A mara ndị ikom asatọ a ikpe ịga mkpọrọ ruo ogologo oge ma ziga ha n’ụlọ mkpọrọ etiti dị n’Atlanta, Georgia, U.S.A. Ọnwa itoolu ka e mesịrị, a tọhapụrụ ha. Na May 1919, ụlọikpe mkpegharị ikpe kwubiri na e kpeghị ndị ahụ na-azara ọnụ ha ikpe kwụ ọtọ, n’ihi ya kwa a gbanwere mkpebi ikpe ahụ. A kpọliteghachiri ikpe ahụ maka mkpegharị, ma ka oge na-aga gọọmenti kagburu ikpe ahụ, na-atọhapụ Nwanna Rutherford na ndị òtù ya kpam kpam dị ka ndị ikpe na-amaghị. Ha maliteghachiri ọrụ ha, mgbakọ e nwekwara na Cedar Point, Ohio, na 1919 nakwa na 1922 nyere ọrụ nkwusa Alaeze ahụ nkwali ọhụrụ.
5. Olee otú ihe si dịrị Ndịàmà Jehova na Nazi Germany?
5 N’afọ ndị 1930, a malitere inwe ọchịchị aka ike, Germany, Itali, na Japan jikọkwara aka wee guzobe ike ọchịchị nke Njikọ Germany na Mba Ndị Òtù Ya. Ná mmalite nke iri afọ ahụ, a kpagburu ndị Chineke ajọ mkpagbu, karịsịa na Nazi Germany. A machibidoro ha iwu. E nyochara ebe obibi dị iche iche, jidekwa ndị bi na ha. A tụbara ọtụtụ puku n’ogige ịta ahụhụ n’ihi na ha jụrụ ịgọnahụ okwukwe ha. Ebumnobi nke ọgụ ahụ a lụsoro Chineke na ndị ya bụ ikpochapụ Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ a na-achị ọchịchị aka ike. * Mgbe Ndịàmà gara n’ụlọikpe dị na Germany ịgba mgba maka ihe ndị ruuru ha, Ministri Okwu Ikpe nke Ọchịchị Alaeze Ukwu ahụ depụtara nkwupụta dị ogologo nke echiche ha iji jide n’aka na ha agaghị enwe ihe ịga nke ọma. Ọ na-ekwu, sị: “Ụlọikpe agaghị anwa anwa ghara imeri nanị n’ihi ihe ndị doro anya na ha bụ iji mezuo ihe iwu kwuru; kama ha aghaghị ịchọ ma chọta ụzọ isi rụọ oké ọrụ ha nwere n’agbanyeghị ihe isi ike ndị pụrụ ịdị.” Nke a pụtara na a pụghị inweta ikpe ziri ezi. Ndị Nazi nọgidere na-ekwusi ike na ọrụ Ndịàmà Jehova dị njọ, ma ọ bụ bụrụ nke na-akpali ibu iro, ma ‘na-akpaghasị ọdịdị Usoro Ọchịchị Ọha na Eze nke Mba ahụ.’
6. Olee mgbalị ndị e mere iji kwụsị ọrụ anyị n’oge Agha Ụwa nke Abụọ nakwa mgbe ọ gasịrị?
6 N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, a machibidoro ma tinyere ndị Chineke ihe mgbochi n’Australia, Canada, na n’ala ndị ọzọ so ná Njikọ nke Mba Ndị Nọbu n’Okpuru Britain—n’Africa, Esia, na n’àgwàetiti ndị dị na Caribbean nakwa na Pacific. Na United States, ndị iro nwere ikike nakwa ndị na-amaghị nke bụ́ eziokwu wetara ‘mmegbu nke e ji ụkpụrụ kpụzie.’ (Abụ Ọma 94:20) Ma, a gbara mgba n’ụlọikpe dị iche iche banyere okwu ikele ọkọlọtọ na iwu dị iche iche nke obodo bụ́ ndị machibidoro ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mkpebi ikpe ndị dị mma e mere na United States ghọkwara ihe nkwado siri ike nke nnwere onwe ife ofufe. Site n’enyemaka Jehova, mgbalị nke ndị iro agaghị nke ọma. Mgbe agha ahụ biri na Europe, e wepụrụ mmachibido iwu ndị ahụ. A tọhapụrụ ọtụtụ puku Ndịàmà e ji eji n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, ma ọgụ ahụ ebighị. Ozugbo Agha Ụwa nke Abụọ biri, Agha Nzuzo malitere. Mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe rụgidekwuru ndị Jehova. Ndị ọchịchị mere ihe iji kpaghasịa ma kwụsị ọrụ ịgba àmà anyị, kwụsị mbupụ na mbubata nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, mechie mgbakọ ihu ọha anyị. A tụrụ ọtụtụ mkpọrọ ma ọ bụ ziga ha n’ogige ọrụ mmanye dị iche iche.
Iji Ọrụ Nkwusa ahụ Gaa n’Ihu!
7. Ahụmahụ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nweworo na Poland, Russia, nakwa n’ala ndị ọzọ n’afọ ndị na-adịbeghị anya?
7 Ka ọtụtụ iri afọ na-agafe, ọrụ nkwusa Alaeze ahụ maliteghachiri. Poland, ọ bụ ezie na ọ ka nọ n’okpuru ọchịchị ndị Kọmunist, kwere ka e nwee mgbakọ ndị were otu ụbọchị na 1982. E nwere mgbakọ mba nile n’ebe ahụ na 1985. Nnukwute mgbakọ mba nile sochiri na 1989,
ọtụtụ puku mmadụ sikwa Russia na Ukraine gaa. N’afọ ahụ Hungary na Poland nyere Ndịàmà Jehova nkwado iwu. N’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 1989, a kwaturu Mgbidi Berlin. Ọnwa ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, anyị nwetara nkwado iwu na East Germany, ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịkwara, e nwere otu mgbakọ mba nile na Berlin. Ná mmalite nke afọ iri ikpeazụ nke narị afọ nke 20 kwa, a malitere ime mgbalị ịhụ ụmụnna nọ na Russia ihu na ihu. E jekwuuru ụfọdụ n’ime ndị isi ọchịchị nọ na Moscow, na 1991 kwa, e debara aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ iwu. Kemgbe ahụ, ọrụ ahụ amụbawo nke ukwuu na Russia nakwa ná mba ndị nọ n’ebe bụbu Soviet Union.8. Gịnị mere Ndịàmà Jehova n’ime afọ 45 ndị sochiri Agha Ụwa nke Abụọ?
8 Ọ bụ ezie na mkpagbu kwụsịrị n’ebe ụfọdụ, ọ kara njọ n’ebe ndị ọzọ. N’ime afọ 45 ndị sochiri Agha Ụwa nke Abụọ, ọtụtụ ala jụrụ inye Ndịàmà Jehova nkwado iwu. Ọzọkwa, a machibidoro anyị ma ọ bụ ọrụ anyị iwu n’ala 23 n’Africa, 9 n’Esia, 8 na Europe, 3 na Latin America, na 4 ná mba ụfọdụ bụ́ àgwàetiti.
9. Olee ihe ndị ohu Jehova gabigaworo na Malawi?
9 Ndịàmà Jehova nọ na Malawi nwetara mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ malite na 1967. N’ihi nnọpụiche ha dị ka ezi ndị Kraịst, ndị kwere ekwe ibe anyị nọ n’ebe ahụ jụrụ ịzụ kaadị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16) Mgbe òtù bụ́ Malawi Congress Party nwesịrị otu nzukọ na 1972, omume mmekpọ ọnụ ahụ malitere ọzọ. A chụpụrụ ụmụnna ahụ n’ebe obibi ha ma jụ inye ha ọrụ. Ọtụtụ puku si ná mba ahụ gbapụ ka a ghara igbu ha. Ma ndị ahụ na-alụso Chineke na ndị ya ọgụ hà nwere ihe ịga nke ọma? Ọ dịghị ma ọlị! Mgbe ọnọdụ gbanwesịrị, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa Alaeze dị 43,767 nyere akụkọ ozi na Malawi na 1999, ihe karịkwara 120,000 gara mgbakọ distrikti ndị e nwere n’ebe ahụ. E wuwo alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ n’isi obodo ahụ.
Ha Na-achọ Ihe Ebubo
10. Dị ka ọ dị n’ihe banyere Daniel, gịnị ka ndị na-emegide ndị Chineke n’oge a meworo?
10 Ndị si n’ezi ofufe dapụ, ndị ụkọchukwu, na ndị ọzọ apụghị ịnagide ozi anyị sitere n’Okwu Chineke. N’ịbụ ndị okpukpe dị iche iche nke Krisendọm na-arụgide, ndị mmegide na-achọ ụzọ ha ga-asị na ọ bụ nke iwu kwadoro, iji gosi na ọgụ ha na-alụso anyị ziri ezi. Olee usoro ha na-eji eme ihe mgbe ụfọdụ? Gịnị ka ndị na-agba izu ọjọọ mere n’ịwakpo Daniel onye amụma? Na Daniel 6:4, 5, anyị na-agụ, sị: “Ndị isi ahụ na ndị ahụ ndị nọchiri anya eze nọ na-achọ ịchọpụta ihe ebubo iji bo Daniel banyere alaeze; ma ọ dịghị ihe ebubo ma ọ bụ omume bibiri ebibi ọ bụla ha pụrụ ịchọpụta; n’ihi na onye kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ bụ, ọ dịghịkwa mmehie ma ọ bụ omume bibiri ebibi ọ bụla a chọpụtara n’ahụ ya. Mgbe ahụ ndị ikom ndị a na-asị, Anyị agaghị achọpụta ihe ebubo iji bo Daniel nke a, ma a sị na anyị achọpụtaghị ya n’ahụ ya n’iwu nke Chineke ya.” N’otu aka ahụ taa, ndị mmegide na-achọ ihe ebubo. Ha na-eti mkpu banyere “òtù nzuzo ndị dị ize ndụ” ma na-anwa ịkpọ Ndịàmà Jehova aha ọjọọ a. Site n’ikwu ihe ndị na-abụchaghị eziokwu, okwu ọjọọ, na ịgha ụgha, ha na-awakpo ofufe anyị na nrapara anyị na-arapara n’ụkpụrụ Chineke.
11. Olee okwu ụgha ụfọdụ ndị na-emegide Ndịàmà Jehova kwuworo?
11 N’ala ụfọdụ, òtù okpukpe na ọchịchị dị iche iche jụrụ ikweta na anyị na-ekpe “okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị.” (Jemes 1:27) N’agbanyeghị na anyị na-arụ ọrụ ndị Kraịst anyị n’ala 234, ndị mmegide na-ekwu na anyị abụghị “okpukpe a ma ama.” N’oge na-adịghị anya tupu e nwee mgbakọ mba nile na 1998, otu akwụkwọ akụkọ Atens kwuru na onye ụkọchukwu nke chọọchị Ọtọdọks nke Gris sịrị na “[Ndịàmà Jehova] abụghị ‘okpukpe a ma ama,’” n’agbanyeghị mkpebi ikpe megidere nke ahụ nke Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Europe. Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, akwụkwọ akụkọ ọzọ e dere n’otu obodo ahụ kwuru na otu onye na-ekwuchitere chọọchị sịrị: “[Ndịàmà Jehova] apụghị ịbụ ‘ọgbakọ ndị Kraịst,’ ebe ọ bụ na o nweghị ihe jikọtara ha na okwukwe ndị Kraịst n’ihe banyere Jisọs Kraịst.” Nke a na-eju anya, n’ihi na ọ dịghị òtù okpukpe ọzọ na-ekwusi okwu ike banyere iṅomi Jisọs karịa Ndịàmà Jehova!
12. N’ibu agha ime mmụọ anyị, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?
12 Anyị na-agbalị ịgbachitere na ịkwado ozi ọma ahụ n’ụzọ iwu. (Ndị Filipaị 1:7) Ọzọkwa, anyị agaghị emebi ma ọ bụ belatatụ nrapara anyị na-araparasi ike n’ụkpụrụ ezi omume Chineke. (Taịtọs 2:10, 12) Dị ka Jeremaịa, anyị ‘na-eke ihe okike n’úkwù anyị ma kwuo ihe nile Jehova nyere anyị n’iwu,’ n’ekweghị ka ndị na-alụso Chineke ọgụ menye anyị ụjọ. (Jeremaịa 1:17, 18) Okwu Dị Nsọ nke Jehova akọwaworo anyị n’ụzọ doro anya ụzọ anyị kwesịrị ịgbaso. Anyị adịghị achọ ịdabere mgbe ọ bụla ‘n’ogwe aka na-adịghị ike nke bụ́ anụ ahụ’ ma ọ bụ chọọ “mgbaba na ndò Ijipt,” ya bụ, ụwa a. (2 Ihe E Mere 32:8; Aịsaịa 30:3; 31:1-3) N’ibu agha ime mmụọ, anyị aghaghị ịnọgide na-atụkwasị Jehova obi anyị nile, na-ekwe ka ọ na-eduzi ijeụkwụ anyị, ma ghara ịdabere ná nghọta anyị. (Ilu 3:5-7) Ọ gwụla ma ànyị nwere nkwado Jehova, ya onwe ya ana-echekwa anyị nche, ọrụ anyị nile ga-abụ “n’efu.”—Abụ Ọma 127:1.
Ndị A Na-akpagbu Ma Ha Adịghị Emebi Okwukwe Ha
13. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na mwakpo ahụ Setan wakporo Jisọs agaghị nke ọma?
13 Onye nlereanya kasịnụ ná nraranye a na-emebighị emebi nye Jehova bụ Jisọs, bụ́ onye e boro ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru na ịkpaghasị udo ọha na eze. Mgbe Paịlet nyochasịrị okwu ikpe Jisọs, ọ dị njikere ịtọhapụ ya. Ma ìgwè mmadụ ahụ, n’ịbụ ndị ndị ndú okpukpe kpaliri, tiri mkpu ka a kpọgbuo Jisọs, ọ bụ ezie na aka ya dị ọcha. Kama ịtọhapụ ya, ha kwuru ka a tọhapụ Barabas—nwoke a tụrụ mkpọrọ maka ịgba ọchịchị mgba okpuru na igbu ọchụ! Paịlet gbalịrị ọzọ ime ka ndị mmegide ahụ na-adịghị eche echiche gbanwee obi ha, ma o mesịrị mee ihe ọha mmadụ ahụ tiri mkpu ka o mee. (Luk 23:2, 5, 14, 18–25) Ọ bụ ezie na Jisọs nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ, mwakpo ahụ jọgburu onwe ya Setan wakporo Ọkpara Chineke aka ya dị ọcha agaghị nke ọma ma ọlị, n’ihi na Jehova kpọlitere Jisọs n’ọnwụ ma bulie ya elu ịnọ n’aka nri Ya. E sikwa n’aka Jisọs ahụ e mere ka ọ dị ebube wụpụ mmụọ nsọ n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., na-eguzobe ọgbakọ ndị Kraịst—“okike ọhụrụ.”—2 Ndị Kọrint 5:17; Ọrụ 2:1–4.
14. Gịnị si na ya pụta mgbe ndị okpukpe bụ́ ndị Juu megidere ụmụazụ Jisọs?
14 Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, ndị okpukpe yiri ndị ozi ahụ egwu, ma ụmụazụ Kraịst ahụ akwụsịghị ikwu ihe ha hụrụ ma nụ. Ndị na-eso ụzọ Jisọs kpere ekpere, sị: “Onyenwe anyị, leekwa ịba mba ha anya: nyekwa ndị ohu Gị ike ka ha were nkwuwa okwu nile kwuo okwu Gị.” (Ọrụ 4:29) Jehova zara ekpere ha site n’ime ka ha jupụta ná mmụọ nsọ na site n’iwusi ha ike ịga n’ihu ná mkpọsa ha na-eme n’atụghị ụjọ. N’oge na-adịghị anya, e nyeghachiri ndị ozi ahụ iwu ka ha kwụsị ime nkwusa, ma Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Iyi egwu, njide, na ịpịa ihe egbochilighị ha ịmụba ọrụ Alaeze ha.
15. Ònye bụ Gameliel, ndụmọdụ dịkwa aṅaa ka o nyere ndị okpukpe na-emegide ụmụazụ Jisọs?
15 Olee otú ndị isi okpukpe ahụ si meghachi omume? “A mapuo ha n’obi ha, ha wee zube igbu [ndị ozi ahụ].” Otú ọ dị, otu onye nkụzi Iwu ahụ aha ya bụ Gameliel, bụ́ onye Farisii, nọ n’ebe ahụ, ndị ahụ nile na-asọpụkwara ya. Mgbe a kpọpụrụ ndị ozi ahụ n’ụlọ nzukọ Sanhedrin ahụ ruo nwa oge, ọ dụrụ ndị okpukpe ahụ na-emegide ha ọdụ, sị: “Ndị ikom nke Israel, na-ezenụ onwe unu n’ihe banyere mmadụ ndị a, ihe unu gaje ime. . . . M sịkwa unu, . . . Wepụnụ aka n’ahụ mmadụ ndị a, hapụkwanụ ha: n’ihi na ọ bụrụ na izu a ma ọ bụ ọrụ a sitere n’aka mmadụ, a ga-akwatu ya n’ala: ma ọ bụrụ na o sitere n’aka Chineke, unu agaghị apụ ịkwatu ha n’ala; ka a ghara ịhụ unu dị ka ndị na-alụkwa ọgụ megide Chineke ma eleghị anya.”—Ọrụ 5:33–39.
Ọ Dịghị Ihe Agha Ọ Bụla A Kpụrụ Imegide Anyị Ga-aga nke Ọma
16. N’okwu nke aka gị, olee otú ị ga-esi akọwa ihe mmesi obi ike nke Jehova na-enye ndị ya?
16 Ndụmọdụ Gameliel nyere dị mma, ọ na-amasịkwa anyị mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-agbachitere anyị. Anyị makwaara na a kwadowo nnwere onwe ife ofufe site ná mkpebi ikpe dị iche iche nke ụlọikpe mere site n’aka ndị ọkàikpe na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu. N’ezie, nrapara anyị na-araparasi ike n’Okwu Chineke na-ewe ndị ụkọchukwu Krisendọm na ndị ndú ndị ọzọ nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, iwe. (Mkpughe 18:1–3) Ọ bụ ezie na ha na ndị ha dọtara na-alụso anyị ọgụ, anyị nwere ihe mmesi obi ike a: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova, ezi omume ha na-esite na m: ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—Aịsaịa 54:17.
17. Ọ bụ ezie na ndị mmegide na-alụso anyị ọgụ, n’ihi gịnị ka obi ji sie anyị ike?
17 Ndị iro anyị na-alụso anyị ọgụ n’enweghị ihe anyị mere, ma anyị adịghị ada mbà n’obi. (Abụ Ọma 109:1–3) Anyị agaghị ekwe ma ọlị ka ndị kpọrọ ozi Bible anyị na-ezi asị menye anyị ụjọ anyị ewee mebie okwukwe anyị. Ọ bụ ezie na anyị na-atụ anya na ọgụ ime mmụọ anyị ga-atawanye akpụ, anyị maara ihe ga-esi na ya pụta. Dị ka Jeremaịa, anyị ga-ahụ mmezu nke okwu amụma ndị bụ́: “Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha agaghị enwe ike imegide gị: n’ihi na gị ka M nọnyeere, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ịnapụta gị.” (Jeremaịa 1:19) Ee, anyị maara na ndị na-alụso Chineke ọgụ agaghị enwe ihe ịga nke ọma!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Lee isiokwu bụ́ “Ha Kwesịrị Ntụkwasị Obi ma Ghara Ịtụ Egwu n’Agbanyeghị Mmegbu Ndị Nazi,” peji nke 24-28.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• N’ihi gịnị ka e jiworo na-awakpo ndị ohu Jehova?
• N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị mmegide siworo lụsoo ndị Jehova ọgụ?
• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka na ndị na-alụso Chineke ọgụ agaghị enwe ihe ịga nke ọma?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 17]
E mesiri Jeremaịa obi ike na Jehova ga-anọnyere ya
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị lanarịrị ogige ịta ahụhụ
[Foto dị na peeji nke 18]
Ime ihe ike nke ìgwè mmadụ mesoro Ndịàmà Jehova
[Foto dị na peeji nke 18]
J. F. Rutherford na ndị ya na ha jekọrọ ozi
[Foto dị na peeji nke 21]
N’ihe banyere Jisọs, ndị lụsoro Chineke ọgụ enweghị ihe ịga nke ọma