Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Mmụọ Chineke Si Arụ Ọrụ Taa?

Olee Otú Mmụọ Chineke Si Arụ Ọrụ Taa?

Olee Otú Mmụọ Chineke Si Arụ Ọrụ Taa?

Ọ DARA ngwụrọ site n’afọ nne ya. Kwa ụbọchị, ọ na-anọdụ n’ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ nsọ nke a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Ọma ịrịọ onyinye ebere n’aka ndị na-abanye n’ime ụlọ nsọ ahụ. Otú ọ dị, n’otu oge, onye arịrịọ a nwere nkwarụ natara onyinye karịrị nnọọ mkpụrụ ego ole na ole. A gwọrọ ya ọrịa ya!—Ọrụ 3:2-8.

Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị ozi bụ́ Pita na Jọn ‘paliri ya’ nke mere ka “ụkwụ ya abụọ . . . wee nwee ume,” ha anaraghị otuto maka ọgwụgwọ ahụ. N’ihi gịnị? Pita n’onwe ya kọwara, sị: “Ndị ikom nke Israel, gịnị mere ihe a na-eju unu anya? ma ọ bụ gịnị mere unu na-elegide anyị anya, dị ka ọ bụ site n’ike nke aka anyị ma ọ bụ dị ka anyị na-asọpụrụ Chineke ka anyị meworo ya ka o jee ije?” N’ezie, ma Pita ma Jọn ghọtara na ọ bụghị site n’ike ha, kama site ná mmụọ nsọ Chineke ka a pụrụ ime ihe dị otú ahụ.—Ọrụ 3:7-16; 4:29-31.

N’oge ahụ, a rụrụ “ọrụ ike” dị otú ahụ iji gosipụta na ọgbakọ ndị Kraịst ahụ e guzobere ọhụrụ nwere nkwado Chineke. (Ndị Hibru 2:4) Ma mgbe ha mezusịrị nzube ha, a ga-eme ka ha “ghara ịdị irè,” ka Pọl onyeozi kwuru. * (1 Ndị Kọrint 13:8) N’ihi ya, anyị adịghịzi ahụ ọgwụgwọ, ozi amụma, ma ọ bụ ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ bụ́ ndị Chineke nyere ikike ha, n’ime ezi ọgbakọ ndị Kraịst.

Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na mmụọ nsọ Chineke adịghịzi arụ ọrụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ka anyị tụlee ụzọ ndị ọzọ mmụọ Chineke si rụọ ọrụ na narị afọ mbụ na otú o si na-arụ ọrụ n’ụbọchị anyị.

“Mmụọ nke Eziokwu”

Otu n’ime ọrụ ndị mmụọ nsọ Chineke na-arụ bụ ime ka a mata ihe, inye ìhè ime mmụọ, ikpughe eziokwu. N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ ịgwa unu, ma unu apụghị iburu ha ugbu a. Ma mgbe ọ bụla Onye ahụ ga-abịa, bụ́ Mmụọ nke eziokwu, Ọ ga-eduba unu n’eziokwu nile.”—Jọn 16:12, 13.

A wụpụrụ “Mmụọ nke eziokwu” ahụ na Pentikọst 33 O.A. mgbe e ji mmụọ nsọ mee ihe dị ka ndị na-eso ụzọ 120 gbakọtara n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jerusalem, baptism. (Ọrụ 2:1-4) Pita onyeozi so ná ndị nọ ya maka ememe ahụ a na-eme kwa afọ. N’ịbụ onye jupụtara ná mmụọ nsọ, Pita “guzoro” ma kọwaa, ma ọ bụ mee ka eziokwu ụfọdụ banyere Jisọs, doo anya. Dị ka ihe atụ, ọ kọrọ banyere otú “Jisọs Onye Nazaret” si bụrụ onye ‘e weliri elu site n’aka nri Chineke.’ (Ọrụ 2:14, 22, 33) Mmụọ Chineke kwalikwara Pita iji anyaike kwupụtara ndị Juu na-ege ya ntị sị: “Ka ụlọ Israel nile mazuo, na Chineke mere Ya ka Ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst anyị, bụ́ Jisọs ahụ Onye unu onwe unu kpọgidere [n’osisi ịta ahụhụ, NW].” (Ọrụ 2:36) N’ihi ozi sitere n’ike mmụọ nsọ nke Pita zisara, e mere ihe dị ka puku mmadụ atọ “naara okwu ya nke ọma” baptism. N’ụzọ dị otú a, mmụọ nsọ Chineke nyere aka iduzi ha gaa n’eziokwu ahụ.—Ọrụ 2:37-41.

Mmụọ nsọ Chineke jekwara ozi dị ka onye ozizi na onye ncheta. Jisọs kwuru, sị: “Onye nkasi obi ahụ, bụ́ Mmụọ Nsọ, Onye Nna m ga-ezite n’aha m, Onye ahụ ga-ezi unu ihe nile, meekwa ka unu cheta okwu nile nke Mụ onwe m gwara unu.”—Jọn 14:26.

Olee otú mmụọ nsọ si arụ ọrụ dị ka onye ozizi? Mmụọ Chineke mere ka ndị ahụ na-eso ụzọ ghọta ihe ndị ha nụburu site n’ọnụ Jisọs bụ́ ndị ha na-aghọtachaghị. Dị ka ihe atụ, ndị ozi ahụ maara na n’oge a na-anwa ya, Jisọs gwara onye Rom na-achị Judia, bụ́ Pọntiọs Paịlet, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.” Otú ọ di, mgbe Jisọs na-arịgo n’eluigwe mgbe ihe karịrị ụbọchị 40 gasịrị, ndị ozi ahụ ka nwere echiche hiere ụzọ na a ga-eguzobe Alaeze ahụ n’ụwa ebe a. (Jọn 18:36; Ọrụ 1:6) N’ụzọ doro anya, ndị ozi ahụ aghọtazughị ihe okwu Jisọs pụtara ruo mgbe Chineke wụpụrụ mmụọ nsọ ya na Pentikọst 33 O.A.

Mmụọ nsọ Chineke jekwara ozi dị ka onye ncheta site n’ime ka e chetaghachi ozizi dị iche iche nke Jisọs. Dị ka ihe atụ, site n’enyemaka mmụọ nsọ, amụma ndị metụtara ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Kraịst bịara nwee ihe ọhụrụ ha pụtara. (Matiu 16:21; Jọn 12:16) Ichetaghachi ozizi Jisọs nyeere ndị ozi ahụ aka iji anyaike gọpụrụ ọnọdụ ha n’ihu ndị eze, ndị majie, na ndị ndú okpukpe.—Mak 13:9–11; Ọrụ 4:5–20.

Tụkwasị na nke ahụ, mmụọ nsọ Chineke nyere aka iduzi ndị Kraịst oge mbụ gaa n’ókèala ndị na-amịpụta mkpụrụ n’ozi ahụ. (Ọrụ 6:6–10) Mmụọ Chineke kwalikwara ndị Kraịst oge mbụ ikere òkè n’ide Okwu Chineke, bụ́ Bible, maka abamuru nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. (2 Timoti 3:16) Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, mmụọ nsọ rụsiri ọrụ ike n’ụzọ dịgasị iche na narị afọ mbụ. E nyeghị ya nanị maka iji rụọ ọrụ ebube dị iche iche.

Mmụọ Nsọ n’Ụbọchị Anyị

N’otu aka ahụ, mmụọ nsọ anọwo na-arụrụ ezi ndị Kraịst ọrụ n’ụbọchị anyị. Nke a pụtara ìhè nye ìgwè nta nke ndị mmụta Bible nọ n’Allegheny, Pennsylvania, U.S.A., n’ọkara ikpeazụ nke narị afọ nke 19. Ndị mmụta Bible a na-anụ ọkụ n’obi chọsiri ike ịmara “eziokwu ahụ.”—Jọn 8:32; 16:13.

Otu onye so n’ìgwè a, bụ́ Charles Taze Russell, kwuru banyere ọchịchọ ọ chọrọ eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ, sị: “Ekpere m ekpere . . . ka e mee ka m nwee ike iwepụ n’obi m na n’uche m, ajọ mbunobi ọ bụla nke pụrụ ịbụ ihe mgbochi na ka mmụọ nsọ ya duzie m inweta nghọta ziri ezi.” Chineke gọziri ekpere obi umeala a.

Ka Russell na ndị enyi ya ji uchu nyochaa Akwụkwọ Nsọ, ọtụtụ ihe bịara doo ha anya. “Anyị chọpụtara na ruo ọtụtụ narị afọ,” ka Russell kọwara, “ịrọ òtù na òtù dị iche iche ekewasịwo ozizi dị iche iche nke Bible n’etiti onwe ha, na-agwakọta ha na ịkọ nkọ na ihie ụzọ nke mmadụ.” Ihe si na nke a pụta bụ ihe ọ kpọrọ “ịkọwahie eziokwu ahụ.” N’ezie, e ji nchịkọta nke ozizi ndị ọgọ mmụọ bụ́ nke gbebatara na Krisendọm kemgbe ọtụtụ narị afọ, zochie eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ. Ma Russell kpebisiri ike ịmara na ịkpọsa eziokwu ahụ.

Site na peji dị iche iche nke akwụkwọ bụ́ Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence, Russell na ndị enyi ya ji obi ike katọọ ozizi okpukpe ụgha bụ́ nke na-akọwahie Chineke. Ha ghọtara na—n’ụzọ megidere echiche okpukpe a ma ama—mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, na n’ọnwụ, anyị na-aga n’ili, nakwa na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ n’ihi ya kwa ọ bụghị akụkụ nke Atọ n’Ime Otu.

Otú ọ dị, dị ka ị pụrụ iche n’echiche, mkpughe dị otú ahụ e kpughere ozizi ụgha dị iche iche kpasuru ndị ụkọchukwu nke Krisendọm iwe. N’ịbụ ndị chọsiri ike ịnọgide n’ọkwá ha ndị a na-asọpụrụ, ọtụtụ ndị ụkọchukwu Katọlik na ndị nke Protestant haziri mkpọsa ndị nzube ha bụ ịkatọ Russell. Ma, ya na ndị enyi ya adaghị mbà. Ha ji obi ike legara mmụọ Chineke anya maka nduzi. “Nkwa Onyenwe anyị kwere,” ka Russell kwuru, “bụ na . . . mmụọ nsọ nke Nna, nke e zitere n’ihi na site n’aka Jisọs Onye Mgbapụta, Onye Ogbugbo na Onyeisi anyị, ga-abụ onye ozizi anyị.” N’ezie mmụọ nsọ ziri anyị ihe! Ndị Mmụta Bible a nwere obi eziokwu nọgidere na-anara mmiri dị ọcha nke eziokwu site na Bible ma na-akpọsa ya n’ụwa nile.—Mkpughe 22:17.

Nzukọ Ndịàmà Jehova nke oge a anọgidewo na-anakwere nduzi nke mmụọ nsọ Chineke ruo ihe karịrị otu narị afọ ugbu a. Ka mmụọ Jehova ji nwayọọ nwayọọ na-eme ka ìhè ime mmụọ ha na-egbukepụ egbukepụ, Ndịàmà ahụ ji obi ha nile na-eme mgbanwe ndị dị mkpa iji kwekọọ ná nghọta ọhụrụ e nwere.—Ilu 4:18.

“Unu Ga-abụkwa Ndị Àmà M”

Jisọs kọwara ihe ngosịpụta ọzọ nke mmụọ nsọ Chineke mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọru 1:8) Nkwa Jisọs nke inye ndị na-eso ụzọ ya “ike” na “mmụọ nsọ” iji rụọ ọrụ Chineke nyere ha ka dịkwa irè taa.

Dị ka otu ìgwè, a maara Ndịàmà Jehova nke ọma n’ihi ọrụ nkwusa ha. (Lee igbe.) N’ezie, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi nke eziokwu ahụ n’ihe karịrị ala na àgwàetiti 230 dị iche iche. N’ọnọdụ ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche, gụnyere itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ebe agha tisasịrị, ha na-eji obi ike eweli olu ha n’ịkwado Alaeze Chineke. Ịnụ ọkụ n’obi ha nwere maka ozi ndị Kraịst na-enye ihe àmà siri ike na mmụọ nsọ nọ n’ọrụ taa. O dokwara anya na Jehova Chineke na-agọzi mgbalị ha.

Dị ka ihe atụ, n’afọ gara aga, e tinyere ihe karịrị otu ijeri awa n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Gịnị sị n’ime ya pụta? Ihe dị ka mmadụ 323,439 gosiri nrara ha raara onwe ha nye Chineke site n’ịbụ ndị e mere baptism n’ime mmiri. Tụkwasị na nke ahụ, a na-eduziri ndị ọhụrụ nwere mmasị dị 4,433,884 ọmụmụ Bible ebe obibi kwa izu. Ná ngụkọta, e tinyere akwụkwọ dị 24,607,741, magazin 631,162,309, na broshuọ na akwụkwọ nta 63,495,728. Lee ihe akaebe dị ike ọ bụ na mmụọ Chineke nọ n’ọrụ!

Gị na Mmụọ Chineke

Mgbe mmadụ zaghachiri n’ụzọ dị mma n’ozi ọma ahụ, mee ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke, ma gosipụta okwukwe ná ndokwa nke ihe mgbapụta ahụ, a na-emepere ya ụzọ maka inwe nguzo dị ọcha n’ebe Chineke nọ. Pọl onyeozi gwara ndị dị otú ahụ, sị: “Chineke . . . na-enye Mmụọ Nsọ Ya ka Ọ baa n’ime unu.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:7, 8; 1 Ndị Kọrint 6:9–11.

Inwe mmụọ Chineke na-arụpụta ọtụtụ ngọzi dị mma. Ụdị ngọzi ndị dị aṅaa? Otu ihe bụ na Okwu Chineke e dere site n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, sị: “Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, [na] imeru ihe n’ókè.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Ya mere, mmụọ nsọ Chineke bụ ikike dị ike maka ime ihe dị mma, na-enyere mmadụ aka igosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke.

Tụkwasị na nke ahụ, ọ bụrụ na ị na-agụ Bible ma na-etinye ihe ị na-amụta n’ọrụ, mmụọ Chineke pụrụ inyere gị aka ito eto n’amamihe, ihe ọmụma, nghọta, n’ime ezi mkpebi, na n’ikike iche echiche. Eze Solomon nwetara “amamihe na nghọta hiri nne nke ukwuu, na obi sara mbara” n’ihi na ọ chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ kama ime ihe na-atọ mmadụ ụtọ. (1 Ndị Eze 4:29) Ebe Jehova nyere Solomọn mmụọ nsọ ya, n’ezie ọ gaghị ajụ inye ndị na-achọ ime ihe na-atọ ya ụtọ mmụọ nsọ ya taa.

Mmụọ nsọ Chineke na-enyekwara ndị Kraịst aka ịlụso Setan na ndị mmụọ ọjọọ, ajọ usoro ihe a, na ọchịchọ ime mmehie nke anụ ahụ ha dara ada, ọgụ. Olee otú nke ahụ si ekwe omume? Pọl onyeozi na-aza, sị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Mmụọ nsọ nwere ike ghara iwepụ ule ma ọ bụ ọnwụnwa dị iche iche; otú ọ dị, ọ pụrụ inyere gị aka ịtachi obi na ha. Site n’ịdabere ná mmụọ nsọ Chineke, anyị pụrụ ịnweta “ọkịka nke ike” iji nagide nsogbu ma ọ bụ nrụgide ọ bụla.—2 Ndị Kọrint 4:7; 1 Ndị Kọrint 10:13.

Mgbe ị tụlere ihe àmà nile ahụ, ihe ịrụ ụka adịkebeghị ya na mmụọ Chineke na-arụ ọrụ taa. Mmụọ Jehova na-enye ndị ohu ya ume ịgba àmà banyere nzube ya dị ebube. Ọ na-anọgide na-ekpughe mgbukepụ nke ìhè ime mmụọ, ọ na-ewusikwa okwukwe anyị ike, na-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Onye Okike anyị. Lee ekele anyị pụrụ inwe na Chineke anọgidewo na-emezu nkwa ya site n’inye ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi taa mmụọ nsọ!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee isiokwu bụ́ “N’ihi Gịnị Ka Onyinye Ọrụ Ebube nke Mmụọ Nsọ Ji Kwụsị?” n’Ụlọ Nche (Bekee) nke August 15, 1971, peji nke 501-505.

[Igbe dị na peeji nke 10]

Ihe Ndị Ọzọ Na-ekwu Banyere Ndịàmà Jehova

“Ebe okpukpe ndị ọzọ na-ego ndị ọkachamara ọrụ iji rata ndị mmadụ na chọọchị ma ọ bụ na-asọrịta mpi n’okwu ndị metụtara ihe ndị na-eme n’oge a ndị dị ka ndina ụdị onwe na isikwopụ afọ ime, Ndịàmà adịghị ekwenyere ụwa na-agbanwe agbanwe. Ha ka na-eme nkwusa ha n’Ụwa n’ụzọ a haziri ahazi.”—The Orange County Register nke Orange County, California, U.S.A.

“Mgbe a bịara n’ịgbasa okwukwe, ọ bụ òtù okpukpe ole na ole na anụ ọkụ n’obi . . . dị ka Ndịàmà Jehova.”—The Republic nke Columbus, Indiana, U.S.A.

“Ọ bụ nanị ha na-eji ‘ozi ọma ahụ’ aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.”—Życie Literackie, Poland.

“Ná mkpọsa ime nkwusa kasị ukwuu a matụworo, Ndịàmà Jehova ewerewo ozi Jehova gazuo ụwa nile.”—News-Observer, Tamaqua Pennsylvania, U.S.A.

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Mmụọ nsọ Chineke na-eme ka anyị na-ahụ ụzọ n’ụzọ ime mmụọ,

. . . na-akwalite ezi àgwà ndị Kraịst,

. . . ma na-akwado anyị n’ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ