Ị̀ Na-echeta?
Ị̀ Na-echeta?
Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:
• Gịnị mere ka ọ dị mfe ịnakwere Krismas na Korea?
E nwere otu nkwenkwe ochie na Korea nakwa n’ụfọdụ ala ndị ọzọ banyere chi kichin bụ́ onye e chere na ọ na-esi na mpio anwụrụ ọkụ abịa ma na-eweta onyinye na December. Ọzọkwa, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, ndị agha United States kesara onyinye na ihe enyemaka na chọọchị ndị dị n’ógbè dị iche iche.—12/15, peji nke 4, 5.
• Ná mmezu nke Aịsaịa 21:8, “onye nche” dị aṅaa ka Chineke nweworo n’oge anyị?
Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka òtù onye nche, emewo ka ndị mmadụ mara ihe ihe ndị na-eme n’ụwa bụ́ ndị na-emezu amụma Bible, pụtara. Ha enyewokwara ndị na-amụ Bible aka ịmata na izere ozizi na omume ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị.—1/1, peji nke 8, 9.
• Olee Ndị Bụ́ “Ndị Okpukpe Polish Brethren”?
Ha bụ otu obere òtù okpukpe dị na Poland na narị afọ nke 16 na17 bụ́ ndị gbara ume ka a na-agbaso Bible, ya mere, ha jụkwara nkwenkwe ndị a ma ama na chọọchị, dị ka Atọ n’Ime Otu, ime ụmụaka baptism, na ọkụ ala mmụọ. Ka oge na-aga, a kpagburu ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ ma manye ha ịgbasa n’ala ndị ọzọ.—1/1, peji nke 21-23.
• N’ihi gịnị ka a ga-eji atụkwasị obi n’amụma Bible kama ịbụ n’amụma ndị ọkà mmụta banyere ọdịnihu ma ọ bụ ndị na-agụ kpakpando buru?
Mmadụ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị amụma bụ ndị a na-apụghị ịtụkwasị obi n’ihi na ha na-eleghara Jehova na Bible anya. Ọ bụ nanị amụma Bible pụrụ inyere gị aka ịmara otú ihe omume si kwekọọ ná nzube Chineke, na-abara gị na ezinụlọ gị uru n’ụzọ na-adịgide adịgide.—1/15, peji nke 3.
• Olee ihe àmà ụfọdụ na-egosi na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ?
Anyị pụrụ ịhụ mmetụta nke nchụpụ a chụpụrụ Setan n’eluigwe. (Mkpughe 12:9) Anyị na-ebi n’oge nke “eze” nke ikpeazụ ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 17:9–11. Ọnụ ọgụgụ nke ezigbo ndị Kraịst e tere mmanụ na-ebelata ebelata, ma o yiri ka ụfọdụ n’ime ha hà ka ga-anọ n’ụwa mgbe mkpagbu ukwu ahụ ga-amalite.—1/15, peji nke 12, 13.
• Olee mgbe e dere akwụkwọ Habakuk, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị na ya?
E dere akwụkwọ Bible a n’ihe dị ka 628 T.O.A. O bu ikpe Jehova megide Juda oge ochie nakwa megide Babilọn. Ọ na-ekwukwa banyere ikpe Chineke nke ga-abịakwasị ajọ usoro ihe dị ugbu a n’isi nso.—2/1, peji nke 8.
• Ebee n’ime Bible ka anyị pụrụ ịchọta ndụmọdụ amamihe nke otu nne nyere ụmụ nwanyị na-ejide onwe ha nke ọma?
Isiakwụkwọ ikpeazụ nke akwụkwọ Ilu, bụ́ isi nke 31, bụ ebe magburu onwe ya a na-achọta ndụmọdụ dị otú ahụ.—2/1, peji nke 30, 31.
• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-enwe ekele na Jehova ekpugheworo anyị “uche nke Kraịst”? (1 Ndị Kọrint 2:16)
Site n’ihe ndekọ Oziọma ahụ, Jehova emewo ka anyị nwee ike ịmụta banyere echiche, mmetụta, ihe omume nke Jisọs, nakwa ihe ndị o butere ụzọ. Nke a pụrụ inyere anyị aka ịdị ka Jisọs, karịsịa ná mgbalị anyị na-etinye n’ọrụ nkwusa ahụ na-azọpụta ndụ.—2/15, peji nke 25.
• Chineke ọ̀ na-aza ekpere taa?
Ee. Ọ bụ ezie na Bible na-egosi na Chineke adịghị aza ekpere nile, ahụmahụ ndị e nwere n’oge a na-egosi na mgbe mgbe, ọ zawo ekpere nke ndị kpekuuru ya ekpere maka nkasi obi na enyemaka n’okwu ndị dị ka idozi nsogbu alụmdi na nwunye.—3/1, peji nke 3-7.
• Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nweta ike Chineke?
Anyị pụrụ ịrịọ maka ya n’ekpere, nweta ike ime mmụọ site na Bible, ma bụrụ ndị e wusiri ike site ná mkpakọrịta ndị Kraịst.—3/1, peji nke 15, 16.
• Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka iritekwu uru ná nzukọ ndị Kraịst?
Ha pụrụ inyere ụmụ ha aka ịmụrụ anya, ikekwe na-ekwe ka ha hie obere ụra tupu oge eruo. A pụrụ ịgba ụmụaka ume ‘idetu ihe,’ dị ka site n’ịkanye ihe n’akwụkwọ mgbe ọ bụla e ji okwu ma ọ bụ aha ha maara nke ọma mee ihe.—3/15, peji nke 17, 18.
• Olee ihe ụfọdụ anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Job?
Job butere mmekọrịta ya na Chineke ụzọ, o mesoro ụmụ mmadụ ibe ya ihe n’ụzọ ziri ezi, ọ gbalịsiri ike iguzosi ike n’ihe nye nwunye ya, o gosipụtara nchegbu maka ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ ya, o jikwa ikwesị ntụkwasị obi tachie obi n’ule.—3/15, peji nke 25-27.
• Bible ò nwere mkpụrụ akwụkwọ ndochianya zoro ezo nke na-eme ka a ghọta ozi ndị e ji mkpụrụ akwụkwọ ndochianya dee?
Ee e. A pụkwara ịzọrọ na e nwere mkpụrụ akwụkwọ ndị e weere na ha bụ mkpụrụ akwụkwọ ndochianya zoro ezo n’akwụkwọ ụfọdụ na-abụghị nke okpukpe. Ọdịiche dị n’otú e sigasị sụpee okwu n’ihe odide Hibru ga-eme ka ihe e weere na ha bụ mkpụrụ akwụkwọ ndochianya ndị dị na Bible bụrụ ihe na-enweghị ihe ha pụtara.—4/1, peji nke 30, 31.