Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ele Ndị na-eme Ihe ike Anya Dị ka Chineke Si Ele Ha?

Ị̀ Na-ele Ndị na-eme Ihe ike Anya Dị ka Chineke Si Ele Ha?

Ị̀ Na-ele Ndị na-eme Ihe ike Anya Dị ka Chineke Si Ele Ha?

Ọ dịwo anya ndị mmadụ nwewara mmasị n’ebe ndị dike, bụ́ ndị na-egosipụta ike ọkpụkpụ aka dị ukwuu na obi ike nọ, ma na-asọpụrụ ha. Otu n’ime ndị dike dị otú ahụ bụ dike ahụ a na-akọ n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ndị gris oge ochie, bụ́ Heracles, ma ọ bụ Hercules dị ka ndị rom si mara ya.

HERACLES bụ oké dike a maara aha ya nke ukwuu, onye kachasị ike ná ndị agha. Dị ka akụkọ mgbe ochie si kọọ, ọ bụ ọkara mmadụ ọkara mmụọ, nwa chi ndị Gris bụ́ Zeus, na Alcmene, nne bụ́ mmadụ. Ọ malitere ịkpa ike mgbe ọ ka bụ nwa e ku n’aka. Mgbe otu chi nwanyị na-ekwo ekworo zipụrụ nnukwu agwọ abụọ ka ha gbuo ya, Heracles nyagburu ha. Mgbe o mere okenye, ọ lụrụ ọtụtụ agha, merie anụ ọjọọ dị iche iche, lụsookwa ọnwụ ọgụ iji zọpụta enyi ya. O bibikwara obodo dị iche iche, dinaa ndị inyom n’ike, si n’otu ụlọ elu tụpụ otu nwata nwoke, ma gbuo nwunye ya na ụmụ ya.

Ọ bụ ezie na ọ bụghị onye dịrị adị n’ezie, site n’oge ochie, a kọrọ banyere Heracles n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke mba ndị dịrị n’oge ochie bụ́ ndị ndị Gris maara. Ndị Rom fere ya ofufe dị ka chi; ndị azụmahịa na ndị njem kpegaara ya ekpere maka ọganihu na nchebe pụọ n’ihe ize ndụ. Akụkọ dị iche iche banyere ike ọ kpara akpaliwo mmasị ndị mmadụ ruo ọtụtụ puku afọ.

Mmalite nke Akụkọ Mgbe Ochie Ahụ

Akụkọ banyere Heracles na ndị dike ọzọ a na-akọ n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme hà dabeere n’ihe mere eme? N’otu echiche, ha pụrụ. Bible na-ekwu banyere otu oge, ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, mgbe “ndị bụ́ chi” na “ndị bụ́ ọkara mmadụ ọkara mmụọ” jegharịrị n’ụwa n’ezie.

N’ịkọwa oge ahụ, Mosis dere, sị: “O ruo, mgbe mmadụ malitere ịba ụba n’elu ala, mgbe a mụkwara ụmụ ndị inyom nye ha, na ụmụ ndị ikom nke Chineke hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ na ha mara mma; ha wee lụtara onwe ha ndị inyom site ná ndị nile ha họpụtara.”—Jenesis 6:1, 2.

“Ụmụ ndị ikom nke Chineke” ahụ abụghị ụmụ mmadụ; ha bụ ndị mmụọ ozi bụ́ ụmụ ndị ikom Chineke. (Tụlee Job 1:6; 2:1; 38:4, 7.) Onye so dee Bible bụ́ Jud na-akọ na ụfọdụ ndị mmụọ ozi “[edebeghị] ịbụ isi nke aka ha, kama ha hapụrụ ebe obibi nke aka ha.” (Jud 6) Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha hapụrụ ebe e kenyere ha ná nzukọ eluigwe nke Chineke n’ihi na ha họọrọ ibinyere ndị inyom mara mma n’ụwa. Jud na-agbakwụnye na ndị mmụọ ozi a nupụrụ isi dị ka ndị Sọdọm na Gọmọra, bụ́ ndị ‘raara onwe ha nye n’ịkwa iko n’ụzọ dị otú ndị a mere, wee pụọ soo anụ ahụ dị iche.’—Jud 7.

Bible enyeghị nkọwa zuru ezu banyere ọrụ ndị mmụọ ozi a nupụrụ isi. Otú ọ dị, akụkọ mgbe ochie nke Gris na nke ebe ndị ọzọ na-akọ banyere ọtụtụ chi na chi nwanyị bụ́ ndị jegharịrị n’etiti ụmụ mmadụ, ma ọ́ bụghị n’ụzọ a na-ahụ anya ọ bụrụ n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya. Mgbe ha nwoghara onwe ha n’ụdị mmadụ, ha na-ama mma dị egwu. Ha riri ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ, rahụọ ụra, ma soro ibe ha na ụmụ mmadụ nwee mmekọahụ. Ọ bụ ezie na e lere ha anya dị ka ndị dị nsọ na ndị na-adịghị anwụ anwụ, ha ghara ụgha ma duhie ndị ọzọ, see okwu ma lụọ ọgụ, rafuo ma dinaa ndị ọzọ n’ike. Akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme dị otú ahụ pụrụ igosipụta ọnọdụ ndị dị n’ezie tupu Iju Mmiri ahụ a kpọtụrụ aha n’akwụkwọ Bible bụ́ Jenesis, ọ bụ ezie na ọ bụ n’ụzọ e tinyere nnu na ose ma gwagbuo agwagbuo.

Ndị Dike Oge Ochie, Ndị A Maara Aha Ha

Ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi bụ́ ndị nwoghara onwe ha, sooro ndị inyom nwee mmekọahụ, ndị inyom ndị ahụ mụtakwara ụmụ. Ndị a abụghị ụmụaka nkịtị. Ha bụ Nefilim, ọkara mmadụ ọkara mmụọ ozi. Ihe ndekọ Bible ahụ na-asị: “Nefilim nọ n’ụwa na mgbe ahụ, ha nọkwa ma e mesịa, mgbe ụmụ ndị ikom nke Chineke na-abakwuru ụmụ ndị inyom nke mmadụ, mgbe ha na-amụkwara ha ụmụ: ndị ahụ bụ ndị dike ahụ ndị nọrịị site na mgbe ebighị ebi gara aga, ndị a maara aha ha.”—Jenesis 6:4.

Okwu Hibru ahụ bụ́ “nefilim” pụtara n’ụzọ nkịtị “ndị ntida,” ndị na-etida ndị ọzọ, ma ọ bụ ndị na-eme ka ndị ọzọ daa site n’imeso ha ihe ike. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ihe ndekọ Bible na-agbakwụnye, sị: “Ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” (Jenesis 6:11) Ndị dike ahụ a na-akọ n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, dị ka Heracles na dike Babilọn ahụ bụ́ Gilgamesh, yiri nnọọ ndị Nefilim.

Rịba ama na a kpọrọ ndị Nefilim ahụ “ndị dike” na “ndị a maara aha ha.” N’adịghị ka onye ezi omume ahụ bụ́ Noa, bụ́ onye biri ndụ n’otu oge ahụ, ndị Nefilim enweghị mmasị n’ime ka a mara aha Jehova. Ha nwere mmasị n’ime ka a mara ha, n’otuto, nakwa n’aha nke aka ha. Site n’ime ihe ndị dị ike, ndị ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ha gụnyere ime ihe ike na mwụfu ọbara, ha nwetara iwu ewu ha chọrọ site n’aka ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ́ nke gbara ha gburugburu. Ha bụ ndị oké dike nke ụbọchị ha—ndị a tụrụ egwu, ndị a kwanyeere ùgwù, na ndị o yiri ka a pụghị imeri ha emeri.

Ọ bụ ezie na ndị Nefilim na ndị nna ha bụ́ ndị mmụọ ozi a chụpụrụ n’ọnọdụ ha pụrụ ịbụworị ndị a ma ama n’anya ndị ọgbọ ha, ha abụtụghị ndị a ma ama n’anya Chineke. Ụzọ ndụ ha rụrụ arụ. N’ihi ya, Chineke mere ihe megide ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi. Pita onyeozi dere, sị: “Chineke emereghị ndị mmụọ ozi ebere mgbe ha mehiere, kama Ọ tụbara ha n’ime [Tatarọs, NW], wee rara ha nye n’olulu nke ọchịchịrị, ka e wee debe ha ikpe ikpe; a sịkwa na O mereghị ụwa ochie ebere, kama ọ bụ Noa, onye mere ha asatọ, bụ́ onye na-ekwusa ezi omume, ka O [chebere], mgbe O mere ka iju mmiri bịakwasị ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 2:4, 5.

N’Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ, ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi nwoghara onwe ha ma jiri ihere laghachi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. Chineke nyere ha ntaramahụhụ site n’igbochi ha inwoghara ahụ mmadụ ọzọ. Ndị Nefilim nile ahụ, bụ́ ụmụ ndị karịrị mmadụ nke ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi mụrụ, lara n’iyi. Nanị Noa na ntakịrị ezinụlọ ya lanarịrị Iju Mmiri ahụ.

Ndị A Maara Aha Ha Taa

Taa, ndị bụ́ chi na ndị bụ́ ọkara mmadụ ọkara mmụọ adịghịzi ejegharị n’ụwa. Otú o sina dị, ime ihe ike ka bara ụba. A na-eto ndị ikom a maara aha ha taa n’akwụkwọ, ihe nkiri sịnịma, telivishọn, na n’egwú dị iche iche. Ha agaghị echetụdị n’echiche ịtụgharị nti nke ọzọ, ịhụ ndị iro ha n’anya, ịchọ udo, ịgbaghara, ma ọ bụ ịkwụsị ime ihe ike. (Matiu 5:39, 44; Ndị Rom 12:17; Ndị Efesọs 4:32; 1 Pita 3:11) Kama nke ahụ, a na-enwe mmasị n’ebe ndị dike nke oge a nọ n’ihi ike ha na ikike ha nwere ịlụ ọgụ, ịbọrọ onwe ha ọ́bọ̀, na iji ihe ike ka ukwuu megwara ihe ike e mere ha. *

Otú Chineke si ele ndị dị otú ahụ anya agbanwebeghị kemgbe ụbọchị Noa. Jehova adịghị enwe mmasị n’ebe ndị na-ahụ ime ihe ike n’anya nọ, ịkpa ike ha adịghịkwa amasị ya. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.”—Abụ Ọma 11:5.

Ụdị Ike Dị Iche

Onye dị nnọọ iche n’ebe ndị dike na-eme ihe ike nọ bụ nwoke a kasị mara amara dịworo ndụ, bụ́ Jisọs Kraịst, onye udo. Mgbe ọ nọ n’ụwa, ‘ọ dịghị ihe ike o mere.’ (Aịsaịa 53:9) Mgbe ndị iro ya bịara ijide ya n’ogige Getsemane, ụmụazụ ya ji ụfọdụ mma agha. (Luk 22:38, 47-51) Ha pụrụ ịgbakọtawo aka lụọ ọgụ iji gbalịa igbochi ya ịbụ onye a raara nye n’aka ndị Juu.—Jọn 18:36.

N’ezie, Pita onyeozi mịpụtara mma agha ya iji chebe Jisọs, ma Jisọs gwara ya, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya: n’ihi na mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:51, 52) Ee, ime ihe ike na-akpata ime ihe ike, dị ka akụkọ ihe mere eme nke mmadụ gosiworo ugboro ugboro. E wezụga ohere nke iji ngwá agha chebe onwe ya, Jisọs nwere ụzọ ọzọ isi chebe onwe ya. Ọ gwara Pita ọzọ, sị: “Ị̀ na-eche na apụghị m ịrịọ Nna m, Ọ ga-ezitekwara m ọbụna ugbu a karị legion iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi?”—Matiu 26:53.

Kama iji ime ihe ike ma ọ bụ nchebe nke ndị mmụọ ozi mee ihe, Jisọs kwere ka ndị gburu ya jide ya. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ọ maara na oge erubeghị ka Nna ya nke eluigwe weta ime ihe ọjọọ ná njedebe n’ụwa. Kama ime ihe n’ike nke onwe ya, Jisọs tụkwasịrị Jehova obi.

Nke a abụghị ọnọdụ nke adịghị ike kama ọ bụ nke ike dị n’ime. Jisọs gosipụtara okwukwe siri ike na Jehova ga-edozi okwu n’oge na n’ụzọ nke Ya. N’ihi nrubeisi ya, e buliri Jisọs elu gaa n’ọkwá dị elu bụ́ nke na-esote nke Jehova n’onwe ya. Pọl onyeozi dere banyere Jisọs, sị: “O wedakwara Onwe ya, wee bụrụ Onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW]. N’ihi nke a Chineke welikwara Ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu; ka ọ ga-abụ n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala, nke ihe nile dị n’eluigwe na ihe nile dị n’elu ụwa na ihe nile dị n’okpuru ala, ka ire nile ọ bụla wee kwupụtakwa na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e wee nye Chineke, bụ́ Nna, otuto.”—Ndị Filipaị 2:8-11.

Nkwa Chineke Kwere Iweta Ime Ihe Ike ná Njedebe

Ezi ndị Kraịst na-eme ka ndụ ha kwekọọ n’ihe nlereanya na ozizi Jisọs. Ha adịghị enwe mmasị ma ọ bụ na-eṅomi ndị a maara aha ha na ndị na-eme ihe ike. Ha maara na mgbe oge Chineke ruru, a ga-ekpochapụ ndị dị otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi, dị nnọọ ka e kpochapụrụ ndị ajọ omume n’ụbọchị Noa.

Chineke bụ́ Onye Okike nke ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụkwa ya ka o ruuru ịbụ Eze. (Mkpughe 4:11) Ọ bụrụ na ọkàikpe bụ́ mmadụ nwere ikike iwu kwadoro ikpe ikpe, Chineke nwere ọbụna ikike ka ukwuu ime otú ahụ. Nkwanye ùgwù o nwere maka ụkpụrụ ezi omume ya, tinyere ịhụnanya o nwere n’ebe ndị hụrụ ya n’anya nọ, ga-akpali ya iweta ajọ omume nile na ndị na-eme ha ná njedebe.—Matiu 13:41, 42; Luk 17:26–30.

Nke a ga-eduga n’udo na-adịgide adịgide n’ụwa, udo nke gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ikpe ziri ezi na ezi omume. E bu ụzọ kwuo nke a n’amụma ahụ a maara nke ọma banyere Jisọs Kraịst, sị: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke Nke bụ́ Dike, Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ, n’elu ocheeze Devid, na n’elu alaeze ya, ime ka o guzosie ike, na ịkwagide ya n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.”—Aịsaịa 9:6, 7.

Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere ndị Kraịst ji aṅa ntị na ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke e nyere ogologo oge gara aga, sị: “Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo, ahọpụtakwala otu efu n’ụzọ ya nile. N’ihi na ihe arụ n’anya Jehova ka onye sihiere esihie bụ: ma n’aka ndị ziri ezi ka izu nzuzo Ya dị.”—Ilu 3:31, 32.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ndị na-eme ihe ike a na-ahụ n’ọtụtụ egwuregwu vidio na ihe nkiri sịnịma ndị ọkà mmụta sayensị chepụtara na-egosipụtakarị ajọ njimara nke ime ihe ike ndị a n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ karị.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

A NA-ENWE MMASỊ N’EBE NDỊ DIKE NKE OGE A NỌ N’IHI IKE HA NA IKIKE HA NWERE IJI IHE IKE KA UKWUU MEGWARA IHE IKE E MERE HA

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

Alinari/Art Resource, NY