Ịkụta Ndị Mmadụ Dị Ka Azụ̀ n’Osimiri Aegean
Ịkụta Ndị Mmadụ Dị Ka Azụ̀ n’Osimiri Aegean
N’ỊBỤ nke akụkụ ka ukwuu nke Gris dị n’ebe ugwu na n’ebe ọdịda anyanwụ ya, nke àgwàetiti Krit dị n’ebe ndịda ya, Turkey adịrịkwa n’ebe ọwụwa anyanwụ ya, Osimiri Aegean bụ akụkụ buru ibu nke ebe ọwụwa anyanwụ Mediterranean. N’ịbụ ebe nnukwu ọdịnala ụfọdụ nke oge ochie si malite, àgwàetiti ndị ukwu na ndị nta jupụtara n’Osimiri Aegean. Ala jupụtara na nkume nke àgwàetiti ndị ahụ, bụ́ ndị ntakịrị ụlọ ọcha ndị na-egbukepụ n’ìhè anyanwụ dịsasịrị na ha, kpaliri otu onye na-ede uri iji ha tụnyere “ịnyịnya ndị e ji nkume mee bụ́ ndị ajị tojuru n’isi.”
Ka a sịkwa ihe mere àgwàetiti ndị a ji soro n’ebe ndị kasị ewu ewu na-adọrọ mmasị ndị njem nleta n’ụwa! Àgwà ọma nke ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị bi ma na-arụ ọrụ n’ebe ahụ na-etinye ihe n’ịma mma nke àgwàetiti ndị ahụ. N’ịbụ ndị na-eme ihe n’eziokwu na ndị na-ele ọbịa, ma bụrụ ndị nweere onwe ha, ndị a na-agbakwụnye njimara pụrụ iche n’ime ka ógbè ahụ bụrụ nke pụrụ iche.
Ọtụtụ ndị bi n’àgwàetiti ndị ahụ na-enweta ihe ha ji ebi ndụ site n’ịkụ azụ̀ n’Osimiri Aegean. Otú ọ dị, ụdị “ịkụ azụ̀” ọzọ dị mkpa na-arụpụta ihe dị ukwuu n’ógbè ahụ. “Ndị ọkụ na-akụta mmadụ,” bụ́ ndị na-ezisa ozi ọma nke Alaeze Chineke, na-agazu àgwàetiti ndị dị n’Aegean, na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst.—Matiu 4:18, 19; Luk 5:10.
Ihe dị ka narị afọ 19 gara aga, ndị Kraịst na-ezisa ozi ọma letara àgwàetiti ndị dị n’Aegean. N’ihe dị ka 56 O.A., mgbe Pọl onyeozi si na njem ozi ala ọzọ nke atọ ya na-alọghachi, ọ kwụsịtụrụ n’àgwàetiti Lésvos, Kaịọs, Samọs, Kos, na Rodes. Dị ka onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi mgbe nile, ọ ghaghị ịbụ na Pọl kwusaara ụfọdụ ndị bi n’àgwàetiti ndị ahụ ozi ọma. (Ọrụ 20:14, 15, 24; 21:1, 2) Mgbe afọ abụọ nke ịga mkpọrọ ya na Rom gasịrị, o yikarịrị ka o letara Krit ma kere òkè n’ọrụ ndị Kraịst n’ebe ahụ. Ka ọ na-erule ngwụsị nke narị afọ mbụ, a chụgara Jọn onyeozi n’àgwàetiti Patmọs “n’ihi okwu Chineke na àmà Jisọs.” (Mkpughe 1:9) Olee otú ndị nkwusa ozi ọma nke oge a si arụ ọrụ n’àgwàetiti ndị a?
Ọrụ Nkwusa Ndị Na-enye Ụgwọ Ọrụ
Ime nkwusa n’àgwàetiti ndị a siri ike ma chọọ ịrụsi ọrụ ike. Ọ chọrọ oké mgbalị na ịchụ onwe onye n’àjà. Ụfọdụ n’ime àgwàetiti ndị ahụ dị anya site n’ibe ha. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ iji ụgbọ mmiri ma ọ bụ ụgbọelu gaa ụfọdụ n’ime ha, ma a pụghị iji ha gaa ndị ọzọ, karịsịa n’oge oyi. Osimiri ahụ pụrụ ịdị ize ndụ, karịsịa mgbe meltemia—oké ifufe na-esi n’ebe ugwu bụ́ nke nwere oge o ji efe—malitere ife. Ọzọkwa, obodo nta ndị dị n’ọtụtụ n’ime àgwàetiti ndị ahụ nọpụrụ iche ma sie ike ngaru n’ihi okporo ụzọ ndị úzúzù jupụtara, ndị a na-eteghịkwa ete, ndị na-afọkarị nke nta ka a ghara ịga ha aga. Ọ bụ nanị ntakịrị ụgbọ mmiri ka a pụrụ iji rute n’ụfọdụ obodo nta.
Were, dị ka ihe atụ, àgwàetiti Icaria. Ndị nkwusa ozi ọma Alaeze 11 nọ ná ntakịrị ọgbakọ dị ebe ahụ apụghị ịrụzu obodo nta nile dị n’àgwàetiti ahụ
na ntakịrị àgwàetiti ndị dị ya nso. Ya mere, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị si Samọs na-abịa enye aka ekwusara ndị Icaria ozi ọma, tinyekwara ndị bi n’àgwàetiti Phournoi, Patmọs, na Lipsos. N’oge na-adịbeghị anya, mgbe a na-eme otu n’ime ụdị mkpọsa ụbọchị abụọ ahụ, Ndịàmà ahụ nyefere magazin 650, broshuọ 99, na akwụkwọ ukwu 25 ndị dabeere n’isiokwu dị iche iche nke Bible! O juru ha anya izute ndị na-amaghị ihe ọ bụla banyere onye Jehova bụ, ndị rịọrọ ha ka ha nọrọ ma kụzikwuoro ha ihe site na Bible. Otu nwanyị gwara otu Onyeàmà, sị: “Ị lawalanụ ugbu a. Ma m ka nwere ọtụtụ ajụjụ dabeere na Bible. Onyekwanụ ga-enyere m aka ịza ha?” Nwanna nwanyị onye Kraịst ahụ kwere nkwa isochi mmasị ahụ site n’iji telifon eme ihe, o sikwa n’ụzọ dị otú ahụ malite ọmụmụ Bible.Mgbe otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị letara Icaria, o mere ndokwa ka a rụzuo àgwàetiti nile ahụ n’otu ngwụsị izu. Ọ rịọrọ maka enyemaka nke ihe dị ka ndị nkwusa Alaeze 30 si Samọs. Ụmụnna ndị a si esi bịa aghaghị ịkwụ ụgwọ maka ịnọ abalị abụọ n’otu ụlọ oriri nakwa maka ịgbaziri obere ụgbọala na ụgbọala ndị injin na-arụ ọrụ na wheel ha anọ. Oké mmiri ezowo ruo ụbọchị abụọ, o doghịkwa anya otú ihu igwe ga-adị ná ngwụsị izu ahụ. Ma ụmụnna ndị ahụ ekweghị ka nke a gbochie ha, ha chetara okwu ndị dị n’Eklisiastis 11:4: “Onye na-arịba ifufe ama agaghị agha mkpụrụ; ọzọ, onye na-elekwasị igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.” N’ikpeazụ, ihu igwe dịtụrụ mma, mgbe ha jisịrị ozi ha dị mkpa gazuo àgwàetiti ahụ nile, ụmụnna ahụ laghachiri n’ụlọ ha na-enwe obi ụtọ na afọ ojuju.
Ndị nkwusa 16 ndị bi n’àgwàetiti Andros tinyere mgbalị dị ukwuu iji rụzuo àgwàetiti ahụ nile. Mgbe ụmụnna nwoke abụọ ruru n’otu obodo nta nọpụrụ iche, ha kpebiri ikwusara ndị nile bi n’ebe ahụ ozi ọma. Ha gwara ndị mmadụ okwu n’ụlọ ha, n’okporo ámá, na n’ubi. Ha letara ọbụna ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ma nyefee ha akwụkwọ. N’ịbụ ndị nwere obi ike na ha akpọtụworo ndị nile bi n’obodo nta ahụ, ha jikeere ịla. Ka ha si n’ebe bụ́ isi nke obodo ahụ na-apụ, ha hụrụ onye ụkọchukwu chọọchị Ọtọdọks nke Gris ka ọ na-abịa. N’ịmata na a gbabeghịrị ya àmà, ha nyere ya otu akwụkwọ nta, bụ́ nke o ji obi ụtọ nara. O doro ha anya ugbu a na ọ dịghị onye e lefuuru anya ná mgbalị ime nkwusa ha!
A na-ewere Gavdos (ma ọ bụ Klọda)—otu àgwàetiti nta nke nọ n’akụkụ Krit, bụ́ nke nanị mmadụ 38 bi na ya—dị ka ebe kasị dị anya na ndịda Europe. (Ọrụ 27:16) Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ya, tinyere di na nwunye ọzọ, mere nkwusa ebe ahụ ruo ụbọchị atọ. Iji belata mmefu, ha hiri ụra n’ụlọ ntu. E ji ozi ọma ahụ gakwuru ndị nile bi n’ebe ahụ, ụmụnna ahụ nwekwara obi ụtọ na ndị bi n’ebe ahụ enweghị ajọ mbunobi. Ha anụbeghị ihe ọ bụla—nke ọma ma ọ bụ nke ọjọọ—banyere Ndịàmà Jehova. Ndị ebe ahụ, gụnyere onye ụkọchukwu, natara akwụkwọ 19 na broshuọ 13. Ka Ndịàmà ahụ ji ntakịrị ụgbọ mmiri na-alaghachi Krit, osimiri ahụ malitere ibigbọ, na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ. “Anyị kelere Jehova na anyị lọrutere n’ụlọ ná ndụ, ma anyị nyekwara ya otuto maka ikwe ka anyị sọpụrụ aha ya n’ebe a kasị dị anya na ndịda Europe,” ka ha kwuru.
Patmọs bụ àgwàetiti ahụ Jọn onyeozi nọ dee akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe. Ruo n’oge na-adịbeghị anya, ọ dịghị Onyeàmà Jehova nọ na Patmọs. Ụmụnna ndị si Samọs ji nlezianya hazie nkwusa ozi ọma n’àgwàetiti ahụ. Ha maara na ha pụrụ ịtụ anya mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ n’ihi na àgwàetiti ahụ bụ ebe bụ́ isi nke Chọọchị Ọtọdọks nke Gris. Otu nwanyị kpọbatara ụmụnna nwanyị abụọ na-ekwusara ya ozi ọma n’ime ụlọ ya.
Di nwanyị ahụ nọgidere na-ajụ onye zitere ụmụnna nwanyị ahụ n’ụlọ ha. Mgbe ha kọwara na ha na-eleta ụlọ nile, ọ jụrụ ọzọ, sị: “Ùnu ji n’aka na ọ bụghị ụfọdụ ndị agbata obi anyị zitere unu ebe a?” Nwunye ya, bụ́ onye mawooro banyere Ndịàmà Jehova mgbe ọ nọ na Zaire, mesịrị kọwaara ụmụnna nwanyị ahụ ihe mere n’ụtụtụ ahụ. Ọ sịrị: “Anọ m na-ekpeku Jehova ekpere dị ka m na-eme n’ụbọchị ndị ọzọ, ka o zite ụfọdụ Ndịàmà n’àgwàetiti a. Di m chịrị m ọchị. O juru mụ na di m anya mgbe m hụrụ unu n’ọnụ ụzọ. Ọ bụ ya mere o ji nọgide na-ajụ onye zitere unu n’ụlọ anyị.” A maliteere nwanyị ahụ ọmụmụ Bible ozugbo. E duziri ọmụmụ ihe ahụ site na telifon ruo ọnwa iri, ọ bụ ezie na nke a furu ma nwanna nwanyị ahụ ma nwanyị ahụ nwere mmasị ego hiri nne. E mere ya baptism, ugbu a ọ bụ nanị ya bụ Onyeàmà e nwere n’àgwàetiti ahụ a chụgara Jọn onyeozi afọ 1,900 gara aga.“Ịkụ Azụ̀” n’Ọdụ Ụgbọ Mmiri
Ụgbọ mmiri dị iche iche na-akwụsị n’ọtụtụ ọdụ ụgbọ mmiri dị n’àgwàetiti Aegean n’oge okpomọkụ ọ bụla, na-ebubata ibu ndị bịara ezumike. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova nwere ohere pụrụ iche nke ịgakwuru ndị mmadụ si ọtụtụ mba ma na-asụ ọtụtụ asụsụ. Ọgbakọ ndị dị ebe ahụ nwere akwụkwọ e ji amụ Bible n’asụsụ dị iche iche, ndị nkwusa na-enyefekwa ọtụtụ puku magazin n’aka ndị bịara njem nleta. Ụfọdụ ụgbọ mmiri na-akwụsị n’otu ọdụ ụgbọ mmiri kwa izu, bụ́ nke na-enye ụmụnna ndị ahụ ohere ndị magburu onwe ha ime nletaghachi na ọbụna iduziri ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ndị ahụ ọmụmụ Bible.
N’oge okpomọkụ nke 1996, otu nwanna nwanyị bụ́ onye nkwusa oge nile na Rodes gbaara otu nwa okoro bụ́ onye Jamaica na-arụ ọrụ n’otu ụgbọ mmiri na-akwụsị n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ na Friday ọ bụla, àmà. Na Friday na-esonụ, a kpọrọ nwoke ahụ òkù ịbịa otu mgbakọ distrikti a ga-enwe n’àgwàetiti ahụ. N’iji Bible Bekee, nwanna nwanyị ahụ bụ́ onye ọsụ ụzọ nyeere ya aka ịghọta eziokwu ụfọdụ nke Bible bụ́ ndị e kwuru n’usoro ihe omume ahụ. Ịhụnanya na omume enyi Ndịàmà ahụ gosiri nwa okoro ahụ ná mgbakọ ahụ masịrị ya n’ụzọ miri emi. Na Friday na-esonụ, ọ kpọbatara ndị ọsụ ụzọ abụọ n’ime ụgbọ mmiri. Ndị ọsụ ụzọ ahụ weere akwụkwọ ndị e biri n’asụsụ Bekee na Spanish gaa. N’ihe na-erughị otu awa, ha nyefechara akwụkwọ nile dị n’akpa ozi ọma ha! Nwa okoro ahụ bụ́ onye Jamaica mụrụ
Bible na Friday ọ bụla ruo ná ngwụsị nke oge okpomọkụ ahụ. N’oge okpomọkụ sochirinụ, ọ laghachiri ma dị njikere ịmaliteghachi ọmụmụ ihe ya. Otú ọ dị, n’oge a, o kpebiri ịgbanwe ọrụ ya iji nwee ike inwe ọganihu ime mmụọ. Mgbe ahụ, ọ pụkwara ọzọ. Lee ihe obi ụtọ ọ bụụrụ ụmụnna ndị nọ na Rodes ịnụ na e mere nwa okoro a baptism ná mmalite nke afọ 1998!Ịnwụta “Azụ̀” Ndị Si Ebe Ọzọ
A maara Osimiri Aegean nke ọma n’ihi ọtụtụ azụ̀ ndị si ebe ọzọ abata na ya, dị ka sardine na swordfish, bụ́ ndị na-abata ná mmiri ya, ụgbụ ndị ọkụ azụ̀ nwere nkà ewee nwụde ha. N’otu aka ahụ, ndị na-ezisa ozi ọma Alaeze ahụ na-achọta ọtụtụ ndị nwere obi ịnabata ihe n’etiti ndị ọrụ si mba ọzọ bụ́ ndị si ọtụtụ mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe kwaga Gris.
Rezi dị afọ iri mgbe mbụ ọ gụrụ banyere Jehova na nzube ya dị iche iche n’ime Ụlọ Nche na Teta! Nke ahụ bụ n’Albania. Mgbe afọ atọ gasịrị, o so ezinụlọ ya kwafee n’àgwàetiti Rodes. Otu ụbọchị, Rezi kpekuru Jehova ekpere ka o nyere ya aka ịchọta ndị Ya n’ebe obibi ọhụrụ ya. N’echi ya, Rezi ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe papa ya ji magazin ndị ahụ ọ maara nke ọma bụ́ Ụlọ Nche na Teta! lọta. Rezi zutere nwanna nwanyị ahụ nyere papa ya magazin ndị ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ malitere ịmụ ihe site n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Mgbe ụfọdụ, ọ na-ekwu ka a mụọrọ ya ihe ugboro atọ n’ụbọchị! Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptism, na March 1998 kwa, e mere ya baptism mgbe ọ dị afọ 14. N’otu ụbọchị ahụ, ọ malitere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, mgbe ọnwa isii gasịkwara, o denyere aha ya dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ onye ozi oge nile.
Otu nwanna nwoke nọ n’àgwàetiti Kos nọ na-amụrụ ụfọdụ ndị si Russia ihe. Mgbe ọ jụrụ ha ma ha nwere ndị enyi ga-achọ ịmụ Bible, ha duuru ya gakwuru di na nwunye bụ́ ndị Armenia—Leonidas na nwunye ya, bụ́ Ophelia—n’obodo nta dị ihe dị ka kilomita 30 site n’ebe ahụ. Ihe ịtụnanya na-echere ụmụnna ahụ. Di na nwunye ahụ bụ́ ndị Armenia bupụtara otu akpa jupụtara n’akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị Watch Tower Society bipụtara n’asụsụ Armenian na Russian! Ha kọwara na ha esorowo Ndịàmà Jehova mụọ Bible ma nwee ọganihu ruo n’ókè nke ịbụ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. N’ihi ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ihe isi ike akụ na ụba, ha aghaghị ịhapụ ala nna ha. Ngwa ngwa ha rutere Kos, ha sooro mama na nwanne Leonidas nke nwanyị bụ́ ndị nọrịị ebe ahụ, malite ịmụ ihe. Na mberede, Onyeàmà ahụ nwere ọmụmụ Bible ọhụrụ atọ ọ ga-eduzi—otu bụ nke Ophelia, nke ọzọ bụ nke Leonidas, nke ọzọ bụ nke mama na nwanne nwanyị Leonidas. Nke a chọrọ iji ọgba tum tum mee njem dị kilomita 30 iji gaa agaa nanị, ugboro atọ n’izu. E mere Leonidas na nwunye ya baptism mgbe ọnwa ụfọdụ gasịrị. Lee ihe na-akwụghachi ụgwọ ọ bụ maka mmụọ ịchụ onwe onye na-àjà nke ụmụnna ndị bi n’ógbè ahụ!
Jehova Na-eme Ka O Too
Ngọzi Jehova pụtara ìhè ná mgbalị ndị nkwusa 2,000 na-eme n’enweghị ike ọgwụgwụ, bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike n’àgwàetiti ndị a dị n’Aegean. Ugbu a, e nwere ọgbakọ 44 na ìgwè 25 nke Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ. N’ime ìgwè ndị ahụ, 17 na-asụ asụsụ ọzọ, ebe ọ bụ uche Jehova ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Tụkwasị na nke ahụ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche 13 na-etinye mgbali dị ukwuu irutekwu ọtụtụ ndị n’ókèala ndị ahụ dịpụrụ adịpụ.
Ruo ọtụtụ narị afọ, Osimiri Aegean aghọwo ebe bụ́ isi maka mwulite ọdịbendị na azụmahia. N’iri afọ ole na ole gara aga, ọ ghọwo ebe a ma ama ọtụtụ narị puku ndị njem na-eleta. Ma nke kasị mkpa, dị ka “ndị ọkụ na-akụta mmadụ,” ndị nkwusa Alaeze achọtawo n’àgwàetiti ndị a, ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị ọ na-anụ ọkụ n’obi ito Jehova. N’ozuzu, ha azaghachiwo n’ụzọ dị ukwuu n’ọkpụkpọ òkù amụma ahụ bụ́: “Ka ha nye Jehova nsọpụrụ, gosikwa otuto Ya n’àgwàetiti nile.”—Aịsaịa 42:12.
[Map dị na peeji 22]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Osimiri Aegean
GRIS
Lésvos
Kaịọs
Samọs
Icaria
Phournoi
Patmọs
Kos
Rodes
Krit
TURKEY
[Foto dị na peeji nke 23]
Àgwàetiti Lésvos
[Foto dị na peeji nke 24]
Àgwàetiti Patmọs
[Foto dị na peeji nke 24]
Àgwàetiti Krit