Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Ọhụrụ Ahụ—Ị̀ Ga-ebi na Ya?

Ụwa Ọhụrụ Ahụ—Ị̀ Ga-ebi na Ya?

Ụwa Ọhụrụ Ahụ—Ị̀ Ga-ebi na Ya?

“Ọ dịghị ezi ihe dịịrị ha, ma ọ bụghị ka mmadụ ṅụrịa ọṅụ, meekwa ezi ihe n’ogologo ndụ ya. Ọzọkwa, mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.”—EKLISIASTIS 3:12, 13.

1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee nchekwube banyere ọdịnihu?

ỌTỤTỤ ndị na-eche banyere Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile dị ka onye na-adịghị ekwe ka mmadụ megharịa ahụ. Ma, akụkụ ihe odide ahụ dị n’elu bụ eziokwu ị ga-ahụ n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ. O kwekọrọ n’ọbụbụ ọ bụ “Chineke [obi ụtọ, NW]” nakwa ná ndebe o debere nne na nna anyị mbụ n’ụwa paradaịs. (1 Timoti 1:11; Jenesis 2:7-9) Mgbe anyị na-achọ ịghọta ọdịnihu ahụ Chineke na-ekwe ndị ya ná nkwa, o kwesịghị iju anyị anya ịmụta banyere ọnọdụ ndị anyị ga-anụ ụtọ ha n’ụzọ na-adịgide adịgide.

2. Olee ihe ụfọdụ ndị ị na-atụ anya ha?

2 N’isiokwu bu ụzọ, anyị nyochara atọ n’ime ebe anọ Bible buru amụma banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (Aịsaịa 65:17) E dekọrọ otu n’ime amụma ndị ahụ a pụrụ ịdabere na ha ná Mkpughe 21:1. Amaokwu ndị sochirinụ na-ekwu banyere oge mgbe Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ga-agbanwe nnọọ ọnọdụ ndị dị n’ụwa ịka mma. Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nke iru újú. Ndị mmadụ agaghịzi anwụ n’ihi ịka nká, ọrịa, ma ọ bụ ihe ọghọm. Iru újú, ịkwa ákwá, na ihe mgbu agaghị adịkwa. Lee atụmanya na-enye obi ụtọ ọ bụ! Ma ànyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-abịa, oleekwa mmetụta atụmanya ahụ pụrụ inwe ugbu a n’ebe anyị nọ?

Ihe Ndị Mere A Ga-eji Nwee Obi Ike

3. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụkwasị nkwa ndị Bible kwere banyere ọdịnihu obi?

3 Rịba ama otú Mkpughe 21:5 si gaa n’ihu. Ọ na-ekwu na Chineke, bụ́ onye nọkwasịrị n’ocheeze ya n’eluigwe, sịrị: “Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” Nkwa ahụ Chineke kwere dị mma karịa mkpọsa nnwere onwe nke mba ọ bụla, iwu ọ bụla e nwere taa banyere ihe ndị ruuru mmadụ, ma ọ bụ ọchịchọ ọ bụla mmadụ nwere maka ọdịnihu. Ọ bụ okwu a pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam bụ́ nke sitere n’ọnụ Onye ahụ Bible sịrị “na-apụghị ikwu okwu ụgha.” (Taịtọs 1:2) N’ụzọ kwere nghọta, ọ pụrụ ịdị gị ka anyị kwụsị ebe a, nwewe nanị obi ụtọ n’atụmanya a magburu onwe ya ma na-atụkwasị Chineke obi. Ma ọ dịghị mkpa ka anyị kwụsị. Anyị ka nwere ihe ndị ọzọ anyị ga-amụta banyere ọdịnihu.

4, 5. Olee amụma Bible ndị a tụlewororịị bụ́ ndị pụrụ ime ka obi ike anyị nwere banyere ọdịnihu sikwuo ike?

4 Tụgharịa uche n’ihe isiokwu bu ụzọ meworo ka o doo anya banyere nkwa dị iche iche Bible kwere banyere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Aịsaịa buru amụma banyere usoro ihe ọhụrụ dị otú ahụ, amụma ya mezukwara mgbe ndị Juu laghachiri n’ala nna ha ma guzobeghachi ezi ofufe. (Ezra 1:1-3; 2:1, 2; 3:12, 13) Ma, nke ahụ ọ̀ gwụla ihe amụma Aịsaịa zoro aka na ya? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe ndị o buru n’amụma ga-emezu n’ụzọ sara mbara karị n’ọdịnihu dị anya. Gịnị mere anyị ji kwubie otú ahụ? Ọ bụ n’ihi ihe anyị na-agụ na 2 Pita 3:13 nakwa ná Mkpughe 21:1-5. Amaokwu ndị ahụ na-ezo aka n’eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke ga-abara ndị Kraịst uru n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ.

5 Dị ka e kwuru na mbụ, Bible ji nkebi ahịrịokwu bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” mee ihe ugboro anọ. Anyị atụlewo atọ n’ime ha, anyị abịawokwa ná nkwubi okwu ndị na-agba ume. Kpọmkwem, Bible na-ebu amụma na Chineke ga-ekpochapụ ajọ omume na ihe ndị ọzọ na-akpata nhụjuanya, na ọ ga-agọzikwukwa ihe a kpọrọ mmadụ n’ime usoro ihe ọhụrụ o kwere ná nkwa.

6. Gịnị ka amụma nke anọ nke kpọtụrụ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” aha na-ekwu na ọ ga-eme?

6 Ka anyị nyochaa ugbu a ebe fọdụrụnụ okwu ahụ bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” pụtara, n’Aịsaịa 66:22-24: “Dị ka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke Mụ onwe m na-eme, ga na-eguzo n’ihu m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), otú a ka mkpụrụ unu na aha unu ga na-eguzo. Ọ ga-erukwa, na site n’otu ọnwa ọhụrụ ruo ọnwa ọhụrụ ọzọ, na site n’otu ụbọchị izu ike ruo ụbọchị izu ike ọzọ, anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịa ịkpọ isiala n’ihu m, ka Jehova sịrị. Ha ga-apụkwa, lekwasị ozu nile nke ndị na-ejehie ejehie megide m: n’ihi na ikpuru ha agaghị anwụ, ọkụ ha agaghị anyụkwa; ha ga-abụkwara anụ ahụ nile ihe ịsọ oyi.”

7. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji kwubie na Aịsaịa 66:22-24 ga-emezu n’ọdịnihu?

7 Amụma a mezuru n’etiti ndị Juu bụ́ ndị birighachiiri n’ala ha, ma a ga-enwe mmezu ya ọzọ. Nke ahụ aghaghị ịbụ ogologo oge mgbe e desịrị akwụkwọ ozi nke abụọ nke Pita na akwụkwọ Mkpughe, n’ihi na ha zoro aka ‘n’eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ’ a ga-enwe n’ọdịnihu. Anyị pụrụ ịtụ anya mmezu ahụ dị ebube na nke zuru ezu n’ime usoro ihe ọhụrụ. Tụlee ọnọdụ ụfọdụ ndị anyị pụrụ ịtụ anya ịnụ ụtọ ha.

8, 9. (a) N’echiche dị aṅaa ka ndị Chineke “ga na-eguzo”? (b) Gịnị ka amụma ahụ bụ́ na ndị ohu Jehova ga-efe ofufe “site n’otu ọnwa ọhụrụ ruo ọnwa ọhụrụ ọzọ, na site n’otu ụbọchị izu ike ruo ụbọchị izu ike ọzọ,” pụtara?

8 Mkpughe 21:4 gosiri na ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ihe e dere n’Aịsaịa isi nke 66 kwekọrọ na nke ahụ. Anyị pụrụ ịhụ site n’amaokwu nke 22 na Jehova maara na eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ agaghị adịru nanị nwa oge, ruo nwa mkpirikpi oge. Ọzọkwa, ndị ya ga-anọtekwa aka; ha “ga na-eguzo” n’ihu ya. Ihe Chineke mewooro ndị ya ọ họpụtara na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike n’ebe ọ nọ. Ezi ndị Kraịst echewo ajọ mkpagbu ihu, ọbụna mgbalị nke ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè ikpochapụ ha. (Jọn 16:2; Ọrụ 8:1) Ma, ọbụna ndị iro dị ike nke ndị Chineke, dị ka Eze Ukwu Nero nke Rom na Adolf Hitler, enwebeghị ike ikpochapụ ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe, ndị a kpọkwasịrị aha ya. Jehova echebewo ọgbakọ nke ndị ya, anyị pụkwara ijide n’aka na ọ pụrụ ịnọgide na-eme ka ọ dịgide.

9 N’otu aka ahụ, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke dị ka ndị so n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, nke bụ́ òtù ndị na-efe ezi ofufe n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ga-adịgide n’otu n’otu n’ihi na ha ga na-efe Onye Okike nke ihe nile ofufe dị ọcha. Nke ahụ agaghị abụ ofufe a na-efe mgbe ụfọdụ ma ọ bụ n’ụzọ a na-ahazighị ahazi. Iwu Chineke, nke e nyere ụmụ Israel site n’aka Mosis, kwuru ka a na-eme ihe omume ụfọdụ nke ife ofufe kwa ọnwa, dị ka n’oge ọnwa ọhụrụ, na n’izu ọ bụla, dị ka n’Ụbọchị Izu Ike. (Levitikọs 24:5-9; Ọnụ Ọgụgụ 10:10; 28:9, 10; 2 Ihe E Mere 2:4) Ya mere Aịsaịa 66:23 na-ezo aka n’ofufe chiri anya nke na-aga n’ihu nke a na-efe Chineke kwa izu na kwa ọnwa. Ekweghị n’ịdị adị nke Chineke na omume ihu abụọ okpukpe agaghị adị mgbe ahụ. “Anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịa ịkpọ isiala n’ihu” Jehova.

10. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji nwee obi ike na ndị na-emebi iwu agaghị emebi ụwa ọhụrụ ahụ n’ụzọ na-adịgide adịgide?

10 Aịsaịa 66:24 na-emesi anyị obi ike na ọ dịghị mgbe udo na ezi omume nke ụwa ọhụrụ ahụ ga-adị n’ihe ize ndụ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emebi ya. Cheta na 2 Pita 3:7 na-ekwu na “ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” dị n’ihu anyị. Ndị ga-anwụ bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ọ dịghị ihe ọjọọ ga-adakwasị ndị aka ha dị ọcha, n’adịghị ka ihe na-eme n’agha ụmụ mmadụ, bụ́ ebe ọnụ ọgụgụ ndị nkịtị na-anwụnụ na-akarị nke ndị agha na-anwụnụ. Onyeikpe Ukwu ahụ na-emesi anyị obi ike na ụbọchị ya ga-abụ ụbọchị ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.

11. Gịnị ka Aịsaịa na-egosi na ọ ga-abụ ọdịnihu nke ndị na-emegide Chineke na ofufe ya?

11 Ndị ezi omume lanarịrịnụ ga-ahụ na okwu amụma Chineke bụ eziokwu. Amaokwu nke 24 na-ebu amụma na “ozu nile nke ndị na-ejehie ejehie megide” Jehova ga-abụ ihe àmà nke ikpe ya. Otú Aịsaịa si kọwaa ya n’ezoghị ọnụ pụrụ iyi ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ. Ma ọ bụ ihe mere eme. N’azụ mgbidi Jerusalem, e nwere ebe a na-ekpofu ahịhịa na, mgbe ụfọdụ, ebe a na-atụba ozu ndị omekome e gburu egbu bụ́ ndị e weere na ha ekwesịghị ka e lizie ha elizie. * N’ebe ahụ, ikpuru na ọkụ na-ere ebe ahụ na-eripịa ma ahịhịa ma ozu ndị ahụ n’egbughị oge. Ihe àmà na-egosi na okwu ihe atụ Aịsaịa ji mee ihe na-akọwa otú ikpe Jehova megide ndị mmehie si bụrụ nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe.

Ihe O Kweworo ná Nkwa

12. Olee ihe ndị Aịsaịa gosikwuru banyere ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ?

12 Mkpughe 21:4 na-agwa anyị banyere ihe ụfọdụ ndị na-agaghị adị n’ime usoro ihe ọhụrụ ahụ na-abịanụ. Otú ọ dị, olee ihe ga-adị mgbe ahụ? Olee otú ndụ ga-adị? Ọ̀ dị ihe ọ bụla a pụrụ ịtụkwasị obi nke pụrụ ime ka anyị matatụ otú ọ ga-adị? Ee. Aịsaịa isi nke 65 na-akọwa n’ụzọ amụma ọnọdụ ndị anyị ga-anụ ụtọ ha ma ọ bụrụ na anyị nwere nnwapụta Jehova ibi ndụ mgbe o kere, n’echiche zuru ezu, eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị a. Ndị e ji ebe obibi na-adịgide adịgide gọzie n’ime ụwa ọhụrụ ahụ agaghị aka nká wee nwụọ ọnwụ a na-apụghị izere ezere. Aịsaịa 65:20 na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ dịghị nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu ga-esitekwa n’ebe ahụ ọzọ, ma ọ bụ agadi nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya: n’ihi na nwata ga-anwụ mgbe ọ gbara [otu narị afọ], a ga-akọchakwa onye mmehie mgbe ọ gbara [otu narị afọ].”

13. Olee otú Aịsaịa 65:20 si emesi anyị obi ike na ndị Chineke ga-enwe nchebe?

13 Mgbe mbụ e mezuru nke a n’ahụ ndị obodo Aịsaịa, ọ pụtara na ụmụ ọhụrụ nọ n’ala ahụ nọ ná nchebe. Ọ dịghị ndị iro na-abatanụ, otú ndị Babilọn batara n’otu oge, ịdọkpụrụ ụmụaka na-aṅụ ara ma ọ bụ igbu ụmụ okorobịa bụ́ ndị nọ n’uju ndụ ha. (2 Ihe E Mere 36:17, 20) N’ime ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ, ndị mmadụ ga-anọ ná nchebe, ná ntụkwasị obi, nwee ike ịnụ ụtọ ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ ahọrọ inupụrụ Chineke isi, a gaghị ekwe ka ọ nọgide na-adị ndụ. Chineke ga-ewezụga ya. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na onye mmehie ahụ na-enupụ isi dị otu narị afọ? Ọ ga-anwụ “mgbe ọ gbara [otu narị afọ]” ma e were ya tụnyere ịdị ndụ na-enweghị ngwụsị.—1 Timoti 1:19, 20; 2 Timoti 2:16-19.

14, 15. Dabere n’Aịsaịa 65:21, 22, ọrụ ndị dị aṅaa na-enye afọ ojuju ka ị pụrụ ịtụ anya ịrụ?

14 Kama ikwuwe otú a pụrụ isi wezụga onye ma ụma na-eme mmehie, Aịsaịa na-akọwa ọnọdụ ibi ndụ ga-adị n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Gbalịa iwere anya nke uche gị hụ onwe gị n’ọnọdụ ahụ. Ihe anya nke uche gị pụrụ ịhụ bụ ihe ndị metụtara gị. Aịsaịa kwuru banyere nke ahụ n’amaokwu nke 21 na 22, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.”

15 Ọ bụrụ na i nwebeghị ahụmahụ n’iwu ụlọ ma ọ bụ n’ịkọ ugbo, amụma Aịsaịa na-enye echiche na ị ga-enweta ọzụzụ. Otú ọ dị, ị̀ ga-adị njikere ịmụta ihe site n’enyemaka nke ndị nkụzi ruru eru, ikekwe ndị agbata obi nwere obiọma bụ́ ndị ga-eji obi ụtọ nyere gị aka? Aịsaịa ekwughị ma ụlọ gị ọ̀ ga-enwe windo buru ibu nke na-enweghị enyo bụ́ nke nwere ihe nsechi, ka i wee nwee ike ịnara ikuku nke ebe okpomọkụ, ma ọ bụ windo enyo e mechiri emechi ndị ị pụrụ isi na ha hụ ihu igwe na-agbanwe agbanwe. Ị̀ ga-eme ka elu ụlọ gị kpọdaa akpọda ka mmiri na snow wee na-awụpụ? Ka ihu igwe nke ebe i bi ọ̀ ga-achọ elu ụlọ dị larịị—dị ka otu n’ime ndị e nwere n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa—elu ụlọ ebe ị pụrụ ịkpọkọta ezinụlọ gị maka ihe oriri na mkparịta ụka dị ụtọ?—Deuterọnọmi 22:8; Nehemaịa 8:16.

16. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji na-atụ anya na ụwa ọhụrụ ahụ ga-abụ nke ga-eweta afọ ojuju n’ụzọ na-adịgide adịgide?

16 Ihe ka mkpa karịa ịmata ụmụ irighiri ihe ndị dị otú ahụ bụ na ị ga-enwe ebe obibi nke gị. Ọ ga-abụ nke gị—ọ gaghị adị ka ugbu a ị pụrụ ịtasị ahụhụ wuo ụlọ, onye ọzọ erizie uru ya. Aịsaịa 65:21 kwukwara na ị ga-akụ ihe ma rie mkpụrụ ya. N’ụzọ doro anya, nke ahụ na-achịkọta ọnọdụ ahụ nile. Ị ga-enweta afọ ojuju dị ukwuu site n’ihe ndị ị tara ahụhụ ha, ihe ndị si ná ndọlị gị pụta. Ị ga-enwe ike ime nke ahụ ruo ogologo oge ị na-adị ndụ—“dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị.” Nkọwa ahụ e nyere ya kwesịrị nnọọ ekwesị ‘ihe nile dị ọhụrụ’!—Abụ Ọma 92:12-14.

17. Olee nkwa ndị mụrụ ụmụ ga-ahụ dị ka nke na-akasi obi karịsịa?

17 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, okwu ndị a ga-emetụ gị n’obi: “Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri: n’ihi na mkpụrụ nke ndị Jehova gọziworo ka ha bụ, ha na ụmụ ga-esi n’ahụ ha pụta. Ọ ga-erukwa na, tutu ha akpọọ, Mụ onwe m ga-aza; mgbe ha onwe ha nọ na-ekwu okwu, Mụ onwe m ga-anụ.” (Aịsaịa 65:23, 24) Ị̀ maara site n’ahụmahụ i nweworo ihe mgbu dị ‘n’ịmụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri’? Ọ dịghị anyị mkpa ịkpọsịsịwa nsogbu nile ụmụaka pụrụ inwe bụ́ ndị na-ewetara ndị nne na nna ha na ndị ọzọ obi ọlụlọ mmiri. N’ihe metụtara nke ahụ, anyị nile ahụwokwa ndị nne na nna mikpuru nnọọ onwe ha n’ọrụ, n’ihe omume, ma ọ bụ n’ihe ụtọ nke ha nke na ha na-eji ntakịrị oge anọnyere ụmụ ha. N’ụzọ dị iche, Jehova na-emesi anyị obi ike na ọ ga-anụ ma gbooro anyị mkpa anyị, ọbụna na-amata ha tupu anyị ekwuo ha.

18. N’ihi gịnị ka ị ga-eji atụ anya ịnụ ụtọ ụmụ anụmanụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ?

18 Ka ị na-eche echiche banyere ihe ndị ị pụrụ ịnụ ụtọ ha n’ụwa ọhụrụ ahụ, jiri anya nke uche gị hụ ọnọdụ nke okwu amụma Chineke na-akọwa: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-atakọ nri n’otu, ọdụm ga-atakwa ahịhịa dị ka ehi: ma agwọ, ájá ga-abụ nri ya. Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile, ka Jehova sịrị.” (Aịsaịa 65:25) Ụmụ mmadụ na-ese ihe agbalịwo ise ọnọdụ ahụ, ma nke a abụghị nchepụta echiche nkịtị nke onye sere ya sere otú masịrị ya. Nke a ga-adị adị n’ezie. Udo ga-adị n’etiti ụmụ mmadụ, udo ga-adịkwa n’etiti ha na ụmụ anụmanụ. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta banyere ihe ndị dị ndụ na ndị nwere mmasị n’ụmụ anụmanụ na-eji ihe ka ukwuu n’afọ ndụ ha na-amụ banyere ụdị anụmanụ ole na ole ma ọ bụ nanị otu ụdị n’ime otu ìgwè. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, cheedị ihe ị ga-enwe ike ịmụta mgbe ụmụ anụmanụ na-adịkwaghị atụ mmadụ ụjọ. Mgbe ahụ ị ga-enwe ike ịgakwuru ọbụna ụmụ nnụnụ na ụmụ obere ihe ndị e kere eke ndị na-ebi n’ime oké ọhịa—ee, kirie ha, mụta ihe site na ha, ma nụ ụtọ ha. (Job 12:7-9) Ị ga-enwe ike ime otú ahụ n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla, n’enweghị ihe ize ndụ site n’aka mmadụ ma ọ bụ anụmanụ. Jehova na-asị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile.” Lee aha mgbanwe nke ahụ ga-abụ site n’ihe anyị na-ahụ taa!

19, 20. N’ihi gịnị ka ndị Chineke ji dị nnọọ iche n’ebe ọtụtụ ndị nọ taa?

19 Dị ka anyị kwuru na mbụ, ụmụ mmadụ apụghị ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu n’ụzọ ziri ezi, n’agbanyeghị nchegbu zuru ebe nile banyere narị afọ iri ọhụrụ. Nke ahụ na-eme ka ọtụtụ ndị nwee obi nkoropụ, mgbagwoju anya, ma ọ bụ nkụda mmụọ. Peter Emberley, bụ́ onyeisi nke otu mahadum dị na Canada, dere, sị: “Ọtụtụ [ndị toruworo ogo mmadụ] na-eche ajụjụ ndị bụ́ isi banyere ịdị adị ihu n’ikpeazụ. Ònye ka m bụ? Gịnị ka m na-adọgburu onwe m n’ezie? Gịnị ka m ga-ahapụrụ ọgbọ na-abịanụ? Ha na-agbalị mgbe ha meworo okenye ime ka ndụ ha dị n’usoro ma nwee nzube.”

20 Ị pụrụ ịghọta ihe mere o ji dị otú ahụ n’ebe ọtụtụ ndị nọ. Ha pụrụ ịchọ ịnụ ụtọ ndụ site n’ihe omume ntụrụndụ dị iche iche ma ọ bụ ụdị ntụrụndụ ndị na-akpali akpali. Ma, ha amaghị ihe ọdịnihu ga-abụ, ya mere ndụ pụrụ ịbụ nke na-enweghị isi, nke na-adịghị n’usoro, nke na-enweghịkwa ezi nzube. Ugbu a jiri nke ahụ tụnyere otú i si ele ndụ anya, na-adabere n’ihe ndị anyị tụleworo. Ị maara na n’ime eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụru ahụ Jehova kwere ná nkwa, anyị ga-enwe ike ilegharị anya ma jiri obi anyị kwuo, sị, ‘N’eziokwu, Chineke emewo ihe nile ka ha dị ọhụrụ!’ Lee ka nke ahụ ga-esi masị anyị!

21. Olee otu isi ihe anyị na-ahụ n’Aịsaịa 65:25 nakwa n’Aịsaịa 11:9?

21 Ọ bụghị ịdị mpako bụ́ iji anya nke uche hụ onwe anyị ka anyị bi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. Ọ na-akpọ anyị òkù, ọbụna na-agba anyị ume, ife ya ofufe ugbu a n’eziokwu wee ruo eru inweta ndụ mgbe ‘ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ ya nile.’ (Aịsaịa 65:25) Otú ọ dị, ị̀ maara na Aịsaịa bu ụzọ kwuo okwu yiri nke ahụ nakwa na ọ gbakwụnyere otu isi ihe dị oké mkpa maka anyị ịnụ ụtọ ụwa ọhụrụ ahụ n’ezie? Aịsaịa 11:9 na-asị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”

22. Ntụle anyị tụlere amụma anọ dị na Bible kwesịrị ime ka anyị kpebisikwuo ike ime gịnị?

22 “Ihe ọmụma Jehova.” Mgbe Chineke ga-eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ, ndị bi n’ụwa ga-enwe ezi ihe ọmụma banyere ya nakwa uche ya. Nke ahụ ga-agụnye ihe karịrị nnọọ isite n’anụmanụ ndị e kere eke mụta ihe. Ọ gụnyere Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ. Dị ka ihe atụ, tụgharịa uche n’ókè anyị hụruworo site n’inyocha nanị amụma anọ ndị kwuru banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (Aịsaịa 65:17; 66:22; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1) E nwere ezi ihe mere ị ga-eji na-agụ Bible kwa ụbọchị. Nke ahụ ọ̀ bụ otu akụkụ nke ihe ndị ị na-eme mgbe dum? Ọ bụrụ na ọ bụghị otú ahụ, mgbanwe ndị dị aṅaa ka ị pụrụ ime ka ọ ga-abụ kwa ụbọchị, ị gụọ ụfọdụ n’ime ihe ndị Chineke nwere ikwu? Ị ga-ahụ na e wezụga ịtụ anya ịnụ ụtọ ụwa ọhụrụ ahụ, ị ga-enweta ihe ụtọ a mụbara amụba ugbu a kpọmkwem, ọbụna dị ka ọbụ abụ ahụ mere.—Abụ Ọma 1:1, 2.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 906, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwubie na Aịsaịa 66:22-24 na-ebu amụma banyere ọdịnihu?

• Gịnị ka ị na-atụ anya ya karịsịa n’ime ihe ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’amụma ndị dị n’Aịsaịa 66:22-24 nakwa n’Aịsaịa 65:20-25?

• Olee ihe ndị mere i ji enwe obi ike banyere ọdịnihu gị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Aịsaịa, Pita, na Jọn buru amụma banyere akụkụ ụfọdụ nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ahụ