Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Atọ n’ime Oziọma ndị ahụ kọrọ mkpesa e mere banyere otite e tere Jisọs mmanụ dị oké ọnụ ahịa. Ọtụtụ ndị ozi hà mere mkpesa, ka ọ̀ bụ Judas bu ya n’isi?

Anyị na-achọta ebe a kọrọ banyere ihe omume a n’Oziọma Matiu, Mak, na Jọn. O yiri ka Judas o butere ụzọ n’ime mkpesa, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ ndị ozi ekwenyeziere ya. Ihe omume a na-egosipụta ihe mere anyị pụrụ iji na-enwe ekele maka inwe ihe ndekọ Oziọma anọ ahụ. Ihe onye edemede nke ọ bụla dere ziri ezi, ma nkọwa ha nile nyere abụghị otu ihe. Site n’ịtụle ihe ndekọ ndị yiri ibe ha, anyị na-aghọta ọtụtụ ihe ndị merenụ n’ụzọ zukwuru ezu ma dokwuo anya.

Ihe ndekọ dị na Matiu 26:6–13 kwuru ebe o mere—ụlọ Saịmọn onye ekpenta, na Betani—ma o kwughị aha nwanyị ahụ malitere ịwụsa Jisọs mmanụ otite n’isi. Matiu na-ekwu, sị: “Ma mgbe ndị na-eso ụzọ Ya hụrụ ya, iwe were ha nke ukwuu,” ha wee mee mkpesa na a pụrụ irewo mmanụ ahụ ma were ego ya nye ndị ogbenye.—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

Ihe ndekọ Mak nwekwara ihe ka ukwuu ná nkọwa ndị ahụ. Ma ọ na-agbakwụnye na ọ kụwara ite ahụ. Mmanụ otite nke bụ́ “ezi nard,” dị ka nke a pụrụ isiwo India tụbata, dị n’ime ya. Banyere mkpesa ahụ, Mak na-akọ na “ụfọdụ dị ndị iwe na-ewe nke ukwuu,” nakwa na “ha . . . na-atamu ntamu megide nwanyị ahụ.” (Mak 14:3–9, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere, ihe ndekọ abụọ ahụ na-egosi na ihe karịrị otu onyeozi tinyere ọnụ ná mkpesa ahụ. Otú ọ dị, olee otú o si malite?

Jọn, bụ́ onye ji anya ya hụ ihe merenụ, gbakwụnyere nkọwa ndị bara uru. O kwuru aha nwanyị ahụ—Meri, nwanne nwanyị Mata na Lazarọs. Jọn nyekwara nkọwa a, nke anyị pụrụ iwere dị ka ihe na-emejupụta akụkọ ahụ kama ịbụ ihe na-emegide ya: “Meri weere mmanụ otite . . . tee ụkwụ Jisọs abụọ, werekwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ Ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Mgbe anyị chịkọtara ihe ndekọ ndị ahụ, anyị pụrụ ịhụ na Meri aghaghị ịwụsawo mmanụ ahụ, nke Jọn kwetara na ọ bụ “ezi nard,” n’isi na n’ụkwụ Jisọs. Jọn nọdewere nnọọ Jisọs nso, ọ ghaghịkwa iwewo iwe n’ihi mmejọ e mejọrọ Ya. Anyị na-agụ, sị: “Judas Iskariọt, otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ Ya, nke gaje ịrara Ya nye, [sịrị], N’ihi gịnị ka a na-ereghị mmanụ otite a [narị shilling atọ], were ya nye ndị ogbenye?”—Jọn 12:2–8.

N’ezie, Judas bụ “otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ Ya,” ma ị pụrụ ịghọta iwe Jọn na onye nọ n’ọnọdụ a nọ na-eme atụmatụ ịrara Jisọs nye. Onye nsụgharị bụ́ Dr. C. Howard Matheny kwuru banyere Jọn 12:4, sị: “Ma okwu bụ́ ‘na-aga’ [ma ọ bụ, “gaje”] ma okwu bụ́ ‘ịrara’ [ma ọ bụ, “gaje ịrara”] na-egosipụta ihe na-eme n’usoro ma ọ bụ ihe omume na-aga n’ihu. Nke a na-egosi na nrara Judas raara Jisọs nye abụghị ihe e mere na mberede n’ihi na e ji ọtụtụ ụbọchị chebara ya echiche ma dokwaa ya.” Jọn mere ka a ghọta na Judas mere mkpesa ahụ “ọ bụghị n’ihi na ọ kpọrọ ndị ogbenye ihe; kama n’ihi na ọ bụ onye ohi, na ebe o ji akpa ego, ọ na-ewepụ ihe a na-etinye n’ime ya.”

N’ihi ya, o yiri ihe ezi uche dị na ya na ọ bụ onye ohi ahụ bụ́ Judas kpalitere mkpesa ahụ n’ihi na ọ ga-enwekwu ihe ọ ga-ezuru ma ọ bụrụ na e rere mmanụ ahụ dị oké ọnụ ahịa ma were ego ya tinye n’ime akpa ego ahụ ọ na-ejide. Ozugbo Judas malitere mkpesa a, ụfọdụ ndị ozi ndị ọzọ pụrụ ịtamuwo ntamu n’ikwenyere ya n’ihe yiri ka o ji okwu. Otú ọ dị, Judas bụ onye bụ́ isi kpalitere mkpesa ahụ.