Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Agbamakwụkwọ Ndị Na-enye Ọṅụ Bụ́ Ndị Na-ewetara Jehova Nsọpụrụ

Agbamakwụkwọ Ndị Na-enye Ọṅụ Bụ́ Ndị Na-ewetara Jehova Nsọpụrụ

Agbamakwụkwọ Ndị Na-enye Ọṅụ Bụ́ Ndị Na-ewetara Jehova Nsọpụrụ

Welsh Na Elthea Lụrụ Di Na Nwunye Na Soweto, South Africa, Na 1985. Site N’oge Ruo N’oge, Ha Na Nwa Ha Nwanyị Bụ́ Zinzi Na-ekiri Ọ́bọ́ Foto Agbamakwụkwọ Ha, Wee Na-echetaghachi Ụbọchị Ọṅụ Ahụ. Ọ Na-amasị Zinzi Ịkọtasị Ndị Bịara Agbamakwụkwọ Ahụ, Ọ Na-amasịkwa Ya Karịsịa Ikiri Foto Ebe Nne Ya Jiri Ejiji Mara Nnọọ Mma.

AGBAMAKWỤKWỌ ahụ ji okwu alụmdi na nwunye e kwuru n’otu ụlọ ezumezu ógbè dị na Soweto, malite. E mesịa, ìgwè ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst, ji ụda olu anọ nwere nkwekọ bụkuo Chineke abụ otuto. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị bịaranụ riri nri ka tepụ uri olu ụtọ nke Alaeze ji nwayọọ na-akpọ. Ọ dịghị ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya e kere, e nweghịkwa egwu dara oké ụda ma ọ bụ ite egwú. Kama nke ahụ, ndị bịaranụ nwere ọṅụ ịkpakọrịta na ikele di na nwunye ahụ. N’ozuzu ya, ihe omume ahụ were ihe dị ka awa atọ. “Ọ bụ agbamakwụkwọ nke m ga-eji mmasị na-echeta mgbe nile,” ka Raymond, bụ́ onye Kraịst bụ́ okenye na-echeta.

N’oge agbamakwụkwọ ha, Welsh na Elthea bụ ndị ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society nke dị na South Africa. Aka ha apụghị iru ihe karịrị agbamakwụkwọ dị mfe. Ụfọdụ ndị Kraịst ahọrọwo ịhapụ ozi oge nile ma nweta ọrụ ego iji nwee ike inweta ego ga-ezu inwe agbamakwụkwọ buru ibu. Otú ọ dị, Welsh na Elthea akwaghị ụta na ha họọrọ inwe agbamakwụkwọ dị mfe n’ihi na o nyere ha ohere ịnọgide na-ejere Chineke ozi dị ka ndị ozi oge nile ruo mgbe ha mụrụ Zinzi.

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-achọ ịlụ onwe ha ahọrọ ka a kpọọ egwú na-abụghị abụ Alaeze na ka a gbaa egwú n’agbamakwụkwọ ha? Gịnị ma ha kpebie ikesa mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya? Gịnị ma ọ bụrụ na aka ha pụrụ iru agbamakwụkwọ buru ibu ma saa mbara? Olee otú ha pụrụ isi jide n’aka na ihe omume ahụ ga-abụ ememe obi ụtọ nke kwesịrị ndị na-efe Chineke? Ajụjụ ndị dị otú ahụ chọrọ iji nlezianya chebara ha echiche, n’ihi na Bible na-enye iwu, sị: “Ma ùnu na-eri ihe, ma ùnu na-aṅụ ihe, ma ùnu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrint 10:31.

Izere Oriri Oké Mkpọtụ

O siri ike ichetụ agbamakwụkwọ na-adịghị enye ọṅụ n’echiche. E nwere ihe ize ndụ ka ukwuu n’imebiga ihe ókè na inwe oriri oké mkpọtụ a na-achịkwaghị achịkwa. N’ọtụtụ agbamakwụkwọ nke ndị na-abụghị Ndịàmà, ihe ndị na-adịghị ewetara Chineke nsọpụrụ na-ewere ọnọdụ. Dị ka ihe atụ, a na-ejikarị mmanya na-aba n’anya eme ihe ruo n’ókè nke ịṅụbiga ya ókè. N’ụzọ dị mwute, nke a emewo ọbụna n’ụfọdụ agbamakwụkwọ ndị Kraịst.

Bible na-adọ aka ná ntị na “onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya bụ.” (Ilu 20:1) Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “mkpọtụ” pụtara ‘ime oké ụzụ.’ Ọ bụrụ na mmanya na-aba n’anya pụrụ ime ka otu onye na-eme ụzụ, cheenụ echiche ihe ọ pụrụ ime ìgwè mmadụ buru ibu bụ́ ndị nọkọtara ọnụ ma ṅụọ mmanya nke ukwuu! N’ụzọ doro anya, ememe ndị dị otú ahụ pụrụ n’ụzọ dị mfe ịbanye ‘n’ịṅụbiga mmanya ókè, [oriri oké mkpọtụ, NW], na ihe yiri ihe ndị a,’ bụ́ ndị e dekọrọ n’ime Bible dị ka “ọrụ nile nke anụ ahụ.” Omume ndị dị otú ahụ na-eme ka onye ọ bụla nke na-enweghị nchegharị ghara iru eru inweta ndụ ebighị ebi n’okpuru ọchịchị nke Alaeze Chineke.—Ndị Galetia 5:19-21.

E ji okwu Grik maka “oriri oké mkpọtụ” mee ihe iji kọwaa ngagharị oké ụzụ nke ìgwè ndị ntorobịa mmanya na-achọ ịba n’anya, bụ́ ndị gụrụ, tee, ma kụọ egwú n’okporo ámá, mere. Ọ bụrụ na a ṅụọ mmanya na-aba n’anya n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa n’agbamakwụkwọ, ọ bụrụkwa na e nwere egwú na ite egwú ndị a na-achịkwaghị achịkwa, e nwere ihe ize ndụ n’ezie na ememe ahụ ga-aghọ ihe dị ka oriri oké mkpọtụ. N’ebe dị otú ahụ, ndị na-esighị ike pụrụ ịdaba n’ọnwụnwa n’ụzọ dị mfe ma rụọ ọrụ ndị ọzọ nke anụ ahụ dị ka “ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ ịkwa iko, [ma ọ bụ daba n’ọnụma].” Gịnị ka a pụrụ ime iji gbochie ọrụ nke anụ ahụ ndị dị otú ahụ imebi ọṅụ nke agbamakwụkwọ ndị Kraịst? Iji zaa ajụjụ ahụ, ka anyị tụlee ihe Bible na-ekwu banyere otu agbamakwụkwọ.

Agbamakwụkwọ nke Jisọs Gara

A kpọrọ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ịbịa otu agbamakwụkwọ na Kena nke Galili. Ha nabatara ọkpụkpọ òkù ahụ, ọbụna Jisọs tụnyere ụtụ n’ọṅụ nke ememe ahụ. Mgbe mmanya gwụrụ, o ji ụzọ ọrụ ebube mee ka e nwekwuo nke kasị nnọọ mma. Obi abụọ adịghị ya na ruo oge ụfọdụ mgbe agbamakwụkwọ ahụ gasịrị, nke fọdụrụnụ gboro mkpa nke nwoke ahụ lụrụ nwunye ọhụrụ bụ́ onye nwere ekele ma gboo mkpa nke ezinụlọ ya.—Jọn 2:3-11.

E nwere ọtụtụ ihe anyị pụrụ ịmụta site n’agbamakwụkwọ ahụ Jisọs gara. Nke mbụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya agaghị ememe alụmdi na nwunye ahụ mgbe a na-akpọghị ha. Bible kwuru kpọmkwem na a kpọrọ ha. (Jọn 2:1, 2) N’otu aka ahụ, n’ilu abụọ ọ tụrụ banyere ememe alụmdi na nwunye, Jisọs kwuru ugboro ugboro banyere ndị bịaranụ ịbụ ndị bịara n’ihi na a kpọrọ ha.—Matiu 22:2-4, 8, 9; Luk 14:8-10.

N’ala ụfọdụ, ọ bụ omenala mmadụ nile nọ n’ógbè inwere onwe ha ịga oriri agbamakwụkwọ ma à kpọrọ ha ma ọ bụ na a kpọghị ha. Otú ọ dị, nke a pụrụ iduga n’ihe isi ike n’ụzọ ego. Mmadụ abụọ na-aga ịlụ onwe ha bụ́ ndị na-abaghị ọgaranya pụrụ ịbanye n’ụgwọ iji jide n’aka na e nwere nri na ihe ọṅụṅụ ga-ezuru ìgwè mmadụ a na-akparaghị ókè. Ya mere, ọ bụrụ na ndị Kraịst abụọ na-aga ịlụ onwe ha ekpebie inwe oriri agbamakwụkwọ dị mfe nke nwere ọnụ ọgụgụ a kapịrị ọnụ nke ndị ga-abịanụ, ndị Kraịst ibe ha a na-akpọghị kwesịrị ịghọta nke a ma kwanyere ya ùgwù. Otu nwoke nke lụrụ nwunye na Cape Town, South Africa, na-echeta na ọ kpọrọ mmadụ 200 n’agbamakwụkwọ ya. Otú ọ dị, mmadụ 600 bịara, ngwa ngwa kwa, nri gwụnahụrụ ha. N’ime ndị ahụ a na-akpọghị bịaranụ bụ ndị ọbịa juru otu bọs bụ́ ndị nọ na-eme njem nleta na Cape Town ná ngwụsị izu a na-agba akwụkwọ ahụ. Onye na-eso bọs a e ji na-eme njem nleta bụ onye ikwu dị anya nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, o chekwara na ọ bụ ihe ruuru ya ịkpọta ìgwè ahụ nile n’emeghịdị ka nwanyị ma ọ bụ nwoke ahụ na-agba akwụkwọ mara!

Ọ gwụla ma e kwuru na onye ọ bụla pụrụ ịbịa oriri agbamakwụkwọ, ezi onye na-eso ụzọ Jisọs ga-ezere ịga oriri agbamakwụkwọ a na-akpọghị ya na ikere òkè ná nri na ihe ọṅụṅụ e wetaara ndị a kpọrọ. Ndị ọ gụrụ agụụ ịga mgbe a na-akpọghị ha kwesịrị ịjụ onwe ha, sị, ‘Mụ ịga oriri agbamakwụkwọ a ọ́ gaghị egosipụta enweghị ịhụnanya n’ebe ndị ahụ na-alụ ọhụrụ nọ? Ọ̀ bụ na m gaghị akpata ahụ erughị ala ma wepụ ihe n’ọṅụ nke ememe ahụ?’ Kama iwe iwe n’ihi ịbụ onye a na-akpọghị, onye Kraịst nwere nghọta pụrụ iji ịhụnanya zigara di na nwunye ahụ ozi iji kelee ha ma cheere ha ngọzi Jehova. Ọ pụrụ ọbụna ịtụle inyere di na nwunye ahụ aka site n’izigara ha onyinye iji tinye ihe n’obi ụtọ nke ụbọchị agbamakwụkwọ ha.—Eklisiastis 7:9; Ndị Efesọs 4:28.

Ònye Ka Ọ Dị n’Isi?

N’akụkụ ụfọdụ nke Africa, ọ bụ omenala na ndị ikwu ka mee okenye ga-eweghara ime nkwadebe maka agbamakwụkwọ ahụ. Mmadụ abụọ ndị na-aga ịlụ onwe ha pụrụ inwe ekele maka nke a, ebe ọ bụ na ọ na-eme ka ha nwere onwe ha pụọ n’ibu ọrụ dị na ya n’ụzọ ego. Ha pụrụ iche na ọ na-emekwa ka ihe ọ bụla pụrụ ime ghara ịdị ha n’isi. Otú ọ dị, tupu mmadụ abụọ na-aga ịlụ onwe ha anakwere ụdị enyemaka ọ bụla site n’aka ndị ikwu nwere ezi ebumnobi, ha kwesịrị ijide n’aka na a ga-akwanyere ọchịchọ ha ùgwù.

Ọ bụ ezie na Jisọs bụ Ọkpara Chineke bụ́ onye “[si] n’eluigwe rịdata,” e nweghị ihe ọ bụla gosiri na o weghaara ma duzie ihe ka ukwuu n’agbamakwụkwọ ahụ e mere na Kena. (Jọn 6:41) Kama nke ahụ, ihe ndekọ Bible ahụ na-agwa anyị na a họpụtara onye ọzọ ịrụ ọrụ dị ka “onyeisi oriri.” (Jọn 2:8) Nwoke a, n’aka nke ya, nọkwa n’okpuru onyeisi ezinụlọ ọhụrụ ahụ, ya bụ nwoke ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ.—Jọn 2:9, 10.

Ndị ikwu bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịkwanyere onyeisi ezinụlọ ọhụrụ ahụ Chineke họpụtara ùgwù. (Ndị Kọlọsi 3:18-20) Ọ bụ ya ka ihe na-eme n’agbamakwụkwọ ya kwesịrị ịdị n’isi. Dị ka o kwesịrị ịdị, nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ kwesịrị inwe ezi uche ma, ya kwe mee, nabata ọchịchọ nke nwanyị ahụ ọ na-aga ịlụ, nne na nna ya, na ndị ọgọ ya. Ma, ọ bụrụ na ndị ikwu esie ọnwụ na ha ga-edokwa ihe n’ụzọ megidere ọchịchọ mmadụ abụọ ahụ na-aga ịlụ onwe ha, mgbe ahụ, mmadụ abụọ ahụ pụrụ iji olu ọma jụ enyemaka ha ma kwụọrọ onwe ha ụgwọ agbamakwụkwọ dị mfe. N’ụzọ dị otú a ọ dịghị ihe ga-ewere ọnọdụ bụ́ nke ga-eme ka mmadụ abụọ ahụ chetawa ihe ndị na-adịghị enye obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, n’otu agbamakwụkwọ ndị Kraịst e mere n’Africa, otu onye ikwu nke na-ekweghị ekwe bụ́ onye jere ozi dị ka onye nhazi ememe tụpụụrụ nna nna ha nwụrụ anwụ mmanya n’ala!

Mgbe ụfọdụ di na nwunye na-aga ezumike nke di na nwunye ọhụrụ tupu ememe agbamakwụkwọ ahụ emechie. N’ọnọdụ dị otú ahụ, nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ kwesịrị ime ndokwa ka ndị tozuru okè jide n’aka na a gbasoro ụkpụrụ Bible nakwa na ememe ahụ mechiri n’ezi oge.

Iji Nlezianya Mee Atụmatụ na Inwe Nguzozi

Ihe àmà na-egosi na e nwere ezi nri n’ụba n’agbamakwụkwọ ahụ Jisọs gara, n’ihi na Bible na-akọwa ya dị ka oriri alụmdi na nwunye. Dị ka a rịbaworo ama, e nwekwara mmanya n’ụba. Obi abụọ adịghị ya na e nwere egwú kwesịrị ekwesị na ite egwú n’ụzọ dị ùgwù n’ihi na nke a bụ ihe a na-ahụkarị ná nnọkọ oriri ndị Juu. Jisọs gosiri nke a n’ilu ya a ma ama banyere nwa mmefu. Nna ahụ bara ọgaranya a kọrọ n’akụkọ ahụ nwere nnọọ obi ụtọ maka nlọghachi nke nwa ya nwoke nwere nchegharị nke na ọ sịrị: “Ka anyị riekwa, ka obi tọọkwa anyị ụtọ.” Dị ka Jisọs si kwuo, ememe ahụ gụnyere “olu abụ na ite egwú.”—Luk 15:23, 25.

Otú ọ dị, ọ dị mma ịmara na Bible akpọtụghị egwú na ite egwú aha kpọmkwem n’agbamakwụkwọ ahụ e nwere na Kena. N’ezie, a kpọtụghị ite egwú aha n’ihe ndekọ ọ bụla nke Bible banyere agbamakwụkwọ. O yiri ka n’etiti ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible, ite egwú bịaara onwe ya, ọ bụghịkwa akụkụ bụ́ isi nke agbamakwụkwọ ha. Ànyị pụrụ ịmụta ihe ọ bụla site na nke a?

N’agbamakwụkwọ ụfọdụ nke ndị Kraịst n’Africa, a na-eji ngwá egwú electronic ndị dị ike eme ihe. Egwú pụrụ ịdị na-ada nnọọ ụda nke na ndị bịaranụ apụghị ikwurịta okwu n’ahụ iru ala. Mgbe ụfọdụ ọ na-edo anya na nri agwụwo ma ite egwú ndị na-eji ụzọ dị mfe ghọọ nke a na-achịkwaghị achịkwa adịghị agwụ agwụ. Kama ịbụ oriri alụmdi na nwunye, ememe ndị dị otú ahụ pụrụ nnọọ ịbụ ihe nkụnye aka maka nnọkọ ite egwú. Ọzọkwa, egwú na-ada oké ụda na-adọtakarị ndị na-akpata nsogbu, ndị a na-amabughị bụ́ ndị bịara nnọọ n’enweghị onye kpọrọ ha.

Ebe ọ bụ na ihe ndekọ Bible banyere agbamakwụkwọ adịghị emesi egwú na ite egwú ike, nke a ó kwesịghị iduzi mmadụ abụọ na-aga ịlụ onwe ha bụ́ ndị na-eme atụmatụ maka agbamakwụkwọ nke ga-ewetara Jehova nsọpụrụ? Ma, ná nkwadebe maka ọtụtụ agbamakwụkwọ ndị e mere na nso nso a n’ebe ndịda Africa, ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst a họtara iso ndị ahụ na-alụ di na nwunye ọhụrụ n’azụ tinyere ọtụtụ awa n’ịmụgharị nzọụkwụ egwú ndị dị mgbagwoju anya. Ruo ọtụtụ ọnwa ha lara oge gabigara nnọọ ókè n’iyi n’ụzọ dị otú a. Ma ọ dị ndị Kraịst mkpa ‘ịzụchapụta oge’ maka “ihe ndị ka mkpa,” dị ka ọrụ izisa ozi ọma, ọmụmụ ihe onwe onye, na ịga nzukọ ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 5:16; Ndị Filipaị 1:10, NW.

Site n’otú mmanya Jisọs wetara haruru, o yiri ka agbamakwụkwọ ahụ e nwere na Kena ò buru ibu, saa mbara. Otú ọ dị, anyị pụrụ ijide n’aka na ememe ahụ abụghị nke mkpọtụ nakwa na ndị bịaranụ aṅụbigaghị mmanya na-aba n’anya ókè dị ka ọ dị n’agbamakwụkwọ ụfọdụ nke ndị Juu. (Jọn 2:10) Olee otú anyị pụrụ isi jide nke a n’aka? N’ihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ n’ebe ahụ. N’ime ndị ikom nile, Jisọs ga-abụworị onye kasị kpachapụ anya irubere iwu Chineke banyere mkpakọrịta ọjọọ, isi: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vine ókè.”—Ilu 23:20.

Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-aga ịlụ onwe ha ekpebie ka e kesaa mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya n’agbamakwụkwọ ha, ha kwesịrị ime ndokwa ka e mee nke a ná nchịkwa siri ike nke mmadụ ndị ruru eru. Ọ bụrụkwa na ha ekpebie ịkpọ egwú, ha kwesịrị ịhọta uri olu ụtọ ndị kwesịrị ekwesị ma mee ka onye ruru eru na-achịkwa ụda ya. E kwesịghị ikwe ka ndị bịaranụ na-achịkwazi ihe ma webata egwú ndị a na-enyo enyo ma ọ bụ gbalie ụda egwú ruo n’ókè na-adịghị mma. Ọ bụrụ na a ga-ete egwú, a pụrụ ịmalite ya n’ụzọ dị ùgwù nakwa n’ụzọ a chịkwara achịkwa. Ọ bụrụ na ndị ikwu na-ekweghị ekwe ma ọ bụ ndị Kraịst na-etozughị okè etee egwú ndị na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ndị na-akpali mmekọahụ, onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ nwere ike ịgbanwe ụdị egwú ahụ ma ọ bụ jiri akọ rịọ ka ite egwú ahụ kwụsị. Ma ọ́ bụghị ya, agbamakwụkwọ ahụ pụrụ ịbanye n’ihe omume aghara ma kpata ịsụ ngọngọ.—Ndị Rom 14:21.

N’ihi ihe ize ndụ ndị dị n’ụdị ite egwú ọgbara ọhụrụ ụfọdụ, egwú na-ada oké ụda, na ịṅụ mmanya na-aba n’anya n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa, ọtụtụ ndị Kraịst na-alụ nwunye ọhụrụ ekpebiwo na ha agaghị etinye akụkụ ndị a n’agbamakwụkwọ ha. A katọwo ụfọdụ n’ihi nke a, kama nke ahụ, e kwesịrị ịja ha mma n’ihi ọchịchọ ha izere ihe ọ bụla pụrụ iwetara aha nsọ Chineke nkọcha. N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị na-alụ nwunye ọhụrụ na-eme ndokwa maka egwú kwesịrị ekwesị, oge ite egwú, na ikesa mmanya ndị na-aba n’anya n’ókè kwesịrị ekwesị. N’ọnọdụ abụọ ahụ, ihe ọ bụla onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ kwere ka o were ọnọdụ n’agbamakwụkwọ ya dị ya n’isi.

N’Africa, ụfọdụ ndị na-etozughị okè na-eleda agbamakwụkwọ ndị Kraịst dị ùgwù anya ma na-ekwu na ọ dị ka ịga olili ozu. Otú ọ dị, nke ahụ abụghị echiche kwesịrị ekwesị. Ọrụ mmehie nke anụ ahụ pụrụ iweta mkpali ndị na-adịru nwa oge, ma ha na-eme ka akọ na uche ndị Kraịst na-enye ha nsogbu, na-ewetakwara aha Chineke nkọcha. (Ndị Rom 2:24) N’aka nke ọzọ, mmụọ nsọ Chineke na-arụpụta ezi ọṅụ. (Ndị Galetia 5:22) Ọtụtụ ndị di na nwunye bụ́ ndị Kraịst na-eji obi ụtọ eleghachi anya azụ n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha, na-amara na ọ bụ ememe obi ụtọ, ọ bụghịkwa “ihe ịsụ ngọngọ.”—2 Ndị Kọrint 6:3.

Welsh na Elthea ka na-echeta ọtụtụ okwu dị mma nke ndị ikwu ha na-ekweghị ekwe bụ́ ndị bịara agbamakwụkwọ ha kwuru. Otu onye sịrị: “Agbamakwụkwọ mkpọtụ ndị a na-eme n’oge a agwụwo anyị ike. Ọ bụ ihe magburu onwe ya ịgbanwetụkwanụ gaa agbamakwụkwọ dị mma.”

Nke kasị mkpa, agbamakwụkwọ ndị Kraịst bụ́ nke na-enye ọṅụ ma dị ùgwù, na-ewetara Onye Mmalite nke alụmdi na nwunye, bụ́ Jehova Chineke, nsọpụrụ.

[Igbe dị na peeji nke 22]

IHE NDỊ A GA-ATỤLE MAKA ORIRI AGBAMAKWỤKWỌ

• Ọ bụrụ na ị kpọọ onye ikwu na-ekweghị ekwe ikwu okwu, ì jidewo n’aka na ọ gaghị ewebata ọdịnala ụfọdụ na-abụghị nke ndị Kraịst?

• Ọ bụrụ na a ga-akpọ egwú, ị̀ họtawo nanị abụ ndị kwesịrị ekwesị?

• À ga-akpọ egwú gị n’ụda dị mma?

• Ọ bụrụ na e kwere ka a gbaa egwú, ọ̀ ga-ewere ọnọdụ n’ụzọ dị ùgwù ?

• À ga-ekesa ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya nanị n’ókè kwesịrị ekwesị?

• Ndị ruru eru hà ga-achịkwa nkesa ya?

• Ì setịpụwo oge kwesịrị ekwesị oriri agbamakwụkwọ ahụ ga-akwụsị?

• Ndị ruru eru hà ga-anọ ya iji hụ na ihe nile gara n’usoro ruo ọgwụgwụ?