Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Mma Agha nke Mmụọ Nsọ Alụso Nrụrụ Aka Ọgụ

Iji Mma Agha nke Mmụọ Nsọ Alụso Nrụrụ Aka Ọgụ

Iji Mma Agha nke Mmụọ Nsọ Alụso Nrụrụ Aka Ọgụ

“Unu yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.”—Ndị Efesọs 4:24.

N’OGE ọ nọ n’ọnọdụ kasị elu, Alaeze Ukwu Rom bụ ọchịchị ụmụ mmadụ kasịnụ nke e nwetụrụla n’ụwa. Iwu ndị Rom dịịrị nnọọ irè nke na ọ ka bụ ebe ọtụtụ mba na-adabere ahazi usoro iwu nke ha. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe Rom rụzuru, usuu ndị agha ya enweghị ike imeri otu onye iro dị aghụghọ: nrụrụ aka. N’ikpeazụ, nrụrụ aka mere ka ọdịda Rom dịkwuo ngwa.

Pọl onyeozi bụ otu onye nke hụjuru anya n’okpuru ndị ọchịchị rụrụ arụ nke Rom. Ihe àmà na-egosi na Filiks, bụ́ onye ọchịchị Rom nke gbara ya ajụjụ, ghọtara na aka Pọl dị ọcha. Ma Filiks, bụ́ otu n’ime ndị ọchịchị kasị rụọ arụọ n’oge ya, gburu oge n’ikpe Pọl ikpe, na-enwe olileanya na Pọl ga-enye ya ego ka e wee tọhapụ ya.—Ọrụ 24:22-26.

Kama inye Filiks ihe iri ngo, Pọl gwara ya hoo haa banyere “ezi omume, na imeru ihe ókè.” Filiks agbanweghị ụzọ ya, Pọl nọgidekwara n’ụlọ mkpọrọ kama ịnwa iji ihe iri ngo zere ịgbaso usoro iwu. O kwusara ozi nke eziokwu na nkwụwa aka ọtọ, o bikwara ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya. “E mere ka anyị kwenye na anyị nwere akọ na uche ọma,” ka o degaara ndị Juu bụ́ ndị Kraịst n’akwụkwọ, “ebe anyị na-achọ ibi obi nke ọma n’ihe nile.”—Ndị Hibru 13:18.

Nguzo dị otú ahụ dị nnọọ iche n’ebe omume ndị e nwere n’oge ahụ dị. Nwanne nwoke Filiks bụ́ Pallas bụ otu n’ime ndị ikom kasị baa ọgaranya n’oge ochie, ọ fọkwara nke nta ka ọ bụrụ iri ngo na nrigbu ka o ji kpakọba akụ̀ na ụba ya nile—nke a gụkọtara ịbụ nde $45. Otú ọ dị, akụ̀ na ụba ya enweghị nnọọ ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ ijeri dollar ndị ọchịchị rụrụ arụ nke narị afọ nke 20 zobeworo n’ihe ndekọ ego ndị zoro ezo nke ụlọ akụ̀. N’ụzọ doro anya, ọ bụ nanị ndị na-amaghị nke a na-akọ ga-ekwere na gọọmenti ndị nke oge a emeriwo n’agha ha na-alụso nrụrụ aka.

Ebe ọ bụ na nrụrụ aka agbanyewo mkpọrọgwụ ruo ogologo oge, ànyị ga-ewererịrị ya na ọ bụ nnọọ akụkụ nke ihe mmadụ bu pụta ụwa? Ka ọ̀ dị ihe a pụrụ ime iji kwụsị nrụrụ aka?

Olee Otú A Pụrụ Isi kwụsị Nrụrụ Aka?

Nzọụkwụ mbụ pụtara ìhè n’ịkwụsị nrụrụ aka bụ ịghọta na nrụrụ aka na-ebibi ihe, bụrụkwa ihe na-ezighị ezi, ebe ọ na-abara ndị na-enweghị ụkpụrụ uru ma na-ewetara ndị ọzọ mwute. Obi abụọ adịghị ya na e nwewo ihe ịga nke ọma ụfọdụ n’akụkụ ahụ. James Foley, bụ́ osote odeakwụkwọ ukwu nke United States, kwuru, sị: “Anyị nile matara na ihe iri ngo na-efu dị ukwuu. Iri ngo na-emebi ezi ọchịchị, na-emebi ịdị irè nke ọnọdụ akụ̀ na ụba na mmepe, na-eme ka azụmahịa bụrụ ihe gbagọrọ agbagọ, na-emekwa ka ụmụ amaala nọrọ n’ọnọdụ ọjọọ gburugburu ụwa.” Ọtụtụ ndị ga-ekwenyere ya. Na December 17, 1997, mba 34 ndị bụ́ isi bịanyere aka ná “nkwekọrịta megidere iri ngo” bụ́ nke e bu n’uche iji “mee ihe pụtara ìhè n’ọgụ ahụ a na-alụso nrụrụ aka n’ụwa nile.” Nkwekọrịta ahụ “na-eme ka ọ bụrụ mpụ bụ́ mmadụ ikwu ka ya nye, ikwe nkwa na ya ga-enye ma ọ bụ inye onye ala ọzọ na-arụrụ ọha na-eze ọrụ ihe iri ngo iji nweta ma ọ bụ nọgide na-enweta abamuru n’achụmnta ego ná mba ọzọ.”

Otú ọ dị, inye ihe iri ngo iji nweta nkwekọrịta achụmnta ego ná mba ọzọ bụ nnọọ akụkụ dị nta a na-ahụ anya nke nrụrụ aka. Iwepụ ụdị nile nke nrụrụ aka chọrọ nzọụkwụ nke abụọ, bụ́ nke ka sie ike: mgbanwe obi ma ọ bụ, mgbanwe nke ọtụtụ obi. Ndị mmadụ n’ebe nile aghaghị ịmụta ịkpọ iri ngo na nrụrụ aka asị. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka inweta abamuru n’ụzọ na-ezighị ezi ga-akwụsị. Iji mezuo nke a, magazin bụ́ Newsweek kwuru na ụfọdụ na-eche na gọọmenti kwesịrị “ịgba ume ka ụmụ amaala n’ozuzu ha nwee echiche ụkpụrụ omume ọma.” Òtù Mba Nile Maka Ịkwụwa Aka Ọtọ, bụ́ òtù na-akpọ òkù maka inye iwu megide nrụrụ aka, na-atụkwa aro ka ndị na-akwado ya “webata ‘mkpụrụ nke iguzosi ike n’ezi ihe’” n’ebe ọrụ.

Ọgụ a na-alụso nrụrụ aka bụ nke metụtara omume nke a na-apụghị iji nanị inye iwu ma ọ bụ “mma agha” nke inye ntaramahụhụ n’ụzọ iwu, merie. (Ndị Rom 13:4, 5) A ghaghị ịkụnye mkpụrụ nke omume ọma na iguzosi ike n’ezi ihe n’obi ndị mmadụ. A pụrụ imezu nke a n’ụzọ kasị mma site n’iji ihe Pọl onyeozi kọwara dị ka “mma agha nke Mmụọ Nsọ,” bụ́ Okwu Chineke, bụ́ Bible, mee ihe.—Ndị Efesọs 6:17.

Bible Na-akatọ Nrụrụ Aka

N’ihi gịnị ka Pọl ji ghara ịnabata nrụrụ aka? Ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ime uche Chineke, bụ́ “Onye na-ahụghị mmadụ ihu ọma n’ikpe, Onye na-anaraghị ihe iri ngo.” (Deuterọnọmi 10:17) Ọzọkwa, obi abụọ adịghị ya na Pọl chetara ntụziaka ahụ a kapịrị ọnụ dị n’Iwu Mosis: “Ewezụgala ikpe; amatala ihu mmadụ n’ikpe: anarakwala ihe iri ngo; n’ihi na ihe iri ngo na-eme ka anya ndị maara ihe kpuo ìsì, ọ na-emekwa ka okwu nile nke ndị ezi omume gbagọọ agbagọọ.” (Deuterọnọmi 16:19) N’otu aka ahụ, Eze Devid ghọtara na Jehova kpọrọ nrụrụ aka asị, ọ rịọkwara ka Chineke ghara ịgụnye ya n’etiti ndị mmehie, bụ́ ndị “aka nri ha jupụtakwara n’iri ngo.”—Abụ Ọma 26:10.

Ndị ji ezi obi efe Chineke nwekwuru ihe ndị mere ha ga-eji ajụ nrụrụ aka. “Eze na-eji ikpe ziri ezi eme ka mba kwụsie ike,” ka Solomọn dere, “ma onye dị anyaukwu maka ihe iri ngo na-etida ya n’ala.” (Ilu 29:4, New International Version) Ikpe ziri ezi—karịsịa mgbe e si n’onye ọchịchị kasị elu mere ya gbadatawa—na-eweta nkwụsị ike, ebe nrụrụ aka na-eme ka mba daa ogbenye. N’ụzọ na-akpali mmasị, Newsweek kwuru, sị: “N’ógbè ebe onye ọ bụla chọrọ iketa òkè n’uru na-esite ná nrụrụ aka, marakwa otú ọ ga-esi enweta ya, ọnọdụ akụ̀ na ụba pụrụ ịdakpọ n’ụzọ dị mfe.”

Ọbụna mgbe ọnọdụ akụ̀ na ụba na-adakpọghị kpam kpam, ndị ikpe ziri ezi na-amasị na-enwe obi nkoropụ mgbe nrụrụ aka jupụtara ebe nile n’ụzọ na-enweghị nchịkwa. (Abụ Ọma 73:3, 13) A na-emejọkwa Onye Okike anyị, bụ́ onye nyere anyị ọchịchọ anyị bu pụta ụwa maka ikpe ziri ezi. N’oge gara aga, Jehova tinyere aka n’ikpochapụ nrụrụ aka pụtara nnọọ ìhè. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị bi na Jerusalem hoo haa ihe mere ọ ga-eji ghahapụ ha n’aka ndị iro ha.

Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Maịka, Chineke kwuru, sị: “Biko, nụrụnụ nke a, unu ndị isi ụlọ Jekọb, na unu ndị ikpe ụlọ Israel, ndị na-akpọ ikpe ziri ezi ihe arụ, ọ bụkwa izi ezi nile ka ha na-eme ka ọ gbagọrọ agbagọrọ. Ndị isi ya na-ekpe ikpe n’ihi iri ngo, ndị nchụàjà ya na-ezi ihe n’ihi ụgwọ, ndị amụma ya na-ajụ ase n’ihi ego . . . N’ihi nke a ka a ga-eji plough gwuo Zaịọn dị ka ubi n’ihi unu, Jerusalem ga-aghọkwa obo ihe obo ihe.” Nrụrụ aka bibiri ọha mmadụ n’Israel, dị nnọọ ka o bibiri Rom ọtụtụ narị afọ mgbe nke ahụ gasịrị. Dị nnọọ ka ịdọ aka ná ntị Chineke si dị, ihe dị ka otu narị afọ mgbe Maịka desịrị okwu ndị ahụ, e bibiri Jerusalem ma gbahapụ ya.—Maịka 3:9, 11, 12.

Otú ọ dị, ọ dịghị mmadụ ma ọ bụ mba ọ bụla ọ dị mkpa ịrụ arụ. Chineke na-agba ndị ajọ omume ume ịhapụ ụzọ ndụ ha ma gbanwee ụzọ ha si eche echiche. (Aịsaịa 55:7) Ọ chọrọ ka onye ọ bụla n’ime anyị jiri achọghị ọdịmma onwe onye nanị dochie anyaukwu, werekwa ezi omume dochie nrụrụ aka. “Onye na-emegbu onye na-enweghị ike na-ata Onye keworo ya ụta: ma onye na-asọpụrụ Ya ka onye na-emere ogbenye amara bụ,” ka Jehova na-echetara anyị.—Ilu 14:31.

Iji Eziokwu Bible Alụso Nrụrụ Aka Ọgụ n’Ụzọ Na-aga nke Ọma

Gịnị pụrụ ịkwali mmadụ ime mgbanwe dị otú ahụ? Ọ bụ otu ikike ahụ kwaliri Pọl ịjụ ibi ndụ dị ka onye Farisii iji ghọọ onye na-agbasosi Jisọs Kraịst ike. “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike,” ka o dere. (Ndị Hibru 4:12) Taa, eziokwu Akwụkwọ Nsọ ka na-akwalite ịkwụwa aka ọtọ, ọbụna n’etiti ndị mikpuworo nnọọ onwe ha ná nrụrụ aka. Tụlee otu ihe atụ.

N’oge na-adịghị anya mgbe o jesịrị ozi agha ya, Alexander, bụ́ onye si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, sonyere n’otu òtù nke na-eme mpụ, na-anapụ mmadụ ihe, na-erikwa ngo. * “Ọrụ m bụ ịnapụta ndị ọchụnta ego bara ọgaranya ego nchebe,” ka ọ na-akọwa. “Ozugbo onye ọchụnta ego tụkwasịrị m obi, ndị ọzọ so n’òtù anyị na-eji ime ihe ike yie ya egwu. Aga m ekwuzi na m ga-eme ihe banyere nke ahụ—n’ọnụ ego dị ukwuu. ‘Ndị m na-arụrụ ọrụ’ na-ekele m maka inyere ha aka idozi nsogbu ha, mgbe ọ bụkwanụ m kpatara ha. N’agbanyeghị otú ọ pụrụ iyiru ihe dị ịtụnanya, nke a bụ akụkụ nke ọrụ ahụ nke na-amasị m.

“Anụkwara m ụtọ ego na mkpali nke ụzọ ndụ a na-ewetara m. Ana m akwọ ụgbọala dara oké ọnụ, biri n’ụlọ mara mma, enwekwara m ego ịzụrụ ihe ọ bụla m chọrọ. Ndị mmadụ na-atụ m egwu, bụ́ nke mere ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye dị ike. N’ụzọ ụfọdụ ana m eche na ọ dịghị onye pụrụ imetụ m aka nakwa na iwu ejighị m. Apụrụ m idozi nsogbu ọ bụla m nwere n’ebe ndị uwe ojii nọ ma ọ́ bụghị site n’aka ọkàikpe bụ́ ọkachamara, bụ́ onye maara ụzọ e si ezere ihe ikpe ziri ezi chọrọ, ọ bụrụ site n’inye onye kwesịrị ekwesị ihe iri ngo.

“Otú ọ dị, ndị ndụ ha dabeere ná nrụrụ aka adịkarịghị eguzosi ike n’ihe. Otu onye n’ime ndị òtù anyị malitere ịkpọ m asị, ihe m adịghịzi ya mma. Na mberede, ụgbọala m mara mma, ego m, na enyi m nwanyị m na-emefuru ego dị ukwuu funahụrụ m. Ọbụna a kụrụ m ihe n’ụzọ dị njọ. Mgbanwe ọnọdụ a mere ka m chesie echiche ike banyere nzube nke ndụ.

“Ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, nne m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, amalitekwara m ịgụ akwụkwọ ha. Ihe odide ahụ dị n’Ilu 4:14, 15 mere ka m chee echiche n’ezie: ‘Abala n’okporo ụzọ ndị na-emebi iwu, agakwala n’ihu n’ụzọ ndị ọjọọ. Zere ya, agabigala n’ime ya; wezụgara ya onwe gị, gabiga.’ Amaokwu ndị dị ka nke a mere ka m kwenyesie ike na ndị chọrọ ibi ndụ ime mpụ enweghị ezi ọdịnihu. Amalitere m ikpeku Jehova ekpere na ịrịọ ya ka o duzie m n’ezi ụzọ ahụ. Esooro m Ndịàmà Jehova mụọ Bible, e mesịakwa, araara m ndụ m nye Chineke. Ebiwo m ndụ n’ịkwụwa aka ọtọ kemgbe ahụ.

“N’ezie, ibi ndụ nkwụwa aka ọtọ apụtawo na m ga na-akpata ego ka nnọọ nta. Ma ugbu a, enwere m mmetụta na m nwere ọdịnihu, na ndụ m nwere ezi nzube. Aghọtara m na ụzọ ndụ m mbụ na ihe ndị dị oké ọnụ ahịa m nwetara na ya dị nnọọ ka ụlọ e ji ájá uzuzu rụọ bụ́ nke gaje ịdakpọsị n’oge ọ bụla. Na mbụ, akọ na uche m enweghị mmetụta. Ugbu a, n’ihi ọmụmụ Bible m, ọ na-enye m nsogbu mgbe ọ bụla a nwara m ime ihe n’akwụwaghị aka ọtọ—ọbụna n’obere ihe. Ana m agbalị ibi ndụ kwekọrọ n’Abụ Ọma 37:3, bụ́ nke na-asị: ‘Tụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe; biri n’ala, na-azụkwa onwe gị n’ikwesị ntụkwasị obi.’”

“Onye Na-akpọ Iri Ngo Asị Ga-adị Ndụ”

Dị ka Alexander chọpụtara, eziokwu Bible pụrụ ịkpali mmadụ imeri nrụrụ aka. O mere mgbanwe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Pọl onyeozi kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs: “Unu tụpụ mmadụ ochie unu, nke na-emebi emebi n’ụzọ agụụ nke aghụghọ, dị ka ibi obi unu na mbụ si dị; ka e meekwa ka unu dị ọhụrụ ná mmụọ nke uche unu, ka unu yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ. N’ihi nke a, ebe unu tụpụrụ okwu ụgha, na-ekwunụ eziokwu onye ọ bụla n’ebe onye agbata obi ya nọ: n’ihi na anyị na-eburịta ihe dị n’ahụ ibe anyị. Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ: kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe, ka o wee nwee ihe ya na onye nọ ná mkpa ga-eke[rị]ta.” (Ndị Efesọs 4:22–25, 28) Ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ dabeere kpọmkwem ná mgbanwe ndị dị otú ahụ.

Ọ bụrụ na a hapụ ya n’egbochighị ya, anyaukwu na nrụrụ aka pụrụ ibibi ụwa, dị nnọọ ka ha si tụnye ụtụ ná mbibi nke Alaeze Ukwu Rom. Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ adịghị eme atụmatụ ịhapụ ya ka ọ kwụsị n’onwe ya. O kpebiwo “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” (Mkpughe 11:18) Jehova na-ekwekwa ndị na-atụsi anya ụwa nke nrụrụ aka na-adịghị na ya ike nkwa na n’oge na-adịghị anya a ga-enwe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.

N’eziokwu, o nwere ike ghara ịdị mfe ibi ndụ taa n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ nke ịkwụwa aka ọtọ. Ka o sina dị, Jehova na-emesi anyị obi ike na ka oge na-aga, “onye anyaukwu na-ewetara ezinụlọ ya nsogbu, ma onye na-akpọ iri ngo asị ga-adị ndụ.” * (Ilu 15:27, NIV) Site n’ịjụ nrụrụ aka ugbu a, anyị na-egosipụta na obi anyị ziri ezi mgbe anyị na-ekpeku Chineke ekpere, sị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:10.

Ka anyị na-eche ka Alaeze ahụ mee ihe, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ‘ịgha mkpụrụ n’ezi omume’ site n’ịjụ ịnabata ma ọ bụ ikere òkè ná nrụrụ aka. (Hosea 10:12) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ndụ anyị kwa ga-egosipụta ike nke Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Mma agha nke mmụọ nsọ pụrụ imeri nrụrụ aka.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 A gbanwewo aha ya.

^ par. 28 N’ezie, e nwere ọdịiche dị n’etiti iri ngo na ego mmachi akpa. Ebe a na-enye ihe iri ngo iji gbagọọ ikpe ziri ezi ma ọ bụ n’ihi nzube ndị ọzọ na-ezighị ezi, ego mmachi akpa bụ ngosipụta nke obi ekele n’ihi ozi e jeere mmadụ. A kọwara nke a ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ nke dị n’Ụlọ Nche (Bekee) nke October 1, 1986.

[Foto dị na peeji nke 7]

Site n’enyemaka Bible, anyị pụrụ ịzụlite “mmadụ ọhụrụ ahụ” ma jụ nrụrụ aka