Ikele Jehova—Site n’Ozi Oge Nile!
Akụkọ Ndụ
Ikele Jehova—Site n’Ozi Oge Nile!
DỊ KA STANLEY E. REYNOLDS SI KỌỌ
A mụrụ m na London, England, na 1910. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, nne m na nna m kwagara n’otu ime obodo nta dị na Wiltshire nke a na-akpọ Westbury Leigh. Dị ka nwa okoro na-eto eto, ana m echekarị, sị, ‘Ònye bụ Chineke?’ Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịgwa m. Apụghịkwa m ịghọta ma ọlị ihe mere o ji dị ógbè nta dị ka nke anyị mkpa inwe ụlọ ekpere abụọ nakwa otu chọọchị iji fee Chineke.
NA 1935, afọ anọ tupu Agha Ụwa nke Abụọ amalite, mụ na nwanne m nwoke nke m tọrọ, bụ́ Dick, gbaara ịnyịnya ígwè gaa Weymouth n’ụsọ oké osimiri ndịda England maka ezumike ịma ụlọikwuu. Ka anyị nọdụrụ ala n’ụlọikwuu anyị na-anụ ụda mmiri na-ezonụ ma na-eche ihe anyị ga-eme, otu nwa amadị kataworo ahụ letara anyị ma nyefee m akwụkwọ atọ na-enye aka ịmụ Bible—The Harp of God, Light I, na Light II. Anaara m ha, na-enwe obi ụtọ inwetakwanụ ihe ọzọ m ga-eme. Ihe m gụrụ kpaliri mmasị m ozugbo, ma amaghị m n’oge ahụ na ọ ga-agbanwe ndụ m kpam kpam—nakwa nke nwanne m nwoke.
Mgbe m laghachiri ụlọ, nne m gwara m na Kate Parsons, bụ́ onye bi n’obodo anyị, kesara otu ụdị akwụkwọ ahụ e ji amụ Bible. A maara ya nke ọma n’ihi na, n’agbanyeghị na o mewo nnọọ agadi, ọ na-agbara otu obere ọgba tum tum eje eleta ndị mmadụ bisasịrị ebisasị n’ógbè anyị. Agara m ịhụ ya, o jikwa ọṅụ nye m akwụkwọ ndị bụ́ Creation na Riches nakwa mbipụta ndị ọzọ nke Watch Tower Society. Ọ gwakwara m na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.
Mgbe m jisịrị Bible m gụọ akwụkwọ ndị ahụ, amatara m na Jehova bụ ezi Chineke ahụ, m chọkwara ife ya ofufe. Ya mere ezigaara m chọọchị anyị akwụkwọ m ji kwuo na
mụ esoghịzi n’òtù ha ma malite ịga ọmụmụ Bible n’ebe obibi John na Alice Moody. Ha bi na Westbury, bụ́ obodo dị anyị nso karịsịa. Anyị na-adị nanị mmadụ asaa ná nzukọ ndị ahụ. Tupu na mgbe nzukọ gasịrị, Kate Parsons na-akpọ ụbọ ya ka anyị na-eji ikpo ọkụ na-abụkọ abụ Alaeze ọnụ!Oge Ndị Mbụ
Apụrụ m ịhụ na anyị na-ebi n’oge dị mkpa, ọ gụsikwara m agụụ ike ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ e buru n’amụma na Matiu 24:14. Ya mere akwụsịrị m ise siga, zụtara onwe m akpati, ma rara onwe m nye Chineke Ukwu ahụ, bụ́ Jehova.
N’August 1936, Joseph F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society, nọ na-eleta Glasgow, Scotland, iji kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Amagedọn.” N’agbanyeghị na Glasgow ji ihe dị ka kilomita 600 dịpụ adịpụ, ekpebisiri m ike ịnọ n’ebe ahụ na ịbụ onye e mere baptism ná mgbakọ ahụ. Enwere m nanị ntakịrị ego, ya mere eweere m ịnyịnya ígwè m banye n’ụgbọ okporo ígwè na-aga Carlisle, bụ́ obodo dị n’ókèala Scotland, ma sizie ebe ahụ gbara ịnyịnya ígwè m gaa ihe dị ka kilomita 160 n’ime ime ebe ugwu. Agbakwara m ịnyịnya ígwè ebe ka ukwuu n’ụla m, mgbe m lọtara ike gwụsịrị m n’ụzọ anụ ahụ ma e wusiri m ike n’ụzọ ime mmụọ.
Site n’oge ahụ gaa n’ihu, ana m agba ịnyịnya ígwè mgbe ọ bụla m na-aga isoro ndị bi n’obodo nta ndị dị anyị nso kerịta ihe m kweere. N’oge ahụ, Onyeàmà ọ bụla nwere kaadị ịgba àmà bụ́ nke nwere ozi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke ndị nwe ụlọ ga-agụ. Anyị na-ejikwa obere ígwè phonograph eme ihe iji kpọọ okwu ndị dabeere na Bible ndị onyeisi oche Society kwunyere na tepụ. Dị ka a pụkwara ịtụ anya ya, anyị na-ebu akpa magazin, * bụ́ nke na-egosipụta anyị dị ka Ndịàmà Jehova.
Ịsụ Ụzọ n’Oge Agha
E mere nwanne m nwoke baptism na 1940. Agha Ụwa nke Abụọ bidoro na 1939, anyị abụọ hụkwara mkpa dị ngwa e nwere maka ndị nkwusa oge nile. N’ihi ya, anyị dejupụtara akwụkwọ ịsụ ụzọ. Anyị nwere obi ekele ịbụ ndị e kenyekọtara ọrụ n’ebe obibi ndị ọsụ ụzọ dị na Bristol, n’ebe ahụ, anyị sonyeere Edith Poole, Bert Farmer, Tom na Dorothy Bridges, Bernard Houghton, na ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ bụ́ ndị okwukwe ha masịworo anyị eri oge.
Otu obere ụgbọala e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị gbara okpotokpo dekwasị “NDỊÀMÀ JEHOVA” n’akụkụ ya nile bịara n’oge na-adịghị anya iburu anyị. Onye na-anya ya bụ Stanley Jones, bụ́ onye mesịrị ghọọ onye ozi ala ọzọ na China, bụ́kwa onye a tụrụ mkpọrọ n’ime ọnụ ụlọ mkpọrọ ọ nọ
nanị ya ruo afọ asaa n’ihi ọrụ nkwusa ya.Ka agha ahụ gara n’ihu, ọ na-esi ike ka anyị rahụruo ụra n’isi n’abalị. Bọmbụ na-ada gburugburu ebe obibi ndị ọsụ ụzọ anyị, anyị aghaghịkwa ịnọ na nche maka ngwá agha ndị na-amụnye ihe ọkụ ma ha gbawaa. N’otu anyasị, anyị hapụrụ ógbè Bristol mgbe e nwesịrị mgbakọ mara mma nke Ndịàmà 200 bịara ma ruo n’ebe obibi anyị dịtụ nchebe site n’ịgafe ebe mgbọ ndị si n’egbe e ji agbatu ụgbọelu na-awụ n’ala.
N’echi ya mụ na Dick laghachiri n’obodo ahụ iji were ihe ụfọdụ ndị anyị chefuru. Akpata oyi wụrụ anyị n’ahụ. E bibiela Bristol. A gbakasịwo obodo ahụ dum ma rechapụ ya n’ọkụ. Okporo Ámá Park, bụ́ ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dịbu, bụzi ikpo ntụ na-asụ anwụrụ ọkụ. Otú ọ dị, ọ dịghị Onyeàmà ọ bụla e gburu ma ọ bụ merụọ ahụ. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, anyị ebupụworị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma kesaa ha n’ụlọ ndị òtù ọgbakọ anyị. Anyị kelere Jehova n’ihi ihe abụọ ahụ.
Nnwere Onwe A Na-atụghị Anya Ya
Ọgbakọ Bristol bụ́ ebe m jere ozi dị ka onyeisi oche ndị nlekọta etowo ruo ihe dị ka ndị ozi 64 ka ọ na-erule oge m nwetara akwụkwọ maka ije ozi agha. A tụbawo ọtụtụ Ndịàmà ndị ọzọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ha, atụkwara m anya na a ga-anapụtụ m nnwere onwe ime nkwusa n’ụzọ yiri nke ahụ. E gere okwu ikpe m n’otu Ụlọikpe Bristol dị n’ógbè ahụ bụ́ ebe Nwanna Anthony Buck, onye bụbu onye ọrụ ụlọ mkpọrọ, kwuchiteere m. Ọ bụ nwoke nwere obi ike, nke na-adịghị atụ egwu, onye na-akwadosi eziokwu Bible ike, n’ihi ụzọ magburu onwe ya o sikwa nọchite anya m, n’ụzọ a na-atụghị anya ya, a gụpụrụ m kpam kpam n’ije ozi agha nanị ma ọ bụrụ na mụ anọgide n’ozi oge nile m!
Obi tọrọ m ụtọ inwere onwe m, ekpebisikwara m ike iji ya mee nkwusa ruo n’ókè kasịnụ o kwere mee. Mgbe m natara ọkpụkpọ òkù ịbịa n’alaka ụlọ ọrụ dị na London iji soro Albert D. Schroeder, bụ́ onye nlekọta nke alaka ahụ, kwurịta okwu, dị ka o kwesịrị ịdị, echere m echiche banyere ihe na-echere m. Cheedị ihe ijuanya m nwere mgbe a kpọrọ m ịga jee ozi na Yorkshire dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ileta otu ọgbakọ dị iche kwa izu iji nyere ụmụnna aka ma gbaa ha ume. Enwere m nnọọ mmetụta na erughị m eru maka ọrụ dị otú ahụ, ma a gụpụwo m n’ozi agha, e nwekwaara m onwe m ịga. Ya mere anakweere m nduzi Jehova ma jiri ọchịchọ obi gaa.
Albert Schroeder kọwaara ụmụnna ahụ onye m bụ n’otu mgbakọ e nwere na Huddersfield, n’April 1941 kwa, amalitere m ọrụ ọhụrụ e kenyere m. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịmara ezigbo ụmụnna ndị ahụ! Ịhụnanya na obiọma ha mere ka m ghọta ọbụna karị na Jehova nwere ndị raara onwe ha nye ya kpam kpam bụ́ ndị hụrụ ibe ha n’anya.—Jọn 13:35.
Inwekwu Ihe Ùgwù Ije Ozi
E nwere otu mgbakọ mba a na-apụghị ichefu echefu nke were ụbọchị ise na 1941 n’Ụlọ Ezumezu De Montfort nke dị na Leicester. N’agbanyeghị ụkọ nri na mmachi a machiri ime njem ná mba ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ rịrị elu na Sunday ruo ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 12,000; ma, n’oge ahụ e nwere nanị ihe ji nke nta karịa Ndịàmà 11,000 ná mba ahụ. A kpọrọ okwu ndị onyeisi oche Society kwunyere na tepụ, e wepụtakwara akwụkwọ bụ́ Children. Mgbakọ ahụ bụ n’ezie oge dị ịrịba ama n’akụkọ ọchịchị Chineke nke ndị Jehova nọ na Britain, bụ́ nke e nwere n’etiti Agha Ụwa nke Abụọ dị ka a pụrụ isi kwuo ya.
N’oge na-adịghị anya e nwesịrị mgbakọ a, a kpọrọ m ije ozi n’ezinụlọ Betel nke London. N’ebe ahụ, arụrụ m ọrụ ná ngalaba nzipụ akwụkwọ nakwa ná ngalaba nkechi akwụkwọ, e mesịakwa m rụọ n’ọfịs, na-ahụ banyere ihe ndị metụtara ọgbakọ dị iche iche.
Ezinụlọ Betel ahụ aghaghị ịnagide mwakpo a na-eji ụgbọelu eme na London ehihie na abalị, nakwa nnyocha ndị ọchịchị na-eme n’esepụghị aka n’ebe ụmụnna nwere ibu ọrụ bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ nọ. A tụbachara Pryce Hughes, Ewart Chitty, na Frank Platt n’ụlọ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ha, n’ikpeazụ kwa a gbaara Albert Schroeder ụgbọ nwa mkpi gaa United States. N’agbanyeghị nrụgide ndị a nile, a nọgidere na-elekọta ọgbakọ dị iche iche na ọdịmma Alaeze ahụ anya nke ọma.
Agaa M Gilead!
Mgbe agha ahụ biri na 1945, etinyere m akwụkwọ maka ịnara ọzụzụ dị ka onye ozi ala ọzọ na Watchtower Bible School of Gilead, a nabatakwara m na klas nke asatọ na 1946. Society mere ndokwa ka ọtụtụ n’ime anyị, gụnyere Tony Attwood, Stanley Jones, Harold King, Don Rendell, na Stanley Woodburn, jiri ụgbọ mmiri si n’ọdụ ụgbọ mmiri a na-akụ azụ̀ na Fowey, gaa. Otu Onyeàmà bi n’ógbè ahụ denyere aha anyị iso otu obere ụgbọ mmiri na-ebu ibu bụ́ nke bu ụrọ. Ebe anyị nọ n’ụgbọ ahụ dị nnọọ mkpagide, mmiri na-ejupụtakarịkwa na ya. Lee ahụ efe anyị nwere mgbe anyị rutere n’ọdụ ụgbọ mmiri anyị ga-esi banye, bụ́ Philadelphia!
Ogige ụlọ akwụkwọ Gilead ahụ dị n’ebe mara mma na South Lansing nke dị n’ebe ugwu New York, ejikwa m ọzụzụ m natara n’ebe ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu. Ụmụ akwụkwọ nọ na klas anyị si ná mba 18 bịa—bụ́ nke mbụ ya Society debatụworo aha ọtụtụ ndị ozi si n’ala ọzọ—anyị nile ghọkwara ezi ndị enyi. Anụrụ m ụtọ mkpakọrịta nke onye mụ na ya bi n’otu ọnụ ụlọ nke ukwuu, bụ́ Kalle Salavaara nke si Finland.
Oge gafere ngwa ngwa, ná ngwụsị nke ọnwa ise kwa, onyeisi oche Society, bụ́ Nathan H. Knorr, si n’isi ụlọ ọrụ Brooklyn bịa iji nye anyị diplọma anyị na iji gwa anyị ebe e kenyere anyị ọrụ. N’oge ahụ, ụmụ akwụkwọ adịghị ama ebe ha ga-aga ruo mgbe e kwupụtara ha n’oge ememe ngụsị akwụkwọ. E kenyere m ọrụ ịlaghachi na Betel London iji nọgide na-arụ ọrụ m n’ebe ahụ.
Alaghachi M London
Afọ ndị sochiri agha ahụ siri ike na Britain. Nri na ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa, gụnyere akwụkwọ, nọgidere bụrụ ndị a na-enweta ntakịrị ntakịrị. Ma anyị nọgidere na-agbalị, ọdịmma Alaeze Jehova gakwara n’ihu. Tụkwasị n’ịrụ ọrụ na Betel, ejere m ozi ná mgbakọ distrikti na sekit dị iche iche ma leta ọtụtụ ọgbakọ, gụnyere ụfọdụ dị na Ireland. Ọ bụkwa ihe ùgwù izute Erich Frost na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ọzọ si Europe nakwa ịmata site n’aka ha ihe banyere iguzosi ike n’ezi ihe nke Ndịàmà ibe anyị bụ́ ndị cheworo ọnọdụ ndị dị egwu nke ogige ịta ahụhụ ndị Nazi ihu. Ozi Betel bụ n’ezie ihe ùgwù na-enye ọṅụ.
Ruo afọ iri, amawo m Joan Webb, bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche nke na-eje ozi na Watford, bụ́ obodo dị kpọmkwem n’ebe ugwu London. Na 1952 anyị lụrụ. Anyị abụọ chọrọ ịnọgide n’ozi oge nile, n’ihi ya obi tọrọ anyị ụtọ mgbe a họpụtara m dị ka onye nlekọta sekit n’oge m hapụsịrị Betel. Sekit mbụ anyị bụ n’ogologo ụsọ oké osimiri nke ndịda England, nke dị na Sussex na na Hampshire. Ọrụ sekit adịghị mfe n’oge ahụ. Anyị na-eji bọs, ịnyịnya ígwè, na ụkwụ eme njem n’ụzọ bụ́ isi. Ọtụtụ ọgbakọ nwere ókèala buru ibu ndị dị n’ime ime obodo, bụ́ ndị na-esikarị ike iru, ma ọnụ ọgụgụ Ndịàmà nọgidere na-amụba n’esepụghị aka.
New York City na 1958
Na 1957, enwetara m ọkpụkpọ òkù ọzọ si na Betel: “Ọ̀ ga-amasị gị ịbịa n’ọfịs ma nye aka Ọrụ 2:41.
ná ndokwa maka ime njem maka mgbakọ mba nile a ga-enwe n’Ámá Egwuregwu Yankee na Polo Grounds dị na New York City na 1958?” N’oge na-adịghị anya mụ na Joan ji ọrụ n’aka n’ịhụ banyere akwụkwọ ndị ụmụnna dejupụtara maka iso ụgbọelu na ụgbọ mmiri ndị Society kwụrụ ụgwọ iji ha mee ihe. Nke a mesịrị bụrụ Mgbakọ Mba Nile nke Ime Ihe Chineke Na-achọ bụ́ nke wuru ewu, nke ọnụ ọgụgụ buru ibu dị 253,922 bịara. Ná mgbakọ a, mmadụ 7,136 gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Jehova site na baptism ime mmiri—ihe karịrị nnọọ okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ahụ e mere baptism n’ihe omume ahụ mere ihe akụkọ nke Pentikọst 33 O.A., dị ka a kọrọ ya na Bible.—Mụ na Joan agaghị echefu ma ọlị obiọma nke Nwanna Knorr mgbe o ji aka ya kpọọ anyị ịga mgbakọ ahụ iji nye aka ilekọta ndị ga-abịa mgbakọ ahụ bụ́ ndị ga-esi n’ala 123 bịarute New York City. Nke ahụ bụụrụ anyị abụọ ahụmahụ na-enye obi ụtọ na afọ ojuju.
Ngọzi nke Ozi Oge Nile
Ozugbo anyị lọghachiri, anyị nọgidere n’ọrụ njegharị ruo mgbe nsogbu ahụ ike bilitere. E nyere Joan àkwà n’ụlọ ọgwụ, enwekwara m ọrịa strok na-adịchaghị njọ. Anyị gafere n’ọsụ ụzọ pụrụ iche ma mesịa nwee ihe ùgwù nke ije ozi n’ọrụ sekit ọzọ ruo nwa oge. N’ikpeazụ, anyị laghachiri na Bristol bụ́ ebe anyị nọgideworo n’ozi oge nile. Nwanne m nwoke, bụ́ Dick, na ezinụlọ ya bidewere anyị, mgbe mgbe anyị na-akọrịtakwa ahụmahụ ndị anyị nweworo.
Enwere m nsogbu anya na-enweghị mmekwata na 1971. Kemgbe ahụ, enwewo m ihe isi ike dị ukwuu n’ịgụ ihe, ya mere tepụ ndị a gụbanyere akwụkwọ ndị e ji amụ Bible na ha bụụrụ m onyinye dị egwu sitere n’aka Jehova. Mụ na Joan ka na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, n’ọtụtụ afọ ndị gafewokwaranụ, anyị enwewo ihe ùgwù inyere ihe dị ka mmadụ 40 aka ịmata eziokwu ahụ, gụnyere otu ezinụlọ nke mmadụ asaa mejupụtara.
Mgbe anyị raara ndụ anyị nye Jehova n’ihe karịrị afọ 60 gara aga, ọchịchọ anyị bụ ịbanye n’ozi oge nile ma nọgide na ya. Lee ekele anyị nwere ịbụ ndị ka nwere ikike ijere Jehova Ukwu ahụ ozi—nanị ụzọ anyị pụrụ isi kelee ya maka ịdị mma ya n’ebe anyị nọ nakwa maka ọtụtụ afọ anyị nwekọworo obi ụtọ ọnụ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Akpa e ji ákwà kwaa bụ́ nke a pụrụ ịnyara n’ubu bụ́kwa nke a kwara iji na-etinye Ụlọ Nche na Consolation (nke mesịrị bụrụ Teta!).
[Foto dị na peeji nke 25]
Mụ na nwanne m nwoke bụ́ Dick (n’isi isi aka ekpe; Dick guzo ọtọ) na ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ ka anyị guzo n’ihu ebe obibi ndị ọsụ ụzọ dị na Bristol
[Foto dị na peeji nke 25]
Ebe obibi ndị ọsụ ụzọ dị na Bristol na 1940
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Stanley na Joan Reynolds n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha, January 12, 1952, nakwa taa