Jehova Ka Obi Anyị Ukwuu
Jehova Ka Obi Anyị Ukwuu
“IHE na-atọ Jehova ụtọ bụ ndị na-atụ egwu Ya,” ka ọbụ abụ ahụ dere. N’ezie, Onye Okike na-enwe aṅụrị n’ikiri nke ọ bụla n’ime ndị ohu ya bụ́ ụmụ mmadụ ka ha na-agbalịsi ike idebe ụkpụrụ ezi omume ya. Chineke na-agọzi ndị ya na-eguzosi ike n’ihe, na-agba ha ume, na-akasikwa ha obi mgbe ha nwere obi nkoropụ. Ọ maara na ndị na-efe ya ofufe ezughị okè, ya mere ihe ọ na-atụ anya ya n’aka ha bụ ihe ha ga-emeli.—Abụ Ọma 147:11.
E nwere ike ọ gaghị esiri anyị ike ikwere na Jehova nwere ịhụnanya dị ukwuu n’ebe ndị ohu ya n’ozuzu ha nọ. Otú ọ dị, ụfọdụ yiri ka ha na-echegbubiga onwe ha ókè banyere emezighị emezi ha nke na ha kwenyesiri ike na ọ dịghị mgbe Jehova pụrụ ịhụ ha n’anya. “Ezutụghị m okè ma ọlị nke Jehova ịhụ m n’anya,” ka ha pụrụ ikwubi. N’ezie, anyị nile na-enwe mmetụta na-ezighị ezi site n’oge ruo n’oge. Ma o yiri ka ụfọdụ ndị hà na-alụso mmetụta nke ịbụ ndị na-abaghị n’ihe ọgụ mgbe nile.
Inwe Nkụda Mmụọ
N’oge Bible, ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwere oké nkụda mmụọ. Job kpọrọ ndụ asị ma chee na Chineke agbahapụla ya. N’otu oge, Hana, bụ́ onye ghọrọ nne Samuel, nwere oké obi erughị ala n’ihi amụtaghị nwa ya, ọ kwakwara Abụ Ọma 38:6; 1 Samuel 1:7, 10; Job 29:2, 4, 5; Ndị Filipaị 2:25, 26.
ákwá nke ukwuu. Devid ‘rudara nke ukwuu,’ obi lọkwara Epafrọdaịtọs mmiri n’ihi na akụkọ banyere ọrịa ya wutere ụmụnna ya.—Gịnị banyere ndị Kraịst taa? Ikekwe nrịanrịa, ịka nká, ma ọ bụ ọnọdụ onwe onye ndị ọzọ na-egbochi ụfọdụ ndị imeru ókè ha gaara enwe mmasị imeru n’ozi dị nsọ. Nke a pụrụ iduga ha ikwubi na ha na-emechu Jehova na ndị kwere ekwe ibe ha ihu. Ma ọ bụ ụfọdụ pụrụ ịdị na-ata onwe ha ụta mgbe nile maka ụzọ ndị ha hiere n’oge gara aga, na-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ gbagharala ha. Ikekwe ndị ọzọ bụ́ ndị a zụlitere n’ezinụlọ ndị ihe na-esiri ike kwenyesiri ike na ha ekwesịghị nnọọ ịbụ ndị a ga-ahụ n’anya. Olee otú nke a si ekwe omume?
Ụfọdụ ndị tolitere n’ezinụlọ a na-adịghị ahụkarị mmụọ nke ịhụnanya na ya kama nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, okwu mkparị, na egwu. E nwere ike ọ dịghị mgbe nna ha gosiri ha ịhụnanya miri emi, ọ dịghị mgbe ọ na-achọ ohere iji jaa mma ma gbaa ume, leghara ịda iwu anya ma dị njikere ịgbaghara ọbụna ihie ụzọ ndị dị njọ karị, ịhụnanya ya emeekwa ka ezinụlọ ya dum nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe. Ebe ọ bụ na ọ dịghị mgbe ha nwere nna na-ahụ n’anya n’ụwa, ọ pụrụ isiri ha ike ịghọta ihe ọ pụtara bụ́ inwe Nna nke eluigwe na-ahụ n’anya.
Dị ka ihe atụ, Fritz na-ede, sị: “Àgwà enweghị ịhụnanya nke nna m metụtara m n’ụzọ dị ukwuu n’oge m bụ nwata nakwa n’oge m bụ onye ntorobịa. * Ọ jatụbeghị m mma, enwetụbeghịkwa m mmetụta nke ịbịaru ya nso. N’ezie, ọtụtụ mgbe, ana m atụ ya ụjọ.” N’ihi ya, Fritz, bụ́ onye nọ n’afọ ndị nke 50 ya, ka na-enwe mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru. Margarette kwa na-akọwa, sị: “Ndị mụrụ m adịghị egosipụta mmetụta, ha adịghịkwa ahụ n’anya. Mgbe m malitere ịmụ Bible, o siiri m ike ichetụdị n’echiche ihe nna na-ahụ n’anya dị ka ya.”
Mmetụta ndị dị otú ahụ, n’agbanyeghị ihe kpatara ha, pụrụ ịpụta na ọ bụghị ịhụnanya bụ isi ihe na-akwali anyị mgbe ụfọdụ ijere Chineke ozi kama, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, ọ bụ obi amamikpe ma ọ bụ egwu. Ihe nile anyị pụrụ ime adịghị mgbe ọ na-eyi ihe na-enye afọ ojuju. Ọchịchọ ime ihe na-atọ Jehova na ndị kwere ekwe ibe anyị ụtọ pụrụ ime ka anyị chee na anyị enweghị ike imeru ókè anyị kwesịrị imeru. N’ihi ya, anyị nwere ike ghara iru ihe mgbaru ọsọ anyị, na-ata onwe anyị ụta, ma na-enwe nkụda mmụọ.
Gịnị ka a pụrụ ime? Ikekwe ọ dị anyị mkpa ichetara onwe anyị otú Jehova nweruru afọ ọma. Otu onye nke ghọtara akụkụ ịhụnanya a nke àgwà Chineke bụ Jọn onyeozi.
“Chineke Ka Obi Anyị Ukwuu”
N’ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ O.A., Jọn degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ, sị: “N’ime nke a ka anyị ga-amara na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ, meekwa ka obi anyị kwenye ekwenye n’ihu Ya, n’ihe ọ bụla nke obi anyị na-ama anyị ikpe n’ime ya; n’ihi na Chineke ka obi anyị ukwuu, Ọ makwaara ihe nile.” N’ihi gịnị ka Jọn ji dee okwu ndị a?—1 Jọn 3:19, 20.
Jọn maara nke ọma na ọ ga-ekwe omume bụ́ ohu Jehova inwe obi amamikpe. Ikekwe Jọn n’onwe ya enwewo mmetụta dị otú ahụ. Ebe Jọn bụ nwa okorobịa nwere obi ọkụ, Jisọs Kraịst gbaziri ya mgbe ụfọdụ n’ihi ịkatọkarị ndị ọzọ. N’ezie, Jisọs nyere Jọn na nwanne ya nwoke bụ́ Jemes “[ùtú] aha [bụ́] Boanajis, nke bụ́, Ụmụ egbe eluigwe.”—Mak 3:17; Luk 9:49–56.
N’ime afọ 60 sochirinụ, Jọn weturu obi ma ghọọ onye Kraịst nwere ezi nguzo, nke na-ahụ n’anya ma nwee obi ebere. Dị ka onye ịkpeazụ nwụrụnụ n’etiti ndị ozi, ka ọ na-erule oge o dere akwụkwọ ozi mbụ o dere n’ike mmụọ nsọ, ọ maara na Jehova adịghị ajụ onye nke ọ bụla n’ime ndị ohu ya ajụjụ maka nke ọ bụla n’iwu nile ọ dara. Kama nke ahụ, ọ bụ Nna na-ahụ n’anya, onye nwere afọ ọma, na-emesapụ aka, nweekwa ọmịiko, onye nwere ịhụnanya miri emi n’ebe ndị nile hụrụ ya n’anya ma na-efe ya ofufe n’eziokwu nọ. Jọn dere, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.
Jehova Na-aṅụrị Ọṅụ n’Ozi Anyị Na-ejere Ya
Chineke maara adịghị ike ndị anyị bu pụta ụwa, ọ na-ebukwa ha n’uche. “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá Abụ Ọma 103:14.
ka anyị bụ,” ka Devid dere. Jehova na-aghọta mmetụta nzụlite anyị na-enwe n’ime ka anyị bụrụ ihe anyị bụ. N’ezie, ọ maara anyị nnọọ karịa otú anyị maara onwe anyị.—Ọ maara na ọtụtụ n’ime anyị ga-enwe mmasị ịdị iche, ma anyị enweghị ike imeri ezughị okè anyị. A pụrụ iji ọnọdụ anyị tụnyere nke Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme.” Anyị nile na-agba otu mgba ahụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, nke a pụrụ ime ka anyị nwee obi amamikpe.—Ndị Rom 7:19.
Na-echeta nke a mgbe nile: Otú Jehova si ele anyị anya dị mkpa karịa otú anyị si ele onwe anyị anya. Mgbe ọ bụla ọ hụrụ ka anyị na-agbalị ime ihe na-atọ ya ụtọ, ọ na-emeghachi omume ọ bụghị nanị site n’inwe obere afọ ojuju kama site n’inwe aṅụrị. (Ilu 27:11) Ọ bụ ezie na ihe anyị rụzuru pụrụ iyi ihe dị nnọọ nta n’anya anyị, njikere anyị dị na ezi ebumnobi anyị na-atọ ya ụtọ. Ọ na-ele anya gabiga ihe anyị na-arụzu; ọ na-aghọta ihe anyị chọrọ ime; ọ maara ọchịchọ anyị dị iche iche. Jehova pụrụ ịma ihe dị anyị n’obi.—Jeremaịa 12:3; 17:10.
Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova bụ ndị na-eme ihere na ndị na-adịkarịghị ekwu okwu site n’ọmụmụ, mmadụ ndị na-adịghị achọ ka a na-ekiri ha. Ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ pụrụ ịbụrụ ndị dị otú ahụ ihe ịma aka na-eyi egwu. Ma, n’ịbụ ndị ọchịchọ ijere Chineke ozi na inyere ndị agbata obi ha aka kpaliri, ọbụna ndị na-eme ihere na-amụta ịgakwuru ndị agbata obi ha ma gwa ha banyere Bible. Ọ pụrụ ịdị ha ka hà na-arụzu ihe dị nta, nke a pụkwara ịnapụ ha ọṅụ ha. Obi ha pụrụ ịgwa ha na ozi ihu ọha ha erughị mgbalị ha na-etinye na ya. Ma Jehova na-aṅụrị ọṅụ n’ezie n’ihi oké mgbalị mmadụ ndị dị otú ahụ na-etinye n’ozi ha. Ọzọkwa, ha apụghị ijide n’aka ebe na mgbe mkpụrụ eziokwu ha ghara ga-epu, tolite, ma mịa mkpụrụ.—Eklisiastis 11:6; Mak 12:41–44; 2 Ndị Kọrint 8:12.
Ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà na-arịa ọrịa na-adịghị ala ngwa ngwa ma ọ bụ bụrụ ndị na-eme agadi. Ịgachi nzukọ anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụrụ ịbụrụ ha ihe ahụ mgbu na nchegbu jupụtara. Ige ntị n’okwu metụtara ọrụ nkwusa pụrụ ichetara ha ihe ha na-emebu na ihe ha ka chọrọ ime, ọ bụ ezie na ọrịa na-adọla ha azụ. Ndị dị otú ahụ pụrụ inwe oké obi amamikpe n’ihi na ha apụghị ịgbaso ndụmọdụ ahụ ruo n’ókè ha ga-enwe mmasị ịgbaso ya. Ma, Jehova ji nguzosi ike n’ihe na ntachi obi ha akpọrọ ihe n’ezie. Ọ bụrụhaala na ha anọgide na-eguzosi ike n’ihe, ọ dịghị echefu ikwesị ntụkwasị obi ha.—Abụ Ọma 18:25; 37:28.
‘Mee Ka Obi Anyị Kwenye’
Ka ọ na-erule oge Jọn mere agadi, ọ ghaghị ịghọtawo ihe dị ukwuu banyere afọ ọma Chineke. Cheta na o dere, sị: “Chineke ka obi anyị ukwuu, Ọ makwaara ihe nile.” Ọzọkwa, Jọn gbara anyị ume ‘ime ka obi anyị kwenye.’ Gịnị ka Jọn bu n’uche site n’okwu ndị ahụ?
Dị ka Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words si kwuo, okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “mee ka e kwenye” pụtara “inweta nkwado, ime ka e kwenye.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, iji mee ka obi anyị kwenye, ọ dị anyị mkpa inweta nkwado nke obi anyị, ime ka o kwere na Jehova hụrụ anyị n’anya. N’ụzọ dị aṅaa?
Fritz, bụ́ onye a kpọtụburu aha n’isiokwu a ejewo ozi dị ka okenye n’otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova ruo ihe karịrị afọ 25, ọ chọpụtawokwa na ọmụmụ ihe onwe onye pụrụ ime ka obi ya kwenyeghachi na Jehova hụrụ ya n’anya. “Ana m eji nlezianya amụchi Bible na mbipụta anyị dị iche iche anya. Nke a na-enyere m aka ịghara ịdị na-eche banyere ihe ndị gara aga kama nke ahụ ọ na-enyere m aka ịnọgide na-ahụ ọdịnihu anyị dị ebube nke ọma. Mgbe ụfọdụ, ihe ndị m mere n’oge gara aga adịghị enye m ọnụ okwu, ana m echekwa na
Chineke apụghị ịhụ m n’anya mgbe ọ bụla. Ma, n’ozuzu, ana m achọpụta na ịmụchi ihe anya na-ewusikwu obi m ike, na-amụba okwukwe m, na-enyekwara m aka ịnọgide na-enwe ọṅụ na ezi nguzo.”N’eziokwu, e nwere ike ọgụgụ Bible na ntụgharị uche agaghị agbanwe ọnọdụ anyị kpọmkwem. Ma, ọ pụrụ ịgbanwe otú anyị si ele ọnọdụ anyị anya. Iburu echiche ndị sitere n’Okwu Chineke n’obi na-enyere anyị aka iche echiche otú o si eche. Ọzọkwa, ọmụmụ ihe na-enyere anyị aka ito eto ná nghọta nke afọ ọma Chineke. Anyị pụrụ iji nke nta nke nta kwere na Jehova adịghị ata anyị ụta maka ebe anyị nọ tolite, ọ dịghịkwa ata anyị ụta maka ahụ esighị ike anyị. Ọ maara na ibu arọ ọtụtụ n’ime anyị bu—ma hà bụ́ nke mmetụta uche ma hà bụ́ nke anụ ahụ—adịghị esikarị anyị n’aka, ọ na-ejikwa ịhụnanya eburu nke a n’uche.
Gịnị banyere Margarette, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite? Mgbe ọ matara Jehova, ịmụ Bible bakwaara ya onwe ya uru dị ukwuu. Dị ka Fritz, ọ ghaghị ịgbanwe echiche o nwere banyere onye bụ́ nna. Ekpere nyeere Margarette aka ịchịkọta ihe ndị ọ mụtara site n’ịmụ ihe. “Iji malitegodị, eweere m Jehova dị ka ezigbo enyi m, ebe ọ bụ na enwere m ahụmahụ ka ukwuu n’ebe ndị enyi na-ahụ n’anya nọ karịa n’ebe nna na-ahụ n’anya nọ. Nke nta nke nta, amụtara m ịkọrọ Jehova mmetụta m, obi abụọ m, nchegbu m, na nsogbu m. Agwara m ya okwu ugboro ugboro n’ekpere, n’otu oge ahụ na-ejikọta ihe ọhụrụ nile m na-amụta banyere ya, dị ka e si adụ ákwà. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, mmetụta m nwere n’ebe Jehova nọ tolitere ruo n’ókè nke na adịghịzi m enwekebe nsogbu iwere ya dị ka Nna m na-ahụ n’anya,” ka Margarette na-ekwu.
Ntọhapụ Pụọ ná Nchegbu Nile
Ruo ogologo oge ajọ usoro ihe ochie a ga-adịru, ọ dịghị onye pụrụ ịtụ anya inwere onwe ya pụọ ná nchegbu. Nye ụfọdụ ndị Kraịst, nke a pụtara na mmetụta nke nchegbu ma ọ bụ obi abụọ pụrụ ịmaliteghachi ma mee ka ha nwee obi erughị ala. Ma anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova maara ezi ebumnobi na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ijere ya ozi. Ọ dịghị mgbe ọ ga-echezọ ịhụnanya anyị na-egosi n’ebe aha ya dị.—Ndị Hibru 6:10.
N’ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ nke Alaeze Mesaịa ga-achị, mmadụ nile na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ịtụ anya ịbụ ndị a tọhapụrụ pụọ n’ibu arọ nile nke usoro ihe Setan. Lee ahụ efe nke ahụ ga-abụ! Mgbe ahụ anyị ga-ahụ ọbụna ihe àmà ka ukwuu nke otú Jehova dịruru n’afọ ọma. Tupu oge ahụ eruo, ka anyị nile kwenye na “Chineke ka obi anyị ukwuu, Ọ makwaara ihe nile.”—1 Jọn 3:20.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 A gbanwewo aha ndị ahụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]
Jehova abụghị onye ọchịchị nchịgbu kama ọ bụ Nna na-ahụ n’anya, nke nwere afọ ọma, nweekwa ọmịiko
[Foto dị na peeji nke 31]
Ịmụ Okwu Chineke na-enyere anyị aka iche echiche otú o si eche