Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nụrụ Ihe Mmụọ Nsọ Nwere Ikwu

Nụrụ Ihe Mmụọ Nsọ Nwere Ikwu

Nụrụ Ihe Mmụọ Nsọ Nwere Ikwu

“Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.”—AỊSAỊA 30:21.

1, 2. Olee ụzọ Jehova siworo na-agwa ụmụ mmadụ okwu n’akụkọ ihe mere eme nile?

ÀGWÀETITI Puerto Rico bụ ebe otu teliskop redio nke nwere otu ihu mbadamba na-eweta ụzarị ozi bụ́ nke kasị ukwuu na nke kasị enweta ozi n’ụwa dị. Ruo ọtụtụ iri afọ, ndị ọkà mmụta sayensị anọwo na-enwe olileanya iji ígwè ọrụ a buru ibu nweta ozi sitere n’ihe ndị dị ndụ bụ́ ndị na-anọghị na mbara ụwa anyị. Ma ha enwetatụbeghị ozi dị otú ahụ. Otú ọ dị, n’ụzọ na-emegide onwe ya, e nwere ozi ndị doro anya sitere n’ógbè na-abụghị nke ụmụ mmadụ bụ́ ndị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inweta mgbe ọ bụla—n’ejighị ngwá ọrụ dị mgbagwoju anya. Ozi ndị a sitere n’Isi Iyi dị nnọọ elu karịa ógbè ọ bụla na-abụghị mbara ụwa anyị nke a pụrụ ichetụdị n’echiche. Ònye bụ Isi Iyi nke ozi ndị dị otú ahụ, oleekwa ndị na-enweta ha? Gịnị ka ozi ndị ahụ na-ekwu?

2 Bible nwere ihe ndekọ dị iche iche nke oge ndị mmadụ jiri ntị ha nụ ozi ndị sitere n’ọnụ Chineke. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ndị mmụọ e kere eke bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ozi Chineke, ziri ozi ndị a. (Jenesis 22:11, 15; Zekaraịa 4:4, 5; Luk 1:26–28) Ugboro atọ, a nụrụ olu Jehova n’onwe ya. (Matiu 3:17; 17:5; Jọn 12:28, 29) Chineke sikwa n’ọnụ ndị amụma bụ́ ụmụ mmadụ kwuo okwu, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha deturu ihe ọ gwara ha ka ha kwuo. Taa, anyị nwere Bible, bụ́ nke na-agụnye ihe ndekọ nke ọtụtụ n’ime okwu ndị a, tinyere ozizi Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya. (Ndị Hibru 1:1, 2) N’ezie, Jehova anọwo na-enye ihe o kere eke bụ́ mmadụ ihe ọmụma.

3. Nzube dị aṅaa ka Chineke ji ezi ozi ya, gịnịkwa ka a na-atụ anya ya n’aka anyị?

3 Ozi nile a sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke na-ekpughe ihe dị nta banyere eluigwe na ala nkịtị. Ha na-elekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa, bụ́ ndị metụtara ndụ anyị ugbu a nakwa n’ọdịnihu. (Abụ Ọma 19:7–11; 1 Timoti 4:8) Jehova na-eji ha eme ihe ịgwa anyị uche ya na inye anyị nduzi ya. Ha bụ otu ụzọ okwu Aịsaịa onye amụma si na-emezu: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:21) Jehova adịghị amanye anyị ige ntị ‘n’okwu’ ya. Ọ dị anyị n’aka ịgbaso nduzi Chineke na ije ije n’ụzọ ya. N’ihi ya, Akwụkwọ Nsọ na-adụ anyị ọdụ ige ntị n’ihe Jehova na-ekwu. N’akwụkwọ Mkpughe, agbamume bụ́ ‘nụ ihe Mmụọ Nsọ [na-ekwu]’ pụtara ugboro asaa.—Mkpughe 2:7, 11, 17, 29; 3:6, 13, 22.

4. Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya n’oge anyị ịtụ anya ka Chineke si n’eluigwe kpọmkwem gwa anyị okwu?

4 Taa, Jehova adịghị agwa anyị okwu kpọmkwem site n’ógbè eluigwe. Ọbụna n’oge Bible, a dịghị anụkebe nkwurịta okwu a karịrị nke mmadụ, mgbe ụfọdụ ọ na-ewe ọtụtụ narị afọ tupu a nụ ya. N’akụkọ ihe mere eme nile, Jehova agwawo ndị ya okwu mgbe mgbe n’ụzọ ndị na-apụtachaghị ìhè. Otú ahụ ka ọ dị n’oge anyị. Ka anyị tụlee ụzọ atọ Jehova si agwa anyị okwu taa.

“Ihe Ọ Bụla E Deworo n’Akwụkwọ Nsọ Bụ Ihe Si n’Obi Chineke Pụta”

5. Olee ngwá ọrụ bụ́ isi Jehova ji agwa ndị mmadụ okwu taa, oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru na ya?

5 Bible bụ ngwá ọrụ bụ́ isi Chineke ji agwa ụmụ mmadụ okwu. O si n’obi Chineke pụta, ihe nile dị n’ime ya pụkwara ịbara anyị uru. (2 Timoti 3:16) Ihe atụ nke mmadụ ndị dịrị adị n’ezie bụ́ ndị ji nnwere onwe ime nhọrọ ha mee ihe n’ikpebi ma hà ga-ege ntị n’olu Jehova ma ọ bụ na ha agaghị ege ntị na ya, jupụtara n’ime Bible. Ihe atụ ndị dị otú ahụ na-echetara anyị ihe mere o ji dị mkpa ige ntị n’ihe mmụọ Chineke na-ekwu. (1 Ndị Kọrint 10:11) Bible bukwa ezi amamihe, na-enye anyị ndụmọdụ maka mgbe mkpebi dị iche iche na-eche anyị ihu ná ndụ. Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na Chineke kwụ anyị n’azụ, na-agwa anyị, sị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.”

6. Gịnị mere Bible ji dị nnọọ elu karịa ihe odide nile ọzọ?

6 Iji nụ ihe mmụọ nsọ na-ekwu site na Bible, anyị aghaghị ịgụchi ya anya. Bible abụghị nanị akwụkwọ e dere nke ọma, nke na-ewu ewu, bụ́ otu n’ime ọtụtụ akwụkwọ ndị dịnụ taa. E ji ike mmụọ nsọ dee Bible, ọ bụkwa echiche Chineke dị na ya. Ndị Hibru 4:12 na-ekwu, sị: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izù nile nke obi.” Ka anyị na-agụ Bible, ihe ndị e dere na ya na-adụpu echiche na mkpali anyị dị ka mma agha, na-ekpughe ókè ndụ anyị kwekọruru n’uche Chineke.

7. N’ihi gịnị ka ịgụ Bible ji dị mkpa, ugboro ole ka a na-agbakwa anyị ume ịgụ ya?

7 “Echiche na izù nile nke obi” pụrụ ịgbanwe ka oge na-aga nakwa ka ahụmahụ ndị anyị na-enwe ná ndụ—ma ndị dị mma ma ndị tara akpụ—na-emetụta anyị. Ọ bụrụ na anyị adịghị amụ Okwu Chineke mgbe nile, echiche, àgwà, na mmetụta uche anyị agaghịzi ekwekọ n’ụkpụrụ Chineke. N’ihi ya, Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Na-anwanụ onwe unu, ma ùnu dị n’okwukwe anyị; na-anwapụtanụ onwe unu.” (2 Ndị Kọrint 13:5, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-anụ ihe mmụọ nsọ na-ekwu, anyị kwesịrị ịṅa ntị na ndụmọdụ nke ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị.—Abụ Ọma 1:2.

8. Olee okwu Pọl onyeozi nke na-enyere anyị aka inyocha onwe anyị n’ihe banyere ịgụ Bible?

8 Otu ihe ncheta dị mkpa nye ndị na-agụ Bible bụ nke a: Wepụtanụ oge zuru ezu iji tụgharịa uche n’ihe unu gụrụ! Ná mgbalị ime ihe kwekọrọ na ndụmọdụ nke ịgụ Bible kwa ụbọchị, anyị agaghị achọ ịhụta onwe anyị dị ka ndị na-agụchapụ ọtụtụ isiakwụkwọ ngwa ngwa n’aghọtaghị ihe anyị gụrụ. Ọ bụ ezie na ịgụchi Bible anya dị mkpa, ihe nkwali anyị nwere ekwesịghị ịbụ nanị ịgụru ebe anyị mere atụmatụ ịgụru; anyị kwesịrị inwe ọchịchọ ziri ezi ịmụta banyere Jehova na nzube ya. N’akụkụ a, anyị pụrụ iji okwu Pọl onyeozi mee ihe nke ọma dị ka ihe nnyocha onwe onye. Ka ọ na-edegara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, o kwuru, sị: “[Egburu m] ikpere m abụọ n’ala nye Nna anyị, ka O wee nye unu, . . . ka Kraịst wee site n’okwukwe unu bigide n’ime obi unu; ka unu, ebe unu gbagideworo mkpọrọgwụ n’ime ịhụnanya bụrụkwa ndị a tọworo ntọala n’ime ya, ka unu wee nara ike ịghọta, unu na ndị nsọ nile, ihe bụ́ obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi, na ịmara ịhụnanya Kraịst nke karịrị ọmụma nke ukwuu hie nne, ka e wee mee ka unu zuo ezuo ruo ozuzu nile nke Chineke.”—Ndị Efesọs 3:14, 16–19.

9. Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ọchịchọ ịmụta ihe n’aka Jehova ma mee ka o mikwuo emie?

9 N’eziokwu, ụfọdụ n’ime anyị adịghị enwe mmasị n’ịgụ ihe site n’ọmụmụ, ebe ndị ọzọ na-agụchi ihe anya. Otú ọ dị, n’agbanyeghị àgwà anyị nwere dị ka ụmụ mmadụ n’otu n’otu, anyị pụrụ ịzụlite ọchịchọ ịmụta ihe n’aka Jehova ma mee ka o mikwuo emie. Pita onyeozi kọwara na anyị kwesịrị inwe agụụ maka ihe ọmụma Bible, ọ ghọtakwara na ọchịchọ dị otú ahụ pụrụ ịbụ nke a na-aghaghị ịzụlite azụlite. O dere, sị: “Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike, ka unu wee were ya na-eto eto ruo nzọpụta.” (1 Pita 2:2, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọzụzụ onwe onye dị mkpa ma ọ bụrụ na ‘agụụ ịmụ Bible ga na-agụsi anyị ike.’ Dị nnọọ ka anyị pụrụ ịzụlite mmasị n’ebe nri ọhụrụ dị mgbe anyị riri ya ọtụtụ ugboro, omume anyị n’ebe ịgụ ihe na ịmụ ihe dị pụrụ ịgbanwe n’ụzọ ka mma ma ọ bụrụ na anyị azụọ onwe anyị ịgbaso usoro ime ihe mgbe dum.

‘Nri n’Oge Ya’

10. Olee ndị mejupụtara “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” oleekwa otú Jehova si eji ha eme ihe taa?

10 Jisọs mere ka a mata ụzọ ọzọ Jehova si agwa anyị okwu taa na Matiu 24:45–47. N’ebe ahụ o kwuru banyere ọgbakọ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ—“ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” bụ́ ndị a họpụtara inye ‘nri ime mmụọ n’oge ya.’ Dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, ndị so n’òtù a bụ ndị “ezinụlọ” Jisọs. Ndị a, tinyere “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ, na-enweta agbamume na nduzi. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Ihe ka ukwuu ná nri a a na-enye n’oge ya na-abịa n’ụdị akwụkwọ e biri ebi, dị ka Ụlọ Nche, Teta!, na mbipụta ndị ọzọ. A na-ekesa nri ime mmụọ ndị ọzọ n’ụdị nke okwu ndị a na-ekwu na ihe ngosi ndị a na-eme ná mgbakọ dị iche iche, nakwa ná nzukọ ọgbakọ.

11. Olee otú anyị si egosipụta na anyị na-anụ ihe mmụọ nsọ nwere ikwu site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”?

11 A na-akwadebe ihe ọmụma “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enye iji wusie okwukwe anyị ike ma zụọ ike nghọta anyị. (Ndị Hibru 5:14) A pụrụ inye ndụmọdụ dị otú ahụ n’ebughị otu onye n’obi iji nye onye nke ọ bụla ohere itinye ya n’ọrụ n’onwe ya. Site n’oge ruo n’oge, anyị na-anata ndụmọdụ ndị metụtara kpọmkwem akụkụ ụfọdụ nke omume anyị. Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe ma ọ bụrụ n’ezie na anyị na-ege ntị n’ihe mmụọ nsọ na-ekwu site n’aka òtù ohu ahụ? Pọl onyeozi na-aza, sị: “Na-ekwenyenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha.” (Ndị Hibru 13:17) N’ezie, ndị nile ndokwa a metụtara bụcha ndị ikom na-ezughị okè. Ma, Jehova na-enwe obi ụtọ n’iji ndị ohu ya bụ́ ụmụ mmadụ na-edu anyị na mgbe ọgwụgwụ a, n’agbanyeghị na ha ezughị okè.

Nduzi Sitere n’Akọ na Uche Anyị

12, 13. (a) Olee ihe nduzi ọzọ Jehova nyeworo anyị? (b) Mmetụta dị aṅaa dị mma ka akọ na uche pụrụ inwe ọbụna n’ebe ndị na-enweghị ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke nọ?

12 Jehova enyewo anyị ebe ọzọ anyị si enweta nduzi—akọ na uche anyị. O kenyere n’ime mmadụ ikike nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. Ọ bụ otu n’ime ihe ndị anyị bu pụta ụwa. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl onyeozi kọwara, sị: “Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ ndị na-enweghị iwu na-eme ihe nile dị n’iwu site ka e si mụọ ha, ndị ahụ, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, ma ha onwe ha bụ iwu e nyere onwe ha; n’ihi na ha na-egosi ọrụ iwu na e dewo ya n’obi ha, akọ na uche ha na-esokwa ya na-agba àmà, ihe ha na-atụle n’obi ha n’etiti onwe ha na-ebokwa ha ebubo ma ọ bụ ma eleghị anya na-agọpụ ha.”—Ndị Rom 2:14, 15.

13 Ruo n’ókè ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-amaghị Jehova pụrụ ime ka echiche ha na omume ha kwekọọ n’ụkpụrụ nke ezi ihe na ihe ọjọọ nke Chineke. Ọ dị ka a ga-asị na ha na-anụ ntakịrị olu dị n’ime ha nke na-eduzi ha n’ụzọ ziri ezi. Ọ bụrụ na nke a pụrụ ịdị otú ahụ n’ebe ndị na-enweghị ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke nọ, lee ka olu ahụ dị n’ime kwesịrị isi na-agwa ezi ndị Kraịst okwu karị! N’ezie, akọ na uche onye Kraịst nke e ji ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke nụchaa, nke na-arụkwa ọrụ n’ụzọ kwekọrọ na mmụọ nsọ Jehova pụrụ inye nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi.—Ndị Rom 9:1.

14. Olee otú akọ na uche e ji Bible zụọ pụrụ isi nyere anyị aka ịgbaso nduzi nke mmụọ Jehova?

14 Ezi akọ na uche, bụ́ nke e ji Bible zụọ, pụrụ ichetara anyị ụzọ mmụọ nsọ chọrọ ka anyị na-eje ije na ya. A pụrụ inwe mgbe ọ na-adịghị ihe ma Akwụkwọ Nsọ ma mbipụta anyị ndị dabeere na Bible kwuru kpọmkwem banyere otu ọnọdụ anyị pụrụ ịchọta onwe anyị na ya. Ma, akọ na uche anyị pụrụ ịdọ anyị aka ná ntị megide ihe pụrụ ịbụ ụzọ na-emerụ ahụ. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ileghara ihe akọ na uche anyị na-ekwu anya pụrụ ịpụta, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ileghara ihe mmụọ Jehova na-ekwu anya. N’aka nke ọzọ, site n’ịmụta ịdabere n’akọ na uche ndị Kraịst anyị a zụrụ azụ, anyị pụrụ ime ezi nhọrọ ọbụna mgbe a na-enweghị kpọmkwem ntụziaka e dere ede. Otú ọ dị, ọ dị mkpa iburu n’uche na mgbe a na-enweghị ụkpụrụ, ụkpụrụ nduzi, ma ọ bụ iwu Chineke nyere, ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ịmanye ndị Kraịst ibe anyị ikwenye n’ihe akọ na uche anyị kpebitere n’ihe ndị bụ́ kpam kpam okwu dịịrị onwe onye.—Ndị Rom 14:1–4; Ndị Galetia 6:5.

15, 16. Gịnị pụrụ ime ka akọ na uche anyị ghara ịrụ ọrụ nke ọma, oleekwa otú anyị pụrụ isi gbochie nke ahụ ime?

15 Akọ na uche dị ọcha nke e ji Bible zụọ bụ ezi onyinye sitere n’aka Chineke. (Jemes 1:17) Ma anyị aghaghị ichebe onyinye a pụọ ná mmetụta ndị na-emerụ emerụ ma ọ bụrụ na ọ gaje ịrụ ọrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka ngwá ọrụ na-echebe omume. Omenala, ọdịnala, na àgwà nke ógbè bụ́ ndị na-emegide ụkpụrụ Chineke pụrụ, ọ bụrụ na a gbasoo ha, ime ka akọ na uche anyị ghara ịrụ ọrụ nke ọma, gharakwa iduzi anyị n’ụzọ ziri ezi. Anyị pụrụ ịghọ ndị na-apụghị ime ezi mkpebi, anyị pụkwara ọbụna ịghọgbu onwe anyị gaa n’ikwere na omume ọjọọ dị mma n’ezie.—Tụlee Jọn 16:2.

16 Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eleghara ịdọ aka ná ntị nke akọ na uche anyị anya, olu ya ga na-ebelata ruo mgbe anyị ghọrọ ndị na-adịghịzi enwe mmetụta ma ọ bụ ndị na-akpọ ekwe nkụ n’ụzọ omume. Ọbụ abụ ahụ kwuru banyere ndị dị otú ahụ mgbe ọ sịrị: “Obi ha bụ nanị abụba dị ka abụba.” (Abụ Ọma 119:70) Ndị na-eleghara nduzi nke akọ na uche ha anya adịghịzi enwe ike iche echiche n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ụkpụrụ Chineke adịghịzi eduzi ha, ha apụghịkwa ime mkpebi ndị kwesịrị ekwesị. Iji zere ọnọdụ dị otú ahụ, anyị kwesịrị ịnakwere nduzi nke akọ na uche ndị Kraịst anyị ọbụna mgbe ihe ndị o metụtara yiri ka hà pere mpe.—Luk 16:10.

Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-ege Ntị Ma Na-erube Isi

17. Ka anyị na-ege ntị ‘n’okwu ahụ a na-ekwu n’azụ anyị’ ma na-aṅa akọ na uche anyị e ji Bible zụọ ntị, olee otú a ga-esi gọzie anyị?

17 Ka anyị na-eguzobe ụkpụrụ nke ige ntị ‘n’okwu ahụ a na-ekwu n’azụ anyị’—dị ka a na-ekwu ha site n’Akwụkwọ Nsọ nakwa site n’aka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche—ka anyị na-aṅakwa ntị n’ihe akọ na uche anyị e ji Bible zụọ na-echetara anyị, Jehova ga-eji mmụọ ya gọzie anyị. N’aka nke ya, mmụọ nsọ ga-eme ka ikike anyị nwere ịnụrụ na ịghọta ihe Jehova na-agwa anyị, ka mma.

18, 19. Olee otú nduzi Jehova pụrụ isi baara anyị uru ma n’ozi anyị ma ná ndụ onwe onye anyị?

18 Mmụọ Jehova ga-emekwa ka anyị nwee anyaike iji amamihe na obi ike na-eche ọnọdụ ndị tara akpụ ihu. Dị ka ọ dị n’ihe banyere ndị ozi, mmụọ Chineke pụrụ ịkpali ike uche anyị ma nyere anyị aka mgbe nile ime ihe na ikwu okwu n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. (Matiu 10:18–20; Jọn 14:26; Ọrụ 4:5–8, 13, 31; 15:28) Mmụọ Jehova na mgbalị nke onwe anyị ga-agbakọ aka wetara anyị ihe ịga nke ọma ka anyị na-eme mkpebi ndị dị mkpa ná ndụ, na-enye anyị obi ike imezu mkpebi ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịdị na-atụle idozigharị ụzọ ndụ gị iji wepụtakwuo oge maka ihe ime mmụọ. Ma ọ bụ ị pụrụ iche nhọrọ ndị dị mkpa, bụ́ ndị na-agbanwe ndụ, ihu, dị ka ịhọrọ onye ị ga-alụ, ịtụle ọrụ a chọrọ inye gị, ma ọ bụ ịzụ ụlọ. Kama ikwe ka mmetụta uche anyị dị ka ụmụ mmadụ bụrụ nanị ihe na-eduzi anyị n’ime mkpebi, anyị kwesịrị ige ntị n’ihe mmụọ Chineke nwere ikwu ma mee ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi ya.

19 N’ezie, anyị na-enwe ekele maka ezi ihe ncheta na ndụmọdụ ndị anyị na-enweta site n’aka ndị Kraịst ibe anyị, gụnyere ndị okenye. Otú ọ dị, ọ dịghị anyị mkpa mgbe nile ichere ka ndị ọzọ mee ka anyị mara ihe ụfọdụ. Ọ bụrụ na anyị maara ụzọ amamihe dị na ya ịgbaso na mgbanwe ndị dị mkpa ka anyị mee n’àgwà na n’omume anyị iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, ka anyị mee ha. Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu matara ihe ndị a, ngọzi na-adịrị unu ma a sị na unu na-eme ha.”—Jọn 13:17.

20. Olee ngọzi na-abịara ndị na-ege ntị ‘n’okwu ahụ a na-ekwu n’azụ ha’?

20 N’ụzọ doro anya, iji mara otú ha ga-esi na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ dịghị ndị Kraịst mkpa ịnụ olu nkịtị sitere n’eluigwe, ọ dịghịkwa ha mkpa ịbụ ndị mmụọ ozi letara. Ha bụ ndị a gọziri site n’inwe Okwu Chineke e dere ede na nduzi ịhụnanya sitere n’aka ndị o tere mmanụ nọ n’ụwa. Ọ bụrụ na ha ejiri nlezianya na-aṅa ntị ‘n’okwu a a na-ekwu n’azụ ha’ ma na-agbaso nduzi nke akọ na uche ha e ji Bible zụọ, ha ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ime uche Chineke. E mesịa, ha ga-ahụ n’ezie ka nkwa Jọn onyeozi mezuru: “Onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

Ntụleghachi Dị Mkpirikpi

• Gịnị mere Jehova ji agwa ihe o kere eke bụ́ mmadụ okwu?

• Ànyị pụrụ isi aṅaa rite uru n’usoro ihe omume nke ịgụchi Bible anya?

• Ànyị kwesịrị isi aṅaa meghachi omume ná nduzi sitere n’aka òtù ohu ahụ?

• Gịnị mere anyị na-ekwesịghị iji leghara ihe akọ na uche anyị e ji Bible zụọ na-agwa anyị, anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Ngwá ọrụ dị mgbagwoju anya adịghị mmadụ mkpa iji nweta ozi ndị sitere n’aka Chineke

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’aka Arecibo Observatory/David Parker/Science Photo Library

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Jehova na-agwa anyị okwu site na Bible nakwa site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”