Ndụ Ezinụlọ Obi Ụtọ Adọta Ndị Ọzọ n’Ebe Chineke Nọ
Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ndụ Ezinụlọ Obi Ụtọ Adọta Ndị Ọzọ n’Ebe Chineke Nọ
JEHOVA ji amamihe na nghọta dị ukwuu gọzie Josef. (Ọrụ 7:10) N’ihi ya, nghọta Josef “dị mma n’anya Fero, na n’anya ndị ohu ya nile.”—Jenesis 41:37.
N’otu aka ahụ taa, Jehova na-enye ndị ya nghọta na mmata site n’ọmụmụ ha na-amụ Bible. (2 Timoti 3:16, 17) Amamihe na nghọta a na-amị ezi mkpụrụ ka a na-etinye ndụmọdụ dabeere na Bible n’ọrụ. Ezi àgwà ha ‘na-adị mma mgbe mgbe n’anya ndị na-ahụ ya,’ dị ka ahụmahụ ndị na-esonụ si Zimbabwe na-egosi.
• Otu nwanyị nwere ndị agbata obi bụ́ Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị na o nweghị mmasị n’ebe Ndịàmà ahụ nọ, omume ha masịrị ya, karịsịa ndụ ha na-ebi n’ụlọ. Ọ hụrụ na di na nwunye ahụ nwere mmekọrịta dị mma nakwa na ụmụ ha na-erube isi. Ọ rịbara ama karịsịa na di ahụ hụrụ nwunye ya n’anya nke ukwuu.
Otu nkwenkwe zuru ebe nile n’ụfọdụ ọdịbendị Africa bụ na ọ bụrụ na di ahụ nwunye ya n’anya, ọ ghaghị ịbụ na nwunye ahụ ji ọgwụ “nweta” ya. Ya mere nwanyị ahụ bịakwutere Onyeàmà a bụ́ nwunye ma jụọ ya, sị: “Biko ị̀ ga-enyetụ m ọgwụ ahụ i nyere di gị ka di m wee hụ m n’anya dị ka di gị hụrụ gị?” Onyeàmà ahụ zara, sị: “Eenụ, aga m ewetara gị ya n’ehihie echi.”
N’echi ya, nwanna nwanyị ahụ ji “ọgwụ” ya leta onye agbata obi ya. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ Bible, ya na akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Mgbe ha tụlesịrị ihe ọmụma dị n’akwụkwọ Ihe Ọmụma n’isiokwu bụ́ “Iwulite Ezinụlọ nke Na-asọpụrụ Chineke,” ọ gwara nwanyị ahụ, sị: “Nke a bụ ‘ọgwụ’ mụ na di m na-eji eme ihe iji ‘nweta’ ibe anyị, ọ bụkwa ya mere anyị ji hụ onwe anyị n’anya nke ukwuu.” Ọ maliteere ya ọmụmụ Bible, nwanyị ahụ nwekwara ọganihu ngwa ngwa ruo n’ókè nke igosipụta nrara ọ raara onwe ya nye Jehova site n’ịbụ onye e mikpuru na mmiri.
• Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ e kenyere ọrụ n’otu obere ọgbakọ dị nso n’ókèala ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Zimbabwe na Mozambique, agaghị ozi ụlọ n’ụlọ ruo izu abụọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị mmadụ nọ na-abịakwute ha iji gee ntị n’ihe ha nwere ikwu. Otu n’ime ndị ọsụ ụzọ ahụ na-akọ otú nke a si malite: “Anyị nọ na-eme njem gaa kilomita 15 iji duziere otu onye nwere mmasị ọmụmụ Bible ebe obibi kwa izu. Ọ naghị adịrị anyị mfe iru n’ógbè a. Anyị aghaghị iji ụkwụ gafee apịtị, anyị aghaghịkwa ịgafe mmiri ndị na-ekwo ekwo bụ́ ndị na-eru anyị n’olu. Nke a gụnyere iburu uwe na akpụkpọ ụkwụ anyị n’isi, irufe osimiri ahụ, na iyirizi uwe anyị ọzọ n’ofe nke ọzọ.
“Ịnụ ọkụ n’obi anyị masịrị nnọọ ndị agbata obi nke onye ahụ nwere mmasị. Onye ndú nke otu òtù okpukpe dị n’ógbè ahụ so n’ime ndị ahụ rịbara nke a ama. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Ọ̀ bụ na unu achọghị inwe ịnụ ọkụ n’obi dị ka ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova?’ N’echi ya, ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya bịara n’ebe obibi anyị iji chọpụta ihe mere anyị ji anọgidesi nnọọ ike. Tụkwasị na nke ahụ, ruo izu abụọ sochirinụ, anyị nwetara ọtụtụ ndị ọbịa nke na anyị enweghịdị oge ịkwadebere onwe anyị nri!”
Otu n’ime ndị bịara n’ebe obibi ndị ọsụ ụzọ ahụ n’ime izu abụọ a bụ onye ndú okpukpe ahụ. Cheenụ echiche ọṅụ ndị ọsụ ụzọ a nwere mgbe ọ nakweere ọmụmụ Bible ebe obibi!