N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Nnọọ Oké Nrụrụ Aka?
N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Nnọọ Oké Nrụrụ Aka?
“Anarakwala ihe iri ngo: n’ihi na ihe iri ngo na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, ọ na-emekwa ka okwu ndị ezi omume gbagọọ agbagọọ.”—Ọpụpụ 23:8.
PUKU afọ atọ na narị ise gara aga, Iwu Mosis katọrọ iri ngo. N’ọtụtụ narị afọ gafeworonụ kemgbe ahụ, iwu ndị na-emegide nrụrụ aka amụbawo. Ka o sina dị, iti iwu enwebeghị ihe ịga nke ọma n’ịkwụsị nrụrụ aka. A na-enye ọtụtụ nde ihe iri ngo kwa ụbọchị, ọtụtụ ijeri mmadụ na-atakwa ahụhụ ya.
Nrụrụ aka ejupụtawo nnọọ ebe nile ma bụrụ nke a na-eme n’ụzọ dị mgbagwoju anya nke na ọ na-eyi egwu ibibi ntọala nke ọha mmadụ kpọmkwem. Ná mba ụfọdụ ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị ihe a na-eme eme ọ gwụla ma e nyere ihe iri ngo. Ihe iri ngo e nyere onye kwesịrị ekwesị ga-eme ka mmadụ nwee ike ịgafe ule, inweta laịsensị ọkwọ ụgbọala, ọrụ ngo, ma ọ bụ mee ka o merie n’okwu ikpe. “Nrụrụ aka dị ka oké mmetọ nke na-anyịgbu echiche ndị mmadụ,” ka Arnaud Montebourg, bụ́ ọkàiwu nọ na Paris kwara n’arịrị.
Iri ngo kasị jupụta n’ógbè azụmahịa. Ụlọ ọrụ ụfọdụ na-ewepụta otu ụzọ n’ụzọ atọ nke uru nile ha ritere nanị iji nye ndị isi gọọmenti ihe iri ngo. Dị ka magazin Britain bụ́ The Economist si kwuo, ihe ruru nnọọ pasent 10 n’ime ijeri $25 a na-emefu kwa afọ ná nzụrịta ngwá agha nke mba nile bụ iji nye ndị na-aga ịbụ ndị ahịa ihe iri ngo. Ka ọ̀tụ̀tụ̀ nke nrụrụ aka a rịworo elu n’ụzọ dị ngwa, ihe ndị ọ rụpụtara aghọwo ọdachi. N’ime afọ iri gara aga, e kwuru na usoro akụ̀ na ụba ịdị n’aka ndị nkịtị “n’ụzọ na-ezighị ezi”—omume achụmnta ego ndị rụrụ arụ bụ́ ndị na-agaziri mmadụ ole na ole nọ n’ezi ọnọdụ, ndị nwere mmekọrịta azụmahịa dị mma—ebibiwo ọnọdụ akụ̀ na ụba nke ọtụtụ mba n’ozuzu ha.
N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, ndị na-akasị ata ahụhụ site ná nrụrụ aka na ndakpọ ọnọdụ akụ̀ na ụba ndị ọ na-eweta bụ ndị ogbenye—ndị ọ na-esiri ike ịnọ n’ọnọdụ nke inye onye ọ bụla ihe iri ngo. Dị ka The Economist si kwuo ya n’ụzọ dị nkenke, “nrụrụ aka bụ nanị otu ụdị nke mmegbu.” À pụrụ ịkwụsị ụdị mmegbu a, ka ọ̀ bụ na a pụghị ịgbanahụ nrụrụ aka agbanahụ? Iji zaa ajụjụ ahụ, anyị ga-ebu ụzọ mata isi ihe ụfọdụ na-akpata nrụrụ aka.
Olee Ihe Ndị Na-akpata Nrụrụ Aka?
N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji ahọrọ ịrụrụ aka kama ime ihe n’eziokwu? Nye ụfọdụ ndị, ịrụrụ aka pụrụ ịbụ ụzọ kasị mfe—ma ọ bụ n’ezie nanị otu ụzọ dịnụ—isi nweta ihe ha chọrọ. Mgbe ụfọdụ, ihe iri ngo pụrụ imeghe ụzọ dị nnọọ mfe isi zere ntaramahụhụ. Ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-ahụ na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị uwe ojii, na ndị ọkàikpe yiri ka ha na-eleghara nrụrụ aka anya ma ọ bụ ọbụna na-eme ya n’onwe ha na-agbaso nnọọ ihe nlereanya ha.
Ka nrụrụ aka na-arị elu, ọ na-aghọ ihe a na-anabatakwu ruo mgbe ọ ga-emesị ghọọ ụzọ ndụ. Mmadụ ndị a na-akwụ nnọọ ụgwọ dị ala na-abịa chewe na ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime. Eklisiastis 8:11.
Ha aghaghị ịna ihe iri ngo ma ọ bụrụ na ha chọrọ ibi ndụ dịtụ mma. Mgbe ọ na-adịghịkwa ihe a na-eme ndị na-anara ihe iri ngo ma ọ bụ ndị na-enye ha iji nweta abamuru n’ụzọ na-adịghị mma, ọ bụ mmadụ ole na ole na-adị njikere ịlụso nrụrụ aka ọgụ. “N’ihi na e meghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ,” ka Eze Solomọn kwuru.—Ikike abụọ dị ike nọgidere na-afụnwu ọkụ nke nrụrụ aka: ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na anyaukwu. N’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ndị rụrụ arụ na-eleghara nhụjuanya nke nrụrụ aka ha na-ewetara ndị ọzọ anya, ha na-emekwa ka ịnara ihe iri ngo yie ihe ziri ezi nanị n’ihi na ha na-erite uru site na ya. Ka ndị na-arụrụ aka na-akpakọbakwu ihe onwunwe, otú ahụ ka ha na-adịkwu anyaukwu. “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ,” ka Solomọn kwuru, “ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ.” (Eklisiastis 5:10) N’ezie, anyaukwu pụrụ ịdị mma maka ịkpata ego, ma ya na nrụrụ aka na mmebi iwu na-agakọ mgbe nile.
Isi ihe ọzọ a na-ekwesịghị ileghara anya bụ òkè onye ahụ a na-adịghị ahụ anya na-achị ụwa a, bụ́ onye Bible kọwara dị ka Setan bụ́ Ekwensu, na-ekere. (1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:9) Setan na-akwalite nrụrụ aka n’ụzọ dị irè. Iri ngo kasịnụ e dekọrọ edekọ bụ nke ahụ Setan kwuru ka ya nye Kraịst. ‘M ga-enye Gị alaeze nile nke ụwa, ọ bụrụ na Ị ga-ada n’ala kpọọ isiala nye m.’—Matiu 4:8, 9.
Otú ọ dị, Jisọs etinyeghị aka ná nrụrụ aka, ọ kụzikwaara ụmụazụ ya ịkpa àgwà n’ụzọ yiri nke ahụ. Ihe Kraịst kụziri ọ̀ pụrụ ịbụ ngwá ọrụ dị irè maka ịlụ ọgụ megide nrụrụ aka taa? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ a.