Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Egwú Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ

Egwú Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ

Egwú Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ

A kọwawo egwú dị ka “nkà kasị ochie na nke kasị bụrụ ihe mmadụ bu pụta ụwa n’ime nkà nile.” Dị ka asụsụ, ọ bụ onyinye dị ịrịba ama nke na-eme ka mmadụ pụọ iche n’ebe anụ ọhịa dị. Egwú na-akpali mmetụta uche. Ọ pụrụ ịdị ụtọ ná ntị ma dịgide n’uche. Nke kasịnụ, egwú pụrụ ime Chineke obi ụtọ.

DỊ KA Bible na-egosi, ụmụ Israel bụ ndị nwere mmasị n’egwú. Egwú bụ “nkà a ma ama n’oge ochie nke Bible,” ka Unger’s Bible Dictionary na-ekwu. Dị ka akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị, ha ji ma egwú a gụrụ n’ọnụ ma ndị a kụrụ ná nkwa mee ihe n’ofufe ha. Ma, ọ bụ olu mmadụ ka e ji mee ihe n’ụzọ kasị pụta ìhè.

Eze Devid họpụtara ndị nnọchianya n’etiti ndị Livaị “dị ka ndị isi akụkụ abụọ nke ndị ọbụ abụ” n’ụlọikwuu ahụ, tupu a rara ụlọ nsọ ahụ Solomọn, bụ́ nwa ya, wuru nye. (1 Ihe E Mere 6:31, 32) Mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bụ́ nke na-anọchite anya ọnụnọ Jehova, n’ime Jerusalem, Devid mere ndokwa maka ụfọdụ n’ime ndị Livaị “ime ka e cheta na ikele na ito Jehova.” Ha “chịịrị une na ụbọ akwara; . . . na-ewerekwa ájà mee ka a nụ ụda ha; . . . na-achịrịkwa opì” ka ha na-abụ abụ otuto. A “kpọrọ [ndị ikom a] n’aha n’aha, ikele Jehova, n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị.”—1 Ihe E Mere 16:4–6, 41; 25:1.

Nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “ruo mgbe ebighị ebi ka ebere [Jehova] dị” pụtara ọtụtụ ugboro n’Abụ Ọma, bụ́ akwụkwọ Bible nke a kasị ejikọta ya na egwú. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ya mejupụtara akụkụ nke abụọ n’ime amaokwu nke ọ bụla so n’amaokwu 26 ahụ dị n’Abụ Ọma nke 136. “Ịdị nkenke ya na-eme ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ikwu ya,” ka otu onye ọkà mmụta Bible na-ekwu. “Onye ọ bụla nụworo ya, pụrụ icheta ya.”

Ihe ndị e dekwasịrị n’elu abụ ọma ndị ahụ na-egosi ojiji e ji ngwá egwú mee ihe n’ụzọ sara mbara. Abụ Ọma nke 150 kpọtụrụ opì ike, ụbọ akwara, egwú otiti, ọ̀jà, na ájà, aha, tinyekwara ụbọ e ji akwara kwee. Otú o sina dị, ihe kasị adọrọ adọrọ bụ olu mmadụ. Amaokwu nke 6 na-agba ume, sị: “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Ja. Toonụ Ja.”

Ebe ọ bụ na egwú na-egosipụta mmetụta ndị anyị na-enwe, echiche ndị na-akpali iru újú n’oge Bible mere ka a bụọ abụ ma ọ bụ kwee ukwe iru újú. Otú ọ dị, ụdị abụ a adịghị ọtụtụ n’ihe ndekọ egwú nke ụmụ Israel. “Ọ bụ nanị n’abụ iru újú ma ọ bụ abụ n’ákwá ka a pụrụ ịhọrọ iji ukwe mee ihe karịa iji uri olu ụtọ nke egwú ma ọ bụ mgbanwe olu na mmesi okwu ike nke okwu nkịtị,” ka akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible bụ́ Insight on the Scriptures, na-ekwu. *

Jisọs na ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi bụkuru Jehova abụ otuto n’abalị ahụ tupu ọnwụ Jisọs, obi abụọ adịghị ya na ha ji okwu ndị dị n’Abụ Ọma Halel ahụ mee ihe. (Abụ Ọma 113-118) Lee ka nke a na-aghaghị isiwo wusie ndị na-eso ụzọ Jisọs ike iche mfu nke ịbụ ndị Nna ha Ukwu gaje ịnwụ ihu! Karịa nke ahụ, mkpebi ha mere ịnọgide na-abụ ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi nke Ọkaaka Kasị Elu nke eluigwe na ala, bụ́ Jehova, aghaghị isiwo ike karị, ka ha bụrụ nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “ruo mgbe ebighị ebi ka ebere ya dị,” ugboro ise.—Abụ Ọma 118:1–4, 29.

Ndị Kraịst oge mbụ nọ n’Efesọs na Kọlọsi weere “abụ ọma na ukwe” nye Chineke otuto. Tụkwasị ná ndị a, ha bụrụ ‘abụ Mmụọ Nsọ’ bụ́ ndị ha bụrụ n’ime obi ha. (Ndị Efesọs 5:19; Ndị Kọlọsi 3:16) Site ma n’abụ ma n’okwu ọnụ, ha ji ọnụ ha mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji kwuo okwu otuto. Jisọs ó kwughị na “ọnụ site n’ihe nke obi nwebigara ókè na-ekwu okwu”?—Matiu 12:34.

Egwú Ndị Na-adịghị Eme Chineke Obi Ụtọ

Ọ bụghị egwú nile a kpọtụrụ aha n’ime Bible mere Chineke obi ụtọ. Tụlee ihe mere n’Ugwu Saịnaị, bụ́ ebe Mosis nọ na-anata Iwu ahụ, gụnyere Iwu Iri ahụ. Mgbe Mosis si n’ugwu ahụ rịdata, gịnị ka ọ nụrụ? “Ọ bụghị olu ndị na-aza n’ịdị ike,” “ọ bụghịkwa olu ndị na-aza n’adịghị ike,” kama ọ bụ “olu ndị na-aza n’ịbụ abụ.” Nke a bụ egwú e jikọtara ya na ikpere arụsị, bụ́ ihe omume nke kpaliri iwe Chineke ma duga n’ọnwụ nke ihe dị ka mmadụ 3,000 n’ime ndị ahụ kụrụ egwú ahụ.—Ọpụpụ 32:18, 25–28.

Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ pụrụ ide, ịgụ, na ịnụ ụtọ ụdị egwú nile, ọ pụtaghị na ha nile na-eme Chineke obi ụtọ. N’ihi gịnị? Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) A na-egosipụtakarị ememe ala imepụta ihe nke ndị na-ekpere arụsị, ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, na ofufe Meri dị ka “nne nke Chukwu,” dị ka isiokwu nke egwú dị iche iche. Ma, nkwenkwe na ihe omume ndị a na-akparị Chineke nke eziokwu, n’ihi na ha ekwekọghị n’ihe e kpughere n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible.—Deuterọnọmi 18:10–12; Ezikiel 18:4; Luk 1:35, 38.

Ịhọrọ Egwú n’Ụzọ Amamihe

Ime nhọrọ n’egwú ndị dịnụ bụ ihe na-agbagwoju anya. A na-eme ọbọ́ compact disc iji kpalie ndị na-azụ ha ịzụ ụdị egwú nile. Ma ọ bụrụ na onye na-efe Chineke chọrọ ime ihe na-atọ Ya ụtọ, ọ ga-elezi anya ma jiri amamihe na-eme nhọrọ iji zere egwú a gụrụ agụ na ndị a kụrụ ná nkwa bụ́ ndị sitere na nkwenkwe okpukpe ụgha ma ọ bụ ndị hiwere isi n’omume rụrụ arụ nakwa n’ofufe ndị mmụọ ọjọọ.

Albert, bụ́ onye jere ozi n’otu oge dị ka onye Kraịst bụ́ onye ozi ala ọzọ n’Africa, na-ekweta na ya adịghị enwecha ohere ịkpọ piano n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ugboro ugboro, o gere tepụ egwú ole na ole ndị na-akpọte aka bụ́ ndị o ji gaa ebe ahụ. N’ịbụ onye laghachiworo ná mba nke aka ya, Albert na-eletazi ọgbakọ ndị Kraịst dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. O nwere oge a kpaara ókè maka ige egwú. “Onye m kasị enwe mmasị n’egwú ọ kụrụ bụ Beethoven,” ka ọ na-ekwu. “N’afọ ndị gafeworonụ, enwetawo m tepụ egwú ya n’ụdị ha dị iche iche.” O nwetawo ọṅụ dị ukwuu site n’ige ha. N’ezie, onye ọ bụla nwere ụdị egwú na-amasị ya, ma dị ka ndị Kraịst, anyị na-eburu ndụmọdụ Pọl n’uche: “Ma unu na-eri ihe, ma unu na-aṅụ ihe, ma unu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrint 10:31.

Egwú na Nraranye

Egwú bụ ihe kasị amasị Susie. “Amalitere m ịkpọ piano mgbe m dị afọ 6, kpọwa violin mgbe m dị afọ 10, n’ikpeazụ kwa, kpọwa ụbọ akwara mgbe m dị afọ 12,” ka ọ na-akọwa. Susie mesịrị gaa Royal College of Music nke dị na London, England, iji mụọ ịkpọ ụbọ akwara. Ọ mụrụ ya afọ anọ n’aka otu onye Spain a ma ama n’ịkpọ ụbọ akwara, nakwa otu afọ ọzọ na Paris Conservatoire, nweta akara ugo mmụta n’egwú nakwa diplọma maka ịkpọ ụbọ akwara na ịkụzi ịkpọ piano.

Susie malitere iso otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na London na-akpakọrịta. N’ebe ahụ, ọ hụrụ na Ndịàmà nwere ezigbo mmasị na ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ. Nke nta nke nta, ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ mụbara, ịnụ ọkụ n’obi o nwere maka ozi Ya kpalikwara ya ịchọ ụzọ isi jeere ya ozi. Nke a dugara ná nraranye na baptism. “Iwere egwú dị ka ọrụ bụ ụzọ ndụ m raara onwe m nye, ya mere ndụ nke nraranye abụghịrị m ihe ọhụrụ,” ka Susie na-ekwu. Oge ọ na-etinye n’ịkụ egwú n’ihu ọha belatara ka ọ na-ekere òkè n’ozi ndị Kraịst nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke ná nrubeisi nye ntụziaka Jisọs.—Matiu 24:14; Mak 13:10.

Ugbu a ọ na-etinye nanị obere oge n’ịkụ egwú, olee otú ọ dị ya? “Mgbe ụfọdụ ana m enwetụ nkụda mmụọ na adịghị m enwekwu oge ịkụ egwú,” ka ọ na-ekweta, “ma aka m na-akpọ ngwá egwú m ma na-anụ ụtọ ha. Egwú bụ onyinye sitere n’aka Jehova. Ana m anụkwu ụtọ ya ugbu a m buteworo ozi ya ụzọ ná ndụ m.”—Matiu 6:33.

Egwú Ndị Na-enye Chineke Otuto

Albert na Susie, nakwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ isii ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà Jehova na-eji egwú eto Jehova Chineke mgbe nile. Ná nzukọ ndị Kraịst ha na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ala 234, n’ebe o kwere mee, ha na-amalite ma na-emechi nzukọ ha site n’ịbụku Jehova abụ. N’abụ ukwu na ndị nta, ọmarịcha uri olu ụtọ dị iche iche na-ebu okwu abụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-enye Jehova Chineke otuto.

Ndị nile bịaranụ na-eweli olu ha iji obi ụtọ bụọ abụ na Jehova bụ Chineke na-eche banyere anyị (Abụ nke 44). Ha na-abụku Jehova abụ otuto (Abụ nke 190). Abụ ha na-egosipụta na e nwere ọṅụ na ibu ọrụ ndị dị n’ịbụ òtù ụmụnna ndị Kraịst, n’ịdị ndụ ndị Kraịst, na n’inwe àgwà ndị Kraịst. Ihe na-etinye ihe n’ịdị ụtọ ha bụ ụdị usoro egwú dị iche iche nke Ndịàmà si Esia, Australia, Europe, nakwa Ebe Ugwu na Ebe Ndịda America ji mee ihe mgbe ha na-ede uri olu ụtọ ndị ahụ. *

“Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ: bụkuonụ Jehova abụ, unu ụwa nile. Bụkuonụ Jehova abụ, gọzienụ aha Ya,” bụ́ okwu mmalite nke otu ọmarịcha ukwe ndị eze bụ́ nke e dere n’oge ọbụ abụ ahụ. “Na-ezisanụ ozi nzọpụta Ya site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ. Kọsaanụ akụkọ ebube Ya n’etiti mba nile, akụkọ oké ọrụ Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche.” (Abụ Ọma 96:1–3) Nke a bụ ihe Ndịàmà Jehova na-eme n’ógbè unu, ha na-akpọkwa gị ka i sonyere ha n’ịbụ abụ otuto a. Ha ga-anabata gị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, bụ́ ebe ị pụrụ ịmụta otú e si eji egwú ndị na-atọ Jehova ụtọ na-eto ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

^ par. 22 Abụ ndị a dị n’akwụkwọ bụ́ Sing Praises to Jehovah, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 28]

Ịbụku Jehova abụ otuto