Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Okwu ahụ Bụ́ “Onye Kraịst” Pụtara Ọ̀ Na-agbanwe?

Ihe Okwu ahụ Bụ́ “Onye Kraịst” Pụtara Ọ̀ Na-agbanwe?

Ihe Okwu ahụ Bụ́ “Onye Kraịst” Pụtara Ọ̀ Na-agbanwe?

GỊNỊ ka ịbụ onye Kraịst pụtara? Olee otú ị ga-esi zaa ya? A jụrụ mmadụ ndị a họpụtagasịrị ná mba dị iche iche ajụjụ ahụ kpọmkwem, leekwa ụfọdụ n’ime ihe ndị ha zara:

“Ịgbaso Jisọs na iṅomi ya.”

“Ịbụ ezi mmadụ na isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe.”

“Ịnakwere Kraịst dị ka Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị.”

“Ịga Mas, ịgụ Rosary, na ịnata Oriri Nsọ.”

“Ekweghị m na ị ghaghị ịga chọọchị iji bụrụ onye Kraịst.”

Ọbụna ọtụtụ akwụkwọ ọkọwa okwu na-enye ọtụtụ nkọwa ndị na-eju anya. N’ezie, otu akwụkwọ nwere nkọwa iri n’okpuru okwu ahụ bụ́ “Onye Kraịst,” na-amalite ‘n’ikwere na Jisọs Kraịst ma ọ bụ ikpe okpukpe ya’ ruo ‘n’onye dị ọcha ma ọ bụ onye a na-anakwere.’ Ọ bụghị ihe ijuanya na ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịkọwa ihe ịbụ onye Kraịst pụtara.

Àgwà Mmadụ Imere Otú Masịrị Ya

Taa, n’etiti ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst—ọbụna n’etiti ndị na-anọ n’otu oche na chọọchị—mmadụ pụrụ ịhụ ọtụtụ echiche dịgasị iche banyere isiokwu ndị dị ka Bible isite n’ike mmụọ nsọ Chineke, ozizi evolushọn, òkè chọọchị na-ekere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na mmadụ iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe o kweere. Okwu ndị metụtara omume, n’isiokwu ndị dị ka nsikwopụ afọ ime, ndina ụdị onwe, na nwoke na nwanyị ibikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye, na-akpalitekarị arụmarụ. N’ụzọ doro anya, àgwà a na-ahụkarị bụ mmadụ imere otú masịrị ya.

Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, otu nzukọ nke ndị chọọchị Protestant mere ntụli aka iji kwadoo nnwere onwe chọọchị “ịhọpụta otu onye okenye a ma ama na-edina nwoke ibe ya iso n’òtù bọọdụ ịchịisi ya,” ka magazin bụ́ Christian Century na-akọ. Ọbụna ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe enyewo echiche na inwe okwukwe n’ebe Jisọs nọ adịghị mkpa maka nzọpụta. Ha kweere na ndị Juu, ndị Alakụba, na ndị ọzọ “yikarịrị nnọọ ka ha ga-aga eluigwe [dị ka ndị Kraịst],” ka otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-ekwu.

Cheedị echiche ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị, banyere onye na-agbaso echiche Marx ịkwado ọchịchị nke usoro akụ̀ na ụba ịdị n’aka ndị nkịtị ma ọ bụ onye na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya ịkwado ọchịchị aka ike ma ọ bụ onye na-ahụ banyere ịdị mma nke gburugburu ebe obibi ịkwado mgbukpọsị oké ọhịa. “Onye ahụ apụghị n’ezie ịbụ onye na-agbaso echiche Marx ma ọ bụ onye na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya ma ọ bụ onye na-ahụ banyere ịdị mma nke gburugburu ebe obibi,” ka ị ga-asị—ihe i kwuru ga-ezikwa ezi. Ma, mgbe ị tụlere echiche dịgasị iche nke ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst taa, ị ga-ahụ nkwenkwe ndị dịrịtara nnọọ iche ma na-emegidekarị ihe Onye guzobere Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ Jisọs Kraịst, kụziri. Gịnị ka nke ahụ na-egosi banyere ụdị Iso Ụzọ Kraịst ha?—1 Ndị Kọrint 1:10.

Mkpali nke ịgbanwe ozizi ndị Kraịst ikwekọ n’àgwà nke ọgbọ a nọ na ya malitere eri oge, dị ka anyị ga-ahụ. Olee mmetụta Chineke na Jisọs Kraịst na-enwe banyere mgbanwe ndị dị otú ahụ? Chọọchị ndị na-akwalite ozizi ndị na-amaliteghị n’ebe Kraịst nọ hà pụrụ ịkpọ onwe ha ndị Kraịst n’ụzọ ziri ezi? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.