Olee Ebe Ị Pụrụ Isi Nweta Ezi Ndụmọdụ?
Olee Ebe Ị Pụrụ Isi Nweta Ezi Ndụmọdụ?
“Inye ndụmọdụ” aghọwo achụmnta ego na-eweta nde kwuru nde dollar kwa afọ. Ndị mmadụ chọrọ enyemaka. Ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike nke uche bụ́ Heinz Lehmann na-ekwu, sị: “[N’ọgbọ nke taa] e nwere erughị eru n’ụzọ mmụta nakwa ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ụkpụrụ okpukpe abụghịzi ihe ha bụbu. Ezinụlọ esichaghịzi ike . . . , n’ihi ya kwa ndị mmadụ na-adagharị adagharị.” Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Eric Maisel na-ekwu, sị: “Ndị na-agakwuburu ndị dibịa afa, pastọ ma ọ bụ dọkịta ezinụlọ ha maka enyemaka n’ihe banyere nsogbu uche, nke ime mmụọ na nke anụ ahụ, na-elegaziri akwụkwọ enyemaka onwe onye anya maka azịza.”
ÒTÙ America Na-ahụ Maka Akparamàgwà guzobere otu ìgwè iji nyochaa ọrụ a na-aba ụba n’ike n’ike. Ha kwuru na ọ bụ ezie na e nwere “ohere dị nnọọ ukwuu iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta onwe ha na ndị ọzọ . . . , nzọrọ na aha ndị e ji akwalite ihe omume ndị a na-abụ ndị gabigara ókè na ndị e kwuru n’ụzọ na-akpali akpali.” Otu onye edemede nke akwụkwọ akụkọ bụ́ Toronto Star na-ekwu, sị: “Kpachara anya banyere ọnụ ọgụgụ aghụghọ okpukpe na nke ime mmụọ e nwere. . . . Kpachara anya karịsịa banyere akwụkwọ enyemaka onwe onye, tepụ ma ọ bụ nzukọ ọmụmụ ihe nile bụ́ ndị na-enye nnọọ ihe ọmụma dị nnọọ ukwuu, n’oge dị nnọọ mkpirikpi, site n’itinye mgbalị ma ọ bụ ọzụzụ onwe onye dị nnọọ nta.” N’eziokwu, e nwere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ji ezi obi na-achọ ịkwado ndị nọ ná mkpa. Otú ọ dị, ihe dị mwute na-eme eme bụ na ọtụtụ ndị na-enweghị ụkpụrụ na-eji owu ọmụma na nhụjuanya ndị mmadụ erite uru, na-enye ihe na-abụghị ezi enyemaka ma ọ bụ ihe ngwọta.
N’iburu nke a n’uche, gịnị bụ isi iyi bụ́ isi nke enyemaka anyị pụrụ ịtụkwasị obi? Olee ebe anyị pụrụ ịhụ ndụmọdụ dị irè nke ga-arụ ọrụ mgbe nile?
Isi Iyi nke Nduzi Na-adịghị Ada Ada
Onye America na-eme nkwusa na narị afọ nke 19 bụ́ Henry Ward Beecher kwuru, sị: “Bible bụ chaatị Chineke nyere gị iji na-akwọ ụgbọ gị, iji mee ka ị ghara imikpu n’ala osimiri, iji gosikwa gị ebe ọdụ ụgbọ mmiri dị, na otú ị ga-esi eru ya n’agbabaghị n’oké nkume ma ọ bụ n’ebe mmiri na-adịghị ogbu.” Nwoke ọzọ kwuru banyere Bible, sị: “Ọ dịghị onye na-etofe Akwụkwọ Nsọ; akwụkwọ ahụ na-asakwu mbara, ma na-emikwu emi ka afọ ndụ na-aga.” N’ihi gịnị ka i ji kwesị ịtụle isi iyi a nke ọma?
N’igosipụta uru ya onwe ya bara, Bible na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Ihe ndị dị na Bible sitere kpọmkwem n’aka Isi Iyi nke ndụ, bụ́ Jehova Chineke. (Abụ Ọma 36:9) N’ihi ya, ọ maara ihe ndị mejupụtara anyị nke ọma, dị ka Abụ Ọma 103:14 na-echetara anyị, sị: “N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” Ya mere, anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu n’abamuru Bible.
N’ezie, Bible bu imerime ụkpụrụ na nduzi ndị ị pụrụ itinye n’ọrụ n’ụzọ bara uru n’ọnọdụ ọ bụla ị pụrụ ịchọta onwe gị. Site na ya Chineke na-agwa anyị, sị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” (Aịsaịa 30:21) Bible ọ̀ pụrụ igbo mkpa ndị mmadụ taa n’ezie? Ka anyị lee.
Bible Na-egbo Mkpa Anyị . . .
N’ịnagide Nchegbu. Bible na-agwa anyị, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ekpere ọ̀ bụrụwo ihe dị irè n’ịnagide nchegbu ndị a na-enwe n’ihi ihe isi ike akụ̀ na ụba, mmetọ n’ụzọ mmekọahụ na ịkpọ iyi, ma ọ bụ ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya? Tụlee ahụmahụ na-esonụ.
Mgbe Jackie nụsịrị banyere mmetọ e metọrọ nwa ya nwanyị n’ụzọ mmekọahụ, o kwetara, sị: “Mmetụta obi amamikpe nke mmadụ na-enwe n’ihi ịbụ onye na-enweghị ike ichebe nwa ya abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Aghaghị m ịlụ ọgụ megide mmetụta nke obi ọjọọ na iwe. Mmetụta ndị a nọ na-amalite ibibi ndụ m. Achọsiri m ike ka Jehova chekwaa obi m.” Mgbe ọ gụsịrị ma gụghachi Ndị Filipaị 4:6, 7, ọ rụsiri ọrụ ike itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ. “Ana m ekpe ekpere kwa ụbọchị, na-arịọ ugboro ugboro ka m ghara ikwe ka mmetụta ndị na-adịghị mma bibie m, Jehova enyewokwara m aka ịzụlite obi dị jụụ na obi ụtọ. N’ezie ana m enwezi udo n’ime onwe m,” ka Jackie na-akọ.
Gị onwe gị kwa pụrụ ịchọta onwe gị n’ọnọdụ ị na-enweghị ike ịchịkwa ma ọ bụ idozi, nke na-ewetakwara gị nchegbu. Site n’ịgbaso ndụmọdụ Bible bụ́ ikpe ekpere, ị pụrụ ịnagide ya n’ụzọ dị irè. Ọbụ abụ ahụ ji okwu ndị a agba anyị ume: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.”—Abụ Ọma 37:5.
Maka Agbamume. Ọbụ abụ ahụ kwuru okwu ekele a: “Jehova, ahụwo m ebe obibi nke ụlọ Gị n’anya, ya na ọnọdụ nke ebe obibi nke ebube Gị. Ụkwụ m eguzowo n’ala dị larịị: n’ime mkpọkọta mmadụ nile ka m ga-agọzi Jehova.” (Abụ Ọma 26:8, 12) A na-agba anyị ume n’ime Bible ịgbakọta ọnụ mgbe nile iji fee Jehova. Olee otú mkpakọrịta a pụrụ isi gboo mkpa gị? Gịnị ka ndị ọzọ chọpụtaworo?
Becky na-akọ, sị: “Ndị mụrụ m adịghị efe Jehova, ya mere ha na-emegide m mgbe ọ bụla m nwara ime ihe ọ bụla metụtara ijere Chineke ozi. Ọ na-ewe m mgbalị dị ukwuu iji gaa nzukọ.” Becky nwere mmetụta na ya enwetawo ọtụtụ ngọzi n’ihi na ya agbalịsiwo ike ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya. “Nzukọ ndị ahụ na-ewusi okwukwe m ike, ka m wee nwee ike ịnagide nrụgide m na-enweta kwa ụbọchị dị ka nwa akwụkwọ, nwa nwanyị, na onye na-ejere Jehova ozi. Ndị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị nnọọ iche n’ebe ụmụ akwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ nọ! Ha na-ahụ n’anya ma na-enye aka, nkwurịta okwu anyị na-agbakwa ume mgbe nile. Ha bụ ezi ndị enyị.”
Ee, site n’ịgbaso ntụzi Bible bụ́ ka a na-ezukọta ọnụ mgbe nile, anyị pụrụ ime ka Jehova gboo mkpa anyị maka agbamume. Ọ bụ n’ebe a ka anyị ga-ahụ ịbụ eziokwu nke okwu ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.”—Abụ Ọma 46:1.
Maka Ọrụ Na-enye Afọ Ojuju na nke Kwesịrị Mgbalị E Tinyere na Ya. “Guzosienụ ike, bụrụnụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ, ndị na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị,” ka Bible na-ekwu ná nkwado. (1 Ndị Kọrint 15:58) ‘Ọrụ Onyenwe anyị’ ọ̀ na-enye afọ ojuju n’ezie? Ozi ndị Kraịst ọ̀ na-arụzu ihe kwesịrị mgbalị e tinyere na ya?
Amelia na-ekwu mmetụta ọ na-enwe, sị: “Eso m otu di na nwunye bụ́ ndị fọrọ nnọọ nke nta ka ha kewaa, mụọ Bible. Enyekwaara m otu nwanyị bụ́ onye e gburu nwa ya nwanyị n’ike, aka. Nwanyị ahụ nwere mmekpa ahụ n’ihi na ọ maghị ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. N’ọnọdụ abụọ a, itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ wetara udo na olileanya ná ndụ ha. Enwere m nnọọ ọṅụ na afọ ojuju dị ukwuu n’ihi na ekeere m òkè n’inyere ha aka.” Scott na-ekwu, sị: “I nwee ahụmahụ dị mma n’ozi ubi, malite ọmụmụ Bible ọhụrụ, ma ọ bụ nwee ihe ịga nke ọma ụfọdụ site n’ịgba àmà mberede, ị ga-ekwugide banyere ya ruo ọtụtụ afọ n’ihu. Ị na-enwetaghachi otu mmetụta na mkpali ahụ mgbe ọ bụla i kwughachiri ya! Ọ bụ n’ozi ka ọṅụ kasị ukwuu na nke na-adịte aka si abịa.”
N’ụzọ doro anya, itinye ntụzi Bible ahụ bụ́ ka anyị bụrụ ndị ozi dị irè, n’ọrụ egbowo mkpa mmadụ ndị a maka ọrụ na-enye afọ ojuju na nke kwesịrị mgbalị e tinyere na ya. A na-akpọkwa gị òkù ikere òkè n’ọrụ a nke izi ndị ọzọ ihe banyere ụzọ na ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke, na-erite uru n’onwe gị n’otu oge ahụ.—Aịsaịa 48:17; Matiu 28:19, 20.
Irite Uru Site n’Okwu Chineke
N’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya, Bible bụ isi iyi a pụrụ ịtụkwasị obi maka nduzi ndị dị irè n’ụwa nke oge a. Iji rite uru site na ya, ọ dị anyị mkpa itinye mgbalị n’esepụghị aka. Anyị aghaghị ịgụ ya, ịmụ ya, na ịtụgharị uche na ya mgbe nile. Pọl dụrụ ọdụ, sị: “Na-ejisi ike n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Timoti 4:15; Deuterọnọmi 11:18-21) Chineke na-emesi gị obi ike na ọ bụrụ na ị rụọ ọrụ iji tinye ndụmọdụ ya n’ọrụ dị ka ọ dị na Bible, ị ga-enwe ihe ịga nke ọma. Ọ na-ekwe nkwa, sị: “Tụkwasị Jehova obi . . . : n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—Ilu 3:5, 6.
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Ịgbaso ndụmọdụ Bible na-eme ka ndụ na-eju afọ