Ị̀ Na-ekwere n’Ihe Ị Na-apụghị Ịhụ Anya?
Ị̀ Na-ekwere n’Ihe Ị Na-apụghị Ịhụ Anya?
MGBE mmadụ na-asị, ‘Ana m ekwere nanị n’ihe m pụrụ ịhụ anya,’ ọ dịghị ekwu ịhụ ihe n’ụzọ nkịtị. N’ezie, anyị nile na-ekwere n’ihe ndị anyị na-apụghị ịhụ anya.
Dị ka ihe atụ, n’ụlọ akwụkwọ, ị pụrụ imewo nnwale e bu n’uche iji gosipụta ịdị adị nke ike ndọta. A pụrụ isi otú a mee ya: Wụsa iberibe ígwè e ji faịlụ mụpụta n’elu mpempe akwụkwọ. Tụkwasịzie mpempe akwụkwọ ahụ n’elu ihe ndọta (magnet). Mgbe mpempe akwụkwọ ahụ
mewere mkpatụ, dị ka a ga-asị na ọ bụ majik, iberibe ígwè ahụ e ji faịlụ mụpụta ga-agbakọta ọnụ na nso ebe ihe ndọta ahụ dị ma gosipụta ebe ike ndọta ahụ ruru. Ọ bụrụ na i mee nke ahụ, ị̀ pụrụ n’ezie ịhụ ebe ike ndọta ahụ ruru? Ee e, kama ị na-ahụ mmetụta ya nke ọma n’ahụ iberibe ígwè ahụ e ji faịlụ mụpụta, na-enye gị ihe àmà na-edo anya na ike ndọta ihe dị adị.Anyị na-anakwere ihe ndị ọzọ anyị na-apụghị ịhụ anya n’arụghị ụka. Mgbe anyị lere anya n’ihe osise mara mma ma ọ bụ nwee mmasị n’ihe ọkpụkpụ mara mma, anyị adịghị enwe obi abụọ banyere ịdị adị nke onye na-ese ihe ma ọ bụ onye ọkpụ ihe. Ya mere, mgbe anyị na-atụgharị uche banyere nsụda mmiri ma ọ bụ na-ekiri ọdịda anyanwụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịbụ ndị a kpaliri ịtụle ma ọ dịghị ihe ọzọ na ha pụrụ ịbụ ọrụ Omenkà ma ọ bụ Ọkpụ Ihe Ukwu rụrụ?
Ihe Mere Ụfọdụ Adịghị Ekwere
N’ụzọ megidere ihe a tụrụ anya ya, ụfọdụ ndị ekweghịzi na Chineke n’ihi ihe a kụziiri ha na chọọchị. Otú a ka ọ dị n’ebe otu nwoke bụ́ onye Norway nọ, bụ́ onye a gwara na Chineke na-akpọ ndị ajọ omume ọkụ na hel na-ere ọkụ. Nwoke ahụ apụghị nnọọ ịghọta ụdị Chineke nke ga na-emekpa ndị mmadụ ahụ n’ụzọ dị otú ahụ, n’ihi ya ọ ghọrọ onye na-ekweghị na Chineke dị.
Otú ọ dị, nwoke ahụ mesịrị kwere inyocha Bible, otu n’ime Ndịàmà Jehova nyekwaara ya aka. O juru ya anya ịmata na Bible adịghị akụzi na a na-ata ndị ajọ omume ahụhụ na hel na-ere ọkụ. Bible ji ọnwụ atụnyere ụra. N’ime ili, anyị adịghị enwe ihe mgbu ọ bụla; anyị adịghị ama ihe ọ bụla. (Eklisiastis 9:5, 10) Nwoke ahụ mụtakwara na ndị ahụ Chineke ga-ekpe ikpe ịbụ ndị mmehie a na-apụghị imekwata emekwata ga-anọgide n’ili ruo mgbe ebighị ebi. (Matiu 12:31, 32) A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ fọdụrụnụ n’oge nke Chineke, ha ga-enwe atụmanya inweta ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. (Jọn 5:28, 29; 17:3) Amamihe dị ná nkọwa a. O kwekọrọ n’okwu Bible bụ́ na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Nwoke a nwere obi eziokwu nọgidere na-amụ Okwu Chineke, ka oge na-agakwa, ọ bịara hụ Chineke nke Bible n’anya.
Ndị ọzọ adịghị ekwere n’ịdị adị nke Onye Okike na-ahụ n’anya n’ihi ịba ụba nke nhụjuanya na ikpe na-ezighị ezi. Ha na-ekwenyere otu nwoke bụ́ onye Sweden bụ́ onye tụrụ aka n’eluigwe n’otu oge ma jụọ, sị: “Olee otú ọ ga-esi bụrụ na Chineke pụrụ ime ihe nile, nke kasị emesapụ aka nọ n’elu ebe ahụ mgbe anyị nwere nnọọ oké nrụrụ aka na ajọ omume n’ala ebe a?” Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye pụrụ ịza ajụjụ ya, ya onwe ya ghọkwara onye na-ekweghị na Chineke dị. Mgbe *
e mesịrị, ọ malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ọ mụtara na Okwu Chineke na-enye azịza na-eju afọ nye ajụjụ ahụ malitere mgbe ochie bụ́, N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị?Nwoke a nwere obi eziokwu mụtara na ịdị adị nke ajọ omume adịghị egosi n’onwe ya na Chineke adịghị. Iji maa atụ: Mmadụ pụrụ imepụta mma ka e jiri ya na-ebe anụ. Onye ahịa ya pụrụ ịzụrụ mma ahụ ma jiri ya gbuo mmadụ kama iji ya bee anụ. Eziokwu ahụ bụ́ na e ji mma ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi adịghị egosi n’ụzọ ọ bụla na ọ dịghị onye mere ya. N’otu aka ahụ, eziokwu ahụ bụ́ na e jibeghị ụwa mee ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nzube e ji kee ya apụtaghị na o nweghị Onye Okike.
Bible na-akụzi na ọrụ Chineke zuru okè. O “[nweghị] ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Chineke na-enye ụmụ mmadụ ezi onyinye, ma e jiriwo ụfọdụ n’ime onyinye ndị ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na-eme ka e nwee nnọọ oké nhụjuanya. (Jemes 1:17) Otú ọ dị, Chineke ga-eweta nhụjuanya ná njedebe. Mgbe nke ahụ gasịrị, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; . . . birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:11, 29.
O metụrụ nwoke Sweden ahụ a kpọtụrụ aha ná mbụ n’ahụ mgbe ọ hụrụ nhụjuanya nke ụmụ mmadụ ibe ya. N’ezie, ọmịiko o nwere n’ebe ndị ọzọ nọ na-emesi ya ike na Chineke dị adị. N’ụzọ dị aṅaa?
Nye ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ, ikwere n’evolushọn bụ nanị nhọrọ fọdụụrụ ha ma ọ bụrụ na ha ekweghị na Chineke. Ndị kweere n’evolushọn na-akụzi “nke ike kwere dịrị”—na ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-asọrịta mpi n’etiti ụdị ha iji dịrị ndụ. Ndị ike kwere na-adị ndụ; ndị ike na-ekweghị na-anwụ. Ha na-ekwu na nke ahụ bụ usoro ebumpụta ụwa nke ihe nile. Ma ọ bụrụ na ọ bụ ka ndị na-adịghị ike nwụọ iji nyere ndị dị ike ohere bụ “ebumpụta ụwa,” olee otú anyị ga-esi akọwa eziokwu ahụ bụ́ na, dị ka nwoke Sweden ahụ, ọ na-emetụ mmadụ ụfọdụ dị ike n’ahụ mgbe ha hụrụ nhụjuanya nke mmadụ ibe ha?
Ịmara Chineke
Anyị apụghị ịhụ Chineke n’ihi na o nweghị ọdịdị mmadụ. Ma, Chineke chọrọ ka anyị mara ya. Otu ụzọ anyị pụrụ isi mara ya bụ site n’ikiri ọrụ ya ndị na-enweghị atụ—“ihe osise” na “ihe ọkpụkpụ” nke okike. Ná Ndị Rom 1:20, Bible na-ekwu, sị: “Ihe [nke Chineke] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya.” Ee, dị nnọọ ka inyocha ihe osise ma ọ bụ ihe ọkpụkpụ pụrụ isi nyere gị aka ịghọta ụdị onye omenkà ahụ bụ, ịtụgharị uche n’ọrụ ndị dị ebube nke Chineke pụrụ inyere gị aka ịmara ụdị onye ọ bụ n’ụzọ ka mma.
N’ezie, anyị apụghị ịza ajụjụ nile na-enye nsogbu ná ndụ nanị site n’ikiri ihe ndị Chineke kere. Ma anyị pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị dị otú ahụ site n’inyocha Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ọ bụ site n’iji obi ọcha gụọ Bible ka ndị ikom abụọ ahụ a kpọtụrụ aha na mbụ ji ruo nkwubi okwu bụ́ na Chineke dị adị nakwa na ihe na-eme anyị na-emetụta ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Iji nwetakwuo ihe ọmụma n’ihe ndị mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị, biko lee akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You?, isi nke 10, ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, isi nke 8, ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]
J. Hester na P. Scowen (AZ State Univ.), NASA