Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Gbaa Klas nke 108 nke Gilead Ume Ije Ozi Dị Nsọ

A Gbaa Klas nke 108 nke Gilead Ume Ije Ozi Dị Nsọ

A Gbaa Klas nke 108 nke Gilead Ume Ije Ozi Dị Nsọ

N’IME Bible, a na-ejikarị okwu ahụ bụ́ “ije ozi dị nsọ” ezo aka n’ofufe Chineke. O sitere n’okwu Grik na-ezo aka n’ijere Chineke ozi. (Ndị Rom 9:4, NW) Mmadụ 5,562 gere ntị n’usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ nke klas nke 108 nke Watchtower Bible School of Gilead, nụrụ ka ndị ọkà okwu na-enye ndụmọdụ dị irè nke ga-enyere ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ aka ijere Jehova Chineke ozi dị nsọ nke ọ ga-anakwere. *

Theodore Jaracz bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ onyeisi oche ya. Ihe omume ahụ ji abụ nke 52, “Aha Nna Anyị,” meghee. Ahịrị nke abụọ nke abụ ahụ na-asị: “Anyị na-achọ ụzọ ndị anyị pụkwara isi doo aha gị na-enweghị atụ nsọ.” N’ezie, nke ahụ gosipụtara ọchịchọ si n’obi nke ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ (bụ́ ndị si ná mba 10) nwere iji ọzụzụ e nyere ha mee ihe n’ebe ndị a ga-ekenye ha ije ozi ala ọzọ, nke ga-abụ n’ala 17.

N’okwu mmeghe ya, Nwanna Jaracz dọọrọ uche ndị na-ege ntị gaa n’ọmụmụ Bible kpụ ọkụ n’ọnụ ụmụ akwụkwọ ahụ nwere ruo ọnwa ise bụ́ nke kwadebere ha maka ije ozi n’ubi ala ọzọ. Nke a nyeere ha aka ‘ịnwa ihe nile,’ ya bụ, iji Okwu Chineke nyochaa ihe ha mụtara tupu mgbe ahụ, na ‘ijidesi ihe ọma ike.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Ọ gbara ha ume iji ikwesị ntụkwasị obi rapara na Jehova, n’Okwu ya, nakwa n’ọrụ ndị ahụ e ji maka ya nye ha ọzụzụ. Gịnị ga-enyere ha aka ka ha na-eme ihe a nile?

Ndụmọdụ Dị Irè Maka Ije Ozi Dị Nsọ

Lon Schilling, onye so na Kọmitii Ịrụ Ọrụ Betel, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ùnu Ga-agafe Ule nke Ezi Uche?” O mere ka uru ọ bara inwe ezi uche, bụ́ nke na-egosipụta amamihe Chineke pụta ìhè. (Jemes 3:17) Inwe ezi uche na-agụnye ịbụ onye na-adịghị akpọ ekwo nkụ, onye na-adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi, onye na-emeru ihe n’ókè, onye na-echebara ndị ọzọ echiche, na onye na-atachi obi. “Ndị nwere ezi uche na-emeru ihe n’ókè ná mmeso ha na-emeso ndị ọzọ. Ha adịghị ahọrọ imebiga ihe ókè,” ka Nwanna Schilling kwuru. Gịnị pụrụ inyere onye ozi ala ọzọ aka inwe ezi uche? Ọ bụ ile onwe ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, iji ohere ndị dapụtaranụ mee ihe n’ige ndị ọzọ ntị ma na-amụta ihe n’aka ha, na ịdị njikere ịtụle echiche ndị ọzọ n’emebighị ụkpụrụ Chineke.—1 Ndị Kọrint 9:19–23.

“Unu Echefula Iri Nri!” bụ isiokwu na-akpali akpali nke okwu na-esonụ n’usoro ihe omume ahụ, bụ́ nke Samuel Herd, onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru. O mere ka abamuru nke iri ezigbo nri ime mmụọ iji nọgide na-agbasi ike n’ije ozi dị nsọ, pụta ìhè. “N’oge na-adịghị anya,” ka Nwanna Herd kwuru, “a ga-amụba ọrụ ime mmụọ unu ka unu na-emikpu onwe unu n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe bụ́ nke e kenyere unu. Ya mere, ọ gaje ịdị unu mkpa ịmụba nri ime mmụọ unu na-eri iji mee ka ikike unu dị otú o kwesịrị.” Iri nri ime mmụọ n’esepụghị aka pụrụ inyere onye ozi ala ọzọ aka izere ịda mbà n’obi n’ụzọ ime mmụọ na agụụ ụlọ. Ọ na-atụnye ụtụ n’inwe afọ ojuju nakwa ná mmadụ ikpebi ịnọgidesi ike n’ozi dị nsọ e kenyere ya ije.—Ndị Filipaị 4:13.

Otu onye nkụzi Gilead, bụ́ Lawrence Bowen, gbara ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha “Laghachi ná Mmalite.” Gịnị ka o bu n’uche? Ọ gwara ndị nile na-ege ntị ka ha sapete Ilu 1:7, nke na-asị: “Egwu Jehova bụ mmalite ihe ọmụma.” Ọkà okwu ahụ kọwara, sị: “Ihe ọ bụla nke na-adịghị akwado eziokwu ahụ bụ́ isi, nke bụ́ na Jehova dị adị, apụtụghị ịbụ ezigbo ihe ọmụma n’ezie, ọ pụghịkwa ime ka e nwee nghọta kwesịrị ekwesị.” Nwanna Bowen ji ụmụ irighiri ihe ndị mejupụtara Okwu Chineke, bụ́ Bible, tụnyere iberibe ihe ndị e si n’ihe osise chapụta. Mgbe e jikọtara iberibe ihe ndị ahụ ọnụ, ha na-aghọ ihe osise zuru ezu. Ka iberibe ihe ndị ahụ na-ehikwu nne, otú ahụ ka ihe osise ahụ na-ebukwu ibu ma na-edokwu anya, otú ahụ kwa ka mmadụ ga na-aghọta ya karị. Nke a pụrụ inyere mmadụ nile aka ijere Chineke ozi dị nsọ.

Wallace Liverance, bụ́ onye na-edeba aha n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, kwuru okwu ikpeazụ n’usoro okwu ndị ahụ. Isiokwu ya bụ “Na-achụrụnụ Chineke Ekele Dị Ka Àjà.” Ọ dọọrọ uche ndị na-ege ntị gaa n’ihe ndekọ ahụ kwuru banyere ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ ndị ekpenta iri. (Luk 17:11–19) Ọ bụ nanị otu laghachiri iji nye Chineke otuto ma kelee Jisọs. “Obi abụọ adịghị ya na ndị ọzọ nwere mkpali na ha adịla ọcha. Ha nwere obi ụtọ na ha adịla ọcha, ma o yiri ka nanị ihe ha chọrọ ọ̀ bụ ka onye nchụàjà kwupụta na ha adịla ọcha,” ka Nwanna Liverance kwuru. Nsacha ime mmụọ nke na-esite n’ịmụta eziokwu ahụ, tinyere ekele, kwesịrị ịkwali mmadụ ikele Chineke maka ịdị mma ya. A gbara ụmụ akwụkwọ nke klas nke 108 nke Gilead ume ịtụgharị uche n’ọrụ na n’ịdị mma nile nke Chineke iji mee ka ozi na àjà ha bụrụ ihe na-egosipụta ekele ha nwere n’ebe Chineke nọ.—Abụ Ọma 50:14, 23; 116:12, 17.

Ahụmahụ na Ajụjụ Ọnụ Banyere Otú E Si Eme Ya

Mark Noumair, onye nkụzi ọzọ nke Gilead, duziri akụkụ sochirinụ n’usoro ihe omume ahụ. O hiwere isi n’ahụmahụ ụmụ klas ahụ nwere n’ozi ubi n’oge a na-enye ha ọzụzụ. Ná nkezi, ụmụ akwụkwọ ahụ etinyewo ihe dị ka afọ 12 n’ozi oge nile tupu ha abịa Gilead. Ka ha nọ n’ụlọ akwụkwọ, ha so ọtụtụ ndị a zụlitere n’ụzọ dịgasị iche malite ọmụmụ Bible, na-egosi na ụmụ akwụkwọ ahụ maara otú e si ‘aghọ ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ.’—1 Ndị Kọrint 9:22.

Mgbe ụmụ akwụkwọ ahụ kọsịrị ahụmahụ ha, Charles Molohan na William Samuelson gbara ụfọdụ ndị òtù ezinụlọ Betel na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị bụ́ ndị gụrụ akwụkwọ na Gilead, ajụjụ ọnụ. Otu n’ime ụmụnna nwoke a gbara ajụjụ ọnụ, bụ́ Robert Pevy, jere ozi na Philippines mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na klas nke 51 nke Gilead. O chetaara klas ahụ, sị: “Mgbe ọ bụla e nwere nsogbu, onye ọ bụla na-ekwu echiche ya banyere otú a ga-esi edozi nsogbu ahụ. Mgbe nile, a na-enwe onye ga-aka gị echeta ihe, onye echiche ya ga-aka mma. Ma ọ bụrụ na unu eleba anya n’ime Bible ma gbalịa ịmara ihe bụ́ echiche Chineke n’okwu ahụ, ọ dịghị onye echiche ya ga-aka nke ahụ mma. Nke ahụ ga-abụ ezi ihe ngwọta ya mgbe nile.”

Iji weta ọmarịcha ihe omume ime mmụọ ahụ ná njedebe, John Barr, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Na-ejerenụ Jehova Ozi Dị Nsọ Bụ́ nke Ọ Na-anara nke Ọma.” O gosipụtara otú a pụrụ isi jee ozi dị nsọ n’ozi ubi iji nyere ndị obi ha ziri ezi aka ife Chineke ofufe n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. Mgbe ọ gụsịrị okwu Jisọs dị na Matiu 4:10, Nwanna Barr kwuru, sị, “Ọ bụrụ na anyị gaje ife nanị Jehova ofufe, anyị aghaghị ịjụ ụdị nile zoro ezo nke ikpere arụsị, dị ka anyaukwu, ọchịchọ ịba ọgaranya, na mmadụ ibuli onwe ya elu. Lee ka o si eme anyị obi ụtọ icheta na ndị ozi ala ọzọ anyị, malite n’afọ ndị 1940 ruo ugbu a, enwewo ihe ndekọ magburu onwe ya n’akụkụ a! Anyị nwekwara obi ike na unu ndị gụsịrị akwụkwọ na klas nke 108 nke Gilead ga-agbaso ezi ihe nlereanya ha. Unu na-aga ijere Jehova ozi dị nsọ, bụ́ onye nanị ya ruru eru inweta ya.”

Nke ahụ bụ otú e si weta ihe omume ahụ na-ewuli elu ná njedebe n’ụzọ dị mma. Oge ruziri maka ịnụ ozi ekele sitere n’aka ndị na-echere ha echiche ọma gburugburu ụwa, maka inye ha diplọma ha, nakwa maka ịgụ akwụkwọ ozi klas ahụ dere, bụ́ ebe ha kwupụtara ekele ha nwere maka ọzụzụ e nyere ha. A gbara klas ahụ na-agụsị akwụkwọ ume igosipụta àgwà nke ịnọgidesi ike n’ọrụ e nyere ha nakwa n’ijere Jehova ozi. Ndị nile bịaranụ, gụnyere ndị ọbịa si mba 25, sonyere n’iji abụ na ekpere mechie usoro ihe omume ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Ebe a nọ mee ihe omume ahụ e mere na March 11, 2000, bụ n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower nke dị na Patterson, New York.

[Igbe dị na peeji nke 23]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 10

Ọnụ ọgụgụ mba ndị e zigara ha: 17

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 46

Nkezi afọ ndụ ha: 34

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12

[Foto dị na peeji nke 24]

Klas nke 108 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Amadori, E.; Cook, O.; Byrne, M.; Lee, A. (2) Newsome, D.; Pederzolli, A.; Bigras, H.; Kato, T.; Gatewood, D. (3) Eade, D.; Eade, J.; Wells, S.; Jamison, J.; Gonzales, M.; Gonzales, J. (4) Kato, T.; Lohn, D.; Niklaus, Y.; Preiss, S.; Foster, P.; Ibarra, J. (5) Amadori, M.; Manning, M.; James, M.; Boström, A.; Gatewood, B.; Newsome, D. (6) Foster, B.; Jamison, R.; Hifinger, A.; Koffel, C.; Koffel, T.; Byrne, G. (7) Hifinger, K.; Manning, C.; Cook, J.; Boström, J.; Lohn, E.; Pederzolli, A. (8) James, A.; Wells, L.; Preiss, D.; Niklaus, E.; Lee, M.; Ibarra, P.; Bigras, Y.