Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ndịàmà Jehova hà na-anabata ọgwụ ọ bụla e si n’ọbara nweta?
Azịza bụ́ isi bụ na Ndịàmà Jehova adịghị anabata ọbara. Anyị kwenyesiri ike na iwu Chineke banyere ọbara abụghị ihe a pụrụ ịgbanwegharị iji kwekọọ n’echiche ndị na-agbanwe agbanwe. Ma, okwu ndị ọzọ na-ebilite n’ihi na a pụziri isi n’ọbara wepụtagasịa ihe anọ bụ́ isi mejupụtara ya nakwa ụmụ irighiri ihe ndị dị n’ihe ndị ahụ mejupụtara ya. N’ikpebi ma ọ̀ ga-anara ihe ndị dị otú ahụ, onye Kraịst ekwesịghị ịtụle nanị abamuru na ihe ize ndụ ga-esi na ya pụta n’ụzọ ahụ ike. Nchegbu ya kwesịrị ịbụ ihe Bible na-ekwu na mmetụta ọ pụrụ inwe ná mmekọrịta ya na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile.
Isi ihe ndị a na-ekwu banyere ha dị nnọọ mfe. Dị ka ihe enyemaka iji hụ ihe mere o ji dị otú ahụ, tụlee ihe ọmụma ụfọdụ dabeere na Bible, n’akụkọ ihe mere eme, na n’ịgwọ ọrịa.
Jehova Chineke gwara nna nna anyị bụ́ Noa na a ghaghị ile ọbara anya dị ka ihe pụrụ iche. (Jenesis 9:3, 4) Ka e mesịrị, iwu Chineke nyere Israel gosipụtara ịdị nsọ nke ọbara: “Ọzọ, nwoke ọ bụla nke sitere n’ụlọ Israel, ma ọ bụ ná ndị ọbịa . . . nke na-eri ọbara ọ bụla; M ga-echekwa ihu m megide mmadụ ahụ nke na-eri ọbara.” Site n’ịjụ irubere iwu Chineke isi, onye Israel pụrụ imerụ ndị ọzọ; ya mere, Chineke gbakwụnyere, sị: “M ga-ebipụkwa ya n’etiti ndị ya.” (Levitikọs 17:10) E mesịa, ná nzukọ ndị ozi na ndị okenye nwere na Jerusalem, ha nyere iwu na anyị aghaghị ‘ịhapụ ọbara.’ Ime otú ahụ dị mkpa dị nnọọ ka izere mmekọahụ rụrụ arụ na ịkwa iko dị.—Ọrụ 15:28, 29.
Gịnị ka ‘ịhapụ’ pụrụ ịpụtawo laa azụ n’oge ahụ? Ndị Kraịst erighị ọbara, ma ọ̀ ka dị ọhụrụ ma ọ kpụkọtawo akpụkọta; ha erighịkwa anụ a na-afụghị mma. Ihe ọzọ a na-agaghị eri bụ nri e tinyere ọbara, dị ka ngwọngwọ ọbara. Iri ọbara n’ụzọ nke ọ bụla n’ime ndị ahụ ga-abụ imebi iwu Chineke.—1 Samuel 14:32, 33.
Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị mmadụ n’oge ochie agaghị echegbuworị onwe ha banyere iri ọbara, dị ka anyị pụrụ ịhụ site n’ihe odide Tertullian (narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A.). N’ịzaghachi ebubo ụgha bụ́ na ndị Kraịst riri ọbara, Tertullian kpọtụrụ aha ebo ndị mere ka nkwekọrịta ha sie ike site n’ịratụ ọbara. O kwukwara na “mgbe a na-eme ihe ngosi n’ọgbọ egwuregwu, [ụfọdụ] bụ́ ndị nwere oké akpịrị ịkpọ nkụ na-ewere ọbara ka gbapụtara ọhụrụ n’ahụ ndị ikpe mara . . . dị ka ihe ngwọta maka àkwụ́kwụ̀ ha.”
Omume ndị ahụ (ya bụrụgodị na ndị Rom ụfọdụ mere ha n’ihi ahụ ike) ezighị ezi nye ndị Kraịst: “Anyị adịghị etinye ọbụna ọbara anụmanụ n’ihe oriri anyị,” ka Tertullian dere. Ndị Rom jiri nri e tinyere ọbara mee ihe iji lee iguzosi ike n’ezi ihe nke ezi ndị Kraịst ule. Tertullian gbakwụnyere, sị: “Ugbu a, ana m ajụ unu, a ga-akpọ nke a gịnị, na unu maara nke ọma [na ndị Kraịst] ga-eji oké ịsọ oyi jụ ọbara ụmụ anụmanụ ma ka na-eche na ọbara mmadụ ga-agụ ha agụụ?”
Taa, ọ bụ mmadụ ole na ole ga-eche na o megidere iwu Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ma ọ bụrụ na onye dọkịta atụọ aro ka ha nara ọbara. N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova chọrọ ịnọgide na-adị ndụ n’ezie, anyị kpebisiri ike irubere iwu Jehova banyere ọbara isi. Gịnị ka nke a pụtara n’iburu n’uche ihe ndị a na-eme maka ahụ ike n’oge a?
Ka mmịnye ọbara n’ozuzu ya ghọrọ ihe a na-emekarị mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, Ndịàmà Jehova hụrụ na nke a megidere iwu Chineke—anyị ka kwekwara na nke ahụ. Ma, ụzọ ịgwọ ọrịa agbanwewo ka oge na-aga. Taa, ihe ka ọtụtụ n’ọbara ndị a na-amịnye abụghị ọbara n’ozuzu ya kama ọ bụ otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ya: (1) mkpụrụ ndụ ọbara uhie; (2) mkpụrụ ndụ ọbara ọcha; (3) platelet; (4) plasma (serum), akụkụ dị mmiri mmiri. Na-adabere n’ọnọdụ onye ọrịa nọ na ya, ndị dọkịta pụrụ ikwu ka e nye ya mkpụrụ ndụ ọbara uhie, mkpụrụ ndụ ọbara ọcha, platelet, ma ọ bụ plasma. Ịmịnye ihe ndị a bụ́ isi mejupụtara ọbara na-eme ka e nwee ike ikegasị otu ọbara n’ahụ ihe ka ọtụtụ ná ndị ọrịa. Ndịàmà Jehova kweere na ịnara mmịnye nke ọbara n’ozuzu ya ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime ihe anọ ahụ bụ́ isi mejupụtara ya na-emebi iwu Chineke. N’ụzọ dị ịrịba ama, ịnọgide na-enwe nguzo a dabeere na Bible echebewo ha pụọ n’ọtụtụ ihe ize ndụ, gụnyere ọrịa ndị dị ka ịba ọcha n’anya na AIDS, bụ́ ndị a pụrụ ibute site n’ọbara.
Otú ọ dị, ebe ọ bụ na a pụrụ isi n’ọbara wepụta ihe ndị ọzọ ma e wezụga ihe ndị ahụ bụ́ isi mejupụtara ya, a na-ajụ ọtụtụ ajụjụ banyere ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ a na-enweta site n’ihe ndị ahụ bụ́ isi mejupụtara ọbara. Olee otú e si eji ụmụ irighiri ihe ndị ahụ eme ihe, gịnịkwa ka onye Kraịst kwesịrị ịtụle mgbe ọ na-eme mkpebi banyere ha?
Ọ bụ ọtụtụ ihe mejupụtara ọbara. Ọbụna plasma *
—nke pasent 90 ya bụ mmiri—nwere imerime mmiri ọgwụ ahụ bụ́ hormone, nnu anụ ahụ, enzyme, na ihe ndị na-edozi ahụ, gụnyere mineral na shuga. Plasma na-ebukwa protein ndị dị ka albumin, ihe ndị na-eme ka ọbara kpụkọọ akpụkọọ, nakwa ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ. Ndị ọkachamara na-ekewapụta ọtụtụ protein ndị dị na plasma ma jiri ha mee ihe. Dị ka ihe atụ, e nyewo ndị ọbara ha na-adịghị akpụkọ ngwa ngwa bụ́ ndị ahụ ha na-agba ọbara n’ụzọ dị mfe, ihe na-akpụkọ ọbara bụ́ VIII. Ma ọ bụ ọ bụrụ na e kpughepụrụ mmadụ nye ọrịa ụfọdụ, ndị dọkịta pụrụ ịtụ aro ka a gbaa ya ọgwụ gamma globulin, bụ́ nke e si na plasma ọbara nke ndị nwererịị ihe ndị na-alụso ọrịa ndị ahụ ọgụ nweta. A na-eji protein ndị ọzọ dị na plasma eme ihe n’ịgwọ ọrịa, ma nke a kpọtụrụ aha n’elu na-egosipụta otú a pụrụ isi wepụta ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ site n’otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara (plasma).Dị nnọọ ka a pụrụ isi na mmiri ọbara (plasma) nweta ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ, a pụrụ ikewasị ihe ndị ọzọ bụ́ isi mejupụtara ọbara (mkpụrụ ndụ ọbara uhie, mkpụrụ ndụ ọbara ọcha, platelet) iji wepụtagasịa obere akụkụ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, mkpụrụ ndụ ọbara ọcha pụrụ ịbụ ebe e si enweta ọgwụ ndị bụ́ interferon na interleukin, bụ́ ndị e ji agwọ ọrịa ndị e butere site na nje virus nakwa ọrịa cancer. A pụrụ isi na platelet nweta ihe e ji agwọ ọnyá. A na-emepụtakwa ọgwụ ndị ọzọ bụ́ ndị e tinyere (ma ọ dịghị ihe ọzọ ná mmalite) ihe ndị e nwetara site n’ihe ndị mejupụtara ọbara. Usoro ọgwụgwọ ndị dị otú ahụ abụghị mmịnye nke ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara; ha na-agụnyekarị ụmụ irighiri ihe ndị e si na ha nweta. Ndị Kraịst hà kwesịrị ịnara ụmụ irighiri ihe ndị a e si n’ọbara nweta, mgbe a na-agwọ ha ọrịa? Anyị apụghị ikwu. Bible enyeghị nkọwa zuru ezu, ya mere onye Kraịst aghaghị ime mkpebi nke ya dabere n’akọ na uche ya n’ihu Chineke.
Ụfọdụ ndị pụrụ ịjụ ihe ọ bụla e si n’ọbara nweta (ọbụna ụmụ irighiri ihe ndị e zubere ka ha lụsoo ọrịa ọgụ ruo nwa oge). Otú ahụ ka ha si ghọta iwu Chineke bụ́ ‘ịhapụ ọbara.’ Ha na-ekwubi na iwu o nyere ụmụ Israel chọrọ ka ‘a wụsị ọbara e wepụtara site n’ihe e kere eke n’ala.’ (Deuterọnọmi 12:22-24) N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị mkpa? Imepụta ọgwụ ndị bụ́ gamma globulin, ọgwụ ndị na-eme ka ọbara kpụkọọ bụ́ ndị e ji ọbara mee, nakwa ihe ndị ọzọ, chọrọ ka e weta ọbara ma yọchaa ya. N’ihi ya, ndị Kraịst ụfọdụ na-ajụ ọgwụ ndị dị otú ahụ dị nnọọ ka ha na-ajụ mmịnye nke ọbara n’ozuzu ya ma ọ bụ ihe anọ bụ́ isi mejupụtara ya. E kwesịrị ịkwanyere nguzo ha sitere n’ezi obi bụ́ nke dabeere n’akọ na uche ùgwù.
Ndị Kraịst ndị ọzọ na-eme mkpebi dị iche. Ha onwe ha kwa na-ajụ mmịnye nke ọbara n’ozuzu ya, mkpụrụ ndụ ọbara uhie, mkpụrụ ndụ ọbara ọcha, platelet, ma ọ bụ plasma. Ma, ha pụrụ ikwe ka onye dọkịta jiri ụmụ irighiri ihe ndị e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara nweta, gwọọ ha. Ọbụna a pụrụ inwe ndịrịta iche n’ebe a. Otu onye Kraịst pụrụ ịnakwere ọgwụ ọgbụgba bụ́ gamma globulin, ma o nwere ike ikwe ma ọ bụ ghara ikwe ka a gbaa ya ọgwụ nwere ihe e si ná mkpụrụ ndụ ọbara uhie ma ọ bụ mkpụrụ ndụ ọbara ọcha nweta. Otú ọ dị, n’ozuzu ya, gịnị pụrụ iduga ndị Kraịst ụfọdụ ikwubi na ha pụrụ ịnara ụmụ irighiri ihe ndị e si n’ọbara nweta?
“Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche nke June 1, 1990, na-ekwu na protein ndị dị na plasma (irighiri ihe dị n’otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara) na-esite n’ọbara nwanyị dị ime baa n’usoro ọbara dịpụrụ iche nke nwa o bu n’afọ. Ya mere nne na-ebufere nwa ya immunoglobulin, na-enye ya ihe ndị dị mkpa na-alụso ọrịa ọgụ. N’ụzọ dịpụrụ iche, ka mkpụrụ ndụ ọbara uhie nke nwa ọhụrụ na-anọzu oge ha kwesịrị ịnọru, a na-ayọcha akụkụ ndị na-ebugharị oxygen. Ụfọdụ n’ime ya na-aghọ bilirubin, bụ́ nke na-esite n’ichi jikọtara nwanyị na nwa o bu n’afọ banye n’ahụ nne ya, a na-ewepụkwa nke a site n’ihe ndị nne ahụ na-anyụpụta n’ahụ ya. Ụfọdụ ndị Kraịst pụrụ ikwubi na ebe ọ bụ na ụmụ irighiri ihe ndị si n’ọbara pụrụ ịbanye n’ahụ onye ọzọ n’ụzọ a nke kwekọrọ n’okike, ha pụrụ ịnara ụmụ irighiri ihe ndị e si n’ọbara plasma ma ọ bụ mkpụrụ ndụ ọbara nweta.
Eziokwu ahụ bụ́ na echiche na mkpebi ndị dabeere n’akọ n’uche pụrụ ịdịrịta iche ọ̀ pụtara na okwu a bụ nke na-adịghị mkpa? Ee e. Ọ bụ okwu siri ike. Ma, e nwere ihe ndị bụ́ isi dị mfe. Ihe e kwuru n’elu na-egosi na Ndịàmà Jehova na-ajụ ma mmịnye nke ọbara n’ozuzu ya ma nke ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara. Bible na-agwa ndị Kraịst ka ha “hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, . . na ịkwa iko.” (Ọrụ 15:29) E wezụga nke ahụ, mgbe a bịara n’ụmụ irighiri ihe ndị sitere na nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ bụ́ isi mejupụtara ya, onye Kraịst nke ọ bụla, mgbe o jisịrị nlezianya na ekpere tụgharịa uche, aghaghị iji akọ na uche meere onwe ya mkpebi.
Ọtụtụ mmadụ ga-adị njikere ịnara usoro ọgwụgwọ ọ bụla nke yiri ka ọ̀ ga-abara ha uru ngwa ngwa, ọbụna usoro ọgwụgwọ ndị a maara na ha nwere ihe ize ndụ ahụ ike, dị ka ọ dị n’ebe ihe ndị e si n’ọbara nweta dị. Onye Kraịst nwere obi eziokwu na-agbalị inwe echiche sakwuru mbara, na nke kakwa guzozie eguzozi, bụ́ nke gụnyere ihe karịrị nanị ihe ndị metụtara anụ ahụ. Ndịàmà Jehova na-enwe ekele maka mgbalị ndị a na-eme iji nye nlekọta ahụ ike dị mma, ha na-atụkwa uru na ọghọm dị n’ọgwụgwọ ọ bụla n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Otú ọ dị, mgbe a bịara n’ihe ndị e nwetara site n’ọbara, ha na-eji nlezianya atụle ihe Chineke na-ekwu nakwa mmekọrịta ha na Onye Na-enye anyị Ndụ.—Abụ Ọma 36:9.
Lee ngọzi ọ bụụrụ onye Kraịst inwe obi ike dị ka ọbụ abụ ahụ nwere, bụ́ onye dere, sị: “Anyanwụ na ọta ka Jehova, bụ́ Chineke, bụ: amara na nsọpụrụ ka Jehova ga-enye: Ọ gaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu okè nọ. Jehova . . . , onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị obi na Gị”!—Abụ Ọma 84:11, 12.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke June 15, 1978 (Bekee), na nke October 1, 1994. Ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ emepụtawo ọgwụ ndị a na-esighị n’ọbara nweta bụ́kwa ndị a pụrụ ikwu ka e jiri mee ihe n’ọnọdụ ụmụ irighiri ihe ndị e si n’ọbara nweta bụ́ ndị e jiworo mee ihe n’oge gara aga.
[Igbe dị na peeji nke 30]
AJỤJỤ NDỊ A TỤRỤ ARO KA Ị JỤỌ ONYE DỌKỊTA
Ọ bụrụ na a na-aga ịwa gị ahụ ma ọ bụ inye gị ọgwụgwọ ndị pụrụ ịgụnye ihe ndị e si n’ọbara nweta, jụọ, sị:
Ndị ọrụ ahụ ike nile na-aga inye m ọgwụgwọ hà maara na, dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ekwuru m ka a ghara ịmịnye m ọbara (ọbara n’ozuzu ya, mkpụrụ ndụ ọbara uhie, mkpụrụ ndụ ọbara ọcha, platelet, ma ọ bụ plasma) n’ọnọdụ ọ bụla?
Ọ bụrụ na ọgwụ ọ bụla a pụrụ ịsị ka e nye gị pụrụ ịbụ nke e si n’ọbara “plasma,” mkpụrụ ndụ ọbara uhie ma ọ bụ nke ọcha, ma ọ bụ “platelet” nweta, jụọ, sị:
E si n’ihe anọ bụ́ isi mejupụtara ọbara mepụta ọgwụ a? Ya bụrụ otú ahụ, ị̀ ga-akọwara m ihe ndị mejupụtara ya?
Ókè hà aṅaa ka a pụrụ inyeru m ọgwụ a e si n’ọbara nweta, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
Ọ bụrụ na akọ na uche ekwe m ka m nara ọgwụ a sitere n’ụmụ irighiri ihe e si n’ọbara nweta, ihe ize ndụ ahụ ike ndị dị aṅaa dị na ya?
Ọ bụrụ na akọ na uche m akpalie m ịjụ ọgwụ a sitere n’ụmụ irighiri ihe e si n’ọbara nweta, olee usoro ọgwụgwọ ọzọ a pụrụ iji mee ihe?
Mgbe m tụlekwusịrị ihe a, olee mgbe m nwere ike ịgwa gị mkpebi m?