Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ Zuru Okè Abụghị Nrọ Nkịtị!

Ndụ Zuru Okè Abụghị Nrọ Nkịtị!

Ndụ Zuru Okè Abụghị Nrọ Nkịtị!

Ụwa zuru okè—gịnị ka ọ pụtara nye gị? Cheedị banyere ọha mmadụ, ebe mpụ, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ụnwụ nri, ịda ogbenye, ma ọ bụ ikpe na-ezighị ezi na-adịghị. Mmadụ nile nwere ezi ahụ ike nke uche na nke anụ ahụ. Iru újú ma ọ bụ obi ilu adịghị n’ihi na e wepụwo ọbụna ọnwụ. Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya inwe agụụ maka ụwa dị otú ahụ?

Ọ BỤ ezie na ha adịghị eleghara ọganihu nke sayensị na nkà na ụzụ anya, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ekweghị n’ezie na ọgụgụ isi ma ọ bụ mmụta nke mmadụ ga-eweta ụwa zuru okè, ebe mmadụ nile ga-ebi n’udo na n’obi ụtọ. N’aka nke ọzọ, a pụghị ịgọnahụ na ọchịchọ mmadụ na-abụ ime ka ihe ka mma na imezi ihe ndị na-ezughị okè. N’ezie, ịrọ nrọ nkịtị na-agaghị eme eme agaghị enyere ndị na-enweghị ebe obibi na ndị ogbenye aka, ọ gaghịkwa eme ka ndị nwere nkwarụ na ndị ọrịa bụ́ ndị ọ na-agụ agụụ inwere onwe ha pụọ ná nhụjuanya ha, nwee afọ ojuju. Ụwa zuru okè agaghị abịa nnọọ site na nkà nchepụta ihe mmadụ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nhụsianya na mmegbu dị ugbu a, e nwere ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ mere ị ga-eji kwere na ụwa nke ị ga-akpọ nke zuru okè dị nso n’ezie.

Mgbe ị na-eche banyere ndụ zuru okè, ndụ Jisọs Kraịst pụrụ ịgbabata gị n’uche. Ọ bụghị nanị Jisọs bụ mmadụ zuru okè bitụworo n’ụwa. Adam na Iv, bụ́ ndị e kere n’onyinyo Chineke, biri ndụ zuru okè n’ime paradaịs. Otú ọ dị, ha tụfuru ọnọdụ a magburu onwe ya n’ihi nnupụisi ha megide Nna ha nke eluigwe. (Jenesis 3:1–6) Otú ọ dị, Onye Okike tinyere ọchịchọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụmụ mmadụ. Eklisiastis 3:11 na-agba akaebe nke ahụ: “Ihe nile ọ bụla ka [Chineke] meworo ka ọ maa mma na mgbe ya: ọzọ, mgbe ebighị ebi ka O tinyeworo n’obi ha, ma ka O si tinye ya mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke rụworo site ná mmalite wee ruo na nsọtụ.”

N’agbanyeghị na ezughị okè na mmehie dubara ihe a kpọrọ mmadụ ná ndụ “ihe efu” na “n’ịbụ ohu mmebi,” rịba okwu nkasi obi Pọl onyeozi ama: “Olileanya siri ike nke ihe nile e kere eke na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike. N’ihi na e doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu, ọ bụghị na ọ chọrọ ya, kama n’ihi Onye ahụ Nke doro ya n’okpuru ya n’olileanya; n’ihi na a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:19–21) Bible na-eme ka o doo anya na Chineke si n’aka Jisọs Kraịst mee ndokwa maka iweghachi ndụ mmadụ zuru okè.—Jọn 3:16; 17:3.

Tụkwasị n’olileanya a dị ebube maka ọdịnihu, anyị nile nwere ikike nke inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, na-eme ka ọganihu anyị pụta ìhè ọbụna ugbu a.

Gbalịa Inwe Ezi Uche

Jisọs Kraịst weere okwu banyere izu okè dị ka ihe dị nnọọ mkpa nke na ọ gwara ìgwè mmadụ na-ege ya ntị, sị: “Unu onwe unu ga-ezu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.” (Matiu 5:48) Jisọs ọ̀ na-atụ anya n’ezie ka anyị ghara inwe ntụpọ n’ajọ usoro ihe dị ugbu a? Ee e. N’ezie, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịzụlite àgwà nke mmesapụ aka, obiọma, na ịhụnanya n’ebe ụmụ mmadụ ibe anyị nọ, ma ọtụtụ mgbe anyị adịghị eme ihe ziri ezi. Ọbụna otu n’ime ndị ozi Jisọs dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa Onye ezi omume, ka O wee gbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume nile. Ọ bụrụ na anyị asị na ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị mehiere, anyị na-eme Ya onye ụgha, okwu Ya adịghịkwa n’ime anyị.”—1 Jọn 1:9, 10.

Otú o sina dị, anyị pụrụ ime ka ụzọ anyị si ele onwe anyị anya ma na-emeso ndị ọzọ ihe ka mma, na-ezere imebiga ihe ókè. Ònye pụrụ ịchọta ihe dị mma ime iji zụlite àgwà ziri ezi na nke ezi uche dị na ya karịa nke ahụ a na-achọta n’Okwu Chineke, bụ́ Bible? Ịzụlite àgwà ndị dị ka ọṅụ na imeru ihe n’ókè ga-enyere anyị aka n’iso ndị ọzọ nọ n’ụlọ ọrụ anyị, di ma ọ bụ nwunye anyị, na ndị mụrụ anyị ma ọ bụ ụmụ anyị, na-emekọ ihe. Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ. Meenụ ka mmadụ nile mara [ezi uche, NW] unu.”—Ndị Filipaị 4:4, 5.

Abamuru Ndị Dị n’Inwe Ezi Uche

Mgbe i ji ezi uche na-enwe atụmanya ma na-ezere àgwà ịchọkarị izu okè bụ́ nke na-akpata mmadụ imekpa onwe ya ahụ na imegide onwe ya, ị na-abara onwe gị nakwa ndị ọzọ uru. Ịmara ihe ị pụrụ ime n’ezie na-agụnye ma ime atụmatụ ihe a ga-emeli emeli ma inwe ezi uche banyere ihe ị chọrọ ime. Cheta, Chineke kere anyị ibi n’ụwa na inweta afọ ojuju n’ọrụ nwere nzube bụ́ nke ga-abara anyị na ndị ọzọ uru.—Jenesis 2:7–9.

Ọ bụrụ na ị nọwo na-achọ ihe gabigara ókè n’aka onwe gị, gịnị ma ị gakwuru Jehova n’ekpere? Inweta ihu ọma Chineke ga-ewetara gị ahụ efe dị ukwuu. Jehova maara ihe mejupụtara anyị na ọnọdụ ezughị okè anyị, n’ihi ya ọ bụghị onye na-enweghị ezi uche ma ọ bụ onye ọ na-esi ike ime obi ụtọ. Ọbụ abụ ahụ na-emesi anyị obi ike, sị: “Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya. N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:13, 14) Lee ekele anyị pụrụ inwe na Chineke na-emeso ụmụ mmadụ ihe n’ụzọ obi ebere dị otú ahụ! Ọ maara erughị eru anyị, ma anyị pụrụ ịdị oké ọnụ ahịa n’anya ya dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.

Kama ịchọkarị izu okè, lee ka o si bụrụ ihe amamihe ka dịrị na ya ịzụlite nghọta ime mmụọ na echiche ziri ezi! Ọzọkwa, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ dịghị onye pụrụ igbochi Jehova imezu nzube ya bụ́ ibuli ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’izu okè n’okpuru Alaeze Chineke. Ma gịnị ka izu okè mmadụ pụtara?

Ndụ Zuru Okè Dị Mma Karịa Àgwà Ịchọkarị Izu Okè

Izu okè apụtaghị ịbụ onye na-achọkarị izu okè. N’ezie, ndị ga-enwe ihe ùgwù nke ịdị ndụ n’ime Paradaịs n’elu ụwa n’okpuru Alaeze Chineke agaghị abụ ndị na-achọ oké ihe n’aka ndị ọzọ na ndị ezi omume n’anya onwe ha. Otu n’ime ihe ndị a chọrọ maka ịlanarị oké mkpagbu ahụ bụ ekele sitere n’ezi obi maka àjà mgbapụta ahụ, dị ka oké ìgwè mmadụ ahụ sitere ná mba nile bụ́ ndị Jọn onyeozi kọwara si kwupụta ya: “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:9, 10, 14) Ndị nile ga-alanarị oké mkpagbu ahụ na-abịanụ ga-enwe ekele na Kraịst ji ọchịchọ obi nwụọ n’ihi ha na ndị nile na-egosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ. Àjà ịhụnanya ya na-enye ihe ndabere maka ịnapụta ha n’ụzọ na-adịgide adịgide pụọ n’ezughị okè na adịghị ike ha.—Jọn 3:16; Ndị Rom 8:21, 22.

Gịnị ka ndụ zuru okè ga-adị ka ya? Kama ịsọ mpi na iji ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-enwe oké ọchịchọ, ịhụnanya na obiọma n’etiti ụmụ mmadụ ga-eme ka ndụ dị ụtọ obibi, na-ewepụ nchegbu na inwe ùgwù dị ala. Ma, ndụ zuru okè agaghị na-agwụ ike ma ọ bụ na-agbụ agbụ. Okwu Chineke akọwaghị ihe nile banyere Paradaịs ma ọ na-akọwa ụdị ndụ anyị pụrụ ịtụ anya ya: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri.”—Aịsaịa 65:21–23.

Kama ịnọ na-eche banyere ụdị ntụrụndụ, ụlọ azụmahịa, nkà na ụzụ, ma ọ bụ usoro ime njem ndị Alaeze ahụ ga-eweta, were anya nke uche gị hụ ebe ị na-anụ ụtọ mmezu nke okwu ndị a: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-atakọ nri n’otu, ọdụm ga-atakwa ahịhịa dị ka ehi: ma agwọ, ájá ga-abụ nri ya. Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile, ka Jehova sịrị.” (Aịsaịa 65:25) Lee ka ndụ zuru okè ga-esi dị iche n’ihe ị na-ahụ taa! Ọ bụrụ na i soro n’etiti ndị a ga-ewere dị ka ndị ruru eru ibi ndụ n’oge ahụ, ị ga-enwe ihe mere ị ga-eji enwe obi ike na Nna gị nke eluigwe na-ahụ n’anya ga-enwe mmasị n’ebe gị na ezinụlọ gị nọ. “Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ; Ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.”—Abụ Ọma 37:4.

Ndụ zuru okè abụghị nrọ nkịtị. A ga-emezu nzube ịhụnanya Jehova maka ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ zuru ezu. Gị na ezinụlọ gị pụrụ iso ná ndị a ga-eweli gaa n’izu okè mmadụ ma biri n’ụwa ọhụrụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Bible na-ebu amụma, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

[Foto dị na peeji nke 6]

Anyị pụrụ ime ka ụzọ anyị si ele onwe anyị na ndị ọzọ anya ka mma, na-ezere àgwà ịchọkarị izu oké ma ọ bụ àgwà inyochasị ihe nile

[Foto dị na peeji nke 7]

Gịnị ma i were anya nke uche gị hụ ka ị nọ n’ọnọdụ udo na nke ezi omume n’ime Paradaịs?