Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Merie Àgwà nke Ịchọkarị Izu Okè?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Merie Àgwà nke Ịchọkarị Izu Okè?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Merie Àgwà nke Ịchọkarị Izu Okè?

Ị̀ na-agbalịsi ike mgbe dum ime nnọọ ike gị nile? O doro anya na ime otú ahụ pụrụ ịbara gị na ndị nọ gị gburugburu uru n’ọtụtụ ụzọ. N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị emebigawo ihe ókè ma ghọọ ndị na-achọkarị izu okè. Gịnị ka nke ahụ pụtara?

OTU ihe okwu ahụ bụ́ “ịchọkarị izu okè” pụtara bụ “àgwà nke iwere ihe ọ bụla na-ezughị okè dị ka ihe a na-apụghị ịnakwere anakwere.” Ikekwe i zutewo ndị nwere àgwà ahụ. Ị pụrụ ịhụ na ihe ndị gabigara ókè ha na-achọ n’aka ndị ọzọ pụrụ iweta ọtụtụ nsogbu, na-eme ka e nwee ọnọdụ na-akpata enweghị afọ ojuju na nkụda mmụọ. Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-emeru ihe n’ókè na-achọpụta na àgwà ịchọkarị izu okè n’echiche nke ịchọ ihe gabigara ókè na ihe ezi uche na-adịghị na ya n’ebe ihe nile a na-eme ná ndụ dị, abụghị ihe kwesịrị ekwesị n’ezie. Ọ bụ ihe e kwesịrị imeri emeri. Otú ọ dị, otu nsogbu dịnụ bụ na a bịa n’àgwà ma ọ bụ n’ọnọdụ uche anyị, ọ pụrụ isiri anyị ike ịchọpụta na anyị nwere àgwà nke ịchọkarị izu okè dị otú ahụ, n’ihi ya, imeri ya bụ ihe ịma aka.

Nelson nwere ibu ọrụ dị ukwuu na ọtụtụ nsogbu idozi. Ọ na-atụlekarị ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ, imepụta ihe bụkwaara ya ihe kasị mkpa. Mgbe mgbe a na-ahụ àgwà nke ịchọkarị izu okè dị ka ihe dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ a na-asọrịta mpi na ya. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị pụrụ inwe mmasị na nkà Nelson, ọchịchọ ọ na-achọkarị izu okè wetaara ya nsogbu ahụ ike, dị ka isi ọwụwa na nchekasị. Ị̀ bụ ụdị mmadụ Nelson?

Àgwà ịchọkarị izu okè na-emetụtakwa ndị na-eto eto. Dị ka nwatakịrị, Rita, bụ́ onye si Rio de Janeiro, nwere mmasị n’ịga akwụkwọ. Ọ gbalịrị ka ọ ghara iyi onye nwere oké ọchịchọ, ma ọ na-enwe nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na ọ gbaghị onye mbụ. Rita na-ekwu, sị: “Site na nwata, ana m eji onwe m atụnyere ndị ọzọ bụ́ ndị nwere oge hiri nne, ebe mụ onwe m na-anọkarị ná nrụgide ma na-eme ihe ọkụ ọkụ. Ọ dịtụghị mgbe m chere na m nwere oge izu ike n’ihi na ọ dịghị mgbe m na-enweghị ihe ndị m na-aghaghị ime.”

Dị ka nwatakịrị nwanyị, Maria na-ebe ákwá n’obi nkoropụ mgbe ọ na-apụghị ise ihe nke ọma dị ka ndị ọzọ na-eme. Ọzọkwa, ka ọ na-achọ ka o zuo okè na nkà ịkụ egwú, ọ na-enwekarị nrụgide na nchegbu kama ịnụ ụtọ egwú ọ na-akụ ma ọ bụ na-agụ. Nwatakịrị nwanyị ọzọ bụ́ onye Brazil, bụ́ Tânia, bụ́ onye gbalịrị inwe ezi uche ma zere asọmpi, kwetara na ya ka na-esetịpụrụ onwe ya ụkpụrụ ndị dị oké elu, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ebe obibi. O chere na ọ gwụla ma ọrụ ya ò zuru okè, ndị mmadụ agaghị enwe mmasị nke ukwuu n’ebe ya nọ. Ọzọkwa, Tânia na-atụ anya ihe dị nnọọ ukwuu n’aka ndị ọzọ, bụ́ nke mere ka o nwee ndakpọ olileanya na obi ilu.

Ọ bụ ezie na inwe ikike, ịdị uchu, na onwe mmadụ iju ya afọ dị mkpa, mmetụta ndị na-ezighị ezi, dị ka ịtụ ụjọ ọdịda, pụrụ ịbụ n’ihi isetịpụrụ onwe onye ihe mgbarụ ọsọ ndị a na-apụghị iru eru. Ndị nne na nna ma ọ bụ ndị ọzọ pụrụ isetịpụ ụkpụrụ ndị chọrọ ime ihe n’izu okè n’ihe omume ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’egwuregwu bụ́ ndị ga-esiri ndị na-eto eto ike iru. Dị ka ihe atụ, nne Ricardo tụrụ anya ihe ndị dị ukwuu n’aka ya, ọ na-achọ ka ọ bụrụ dọkịta, na-akpọ piano, na-asụkwa ọtụtụ asụsụ. Ị̀ pụrụ ịhụ na omume a, ọ bụrụ na e mebiga ya ókè, na-kpata nsogbu ma ọ bụ ndakpọ olileanya?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Zere Àgwà nke Ịchọkarị Izu Okè?

A na-achọsi ọrụ bụ́ ịgba, iru ụkpụrụ ndị dị elu dị ka e si chọọ ha kpọmkwem nakwa n’ụzọ magburu onwe ha, ike. Ya mere, ndị mmadụ aghaghị ịsọrịta mpi n’ọrụ. Isi ihe ọzọ na-eme ka ọtụtụ ndị na-agbalịsikwu ike karị bụ ụjọ nke ịbụ ndị ihe ha ji akpa afọ ha funahụrụ. Ụfọdụ ndị ọrụ na-eyi onye na-eme egwuregwu bụ́ onye na-achụ ihe gabigara ókè n’àjà iji mee ka o mekarịsịa ndị ọzọ. E mesịa, mgbe o chere asọmpi tara akpụ ihu, ọ pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ onye a rụgidere inye onwe ya ọzụzụ ọbụna karị, ikekwe na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe iji nwekwuo ọganihu na—ka ọ na-enwe olileanya inwe—mmeri. Kama ịchụso ihe dị mma n’ụzọ ziri ezi, àgwà ịchọkarị izu okè na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị “ụjọ ọdịda na-akwali” ma ọ bụ ndị “na-achọsi ike ịbụ ndị mbụ.”—The Feeling Good Handbook.

N’eziokwu, ụfọdụ na-eche na ha pụrụ mgbe nile imeziwanye ihe ha pụrụ ime n’ọrụ nkà ma ọ bụ n’egwuregwu. Ma, dị ka Dr. Robert S. Eliot si kwuo, “ịchọkarị izu okè bụ atụmanya a na-apụghị inweta ma ọlị.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ihe mejupụtara ya bụ obi amamikpe, ngọpụrụ onwe onye, na egwu nke ịbụ onye a kwara emo.” N’ihi ya, lee ka okwu Eze Solomọn nwere amamihe si bụrụ eziokwu: “Mụ onwe m wee hụ ndọgbu nile mmadụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, ya na ọrụ nile na-agazi agazi, na ọ bụ n’ihi nke a ka mmadụ ga-abụ onye mmadụ ibe ya ga-ekwoso ekworo. Nke a bụkwa ihe efu na ịchọ ijide ifufe.”—Eklisiastis 4:4.

Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-achọkarị izu okè? Ị̀ na-enwekwu ndakpọ olileanya ka ị na-agbalịsikwu ike? Ị̀ ga-enwe mmasị ịbụ onye na-adịghị achọkarị ihe dị ukwuu n’aka mmadụ ma nwekwuo ahụ iru ala? Gịnị ka izu okè pụtara? Ọ́ dịghị agụ gị agụụ iji ikike gị mee ihe n’ụzọ kasị zuo ezu ma na-ezere àgwà ịchọkarị izu okè? Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ iji ikike Chineke nyere ha chọpụta ihe ndị ga-abara ndị ọzọ uru, cheedị echiche ihe ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ịrụzu n’ọnọdụ zuru okè nakwa ná nduzi Chineke!

[Foto dị na peeji nke 4]

Ndị nne na nna ma ọ bụ ndị ọzọ pụrụ ịchọ izu okè n’aka ndị na-eto eto, bụ́ nke ha na-apụghị iru