Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Nile Bụ Ụmụnna”

“Unu Nile Bụ Ụmụnna”

“Unu Nile Bụ Ụmụnna”

“Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu, Rabaị: n’ihi na otu Onye bụ Onye ozizi unu, ma unu onwe unu nile bụ ụmụnna.”—MATIU 23:8.

1. Olee ihe kwesịrị ka anyị tụlee?

“ÒNYE kwesịrị ka a sọpụrụ ya karị, ọ̀ bụ onye ozi ala ọzọ ka ọ bụ onye Betel?” ka otu nwanyị bụ́ onye Kraịst nọ n’otu mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ji ezi obi jụọ otu onye ozi ala ọzọ si Australia. Ọ chọrọ ịmara onye e kwesịrị ịkwanyere ùgwù karị, ọ̀ bụ onye ozi ala ọzọ si mba ọzọ ka ọ bụ onye ozi na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị ná mba ya. Ajụjụ ahụ e ji ezi obi jụọ bụ́ nke na-egosipụta echiche nke iji ọkwá akpọrọ ihe, juru onye ozi ala ọzọ ahụ anya. Otú ọ dị, ajụjụ banyere onye ka ukwuu sitere n’ọchịchọ nke ịmara ọnọdụ ndị mmadụ n’ọkwá nke ike na mmetụta.

2. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị anyị na ha na-efekọ ofufe anya?

2 Echiche a abụtụghị ihe ọhụrụ. Ọbụna ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere arụmụka na-aga n’ihu n’ihu banyere onye kasị ukwuu. (Matiu 20:20-24; Mak 9:33-37; Luk 22:24-27) Ha onwe ha kwa sitere n’ógbè ebe e nwere omume nke iji ọkwá akpọrọ ihe, bụ́ nke okpukpe ndị Juu narị afọ mbụ. N’iburu ọdịbendị dị otú ahụ n’uche, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu, Rabaị: n’ihi na otu Onye bụ Onye ozizi unu, ma unu onwe unu nile bụ ụmụnna.” (Matiu 23:8) Utu aha okpukpe dị ka “Rabaị,” nke pụtara “Onye Ozizi,” “na-akwalite nganga na mmetụta nke ịka ndị ọzọ elu n’ebe ndị a na-etu ya nọ, na anyaụfụ na mmetụta nke ịdị ala n’ebe ndị a na-adịghị etu ya nọ; mmụọ na ọchịchọ e ji eme ya na-emegidekwa ‘ịdị mfe nke dị n’ime Kraịst,’” ka ọkà mmụta Bible bụ́ Albert Barnes kwuru. N’ezie, ndị Kraịst na-ezere ịkpọ ndị nlekọta nọ n’etiti ha “Okenye onye a na Okenye onye ahụ,” na-eji okwu ahụ bụ́ “okenye” eme ihe dị ka utu aha ịja mma efu. (Job 32:21, 22) N’aka nke ọzọ, ndị okenye bụ́ ndị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Jisọs bu n’uche nye ndụmọdụ ahụ na-akwanyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ùgwù, dị nnọọ ka Jehova na-akwanyere ndị ji iguzosi ike n’ihe efe ya ùgwù, dịkwa ka Jisọs Kraịst si akwanyere ụmụazụ ya na-eguzosi ike n’ihe nye ya, ùgwù.

Ihe Nlereanya Jehova na nke Jisọs

3. Olee otú Jehova si akwanyere ndị o kere eke bụ́ mmụọ ùgwù?

3 N’agbanyeghị na Jehova bụ “Onye kachasị ihe nile elu,” site ná mmalite, ọ kwanyeere ihe ndị o kere eke ùgwù site n’ime ka ha kere òkè n’ọrụ ya. (Abụ Ọma 83:18) Mgbe o kere mmadụ mbụ ahụ, Jehova mere ka Ọkpara ọ mụrụ nanị ya kere òkè n’ọrụ ahụ dị ka “onye ọkà.” (Ilu 8:27-30; Jenesis 1:26) Ọbụna Jehova kpọrọ ndị mmụọ ozi ya nọ n’eluigwe ikwu otú ha ga-esi bibie ajọ Eze Ehab mgbe O kpebiworo ime otú ahụ.—1 Ndị Eze 22:19-23.

4, 5. Olee otú Jehova si akwanyere ụmụ mmadụ o kere eke ùgwù?

4 Jehova na-achị achị dị ka Ọkaaka Kasị Elu nke eluigwe na ala. (Deuterọnọmi 3:24) Ọ dịghị ya mkpa ịkpọtụrụ ụmụ mmadụ. Ma, ọ na-ewedata onwe ya ala, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji rịba ha ama. Otu ọbụ abụ bụrụ, sị: “Ònye dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị? Nke na-eme Onwe ya ka Ọ dị elu ịnọdụ ka eze, Nke na-eme Onwe ya ka Ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya. Ọ bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie.”—Abụ Ọma 113:5–8.

5 Tupu o bibie Sọdọm na Gọmọra, Jehova gere ntị n’ajụjụ Abraham ma mezuo ihe Abraham lere anya dị ka ikpe ziri ezi. (Jenesis 18:23-33) N’agbanyeghị na Jehova dị mbụ mara ihe ga-esi n’ihe Abraham na-arịọ pụta, o ji ndidi gee Abraham ntị ma nabata echiche ya.

6. Gịnị si n’ùgwù Jehova kwanyeere Habakuk mgbe ọ jụrụ ya ajụjụ pụta?

6 Jehova gekwara Habakuk ntị, bụ́ onye jụrụ, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-etiku Gị, ma Ị dịghị anụ?” Jehova ò lere ajụjụ ahụ anya dị ka ịma ikike ya aka? Ee e, o lere ajụjụ ndị Habakuk jụrụ anya dị ka ndị kwesịrị ekwesị, ozugbo nke ahụ gasịrị o kpughere nzube ya ime ka ndị Kaldea bilie iji mezuo ihe o kpere n’ikpe. O mesiri onye amụma ahụ obi ike na ‘ikpe a e buru n’amụma aghaghị ịbịa.’ (Habakuk 1:1, 2, 5, 6, 13, 14; 2:2, 3) Site n’iji nchegbu Habakuk kpọrọ ihe na ịzaghachi ya, Jehova kwanyeere onye amụma ahụ ùgwù. N’ihi ya, ihu onye amụma ahụ na-echegbu onwe ya gbachapụrụ, o wee nwee ọṅụ, na-enwe ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Chineke nke nzọpụta ya nọ. E gosipụtara nke a n’akwụkwọ Habakuk ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ bụ́ nke na-ewusi ntụkwasị obi anyị ike taa n’ebe Jehova nọ.—Habakuk 3:18, 19.

7. N’ihi gịnị ka òkè Pita keere na Pentikọst 33 O.A. ji dị ịrịba ama?

7 Jisọs Kraịst bụ onye nlereanya ọzọ nke ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na “onye ọ bụla nke ga-agọnahụ m n’ihu mmadụ, ya ka Mụ onwe m ga-agọnahụkwa n’ihu Nna m.” (Matiu 10:32, 33) Otú ọ dị, n’abalị a raara ya nye, ndị na-eso ụzọ ya nile gbahapụrụ ya, Pita onyeozi gọnahụkwara ya ugboro atọ. (Matiu 26:34, 35, 69-75) Jisọs lere anya gabiga ọdịdị elu ahụ ma rịba mmetụta Pita nwere n’ime ime obi ya ama, bụ́ nchegharị ya miri emi. (Luk 22:61, 62) Nanị ihe dị ka ụbọchị 51 mgbe nke ahụ gasịrị, Kraịst kwanyeere onyeozi ahụ nwere nchegharị ùgwù site n’ikwe ka ọ nọchite anya ndị ozi 120 nke Jisọs n’ụbọchị Pentikọst ma were “mkpịsị ugodi [mbụ] nke alaeze eluigwe” mee ihe. (Matiu 16:19; Ọrụ 2:14-40) E nyere Pita ohere ‘ichigharị ma mee ka ụmụnna ya guzosie ike.’—Luk 22:31-33.

Ịkwanyere Ndị Òtù Ezinụlọ Ùgwù

8, 9. Olee otú onye bụ́ di pụrụ isi ṅomie Jehova na Jisọs n’ịkwanyere nwunye ya ùgwù?

8 Ndị bụ́ di na ndị nne na nna ga-eme nke ọma iṅomi Jehova na Jisọs Kraịst n’iji ikike ịchịisi Chineke nyere ha eme ihe. Pita dụrụ ọdụ, sị: “Ndị bụ́ di, otú ahụ, soonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ́ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị.” (1 Pita 3:7) Were ya na i ji efere ájá, bụ́ nke o doro anya na ọ dị mfe nkụwa karịa efere osisi. Ọ̀ bụ na ị gaghị akpachara anya karị? Onye bụ́ di pụrụ ime otú ahụ site n’iṅomi Jehova, na-ege echiche nwunye ya ntị mgbe ọ na-eme mkpebi n’ezinụlọ. Cheta na Jehova wepụtara oge iji soro Abraham tụgharịa uche. N’ịbụ onye na-ezughị okè, di nwere ike ọ gaghị ahụcha akụkụ nile nke okwu ahụ. Ya mere, ọ̀ bụ na ọ gaghị abụ ihe amamihe ka dịrị na ya ịkwanyere nwunye ya ùgwù site n’iji ezi obi tụlee echiche ya?

9 N’ala ebe e ji ikike ndị nwoke akpọrọ ihe nke ukwuu, onye bụ́ di aghaghị iburu n’uche na ọ pụrụ ịbụ na nwunye ya aghaghị imeri ọtụtụ ihe mgbochi iji kwupụta ihe ndị dị ya n’obi. Ṅomienụ ụzọ Jisọs Kraịst si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe, bụ́ ndị so n’òtù nwanyị ọ na-aga ịlụ n’ọdịnihu, n’oge ọ nọ n’ụwa. O ji ha kpọrọ ihe, na-echebara erughị eru ha n’ụzọ anụ ahụ na n’ụzọ ime mmụọ echiche ọbụna tupu ha ekwupụta ihe ndị dị ha mkpa. (Mak 6:31; Jọn 16:12, 13; Ndị Efesọs 5:28-30) Tụkwasị na nke ahụ, wepụtanụ oge iji nyochaa ihe nwunye unu na-emere unu na ezinụlọ unu, ma gosipụta ekele unu n’okwu nakwa n’omume. Ma Jehova ma Jisọs kelere ndị kwesịrị ekwesị, jaa ha mma, gọziekwa ha. (1 Ndị Eze 3:10-14; Job 42:12-15; Mak 12:41-44; Jọn 12:3-8) Mgbe di ya ghọsịrị otu n’ime Ndịàmà Jehova, otu nwanyị bụ́ onye Kraịst bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa kwuru, sị: “Di m na-anọbu m n’ihu ma anyị na-aga ije, na-ahapụ m iburu ihe nile. Ugbu a, ọ na-ebugideziri m akpa ma na-egosipụta ekele maka ihe m na-eme n’ụlọ!” Okwu ekele si n’obi na-enyere nwunye gị aka n’ụzọ dị ukwuu inwe mmetụta nke ịbụ onye e ji kpọrọ ihe.—Ilu 31:28.

10, 11. Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ọma nke Jehova n’imeso mba Israel na-enupụ isi ihe?

10 N’imeso ụmụ ha ihe, karịsịa mgbe ịdọ aka ná ntị dị mkpa, ndị nne na nna kwesịrị iṅomi ihe nlereanya Chineke. “Jehova wee gbaara Israel àmà, gbaakwara Juda” ka ha si n’ụzọ ọjọọ ha laghachi, ma ha “kwesiri olu ike.” (2 Ndị Eze 17:13-15) Ọbụna ụmụ Israel “ji ọnụ ha [nwaa ịghọgbu, NW] Ya, ji[ri]kwa ire ha na-agwa Ya okwu ụgha.” Ọtụtụ ndị nne na nna pụrụ iche na ụmụ ha na-akpa àgwà dị otú ahụ mgbe ụfọdụ. Ụmụ Israel ‘nwara Chineke’ ma mee ka o nwee mwute. Ma, Jehova “nwere obi ebere, Ọ na-ekpuchi ajọ omume ha, Ọ dịghị ebibikwa ha.”—Abụ Ọma 78:36–41.

11 Ọbụna Jehova rịọrọ ụmụ Israel arịrịọ, sị: “Biko bịanụ, ka anyị rụrịta ụka . . . : ọ bụrụ na mmehie unu adị ka uwe uhie, ọ bụ dị ka snow ka ha ga-adị ọcha.” (Aịsaịa 1:18) Ọ bụ ezie na Jehova emehieghị ihe, ọ kpọrọ mba ahụ na-enupụ isi ịbịa ka ha rụrịta ụka. Lee àgwà mara mma nke a bụụrụ ndị nne na nna iṅomi n’imeso ụmụ ha ihe! Mgbe ọ dị mkpa, kwanyerenụ ha ùgwù site n’ịnụ ihe ha nwere ikwu n’okwu ahụ, sorokwanụ ha tụgharịa uche banyere ihe mere ha na-aghaghị iji mee mgbanwe.

12. (a) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere ịsọpụrụ ụmụ anyị karịa Jehova? (b) Gịnị ka a chọrọ ma ọ bụrụ na anyị ga-asọpụrụ ùgwù nke ụmụ anyị mgbe anyị na-adọ ha aka ná ntị?

12 N’ezie, mgbe ụfọdụ ọ na-adị mkpa inye ụmụaka ndụmọdụ siri ike. Ndị nne na nna agaghị achọ ịdị ka Ilaị, bụ́ onye ‘sọpụụrụ ụmụ ya ndị ikom karịa Jehova.’ (1 Samuel 2:29) Ma, ọ dị ụmụaka mkpa ịhụ ebumnobi ịhụnanya e ji maka ya mee mgbazi ahụ. Ha kwesịrị inwe ike ịghọta na nne na nna ha hụrụ ha n’anya. Pọl na-adụ ndị bụ́ nna ọdụ, sị: “Akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ọ bụ ezie na ndị bụ́ nna ga-eji ikike e nyere ha mee ihe, isi ihe a na-ekwu n’ebe a bụ na ọ dị ndị bụ́ nna mkpa iji ùgwù nke ụmụ ha kpọrọ ihe site n’ịghara ịdị na-akpasu ha iwe n’ihi aka ike ha. Ee, ichebara ùgwù nke ụmụaka echiche chọrọ oge na mgbalị n’akụkụ nke ndị nne na nna, ma mkpụrụ nke ime otú ahụ na-amịpụta kwesịrị àjà nile a na-achụrụ ya.

13. Gịnị bụ echiche Bible banyere ndị meworo agadi n’ezinụlọ?

13 Ịkwanyere ndị òtù ezinụlọ ùgwù gụnyere ihe karịrị mmadụ imeso nwunye na ụmụ ya ihe n’ụzọ dị ùgwù. “Ị kaa nkà, na-erubere ụmụ gị isi,” ka otu ilu ndị Japan na-ekwu. Ihe ilu ahụ pụtara bụ na ndị nne na nna mere agadi kwesịrị izere ịgabiga ebe ikike ha dị ka nne ma ọ bụ nna ruru, ha kwesịkwara ige ntị n’ihe ụmụ ha toworo eto na-ekwu. Ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nsọ kwadoro ka ndị nne na nna na-akwanyere ụmụ ha ùgwù site n’ige ha ntị, ụmụ ekwesịghị igosipụta àgwà nke enweghị nkwanye ùgwù n’ebe ndị meworo agadi n’ezinụlọ ha nọ. “Eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi,” ka Ilu 23:22 na-ekwu. Eze Solomọn mezuru ihe ilu a kwuru ma nye nne ya nsọpụrụ mgbe ọ bịara ịrịọ ya arịrịọ. Solomọn mere ka a dọwara nne ya ocheeze n’aka nri ocheeze nke ya ma gee ntị n’ihe nne ya meworo agadi, bụ́ Bat-sheba, nwere ịgwa ya.—1 Ndị Eze 2:19, 20.

14. Olee otú anyị pụrụ isi na-asọpụrụ ndị meworo agadi n’ọgbakọ?

14 N’ezinụlọ ime mmụọ anyị gbasapụrụ agbasapụ, anyị nọ n’ezi ọnọdụ ‘ibute ụzọ’ n’ịkwanyere ndị meworo agadi nọ n’ọgbakọ ùgwù. (Ndị Rom 12:10, NW) Ọ pụrụ ịbụ na ha enweghịzi ike imeru otú ha na-emerubu na mbụ, nke ahụ pụkwara ịkụda ha mmụọ. (Eklisiastis 12:1-7) Otu Onyeàmà e tere mmanụ bụ́ onye meworo agadi nke na-enweghị ike isi n’elu àkwà bilie bụ́ onye nọ n’ebe a na-elekọta ndị ahụ na-adịghị ike, kwupụtara nkụda mmụọ dị otú ahụ, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịnwụ ka m wee nwee ike ịmaliteghachi ọrụ.” Nye ndị agadi dị otú ahụ, anyị igosi ha nghọta na nsọpụrụ ruuru ha pụrụ inye aka. E nyere ụmụ Israel iwu, sị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.” (Levitikọs 19:32) Gosi nchebara echiche site n’ime ka ndị agadi nwee mmetụta nke ịbụ ndị a chọrọ na ndị e ji kpọrọ ihe. ‘Ibili ọtọ’ pụrụ ịgụnye ịnọdụ ala ma gee ntị ka ha na-akọ ihe ha rụzuworo ọtụtụ afọ gara aga. Nke ahụ ga-eme ka ndị agadi nwee ùgwù, ọ ga-ewulikwukwa ndụ ime mmụọ anyị elu.

‘N’igosi Nsọpụrụ, Na-ebutenụ Ụzọ’

15. Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji mee ka ndị òtù ọgbakọ nwee ùgwù?

15 Ndị òtù ọgbakọ na-aka eme nke ọma mgbe ndị okenye na-esetịpụrụ ha ezi ihe nlereanya. (1 Pita 5:2, 3) N’agbanyeghị na ha ji ọrụ n’aka, ndị okenye na-ahụ n’anya na-ebute ụzọ n’ịgakwuru ndị na-eto eto, ndị isi ezinụlọ, ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ, ndị odozi akụ̀, na ndị agadi, ma ndị dị otú ahụ hà nwere ihe isi ike ma ọ bụ na ha enweghị. Ndị okenye na-ege ntị n’ihe ndị òtù ọgbakọ nwere ikwu ma jaa ha mma maka ihe ike kwere ha mee. Onye okenye anya na-eru ala bụ́ onye na-ekwu okwu ekele banyere ihe nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị na-eme na-eṅomi Jehova, bụ́ onye na-enwe ekele n’ebe ihe ndị o kere eke nọ n’ụwa nọ.

16. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-ele ndị okenye anya dị ka ndị e kwesịrị ịsọpụrụ otú e si asọpụrụ ndị ọzọ n’ọgbakọ?

16 Site n’iṅomi Jehova, ndị okenye na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ: “N’ịhụnanya ụmụnna na-enwenụ mmetụta dị nro maka ibe unu. N’igosi nsọpụrụ n’ebe ibe unu nọ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10, NW) Nke a pụrụ isikwuru ndị okenye bi ná mba ebe e ji ọkwá akpọrọ ihe nke ukwuu, ike. Dị ka ihe atụ, n’otu mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, e nwere okwu abụọ e ji eme ihe maka “nwanna,” otu bụ nke e ji eme ihe maka ndị nọ n’ọnọdụ dị elu, nke ọzọkwa bụ maka ndị nkịtị. Ruo na nso nso a, ndị òtù ọgbakọ ji nke ahụ bụ́ maka ndị nọ n’ọnọdụ dị elu na-eme ihe mgbe ha na-ekwu banyere ndị okenye na ndị meworo agadi, na-eji nke ndị nkịtị ahụ eme ihe mgbe ha na-ekwu maka ndị ọzọ. Otú ọ dị, a gbara ha ume iji okwu ndị nkịtị ahụ eme ihe n’oge nile n’ihi na, dị ka Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, “unu nile bụ ụmụnna.” (Matiu 23:8) Ọ bụ ezie na ịkpa ókè a nwere ike ghara ịpụta ìhè otú a ná mba ndị ọzọ, ọ dị anyị nile mkpa ịkpachara anya banyere ọchịchọ mmadụ nke ịkpa ókè ọkwá.—Jemes 2:4.

17. (a) N’ihi gịnị ka ndị okenye kwesịrị iji bụrụ ndị na-adị mfe njekwuru? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị okenye pụrụ isi ṅomie Jehova n’imeso ndị òtù ọgbakọ ihe?

17 N’ezie, Pọl gbara anyị ume imeso ndị okenye ụfọdụ ihe dị ka ndị kwesịrị “nsọpụrụ okpukpu abụọ,” ma ha bụkwa ụmụnna. (1 Timoti 5:17) Ọ bụrụ na anyị nwere ike iwere “nkwuwa okwu bịaruo ocheeze amara” nke Eze Eluigwe na Ala, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe ike ịbịaru ndị okenye nso, bụ́ ndị ga-eṅomi Jehova? (Ndị Hibru 4:16; Ndị Efesọs 5:1) Ndị nlekọta pụrụ inyocha otú ha bụruru ndị na-adị mfe njekwuru site n’ịtụle ókè ndị ọzọ na-abịakwuteru ha iji nweta ndụmọdụ ma ọ bụ aro. Mụta ihe site n’otú Jehova si eme ka ndị ọzọ kere òkè n’ọrụ ya. Ọ na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù site n’ikenye ha ọrụ. Ọ bụrụgodị na aro Onyeàmà ọzọ tụrụ pụrụ iyi ihe na-agaghị agazi agazi, ndị okenye kwesịrị inwe ekele maka nchegbu o gosiri. Chetanụ otú Jehova si mesoo ajụjụ nchọpụta ndị Abraham jụrụ na ákwá obi erughị ala Habakuk kwara.

18. Olee otú ndị okenye pụrụ isi ṅomie Jehova n’ịgbazi ndị enyemaka dị mkpa?

18 Mgbazi dị ụfọdụ ndị Kraịst ibe unu mkpa. (Ndị Galetia 6:1) Ma, ha dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova, bụrụ ndị e kwesịrị imeso ihe n’ụzọ dị ùgwù. “Mgbe onye na-enye m ndụmọdụ mesoro m ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù, ọ na-adịrị m mfe ijekwuru ya,” ka otu Onyeàmà kwuru. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ dị mma nye ndụmọdụ mgbe e mesoro ha ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù. Ọ pụrụ iwe oge ka ukwuu, ma ịtọ ntị n’ala gerechaa ihe ndị ahụ weere nzọụkwụ ndị na-ezighị ezi nwere ikwu na-eme ka ọ dịkwuoro ha mfe ịnara ndụmọdụ ndị dị mkpa. Burunụ n’uche otú Jehova si soro ụmụ Israel tụgharịa uche ugboro ugboro n’ihi ọmịiko o nwere n’ebe ha nọ. (2 Ihe E Mere 36:15; Taịtọs 3:2) Ndụmọdụ e ji ọmịiko nye ga-emetụ ndị ahụ enyemaka dị mkpa, n’obi.—Ilu 17:17; Ndị Filipaị 2:2, 3; 1 Pita 3:8.

19. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị na-ekweghị n’ihe ndị Kraịst kweere anya?

19 Anyị ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù ruru n’ebe ndị pụrụ ịghọ ụmụnna ime mmụọ anyị n’ọdịnihu nọ. Ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị na-egbu oge n’ịnabata ozi anyị ugbu a, ma ọ ka dị anyị mkpa inwe ndidi n’ebe ha nọ ma ghọta na ha nwere ùgwù dị ka ụmụ mmadụ. Jehova “[ezubeghị] ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe echiche Jehova? N’ichebara ndị mmadụ n’ozuzu ha echiche, anyị pụrụ imeghe ụzọ maka ịgba àmà ma ọ bụrụ na anyị na-agbalị mgbe nile ịbụ ezi ndị agbata obi. N’ezie, anyị na-ezere inwe mkpakọrịta ndị pụrụ ịkpata ọdachi ime mmụọ. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ma, anyị na-egosipụta “obiọma,” ọ bụghị ilelị ndị na-ekweghị n’ihe anyị kweere.—Ọrụ 27:3.

20. Gịnị ka ihe nlereanya Jehova na nke Jisọs Kraịst kwesịrị ịkwali anyị ime?

20 Ee, Jehova na Jisọs Kraịst na-ele onye nke ọ bụla n’ime anyị anya dị ka onye kwesịrị ka a kwanyere ya ùgwù. Ka anyị na-echeta mgbe nile otú ha si eme omume ma na-ebute ụzọ otú ahụ n’igosi ibe anyị nsọpụrụ. Ka anyị buru okwu Onyenwe anyị bụ́ Jisọs Kraịst n’uche mgbe nile, bụ́: “Unu nile bụ ụmụnna.”—Matiu 23:8.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú i kwesịrị isi na-ele ndị gị na ha na-efekọ ofufe anya?

• Olee otú ihe nlereanya Jehova na nke Jisọs si akwali gị ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù?

• Olee otú ndị bụ́ di na ndị bụ́ nne na nna pụrụ isi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù?

• Ndị okenye ile ndị Kraịst ibe ha anya dị ka ụmụnna ha ọ̀ na-akwali ha ime omume n’ụzọ ndị dị aṅaa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Jiri okwu ekele na-egosi nwunye gị nkwanye ùgwù

[Foto dị na peeji nke 18]

Na-akwanyere ụmụ gị ùgwù site n’ige ha ntị

[Foto dị na peeji nke 18]

Na-emeso ndị òtù ọgbakọ ihe n’ụzọ dị ùgwù