Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Pụrụ Ịchọta Udo nke Obi?

Ị̀ Pụrụ Ịchọta Udo nke Obi?

Ị̀ Pụrụ Ịchọta Udo nke Obi?

Laa azụ na 1854, onye America na-ede akwụkwọ bụ́ Henry Thoreau dere, sị: “Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ mmadụ na-ebi ndụ nke enweghị olileanya n’ekwupụtaghị ya n’ọnụ.”

Ihe àmà na-egosi na n’oge ya, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ enweghị udo nke obi. Otú ọ dị, nke ahụ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 150 gara aga. Ihe ọ̀ gbanwewo n’oge a? Ka okwu Thoreau ọ̀ ka metụtara oge a? Gịnị banyere gị onwe gị? Ì nwere afọ ojuju, nwee udo nke obi? Ka ị̀ bụ onye obi na-erughị ala, na-amaghị ihe ọdịnihu ga-abụ, ‘na-enweghị olileanya ma ghara ikwupụta ya n’ọnụ,’ n’ikwu okwu Thoreau n’ụzọ ọzọ?

N’ỤZỌ dị mwute, e nwere ọtụtụ ihe dị n’ụwa na-anapụ ụmụ mmadụ udo nke obi. Ka anyị kpọtụ nanị ole na ole aha. N’ọtụtụ mba, enweghị ọrụ na ịkpata ego dị nta na-akpata ịda ogbenye nakwa oké nchegbu n’ihi akụ̀ na ụba. N’ala ndị ọzọ, ọtụtụ ndị na-etinye ihe ka ukwuu n’ume ọrụ ha n’ịchụso akụ̀ na ụba na ihe onwunwe. Otú ọ dị, mgbe mgbe, ụzọ ndụ asọmpi nke na-eso ya na-eweta nchegbu, ọ bụghị udo nke obi. Nrịanrịa, agha, mpụ, ikpe na-ezighị ezi, na mmegbu na-anapụkwa ụmụ mmadụ udo nke obi.

Ha Chọrọ Udo nke Obi

Ọtụtụ ndị adịghị njikere ịnagide ụwa a otú a ọ dị. Antônio * bụbu onye ndú nke ndị ọrụ n’otu nnukwu ụlọ mmepụta ihe dị na São Paulo, Brazil. N’ịbụ onye nwere olileanya ime ka ọnọdụ ya ná ndụ ka mma, o keere òkè ná mkpesa na njegharị iwe dị iche iche, ma nke a ewetaghịrị ya udo nke obi.

Ụfọdụ na-eche na alụmdi na nwunye ga-eme ka ha nwee udo nke obi ruo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ná ndụ ha, ma ha pụrụ inwe ndakpọ olileanya. Marcos bụbu onye ọchụ ntá ego ihe na-agara nke ọma. O tinyere isi na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ghọọ onyeisi nke otu obodo ukwu a na-emepụta ihe na ya. Otú ọ dị, ndụ ọ na-ebi n’ụlọ dakpọrọ nnọọ adakpọ. Mgbe ụmụ ya hapụrụ ụlọ, ya na nwunye ya kewara n’ihi esemokwu ndị ha na-apụghị idozi.

Gerson, bụ́ nwata tolitere n’okporo ámá dị na Salvador, Brazil, chọrọ inwe ahụmahụ na-akpali akpali. Ọ kpagharịrị site n’otu obodo gaa n’ọzọ, na-eso ndị na-anya gwongworo eme njem. N’oge na-adịghị anya ọ ghọrọ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ, na-apụnara ndị mmadụ ihe iji na-akwado àgwà ọjọọ ya. Ndị uwe ojii jidere ya ọtụtụ ugboro. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ịbụ onye na-achọ okwu, nke na-eme ihe ike, Gerson chọsiri ike inwe udo nke obi. Ọ̀ dị mgbe ọ bụla ọ pụrụ ịchọta ya?

Mgbe Vania ka bụ nwata, nne ya nwụrụ, Vania wee buru ibu ọrụ nke ilekọta ụlọ, gụnyere ilekọta nwanne ya nwanyị na-arịa ọrịa. Vania gara chọọchị ma nwee mmetụta na Chineke agbahapụla ya. N’ezie o nweghị udo nke obi.

E nwekwara Marcelo. Nanị ihe Marcelo chọrọ bụ ikpori ndụ. Ọ na-amasị ya isoro ndị na-eto eto ndị ọzọ na-enwe nnọkọ oriri—na-agba egwú, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-aṅụkwa ọgwụ ọjọọ. N’otu oge, ọ lụrụ ọgụ ma merụọ onye ntorobịa ọzọ ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ kwara ụta nke ukwuu maka ihe o meworo ma kpekuo Chineke ekpere maka enyemaka. Ya onwe ya kwa chọrọ udo nke obi.

Ahụmahụ ndị a na-egosi ọnọdụ ụfọdụ pụrụ ime ka mmadụ ghara inwe udo nke obi . Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla onye ndú ndị ọrụ ahụ, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ, nwata ahụ toro n’okporo ámá, nwata nwanyị ahụ na-arụgbu onwe ya n’ọrụ, na onye ahụ na-aga nnọkọ oriri pụrụ isi nweta udo nke obi ha chọrọ inwe? Ihe mere ha ọ̀ na-akụziri anyị ihe ọ bụla? Azịza nye ajụjụ abụọ ahụ bụ ee, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 3]

Ị̀ na-achọsi udo nke obi ike?