Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jirinụ Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ

Jirinụ Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ

Jirinụ Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ

“N’akụkụ mmụọ unu, na-adịnụ ọkụ; n’akụkụ Onyenwe anyị, na-abụnụ ohu.”—NDỊ ROM 12:11.

1, 2. Àgwà dị aṅaa ka ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịnọgide na-enwe dị ka ndị na-ekwusa ozi ọma?

NWA okorobịa na-enwe mkpali ma o nweta ọrụ ọhụrụ. N’ụbọchị mbụ ọ gara ọrụ, ọ na-atụsi anya ike ịnara ntụziaka nke onye were ya n’ọrụ. Ọ na-atụ anya ọrụ mbụ a ga-enye ya ma jiri nnọọ obi ya nile rụọ ya. Ọ na-adị ya ọkụ n’obi ime ike ya nile.

2 N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị onwe anyị bụ́ ndị Kraịst pụrụ ile onwe anyị anya dị ka ndị malitere ọrụ ọhụrụ. Ebe ọ bụ na olileanya anyị bụ ịdị ndụ ebighị ebi, a pụrụ ikwu na anyị ka malitere nnọọ ịrụrụ Jehova ọrụ. N’ezie, Onye Okike anyị nwere ọtụtụ ọrụ o bu n’uche ka anyị rụọ bụ́ ndị anyị ga na-arụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma ọrụ mbụ anyị natara nnọọ bụ nke ikwusa ozi ọma Alaeze ya. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:4) Olee otú ọrụ a Chineke nyere anyị dị anyị n’obi? Dị ka nwa okorobịa ahụ, anyị kwesịrị iji ike anyị nile, ịdị uchu, ọṅụ—ee, ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ya!

3. Gịnị ka a chọrọ iji nwee ihe ịga nke ọma dị ka onyeozi nke ozi ọma ahụ?

3 N’eziokwu, ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Tụkwasị n’ozi anyị, anyị nwere ọtụtụ ibu ọrụ ndị ọzọ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-achọ ihe dị ukwuu n’aka anyị n’ụzọ anụ ahụ na n’ụzọ mmetụta uche. N’akụkụ kasị ukwuu, ọ bụ ejisiri ike ka anyị ji na-elebara ihe ndị a anya ma na-etinyezu uche n’ozi ahụ. Ma, ọ pụrụ ịbụ ndọlị na-aga n’ihu. (Mak 8:34) Jisọs mesiri ya ike na ka anyị wee nwee ihe ịga nke ọma dị ka ndị Kraịst, ọ ga-achọ mgbalị siri ike.—Luk 13:24.

4. Olee otú nchegbu anyị na-enwe kwa ụbọchị pụrụ isi metụta otú anyị si ele ihe ime mmụọ anya?

4 Ebe ọ bụ na anyị nwere nnọọ ọtụtụ ihe ime, ọ na-adị mfe mgbe ụfọdụ inwe mmetụta nke ịbụ ndị ihe na-erikpu ma ọ bụ na-anyịgbu. “Nchegbu nke ndụ” pụrụ ịkpagbu ịnụ ọkụ n’obi na ekele anyị nwere maka ọrụ ọchịchị Chineke. (Luk 21:34, 35; Mak 4:18, 19) N’ihi ọdịdị ezughị okè anyị dị ka ụmụ mmadụ, anyị pụrụ ịhapụ ‘ịhụnanya ahụ anyị nwere na mbụ.’ (Mkpughe 2:1–4) Akụkụ ụfọdụ nke ozi anyị na-ejere Jehova pụrụ ịghọtụ ihe a na-eme iji mezuo iwu. Olee otú Bible si enye anyị agbamume dị mkpa iji mee ka ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere n’ebe ozi anyị dị dịgide?

Dị Ka “Ọkụ Na-ere Ere” n’Obi Anyị

5, 6. Olee otú Pọl onyeozi si lee ihe ùgwù ya nke ime nkwusa anya?

5 Ozi Jehova nyefere anyị dị nnọọ oké ọnụ ahịa ikwe ka ọ ghọọ ihe a na-ejighị kpọrọ ihe. Pọl onyeozi weere ikwusa ozi ọma dị ka ihe ùgwù dị nnọọ ukwuu, o lekwara onwe ya anya dị ka onye na-erughị eru ịbụ onye e nyere ya. O kwuru, sị: “Ọ bụ mụ onwe m, bụ́ onye dị nta karịa onye dịkarịsịrị nta n’etiti ndị nsọ nile, ka e nyere amara nke a, izisara ndị mba ọzọ ozi ọma nke akụ̀ nke Kraịst nke a na-enweghị ike ịtụpụta ya; na inye ha nile ìhè ịhụ ihe bụ́ ọchịchị ezinụlọ nke ihe omimi ahụ nke e zoworo n’ime Chineke site n’oge nile, Onye kere ihe nile.”—Ndị Efesọs 3:8, 9.

6 Àgwà ziri ezi Pọl nwere banyere ozi ya bụụrụ anyị ihe nlereanya magburu onwe ya. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, o kwuru, sị: “Ọ dị m ọkụ n’obi izikwa . . . ozi ọma.” Ihere ozi ọma ahụ emeghị ya. (Ndị Rom 1:15, 16) O nwere àgwà ziri ezi ma jiri ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ya.

7. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, gịnị ka Pọl dọrọ aka ná ntị megide?

7 Pọl onyeozi ghọtara mkpa ọ dị ịnọgide na-enwe echiche nke ịnụ ọkụ n’obi, ya mere ọ dụrụ ndị Kraịst nọ na Rom ọdụ, sị: “N’akụkụ ịnụ ọkụ nke obi unu, na-agharanụ ịdị ọ̀bọ̀; n’akụkụ mmụọ unu, na-adịnụ ọkụ; n’akụkụ Onyenwe anyị, na-abụnụ ohu.” (Ndị Rom 12:11) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ịdị ọ̀bọ̀” bu echiche nke “ịdị umengwụ, ịdị ngálá.” Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ghara ịdị ọ̀bọ̀ n’ezie n’ozi anyị, ọ dị anyị nile mkpa ịnọ na nche banyere mgbaàmà ndị mbụ nke umengwu ime mmụọ ma mee mgbanwe ndị kwesịrị ekwesị n’àgwà anyị ma ọ bụrụ na anyị achọpụta mgbaàmà ndị dị otú ahụ n’ime onwe anyị.—Ilu 22:3.

8. (a) Gịnị dị ka “ọkụ na-ere ere” n’obi Jeremaịa, n’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Jeremaịa?

8 Mmụọ Chineke pụkwara inyere anyị aka mgbe anyị nwere nkụda mmụọ. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, Jeremaịa onye amụma nwere nkụda mmụọ, o chekwara echiche ịkwụsị ọrụ ibu amụma ya. Ọbụna o kwuru banyere Jehova, sị: “M gaghị ehota Ya, m gaghị ekwukwa okwu ọzọ n’aha Ya.” Nke a ọ̀ bụ ihe àmà na-egosi na Jeremaịa erutụghị nnọọ eru n’ụzọ ime mmụọ? Ee e. N’ezie, ọnọdụ ime mmụọ siri ike nke Jeremaịa, ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ, na ịnụ ọkụ n’obi o nwere maka eziokwu ahụ nyere ya ikike ịnọgide na-ebu amụma. Ọ na-akọwa, sị: “[Okwu Jehova] wee dị n’obi m dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro n’ọkpụkpụ m nile, ike gwụkwara m ịnagide ya, enweghịkwa m ike.” (Jeremaịa 20:9) Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị na ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi ga na-enwe nkụda mmụọ site n’oge ruo n’oge. Ma mgbe ha kpekuru Jehova ekpere maka enyemaka, ọ ga-achọpụta ihe dị ha n’obi ma nye ha mmụọ nsọ ya n’efu ma ọ bụrụ na, dị ka Jeremaịa, okwu ya dị n’obi ha.—Luk 11:9–13; Ọrụ 15:8.

“Unu Emenyụla Ọkụ nke Mmụọ Nsọ”

9. Gịnị pụrụ ibelata ọrụ mmụọ nsọ na-arụrụ anyị?

9 Pọl onyeozi dụrụ ndị Tesalọnaịka ọdụ, sị: “Unu emenyụla [ọkụ nke, NW] Mmụọ Nsọ.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:19) Ee, omume na àgwà ndị na-emegide ụkpụrụ Chineke pụrụ ibelata ọrụ mmụọ nsọ na-arụrụ anyị. (Ndị Efesọs 4:30) Ndị Kraịst taa nwere ọrụ nke ikwusa ozi ọma. Anyị na-eji ihe ùgwù a akpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ bụghịrị anyị ihe ijuanya na ndị na-amaghị Chineke na-elelị ọrụ nkwusa anyị. Ma mgbe onye Kraịst kpachapụụrụ anya na-eleghara ozi ya anya, ọ pụrụ iduga n’imenyụ ọkụ nke mmụọ Chineke bụ́ nke na-akwali anyị.

10. (a) Olee otú echiche nke mmadụ ibe anyị pụrụ isi metụta anyị? (b) Echiche bụ ịgba dị aṅaa banyere ozi anyị ka e kwupụtara ná 2 Ndị Kọrint 2:17?

10 Ụfọdụ ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ ile ozi anyị anya dị ka nkesa akwụkwọ nkịtị. Ndị ọzọ pụrụ ikwubi n’ụzọ na-ezighị ezi na anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ nanị iji nata onyinye. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka echiche na-ezighị ezi ndị dị otú ahụ metụta àgwà anyị, nke a pụrụ ibelata ihe anyị na-arụpụta n’ozi. Kama ikwe ka echiche dị otú ahụ metụta anyị, ka anyị nọgide na-enwe echiche Jehova na Jisọs nwere n’ebe ozi anyị dị. Pọl onyeozi kwupụtara echiche ahụ bụ ịgba mgbe o kwuru, sị: “Anyị adịghị ka ọha mmadụ, ndị weere ihe na-adịghị mma na-etigwa n’okwu Chineke: kama dị ka ndị sitere n’ịdị ọcha, kama dị ka ndị sitere na Chineke, ọ bụ n’ihu Chineke, n’ime Kraịst ka anyị na-ekwu.”—2 Ndị Kọrint 2:17.

11. Gịnị mere ka ndị Kraịst mbụ nwee ike ịnọgide na-anụ ọkụ n’obi ọbụna n’okpuru mkpagbu, oleekwa otú ihe nlereanya ha kwesịrị isi metụta anyị?

11 N’oge na-adịghị anya mgbe Jisọs nwụsịrị, ndị na-eso ụzọ ya nọ na Jerusalem chere oge mkpagbu ihu. E yiri ha egwu ma nye ha iwu ịkwụsị ime nkwusa. Ma, Bible na-ekwu na ha “[jupụtara] ná Mmụọ Nsọ, wee were nkwuwa okwu na-ekwu okwu Chineke.” (Ọrụ 4:17, 21, 31) Okwu Pọl gwara Timoti afọ ụfọdụ mgbe nke a gasịrị na-egosi àgwà ziri ezi nke ndị Kraịst kwesịrị ịnọgide na-enwe. Pọl kwuru, sị: “Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ; kama ọ bụ nke ike na ịhụnanya na ime ka uche zuo okè. Ya mere ka ihere àmà nke Onyenwe anyị, ma ọ bụ ihere nke mụ onye mkpọrọ Ya, ghara ime gị: kama so ozi ọma Ya hụjukọọ anya dị ka ike nke Chineke si dị.”—2 Timoti 1:7, 8.

Gịnị Ka Anyị Ji Onye Agbata Obi Anyị Ụgwọ Ya?

12. Gịnị bụ isi ihe mere anyị ji ekwusa ozi ọma?

12 Iji nwee àgwà kwesịrị ekwesị n’ebe ozi anyị dị, anyị aghaghị inwe ezi ebumnobi. N’ihi gịnị ka anyị ji eme nkwusa? A na-ahụ isi ihe kpatara ya n’okwu ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Ndị ebere Gị na-agọzikwa Gị [Jehova]. Nsọpụrụ nke alaeze Gị ka ha na-ekwupụta, ọ bụ ịdị ike Gị ka ha na-ekwu okwu banyere ya; ime ka ụmụ mmadụ mara ịdị ike Ya nile, na nsọpụrụ nke ịma mma nke alaeze Ya.” (Abụ Ọma 145:10–12) Ee, anyị na-eme nkwusa iji too Jehova n’ihu ọha na iji doo aha ya nsọ n’ihu ihe nile a kpọrọ mmadụ. Ọbụna mgbe mmadụ ole na ole na-ege anyị ntị, anyị iji ikwesị ntụkwasị obi na-akpọsa ozi nzọpụta ahụ na-ewetara Jehova otuto.

13. Gịnị na-akwali anyị ịgwa ndị ọzọ banyere olileanya nke nzọpụta?

13 Anyị na-emekwa nkwusa n’ihi ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ nakwa iji zere ikpe ọmụma ọbara. (Ezikiel 33:8; Mak 6:34) Nke a na ihe Pọl kwuru mgbe ọ na-ekwu banyere ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst, nwere njikọ: “Eji m mmadụ nile ụgwọ, ma ndị Grik ma ndị na-asụ asụsụ ọzọ, ma ndị maara ihe ma ndị na-enweghị uche.” (Ndị Rom 1:14) Pọl nwere mmetụta na ya ji ndị mmadụ ụgwọ ikwusara ha ozi ọma, ebe ọ bụ na uche Chineke bụ ka “a zọpụta mmadụ nile.” (1 Timoti 2:4) Taa, anyị nwere ịhụnanya na ibu ọrụ dị otú ahụ n’ebe onye agbata obi anyị nọ. Ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ kpaliri ya izite Ọkpara ya n’ụwa ịnwụ n’ihi ha. (Jọn 3:16) Nke ahụ bụ àjà dị ukwuu. Anyị na-eṅomi ịhụnanya Jehova mgbe anyị na-etinye oge na mgbalị n’ịgwa ndị ọzọ banyere ozi ọma nke nzọpụta bụ́ nke dabeere n’àjà Jisọs.

14. Olee otú Bible si akọwa ụwa nke na-esoghị n’ọgbakọ ndị Kraịst?

14 Ndịàmà Jehova na-ele ụmụ mmadụ ibe ha anya dị ka ndị pụrụ isonye n’òtù ụmụnna ndị Kraịst. Anyị aghaghị iji nkwuwa okwu na-eme nkwusa, ma nkwuwa okwu anyị abụghị nke na-akpata esemokwu. N’eziokwu, Bible na-eji okwu ndị siri ike eme ihe mgbe ọ na-ekwu banyere ụwa n’ozuzu ya. Pọl ji okwu ahụ bụ́ “ụwa” n’onwe ya mee ihe dị ka ihe na-adịghị mma mgbe ọ na-ekwu banyere “amamihe nke ụwa nke a” na “agụụ ihe ọjọọ dị n’ụwa.” (1 Ndị Kọrint 3:19; Taịtọs 2:12) Pọl chetakwaara ndị Kraịst bụ́ ndị Efesọs na mgbe ha jegharịrị “n’ụzọ oge nke ụwa nke a,” na ha “nọ n’ọnwụ” n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Efesọs 2:1–3) Okwu ndị a na ndị ọzọ yiri ha kwekọrọ n’okwu Jọn onyeozi bụ́: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

15. Gịnị ka anyị na-adịghị eme n’ebe ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst nọ, n’ihi gịnịkwa?

15 Otú ọ dị, cheta na okwu ndị dị otú ahụ na-ezo aka n’ụwa n’ozuzu ya bụ́ nke e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị n’ụmụ mmadụ. Ndị Kraịst adịghị anwa ibu ụzọ kwubie otú mmadụ ọ bụla ga-esi emeghachi omume n’ebe ọrụ nkwusa ahụ dị. Ha enweghị ihe ndabere iji kọwaa mmadụ ọ bụla dị ka ewu. Ọ dịghị anyị n’aka ikwu ihe ga-eme mgbe Jisọs ga-abịa ikewapụta “atụrụ” site “n’ụmụ ewu.” (Matiu 25:31–46) Ọ bụ Jisọs bụ onyeikpe a họpụtara; ọ bụghị anyị. E wezụga nke ahụ, ahụmahụ egosiwo na ụfọdụ ndị tinyemiburu aka ọbụna n’omume kasị njọ anakwerewo ozi Bible, gbanwee, ma ghọọ ndị Kraịst na-ebi ndụ dị ọcha. N’ihi ya, ọ bụ ezie na anyị nwere ike ghara ịchọ ka anyị na mmadụ ụfọdụ na-akpakọrịta, anyị adịghị ala azụ iji ohere ọ bụla dapụtaranụ agwa ha banyere olileanya Alaeze ahụ. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere mmadụ ụfọdụ bụ́ ndị, mgbe ha ka bụ ndị na-ekweghị ekwe, “e doro ịnata ndụ ebighị ebi.” Ha mesịrị ghọọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 13:48) N’ihi ya, anyị apụghị ịma ma ọlị onye e doro ịnata ya ruo mgbe anyị gbaara ya àmà—ikekwe ọtụtụ ugboro. N’iburu nke a n’uche, anyị ga-eji ‘ịdị nwayọọ’ na “nsọpụrụ miri emi” NW) na-emeso ndị na-anakwerebeghị ozi nke nzọpụta, ihe, na-enwe olileanya na ụfọdụ n’ime ha ka pụrụ imeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi nke ndụ ahụ dị.—2 Timoti 2:25; 1 Pita 3:15.

16. Gịnị bụ otu ihe mere anyị ji achọ ịzụlite “nkà izi ihe”?

16 Ịzụlite nkà dị ka ndị ozizi ga-eme ka anyị nwekwuo mmasị ikwusa ozi ọma ahụ. Iji maa atụ: Egwuregwu dị ụtọ pụrụ ịbụ ihe na-adịghị amasị onye na-amaghị otú e si egwu ya. Ma ọ na-atọ onye maara otú e si egwu ya nke ọma ụtọ. N’otu aka ahụ, ndị Kraịst bụ́ ndị zụlitere “nkà izi ihe” NW) na-amụba ọṅụ ha na-enwe n’ozi ahụ. (2 Timoti 4:2; Taịtọs 1:9) Pọl dụrụ Timoti ọdụ, sị: “Na-anụ ọkụ n’obi iche onwe gị n’ihu mmadụ dị ka onye Chineke nwapụtaworo, onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime ya, onye na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.” (2 Timoti 2:15) Olee otú anyị pụrụ isi zụlite nkà izi ihe anyị?

17. Ànyị pụrụ isi aṅaa mee ka “agụụ” ihe ọmụma Bible ‘na-agụsi anyị ike,’ ihe ọmụma dị otú ahụ ga-esikwa aṅaa baa uru n’ozi anyị?

17 Otu ụzọ bụ inwekwu ezi ihe ọmụma. Pita onyeozi na-agba anyị ume, sị: “Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike, ka unu wee were ya na-eto eto ruo nzọpụta.” (1 Pita 2:2) N’ụzọ ebumpụta ụwa, agụụ mmiri ara na-agụsi nwa e ku n’aka nke nwere ezi ahụ ike, ike. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịdị onye Kraịst mkpa ime ka “agụụ” ihe ọmụma Bible ‘na-agụsi ya ike.’ A pụrụ ime nke a site n’ịzụlite àgwà dị mma nke ịmụ ihe na ịgụ ihe. (Ilu 2:1–6) A chọrọ mgbalị na ọzụzụ onwe onye ma ọ bụrụ na anyị ga-abụ ndị ozizi nwere nkà nke Okwu Chineke, ma mgbalị ndị dị otú ahụ na-eweta ụgwọ ọrụ. Obi ụtọ a na-enweta n’inyocha Okwu Chineke ga-eme ka anyị dị ọkụ ná mmụọ Chineke, na-enwe oké mmasị isoro ndị ọzọ kerịta ihe ndị anyị na-amụta.

18. Olee otú nzukọ ndị Kraịst pụrụ isi kwadebe anyị ikwuzi okwu nke eziokwu ahụ?

18 Nzukọ ndị Kraịst na-ekerekwa òkè dị mkpa n’anyị iji nkà were Okwu Chineke na-eme ihe. Mgbe a na-agụ akụkụ Bible dị iche iche n’oge a na-ekwu okwu ihu ọha nakwa n’oge okwu ndị ọzọ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị ga-eme nke ọma iso na-agụ n’ime Bible nke anyị. Ọ ga-abụrụ anyị amamihe ịṅa ntị nke ọma n’ihe omume ndị a na-eme ná nzukọ, gụnyere ndị metụtara ọrụ nkwusa anyị kpọmkwem. Anyị ekwesịghị ma ọlị ileda uru ihe ngosi bara anya, ikekwe na-ekwe ka a dọpụ uche anyị. Ọzọkwa, ọzụzụ onwe onye na itinye uche n’ihe dị mkpa. (1 Timoti 4:16) Nzukọ ndị Kraịst na-ewuli okwukwe anyị elu, na-enyere anyị aka ime ka agụụ Okwu Chineke na-agụsi anyị ike, na-azụkwa anyị ịbụ ndị na-eji oké mmasị ekwusa ozi ọma ahụ.

Anyị Pụrụ Ịdabere ná Nkwado Jehova

19. N’ihi gịnị ka ikerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa ji dị mkpa?

19 Ndị Kraịst bụ́ ndị ‘na-anụ ọkụ ná mmụọ,’ ndị ọ na-adị ọkụ n’obi ikwusa ozi ọma ahụ na-agbalịsi ike ikerechi òkè anya n’ozi. (Ndị Efesọs 5:15, 16) N’eziokwu, ọnọdụ anyị dịgasị iche, mmadụ nile apụghịkwa itinye oge hà nhata n’ọrụ a na-azọpụta ndụ. (Ndị Galetia 6:4, 5) Ma, ikekwe ugboro ole anyị na-agwa ndị ọzọ banyere olileanya anyị dị mkpa karịa ngụkọta nke oge anyị na-etinye n’ọrụ nkwusa ahụ. (2 Timoti 4:1, 2) Ka anyị na-emekwu nkwusa, otú ahụ ka anyị ga na-aghọtakwu ịdị mkpa nke ọrụ a. (Ndị Rom 10:14, 15) Anyị ga na-enwekwu ọmịiko na mmetụta n’ebe ndị ọzọ nọ mgbe anyị na-ezute ndị nwere obi eziokwu mgbe nile bụ́ ndị na-eze ume na-asụ ude, ndị na-enweghịkwa olileanya.—Ezikiel 9:4; Ndị Rom 8:22.

20, 21. (a) Ọrụ dị aṅaa ka anyị ka ga-arụ? (b) Olee otú Jehova si akwado mgbalị anyị?

20 Jehova enyefewo anyị ozi ọma ahụ. Nke a bụ ọrụ mbụ anyị natara n’aka ya dị ka “ndị ha na [ya] na-arụkọ ọrụ.” (1 Ndị Kọrint 3:6–9) Anyị na-enwe oké mmasị iji mkpụrụ obi anyị nile rụzuo ọrụ a Chineke nyere anyị, ruo ókè ike kwere anyị. (Mak 12:30; Ndị Rom 12:1) A ka nwere ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu nọ n’ụwa bụ́ ndị agụụ eziokwu na-agụ. Anyị nwere ọrụ dị ukwuu ịrụ, ma anyị pụrụ ịdabere ná nkwado Jehova ka anyị na-ejezu ozi anyị.—2 Timoti 4:5.

21 Jehova na-enye anyị mmụọ ya, na-ejikwa “mma agha nke Mmụọ Nsọ,” bụ́ Okwu Chineke, akwadebe anyị. Site n’enyemaka ya, anyị pụrụ ịsaghe ọnụ anyị, “[were] nkwuwa okwu mee ka mmadụ mara ihe omimi nke ozi ọma.” (Ndị Efesọs 6:17–20) Ka e kwuo banyere anyị ihe Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka: “Ọ bụghị nanị n’okwu ọnụ ka ozi ọma anyị bịaruru unu, kama ọ bịakwara n’ike, na n’ime Mmụọ Nsọ na ọtụtụ nkwezu.” (1 Ndị Tesalọnaịka 1:5) Ee, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ!

Ntụleghachi Dị Mkpirikpi

• N’ihi nchegbu nke ndụ, gịnị pụrụ ime ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere n’ozi ahụ?

• N’ụzọ dị aṅaa ka ọchịchọ anyị nwere ikwusa ozi ọma ahụ kwesịrị isi dị ka “ọkụ na-ere ere” n’obi anyị?

• Olee àgwà ndị na-ezighị ezi anyị kwesịrị izere n’ebe ozi ahụ dị?

• N’ozuzu, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị na-ekweghị n’ihe ndị anyị kweere anya?

• Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịnọgide na-anụ ọkụ n’obi n’ọrụ nkwusa ahụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ndị Kraịst na-eṅomi ịnụ ọkụ n’obi Jeremaịa na Pọl

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi nọ na-akpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi