Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Ọzụzụ Atụrụ, ‘Meenụ Ka Obi Unu Dị Obodobo’!

Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Ọzụzụ Atụrụ, ‘Meenụ Ka Obi Unu Dị Obodobo’!

Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Ọzụzụ Atụrụ, ‘Meenụ Ka Obi Unu Dị Obodobo’!

“JEHOVA bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m.” Devid ji okwu ndị ahụ kwupụta obi ike zuru ezu o nwere n’ebe Chineke ya nọ. Jehova duuru ya, n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, gaa “n’ebe ịta nri nke ahịhịa ndụ” nakwa “n’akụkụ mmiri nke izu ike,” na-eduzi ya “n’ụzọ nile nke ezi omume.” Mgbe ndị mmegide gbara ya gburugburu, Devid nwetara nkwado na agbamume, bụ́ nke kpaliri ya ịgwa Jehova, sị: “M gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla; n’ihi na Gị onwe gị nọnyeere m.” N’ịbụ onye nwere Onye Ọzụzụ Atụrụ Kasị Ukwuu dị otú ahụ, Devid kpebisiri ike “[ibi] n’ụlọ Jehova ruo ogologo ụbọchị nile.”—Abụ Ọma 23:1-6.

Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya nwetakwara nlekọta ịhụnanya nke Jehova, o gosipụtakwara nlekọta a n’ụzọ zuru ezu n’ụzọ o si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe n’oge o biri n’elu ala. N’ihi ya, Akwụkwọ Nsọ na-ezo aka n’ebe ọ nọ dị ka “onye ọzụzụ atụrụ ọma,” “oké Onye ọzụzụ atụrụ,” na “Onyeisi ọzụzụ atụrụ.”—Jọn 10:11; Ndị Hibru 13:20; 1 Pita 5:2-4.

Jehova na Jisọs Kraịst na-anọgide na-azụ ndị hụrụ ha n’anya dị ka atụrụ. A na-egosipụta ọzụzụ ha, n’akụkụ ụfọdụ, site ná ndokwa ịhụnanya ha mere maka inwe ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru n’ọgbakọ. Ọ bụ ndị ọzụzụ atụrụ dị otú ahụ ka Pọl gwara okwu mgbe o kwuru, sị: “Na-ezenụ onwe unu na ìgwè atụrụ nta nile, nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị na-elekọta ya anya n’etiti ya, ka unu na-azụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ, nke O ji ọbara nke [Ọkpara, NW] Ya onwe ya zụtara Onwe ya.”—Ọrụ 20:28.

Ịzụ ìgwè atụrụ ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe nlereanya Jehova na Kraịst Jisọs setịpụrụ abụghị ọrụ dị mfe, ma ọ dị mkpa ugbu a karịa ka ọ dịtụworo. Chee banyere ihe karịrị otu nde Ndịàmà bụ́ ndị e meworo baptism n’ime afọ atọ gara aga! Ndị ọhụrụ dị otú ahụ enweghị ahụmahụ ndị na-esite n’ọtụtụ afọ nke ịrụ ọrụ. Cheekwa banyere Ndịàmà ka bụ́ ụmụaka ma ọ bụ ndị nọ n’afọ iri na ụma. Ha chọrọ nlebara anya ọ bụghị nanị site n’aka ndị mụrụ ha kamakwa site n’aka ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru n’ọgbakọ.

N’ezie, onye Kraịst ọ bụla na-enweta nrụgide ndị si n’èzí, gụnyere nrụgide ndị ọgbọ. Anyị nile aghaghị itinye mgbalị iji guzogide ọnwụnwa siri ike nke ịgbaso ụzọ ụwa nke imeju ọchịchọ onwe onye. Ná mba ụfọdụ, ndị nkwusa Alaeze pụrụ inwe nkụda mmụọ n’ihi na ndị mmadụ emeghachighị omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi ha dị. Ọtụtụ ndị nkwusa nwere nsogbu ahụ ike ndị dị njọ. Nsogbu ego pụrụ ịnapụ ndị ọzọ mkpali ha na-enwe ibu ụzọ chọọ Alaeze ahụ. N’eziokwu, enyemaka nke ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya dị anyị nile—gụnyere ndị nọteworo aka n’eziokwu ahụ—mkpa, anyị nile kwesịkwara inweta ya.

Ihe Mkpali Kwesịrị Ekwesị

A dụrụ ndị Kraịst narị afọ mbụ ọdụ, sị: ‘Meenụ ka obi unu dị obodobo’! (2 Ndị Kọrint 6:11-13) Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ga-eme nke ọma ịgbaso ndụmọdụ a n’ịrụ ọrụ ọzụzụ atụrụ ha. Olee otú ha pụrụ isi mee otú ahụ? Gịnịkwanụ banyere ndị ohu na-eje ozi, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha gaje ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ?

Ọ bụrụ na ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ga-abụ ngọzi nye ìgwè atụrụ ahụ, ha agaghị abụ ndị nanị echiche nke ime ihe n’ihi na ọ bụ ibu ọrụ dịịrị ha, na-akpali. A na-adụ ha ọdụ, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti unu, na-elekọta ha anya, ọ bụghị n’ihi na mkpa na-akpa unu, kama site n’ọchịchọ obi, dị ka Chineke chọrọ; ọ bụghịkwa n’ihi uru na-eweta ihere, kama n’ihi na unu dị ọkụ n’obi.” (1 Pita 5:2, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere, ọzụzụ atụrụ dị irè chọrọ inwe ọchịchọ na ịnụ ọkụ n’obi ijere ndị ọzọ ozi. (Jọn 21:15-17) Ọ pụtara ịhụ mkpa nke atụrụ ahụ na ịdị ngwa igbo ha. Ọ pụtara igosipụta ezi àgwà ndị Kraịst nke a maara dị ka mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke mgbe a na-emeso ndị ọzọ ihe.—Ndị Galetia 5:22, 23.

Mgbe ụfọdụ, ọzụzụ atụrụ na-agụnye ileta ụmụnna n’ebe obibi ha. * Ma ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị ‘na-eme ka obi ha dị obodobo’ na-ewepụta onwe ha ije ozi. Ya bụ, ha na-eme ihe karịrị ime nleta ọzụzụ atụrụ mgbe ụfọdụ. Ha na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ eme ihe iji nye ndị ọzọ nọ n’ìgwè atụrụ ahụ ọzụzụ.

Inye Ndị Ọzọ Ọzụzụ Ịghọ Ndị Ọzụzụ Atụrụ

Nwanna nwoke ọ bụla, n’agbanyeghị afọ ndụ ya, nke “na-agbaso ọnọdụ onye [nlekọta] . . . agụụ ọrụ ọma na-agụ ya.” (1 Timoti 3:1) Ọtụtụ ndị ohu na-eje ozi egosipụtawo ọchịchọ obi ha iru eru maka inwetakwu ihe ùgwù. N’ihi ya, ndị okenye na-eji ọṅụ enyere ụmụnna nwoke ndị a nwere ọchịchọ obi, aka, iwere nzọụkwụ a dị mkpa ‘n’ịgbaso ọnọdụ onye nlekọta.’ Nke a pụtara ịzụ ha ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ dị irè.

N’ihi ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Chineke, ndị ọzụzụ atụrụ ụgha dị ka ndị ahụ a kọwara n’Ezikiel 34:2-6, emebeghị ka ọgbakọ ndị Kraịst nke Jehova ghara isi ike. Jehova sọrọ ndị a oyi, o mezikwara emezi n’ime otú ahụ. Kama ịzụ ìgwè atụrụ ahụ, ha na-azụ onwe ha. Ha emeghị ka ndị ahụ na-adịghị ike dị ike, ha agwọghị ndị na-arịa ọrịa, ha ekechighị ọkpụkpụ gbajiri agbaji, ma ọ bụ kpọghachi ndị a chụsara achụsa ma ọ bụ ndị furu efu. N’ịbụ ndị na-eme omume dị ka anụ ọhịa wolf kama ịbụ dị ka ndị ọzụzụ atụrụ, ha megburu atụrụ ahụ. Atụrụ ahụ e leghaara anya gbasasịrị, na-akpagharị n’enweghị onye na-elekọta ha.—Jeremaịa 23:1, 2; Nehum 3:18; Matiu 9:36.

N’adịghị ka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị Kraịst na-agbaso ihe nlereanya Jehova. Ha na-enye aka iduga atụrụ ahụ “n’ebe ịta nri nke ahịhịa ndụ” ime mmụọ nakwa “n’akụkụ mmiri nke izu ike.” Ha na-agbalị iduzi ha “n’okporo ụzọ nile nke ezi omume” site n’inyere ha aka ịghọta Okwu Jehova n’ụzọ kwesịrị ekwesị na itinye ya n’ọrụ n’onwe ha. Ha pụrụ ime nke a n’ụzọ dị irè n’ihi na ha “nwere ike izi ihe.”—1 Timoti 3:2.

Ihe ka ukwuu ná nkụzi ndị okenye na-ewere ọnọdụ n’ikpo okwu n’oge nzukọ ọgbakọ. Otú ọ dị, ndị okenye na-akụzikwara otu mmadụ n’otu mgbe ihe. N’ezie, ụfọdụ na-akụzi ihe n’ụzọ ka mma mgbe ọ bụ otu onye na ibe ya, ebe ndị ọzọ nwere nkà karị n’ikwu okwu n’ihu ọha. Ma enwechaghị ikike n’otu akụkụ nke izi ihe apụtachaghị na mmadụ erughị eru dị ka onye ozizi. Ndị okenye na-eji ohere nile dapụtaara ha, gụnyere oge nleta ọzụzụ atụrụ, ezi ihe. A na-enye ọzụzụ ụfọdụ n’ụzọ e dokwara edokwa, dị ka ihe atụ, ná nleta ndị a haziri ahazi. Ma a pụkwara inye ọzụzụ dị ukwuu n’ụzọ a na-edokwaghị edokwa, bụ́kwa nke na-aba oké uru.

Ndị Ọzụzụ Atụrụ na Ndị Ozizi Oge Nile

Amamihe na ahụmahụ dị onye dọkịta mkpa iji rụọ ọrụ ya. Ma ndị ọ na-agwọ na-enwe ekele mgbe ọ na-egosi obiọma, ọmịiko, nchebara echiche, na ezi mmasị. Ihe ndị a aghaghị ịbụ akụkụ nke àgwà ya. N’otu aka ahụ, onye bụ́ ezi onye ozizi na onye ọzụzụ atụrụ aghaghịkwa inwe àgwà ndị yiri nke ahụ, ha ga-eso n’àgwà ndị ọ na-akpa kwa ụbọchị. Ezigbo onye ozizi ga-adị njikere ịkụziri ndị nọ ya gburugburu ihe mgbe ọ bụla ọ dị mkpa. “Okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!” ka Ilu 15:23 na-ekwu. “Mgbe ya” pụrụ ịbụ mgbe ọ na-ekwu okwu n’ikpo okwu, mgbe ọ na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ma ọ bụ mgbe ọ na-enwe nkwurịta okwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ na telifon. N’otu aka ahụ, ezi onye ọzụzụ atụrụ na-agbalịsi ike igosipụta ezi àgwà na ịhụnanya n’oge nile, ọ bụghị nanị mgbe ọ na-eme nleta ọzụzụ atụrụ. N’ịbụ onye ‘meworo ka obi ya dị obodobo,’ ọ ga-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iji nye atụrụ ahụ ọzụzụ, na-enye ha nlekọta dị ha mkpa na mgbe ya. Ọ bụ nke a na-eme ka atụrụ ahụ hụ ya n’anya.—Mak 10:43.

Wolfgang, onye bụ́ okenye ugbu a, na-echeta nleta nkịtị nke otu onye ohu na-eje ozi na nwunye ya letara ezinụlọ ya. Ọ na-ekwu, sị: “Ụmụ anyị nwere nnọọ obi ụtọ n’ihi ntị a ṅara ha na nnọkọ ọma anyị nwere. Ha ka na-ekwu banyere ya.” Ee, ohu na-eje ozi a gosipụtara na ọ na-eche banyere ndị ọzọ; ọ ‘na-eme ka obi ya dị obodobo.’

Ohere ọzọ mmadụ nwere ‘ime ka obi ya dị obodobo’ bụ site n’ileta ndị ọrịa, okwu agbamume dị nkenke e dere ede, ma ọ bụ ịkpọ ha na telifon—ihe ọ bụla ị ga-eme iji mee ka ha mara na ị na-eche banyere ha! Nye aka mgbe ọ dị mkpa. Ọ bụrụ na ha chọrọ ikwu okwu, gee ntị nke ọma. Kwuo banyere ihe omume ọchịchị Chineke ndị dị mma a na-eme n’ọgbakọ unu na n’ebe ndị ọzọ. Nyere ha aka ilekwasị anya n’ọdịnihu dị ebube nke dịịrị ndị hụrụ Jehova n’anya.—2 Ndị Kọrint 4:16-18.

Tụkwasị ná Nleta Ọzụzụ Atụrụ

N’iburu n’uche nzube e ji enye ọzụzụ, o doro anya na ime nleta ọzụzụ atụrụ e dokwara edokwa n’ebe obibi ụmụnna, ọ bụ ezie na ọ dị mkpa, bụ nanị otu akụkụ nke ihe ndị a chọrọ. Onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya ‘na-eme ka obi ya dị obodobo’ site n’ịbụ onye na-adị mfe njekwuru n’ọnọdụ nile nakwa n’oge nile. Mmekọrịta ịhụnanya ọ na-azụlite n’ebe ụmụnna ya nọ na-emesi ha obi ike na n’oge ndị tara akpụ, ọ dịghị ha mkpa ịtụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla, na-amara na nwanna ha nwoke na-ahụ n’anya, bụ́ onye Kraịst ahụ bụ́ onye ọzụzụ atụrụ, na-eche banyere ha.—Abụ Ọma 23:4.

Ee, unu nile bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ ‘meenụ ka obi unu dị obodobo.’ Gosipụtanụ ezi ịhụnanya n’ebe ụmụnna unu nọ—gbaanụ ha ume, meenụ ka ha nwee ume ọhụrụ, wulienụ ha elu n’ụzọ ime mmụọ n’ụzọ ọ bụla unu nwere ike. Nyerenụ ha aka iguzosi ike n’okwukwe. (Ndị Kọlọsi 1:23) N’ịbụ ndị e ji ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị ‘na-eme ka obi ha dị obodobo’ gọzie, ọ dịghị ihe ga-akọ atụrụ ahụ. Ha ga-ekpebisi ike, dị ka Devid, ibi n’ụlọ Jehova ruo ogologo ụbọchị nile. (Abụ Ọma 23:1, 6) Olee ihe ọzọ onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya ga na-achọ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 A pụrụ ịchọta aro ndị a tụrụ maka ime nleta ọzụzụ atụrụ n’Ụlọ Nche nke September 15, 1993, peji nke 20-23, na nke March 15, 1996, peji nke 24-27.

[Igbe dị na peeji nke 30]

Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Ọzụzụ Atụrụ

• Na-eji ịnụ ọkụ n’obi na ọchịchọ obi eje ozi

• Na-azụ ma na-elekọta ìgwè atụrụ ahụ

• Na-enyere ndị ọzọ aka iru eru ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ

• Na-eleta ndị ọrịa ma na-elekọta ha

• Na-amụrụ anya iji na-enyere ụmụnna ha aka n’oge nile

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ma hà nọ n’ozi ubi, ná nzukọ, ma ọ bụ ná nnọkọ oriri, ndị okenye bụ ndị ọzụzụ atụrụ mgbe nile