Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nzukọ Kwa Afọ October 7,2000

Nzukọ Kwa Afọ October 7,2000

Nzukọ Kwa Afọ October 7,2000

A GA-EME NZUKỌ KWA AFỌ nke ndị nọ n’òtù Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania n’October 7, 2000, n’Assembly Hall of Jehovah’s Witnesses, 2932 Kennedy Boulevard, Jersey City, New Jersey. Nzukọ ga-ebu ụzọ bụ́ maka nanị ndị nọ n’òtù ahụ ga-amalite n’elekere 9:15 nke ụtụtụ, nzukọ ezumezu kwa afọ ga-esochikwa n’elekere 10:00 nke ụtụtụ.

Ndị so n’òtù ụlọ ọrụ ahụ kwesịrị ime ka Ọfịs Odeakwụkwọ òtù ahụ mara ugbu a banyere mgbanwe ọ bụla e nweworo n’adres nzipụ ozi ha n’ime otu afọ gara aga ka akwụkwọ ịma ọkwa na akwụkwọ ozi nnọchiteanya ndị a na-ezitere ha mgbe nile nwee ike iru ha aka n’ime July.

A ga-ezighachi akwụkwọ nnọchiteanya ndị ahụ, ndị a ga-ezigara ndị òtù ahụ ha na akwụkwọ ịma ọkwa maka nzukọ kwa afọ ahụ iji wee rute n’Ọfịs Odeakwụkwọ nke Society n’oge na-agafeghị August 1. Onye ọ bụla so n’òtù ahụ kwesịrị idejupụta ma zighachi akwụkwọ nnọchiteanya nke ya ngwa ngwa, na-egosi ma ọ̀ ga-abịa nzukọ ahụ n’onwe ya ka ọ bụ na ọ gaghị abịa. Ihe ọmụma e nyere n’akwụkwọ nnọchiteanya nke ọ bụla kwesịrị ido anya n’okwu a, ebe ọ bụ na a ga-adabere na ya iji mara ndị ga-abịanụ.

A na-atụ anya na a ga-enwezu nnọkọ nile, gụnyere nzukọ metụtara ọrụ na inye akụkọ ozi, n’ihe dị ka elekere 1:00 nke ehihie ma ọ bụ n’oge na-adịghị anya mgbe ọ gasịrị. A gaghị enwe nnọkọ nke ehihie. N’ihi ohere na-ebughị ibu, ọ bụ nanị ndị nwere tiketi ka a ga-anabata. Ọ dịghị ndokwa ọ bụla a ga-eme iji nọrọ n’ụlọ mgbakọ ndị ọzọ gee ihe ndị a ga-ekwu ná nzukọ kwa afọ a na telifon.