Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Nyere Ọtụtụ Mbe Ìhè

Onye Nyere Ọtụtụ Mbe Ìhè

Akụkọ Ndụ

Onye Nyere Ọtụtụ Mbe Ìhè

AKỤKỌ BANYERE GEORGE YOUNG DỊ KA RUTH YOUNG NICHOLSON SI KỌỌ

“Gịnịzi mere a ga-eji ghara ịkpọ okwu aha n’ikpo okwu anyị? . . . Ụdị ndị ikom dị aṅaa ka anyị ga-abụ ma ọ bụrụ na anyị agbachie nkịtị mgbe anyị nwapụtasịrị na ihe ndị a m dere banyere ha bụ eziokwu? Ka anyị ghara ịhapụ ndị mmadụ n’amaghị ihe, kama ka anyị kpọsaa eziokwu ahụ n’agọpụrụghị ma ọ bụ zochie ihe ọ bụla.”

OKWU ndị a so n’ihe nna m dere n’akwụkwọ ozi dị peji 33 nke o ji rịọ ka a kachapụ aha ya n’akwụkwọ e ji edekọ aha ndị chọọchị. Ọ bụ n’afọ 1913. Site n’oge ahụ gawa, ọ malitere ibi ndụ jupụtara n’ihe omume bụ́ nke dugara ya n’ije ozi dị ka onye nyere ọtụtụ mba ìhè. (Ndị Filipaị 2:15) Site n’oge m bụ nwatakịrị nwanyị, enwetara m akụkọ banyere ahụmahụ nna m site n’aka ndị ikwu anyị nakwa site n’ihe ndekọ ndị mere eme, ndị enyi m nyekwaara m aka ịchịkọta akụkọ ndụ ya ọnụ. N’ọtụtụ ụzọ, ndụ nna m na-echetara m nke Pọl onyeozi. Dị ka “onyeozi nke ndị mba ọzọ” ahụ, nna m na-adị njikere mgbe nile ime njem ịga zisaara ndị bi n’ala nile nakwa n’àgwàetiti nile ozi Jehova. (Ndị Rom 11:13; Abụ Ọma 107:1–3) Ka m kọọrọ unu banyere nna m, bụ́ George Young.

Afọ Ndụ Ya Ndị Mbụ

Nna m bụ nwa nwoke ikpeazụ nke John na Margaret Young, bụ́ ndị na-aga chọọchị Presbyterian nke Scotland. A mụrụ ya na September 8, 1886, ntakịrị oge mgbe ezinụlọ ahụ sisịrị Edinburgh, Scotland, kwafee British Columbia nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Canada. A mụrụ ụmụnne ya ndị nwoke atọ tọrọ ya—Alexander, John, na Malcolm—na Scotland afọ ole na ole tupu mgbe ahụ. Nna m ji afọ abụọ tọọ Marion, bụ́ nwanne ha nwanyị, onye ha ji ụzọ ịhụnanya akpọ Nellie.

Ụmụaka ahụ kporiri ndụ ka ha na-etolite n’otu ugbo dị na Saanich, nke na-adịghị anya site na Victoria, British Columbia. N’otu oge ahụ, ha mụtara ibu ibu ọrụ. Ya mere tupu nne na nna ha esi Victoria ha na-aga alọta, ha na-arụchala ọrụ ha na-arụ n’èzí ma debe ebe obibi ha ọcha.

Ka oge na-aga, nna m na ụmụnne ya ndị nwoke bịara nwee mmasị n’igwupụta akụ̀ ndị dị n’ala nakwa n’ịzụ ahịa osisi. A bịara mara ụmụnne ahụ bụ́ ụmụ Young dị ka ndị na-agba mgbere osisi (ndị ikom na-enyocha ala iji mara ma osisi ọ pụrụ ito nke ọma na ya) nakwa dị ka ndị na-azụ ma na-ere osisi. Ọ bụ nna m na-ahụ maka ihe ndị metụtara ego.

N’ikpeazụ, mmasị nna m nwere n’ihe ime mmụọ dugara ya n’ikpebi ịghọ ụkọchukwu Presbyterian. Otú ọ dị, ihe dị ka n’oge ahụ, okwu chukwu ndị na-agba n’akwụkwọ akụkọ bụ́ ndị Charles Taze Russell, bụ́ onyeisi oche mbụ nke Zion’s Watch Tower Tract Society, kwuru, metụtara ndụ ya n’ụzọ miri emi. Ihe nna m mụtara kpaliri ya ide na izipụ akwụkwọ ozi ahụ m hotara ná mmalite bụ́ nke o jiri kwuo na ya agaghịzi eso chọọchị ahụ.

Nna m ji nkwanye ùgwù were amaokwu ndị dị na Bible mee ihe n’ụzọ doro anya iji gosi na ozizi chọọchị ndị bụ́ na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ nakwa na Chineke ga-emekpa mkpụrụ obi mmadụ ahụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi bụ ụgha. O kpughekwara ozizi Atọ n’Ime Otu, na-egosi na o sighị n’aka ndị Kraịst malite nakwa na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ya ma ọlị. Site n’oge ahụ gawa, ọ banyere n’ije ozi ndị Kraịst n’iṅomi Jisọs Kraịst, na-eji ike na ume ya nile eme ihe n’ụzọ obi umeala iji nye Jehova otuto.

Na 1917, n’okpuru nduzi nke Watch Tower Society, nna m malitere ije ozi dị ka onye pilgrim, dị ka a na-akpọ ndị nnọchịanya na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. N’obodo ukwu na n’obodo nta ndị dị n’ofe Canada, o kwuru okwu ihu ọha ma gosi ihe nkiri slide ahụ a maara dị ka “Foto Ihe Nkiri nke Okike.” Ndị mmadụ na-ejupụta n’ebe a na-ekiri ihe n’ihi nleta nna m. Usoro ihe omume nke nleta ndị o mere dị ka onye pilgrim na-apụta n’Ụlọ Nche ruo 1921.

Otu akwụkwọ akụkọ Winnipeg kọrọ na Young Onye Na-ezisa Ozi Ọma gwara mmadụ 2,500 okwu nakwa na ọtụtụ mmadụ apụghị ịbata n’ihi na ndị mmadụ jupụtara nnọọ n’ụlọ ezumezu ahụ. N’Ottawa, o kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ịga Hel Ma Lọghachi.” N’ebe ahụ otu agadi nwoke kọrọ, sị: “Mgbe George Young kwusịrị okwu, ọ kpọrọ ndị ụkọchukwu nọ n’otu ahịrị oche ka ha bịa n’elu ikpo okwu iji soro ya kwurịta isiokwu ahụ, ma ọ dịghị otu n’ime ha gara. Mgbe ahụ ka m matara na achọtawo m eziokwu ahụ.”

Nna m gbalịrị iwebata ọtụtụ ihe omume ime mmụọ ruo ókè o kwere mee ka ọ nọ na njem nleta ya dị ka onye pilgrim. Nke ahụ gasịa, ọ na-eme ngwa ngwa gaa banye ụgbọ okporo ígwè na-aga ebe ọzọ o mere atụmatụ ịga. Mgbe o ji ụgbọala na-eme njem, ọ na-apụkarị n’isi ụtụtụ iji ruo ebe ọzọ e kenyere ya ọrụ. Tụkwasị n’ịbụ onye na-anụ ọkụ n’obi, a maara nna m dị ka onye na-echebara ndị ọzọ echiche, e jikwa ọrụ ya na mmesapụ aka ya dị ka onye Kraịst mara ya.

N’ime ọtụtụ mgbakọ ndị mbụ ọ gara, nke kwesịrị ncheta karịsịa bụ nke e nwere n’Edmonton, Alberta, na 1918. Mmadụ nile so n’ezinụlọ ha bịara ya maka baptism Nellie. Ọ bụkwa oge ikpeazụ ụmụnne ndị nwoke ahụ nọkọrọ ọnụ. Afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, Malcolm nwụrụ n’ihi oyi bara ya n’ahụ. Dị ka ụmụnne ya ndị nwoke atọ na nna ya, Malcolm nwere olileanya nke ndụ eluigwe, ha nile nọgidekwara na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo ọnwụ ha.—Ndị Filipaị 3:14.

O Jee Ubi Ala Ọzọ

Mgbe nna m gazuru njem ime nkwusa na Canada na September 1921, Joseph F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, gwara ya ka ọ gaa n’àgwàetiti ndị dị na Caribbean. A nabatara “Foto Ihe Nkiri nke Okike” ahụ nke ọma n’ebe nile nna m gosiri ya. O si Trinidad deta akwụkwọ, sị: “Ndị mmadụ jupụtara ebe ahụ, e kweghịkwa ọnụ ọgụgụ buru ibu bata. N’anyasị nke abụọ, ndị mmadụ jupụtara n’ụlọ ahụ.”

E mesịa, na 1923, e zigara nna m Brazil. N’ebe ahụ, ọ gwara ìgwè mmadụ gere ntị okwu, na-eji onye ntụgharị e goro ego eme ihe mgbe ụfọdụ. Ụlọ Nche (Bekee) nke December 15, 1923, kọrọ, sị: “Site na June 1 ruo September 30, Nwanna Young nwere nzukọ ihu ọha 21, ndị ngụkọta nke ọnụ ọgụgụ ndị gara ha dị 3,600; nzukọ klas 48, ndị gara ya dị 1,100; kesaa akwụkwọ ọnụ ọgụgụ ha ruru 5,000 n’asụsụ Portuguese n’anaghị ego.” Ọtụtụ ndị ji mmasị meghachi omume mgbe nna m kwuru okwu bụ́ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.”

Mgbe a raara ihe owuwu ndị ọhụrụ nye na Brazil na March 8, 1997, broshuọ nraranye ahụ kọrọ, sị: “1923: George Young bịarutere Brazil. Ọ haziri alaka ụlọ ọrụ n’etiti Rio de Janeiro.” Ọ bụ ezie na e nwere akwụkwọ e ji amụ Bible n’asụsụ Spanish, e nwere mkpa inwekwa ya n’asụsụ Portuguese, bụ́ asụsụ bụ́ isi nke Brazil. N’ihi ya, n’October 1, 1923, a malitere ibipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Portuguese.

Nna m zutere ọtụtụ ndị a ma ama na Brazil. Otu bụ nwoke Portugal bụ́ aka ji akụ̀ nke aha ya bụ Jacintho Pimentel Cabral, bụ́ onye nyere ụlọ ya maka ịnọ na-enwe nzukọ. N’oge na-adịghị anya, Jacintho nakweere eziokwu Bible ma mesịa ghọọ otu n’ime ndị na-arụ ọrụ n’alaka ahụ. Onye ọzọ bụ Manuel da Silva Jordão, bụ́ nwa okorobịa bụ́ onye Portugal nke na-elekọta ubi. Ọ nụrụ okwu ihu ọha nke nna m kwuru bụ́ nke kwaliri ya ilaghachi Portugal ije ozi dị ka onye colporteur, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova n’oge ahụ.

Nna m ji ụgbọ okporo ígwè mee njem nke ukwuu gburugburu Brazil, o jisikwara ike chọpụta ndị nwere mmasị. N’otu n’ime njem ya, o zutere Bony na Catarina Green, ọ nọnyekwaara ha ruo ihe dị ka izu abụọ, na-akọwara ha Akwụkwọ Nsọ. Ihe dị ka mmadụ asaa so n’ezinụlọ ahụ mesịziri gosipụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova site na baptism ime mmiri.

Onye ọzọ o zutere bụ Sarah Bellona Ferguson na 1923. Na 1867, mgbe ọ bụ nwa agbọghọ, ya na nwanne ya nwoke bụ́ Erasmus Fulton Smith na ndị ọzọ so n’ezinụlọ ha, si United States kwaga Brazil. Kemgbe 1899, ọ nọwo na-enwetachi magazin Ụlọ Nche anya site na post ọfịs. Nleta nna m letara ha bụ ezi ohere ahụ Sarah, ụmụ ya anọ, na otu onye nna m kpọrọ Daada Sallie nọworo na-eche eri oge iji bụrụ ndị e mere baptism. Nke ahụ bụ na March 11, 1924.

N’oge na-adịghị anya, nna m nọ na-eme nkwusa ná mba ndị ọzọ dị n’Ebe Ndịda America. Na November 8, 1924, o si Peru deta akwụkwọ, sị: “M ka kesasịrị traktị 17,000 na Lima na Callao.” Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gawara Bolivia iji kesaa traktị n’ebe ahụ. O dere banyere nleta ahụ, sị: “Nna anyị na-agọzi mgbalị m. Otu onye India nyeere m aka. Ụlọ ya dị n’isi mmiri Amazon. O werewo 1,000 traktị na akwụkwọ ụfọdụ laa.”

Site ná mgbalị ndị nna m mere, a ghara mkpụrụ nke eziokwu Bible n’ọtụtụ mba ndị dị n’Ebe Etiti na n’Ebe Ndịda Kọntinentị America. Ụlọ Nche (Bekee) nke December 1, 1924, kọrọ, sị: “George Young anọwo n’Ebe Ndịda America ruo ihe karịrị afọ abụọ ugbu a. . . . Ọ bụworo nwanna a a hụrụ n’anya ihe ùgwù iburu ozi nke eziokwu ahụ gaa Punta Arenas, nke dị n’Ọwara Mmiri Magellan.” Nna m butekwara ụzọ n’ọrụ nkwusa ahụ ná mba ndị dị ka Costa Rica, Panama, na Venezuela. Ọ gara n’ihu n’agbanyeghị na o butere ọrịa ịba bụ́ nke metụtara ahụ ike ya.

Ọ Gazie Europe

Na March 1925, nna m banyere ụgbọ mmiri ịga Europe, bụ́ ebe o nwere olileanya ikesa traktị 300,000 ndị dabeere na Bible na Spain nakwa Portugal nakwa ime ndokwa ka Nwanna Rutherford kwuo okwu ihu ọha. Otú ọ dị, mgbe nna m rutesịrị Spain, o kweghị ka Nwanna Rutherford kwuo okwu ihu ọha ndị dị otú ahụ n’ihi ọnọdụ nke okpukpe ekweghị ọzọ dịrị nke e nwere n’ebe ahụ.

Ná nzaghachi, Nwanna Rutherford degaara ya akwụkwọ, na-ehota Aịsaịa 51:16, sị: “Etinyewo m okwu m n’ọnụ gị, ekpuchiwokwa m gị na ndò nke aka m, ka m wee nwee ike ịkụ eluigwe, ma tọọ ntọala ụwa, ma sị Zaịọn, Unu bụ ndị m.” (King James Version) Mgbe o kwuru nke ahụ, nna m kwubiri, sị: “N’ezie ọ bụ uche Onyenwe anyị ka m gaa n’ihu ma hapụrụ ya ihe ga-esi na ya pụta.”

Na May 10, 1925, Nwanna Rutherford si n’aka onye ntụgharị kwuo okwu ihu ọha ya n’Ụlọ Ihe Nkiri Novedades nke dị na Barcelona. Ihe karịrị mmadụ 2,000 gara ya, gụnyere otu onye ọrụ gọọmenti na onye nche pụrụ iche bụ́ ndị nọ n’elu ikpo okwu. A gbasoro usoro yiri nke ahụ na Madrid, bụ́ nke mmadụ 1,200 gara. Mmasị okwu ndị a kpaliri dugara n’iguzobe alaka ụlọ ọrụ na Spain bụ́ nke, dị ka 1978 Yearbook of Jehovah’s Witnesses si kwuo ya, e nyefere “n’aka George Young iduzi.”

Na May 13, 1925, Nwanna Rutherford kwuru okwu na Lisbon, Portugal. Nleta o mere n’ebe ahụ nwekwara nnukwu ihe ịga nke ọma, n’agbanyeghị mgbalị ndị ụkọchukwu mere itisasị nzukọ ahụ site n’iti mkpu na itikasị oche. Mgbe Nwanna Rutherford kwusịrị okwu ihu ọha ya na Spain na Portugal, nna m nọgidere na-egosi “Foto Ihe Nkiri” ahụ, o mekwara ndokwa ka e bipụta ma kesaa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ebe ndị ahụ. Na 1927 ọ kọrọ na ‘a kpọsawo ozi ọma ahụ n’obodo ukwu na n’obodo nta nile dị na Spain.’

Ime Nkwusa na Soviet Union

Ebe ọzọ e kenyere nna m ọrụ ozi ala ọzọ bụ Soviet Union, bụ́ ebe o rutere n’August 28, 1928. Ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ ozi o dere, nke akara ụbọchị ya bụ October 10, 1928, na-agụ, sị:

“Kemgbe m bịara Russia, apụrụ m n’ezie iji obi m nile kpesie ekpere ike, sị, ‘Ka alaeze gị bịa.’ Ana m amụ asụsụ ha, ma anaghị m amụta ya ngwa ngwa. Onye na-atụgharịrị m okwu bụ nnọọ nwoke na-enweghị atụ, ọ bụ onye Juu, ma o kweere na Kraịst ma nwee mmasị na Bible. Enwewo m ahụmahụ ndị na-akpali mmasị ma amaghị m ókè a ga-ekwe ka m nọruo. N’izu gara aga, a gwara m ka m pụọ n’ime awa 24 ma e doziri okwu ahụ, n’ihi ya, apụrụ m ịnọtụkwu.”

Ọ kpọtụụrụ ụfọdụ ndị Mmụta Bible nọ na Kharkov, nke bụzi obodo ukwu na Ukraine, mmekọrịta ịhụnanya si na ya pụta mere ka anya mmiri nke ọṅụ gbaa ha. E nwere obere mgbakọ kwa abalị ruo etiti abalị. Mgbe o mesịrị dee akwụkwọ ozi banyere nzukọ a o so ụmụnna a nwee, nna m kwuru, sị: “Chei, ụmụnna a, e jichiri akwụkwọ ole na ole ha nwere, ndị ọchịchị ha enweghịkwa omume enyi, ma ha na-enwe obi ụtọ.”

E mere ka ozi nna m jere na Soviet Union pụta ìhè na broshuọ pụrụ iche e wepụtara maka ndị gara nraranye nke ihe owuwu alaka ọhụrụ ahụ dị na St. Petersburg, Russia, nke e mere na June 21, 1997. Broshuọ ahụ na-ekwu na e zigara nna m Moscow, ọ na-akọkwa na nna m natara ikike “ibipụta mkpụrụ 15,000 nke akwụkwọ nta ndị bụ́ Freedom for the Peoples na Where Are the Dead? maka nkesa na Russia.”

Mgbe nna m sisịrị Russia lọta, e kenyere ya ọrụ pilgrim na United States. Na South Dakota, ọ gara n’ụlọ Nellena na Verda Pool, bụ́ ụmụnne nwanyị abụọ bụ́ ndị ghọrọ ndị ozi ala ọzọ na Peru ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị. Ha gosipụtara ezi ekele maka ozi nna m jere n’adaghị mbà ma kwuo, sị: “Ụmụnna nwoke ndị nọ n’oge gboo ahụ nwere mmụọ ịsụ ụzọ n’ezie ka ha na-aga n’ebe ndị a na-abụghị mba ha n’ejighị ihe onwunwe buru ibu ma jiri obi jupụtara n’ịhụnanya maka Jehova na-aga. Nke ahụ bụ ihe kwaliri ha ịrụzu ihe ha rụzuru.”

Ịlụ Nwunye na Njem nke Abụọ

N’afọ ndị a nile, nna m na Clara Hubbert nke bi n’Àgwàetiti Manitoulin, Ontario, nọ na-ederịta akwụkwọ ozi. Ha abụọ gachara mgbakọ ahụ e nwere na Columbus, Ohio, na July 26, 1931, bụ́ mgbe Ndị Mmụta Bible nakweere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10–12) Otu izu mgbe nke ahụ gasịrị, ha lụrụ. N’oge na-adịghị anya, nna m pụkwara ọzọ, na njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ n’àgwàetiti ndị dị na Caribbean. N’ebe ahụ, o nyere aka ịhazi nzukọ na inye ndị ọzọ ọzụzụ n’ozi ụlọ n’ụlọ.

Nne m nwetara foto, kaadị, na akwụkwọ ozi ndị si Suriname, St. Kitts, na ọtụtụ ebe ndị ọzọ. Akwụkwọ ozi ndị ahụ kọrọ banyere ọganihu nke ọrụ nkwusa ahụ, mgbe ụfọdụ kwa, ọ na-agụnye akụkọ banyere ụmụ nnụnụ, ụmụ anụmanụ, na osisi ndị dị kpọmkwem ná mba ọ nọ na ya. Na June 1932, nna m rụsịrị ọrụ e kenyere ya na Caribbean, ọ nọkwa n’ebe ndị kwụrụ ụgwọ kasị ala na-anọ n’ụgbọ mmiri ọ banyere dị ka ọ na-emebu, wee lọtaghachi Canada. Mgbe nke ahụ gasịrị, ya na nne m kerekọọrọ òkè ọnụ n’ọrụ ime nkwusa oge nile, na-eso nnukwu ìgwè ndị ọzọ bụ́ ndị ozi oge nile eme nkwusa n’ógbè Ottawa n’oge oyi nke 1932/1933.

Akụkọ Dị Mkpirikpi Banyere Ndụ Ezinụlọ Anyị

Na 1934, a mụrụ nwanne m nwoke, bụ́ David. Mgbe ọ ka bụ nnọọ nwata, ọ na-eguzo n’elu igbe okpu mama m ma na-amụ ikwu “okwu” nke ya. Ná ndụ ya nile, o gosipụtawo ịnụ ọkụ n’obi o nwere n’ebe Jehova nọ dị ka nna ya. Ha atọ na-eji ụgbọala e kekwasịrị ígwè okwu n’elu ya eme njem, ka ha na-eleta ọgbakọ ndị dị site n’ụsọ oké osimiri ebe ọwụwa anyanwụ Canada ruo na nke ebe ọdịda anyanwụ. A mụrụ m na 1938 mgbe nna m nọ na-eje ozi na British Columbia. David na-echeta mgbe nna m nyiwere m n’elu ihe ndina, nna m, nne m, na David egbuokwa ikpere n’ala gburugburu ya ka nna m kpere ekpere inye ekele n’isi m.

N’oge oyi nke 1939, anyị biri na Vancouver ka nna m na-eleta ọgbakọ ndị dị n’ógbè ahụ. Otu akwụkwọ ozi nke akara ụbọchị ya bụ January 14, 1939, bụ́ nke o dere mgbe ọ nọ na Vernon, British Columbia, so n’ime ọtụtụ akwụkwọ ozi anyị nwetara n’afọ ndị ahụ. Nna m detaara ya Clara, David, na Ruth, na-asị: “Nanị obere nsutụ ọnụ na mmakụ.” Onye nke ọ bụla n’ime anyị nwere ozi na ya. O kwuru banyere owuwe ihe ubi ịbụ nke hiri nne n’ebe ahụ ma ndị ọrụ adịrị ole na ole.—Matiu 9:37, 38.

Otu izu mgbe nna m sisị n’ọrụ e kenyere ya na Vancouver lọta, ọ tụbọrọ ná nzukọ. Nchọpụta e mere mgbe nke ahụ gasịrị kpughere na o nwere akpụ cancer kpatara n’ụbụrụ. Na May 1, 1939, o jesịrị ozi elu ala ya. Adị m ọnwa itoolu, David dịkwa ihe fọrọ nta ka ọ bụrụ afọ ise. Nne anyị nke anyị hụrụ n’anya, bụ́ onye nwekwara olileanya nke ndụ eluigwe, nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo ọnwụ ya na June 19, 1963.

Nna m gosipụtara n’ụzọ magburu onwe ya mmetụta o nwere maka ihe ùgwù ya nke iburu ozi ọma ahụ gaa ọtụtụ mba n’otu n’ime akwụkwọ ozi o detaara mama m. Ụfọdụ n’ime ihe o kwuru bụ: “Jehova ji amara kwe ka m gaa n’ala ndị a dị ka ìhè iji zie ozi Alaeze ahụ. Ka e too aha nsọ ya. Ebube ya na-enwu site n’adịghị ike na erughị eru.”

Ugbu a, ụmụ, ụmụ ụmụ, na ụmụ ụmụ ụmụ George na Clara Young na-ejekwara Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ozi. A gwara m na nna m na-ehotakarị Ndị Hibru 6:10, bụ́ nke na-asị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.” Anyị onwe anyị kwa echezọbeghị ọrụ nna m rụrụ.

[Foto dị na peeji nke 23]

Nna m, n’aka nri, ya na ụmụnne ya ndị nwoke atọ

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Nna m (nke guzo ọtọ) na Nwanna Woodworth, Nwanna Rutherford, na Nwanna Macmillan

N’okpuru: Nna m (n’isi isi aka ekpe) ka ya na Nwanna Russell nọ n’otu ìgwè

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Nna m na nne m

N’okpuru: Ụbọchị agbamakwụkwọ ha

[Foto dị na peeji nke 27]

Mụ na David na nne m afọ ụfọdụ mgbe nna m nwụsịrị