Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa Nke Rụrụ Arụ

Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa Nke Rụrụ Arụ

Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa Nke Rụrụ Arụ

ONYE nke nwoke dị oji, maa mma. Onye nke nwanyị nwere nkà, maakwa mma. Ha abụọ na-arụ n’otu ụlọ ọrụ. Nke nwanyị nwere mmasị dị ukwuu n’ebe ọ nọ. Nke nwoke na-egosi ya mmetụta ịhụnanya. Ha na-azụrịtara onwe ha onyinye. N’oge na-adịghị anya, ha malitere inwe mmekọ. Nke nwoke hapụrụ nwunye ya n’ihi ya. N’ikpeazụ, nke nwanyị kpebiri ịlaghachikwuru di ya ma kwụsị mmekọrịta ahụ. N’enwechaghị mmasị, ọ gbalịrị ịlaghachikwuru nwunye ya. Otú ọ dị, n’ihi egosighị ezigbo ịkwa ụta, o nweghị ihe ịga nke ọma. Ebe ọ na-adịghị onye e merụrụ ahụ, onye ọ bụla o metụtara biiri ndụ gaa n’ihu.

A dịghịzi ele ụkpụrụ omume mmekọahụ anya dị ka ezi ụkpụrụ n’ụwa a. Ịchụso ihe ụtọ na afọ ojuju n’eleghị anya n’azụ yiri ka ọ bụ ihe zuru ebe nile. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye yiri ka ọ bụ ihe zuru ụwa ọnụ ma jupụta n’ebe ụfọdụ dị ka alụmdi na nwunye.”

Ma, Jehova Chineke na-achọ ka alụmdi na nwunye bụrụ “ihe a na-asọpụrụ n’etiti [mmadụ] nile” nakwa ka ihe ndina alụmdi na nwunye bụrụ ihe “a dịghị emerụ emerụ.” (Ndị Hibru 13:4) Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) N’ihi ya, iji nweta ihu ọma Chineke, ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-adị ọcha n’omume n’ụwa a rụrụ arụ.

Olee otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị pụọ ná mmetụta ndị na-emerụ emerụ gbara anyị gburugburu? N’isi nke 5 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu, Eze Solomọn nke Israel oge ochie na-enye azịza ya. Ka anyị nyochaa ihe o nwere ikwu.

Izuzu Ichebe Gị

“Nwa m, ṅaa ntị n’amamihe m,” ka eze Israel ji malite. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Tọọ ntị gị n’ala nye nghọta m: ka i wee debe izuzu dị iche iche, ka egbugbere ọnụ gị wee chebekwa ihe ọmụma.”Ilu 5:1, 2.

Iji guzogide ọnwụnwa ndị na-eduga n’ime omume rụrụ arụ, ọ dị anyị mkpa inwe amamihe—ikike nke iji ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ eme ihe—na nghọta, ma ọ bụ ike nke ịmata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ na ịhọrọ ụzọ ziri ezi. A gbara anyị ume ịṅa ntị n’amamihe na nghọta ka anyị wee nwee ike ichebe izuzu anyị. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Mgbe anyị na-amụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, ọ dị anyị mkpa ịrịba ụzọ Jehova si eme ihe ama ma tọọ ntị anyị n’ala nye uche na nzube ya. Site n’ime nke a, anyị ga na-eduzi usoro iche echiche anyị n’ụzọ ndị ziri ezi. Izuzu e nwetara n’ụzọ dị otú ahụ kwekọrọ n’amamihe na ihe ọmụma Chineke. Mgbe e ji izuzu a mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ na-echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị e ji ihe ụra dị iche iche nke omume rụrụ arụ mata n’ọnyà.

Kpachara Anya Maka Okpo Ọnụ Na-akwọ Mụrụmụrụ

Ihe mere izuzu ji dị mkpa iji nọgide na-adị ọcha n’omume n’ụwa nke na-adịghị ọcha bụ n’ihi na ụzọ nke onye na-eme omume rụrụ arụ na-adọrọ adọrọ. Solomọn na-adọ aka ná ntị, sị: “Egbugbere ọnụ nke nwanyị [ala ọzọ, NW] na-abụsị mmanụ aṅụ, ihe kwọrọ mụrụmụrụ karịa mmanụ ka okpo ọnụ ya dịkwa: ma ikpeazụ ya na-elu ilu dị ka wormwood, ọ dị nkọ dị ka mma agha ihu abụọ.”Ilu 5:3, 4.

N’ilu a, a kọwara onye na-ebi ndụ ọjọọ dị ka “nwanyị ala ọzọ”—onye akwụna. * Okwu o ji arata onye ọ na-ala n’iyi na-adị ụtọ dị ka mmanụ aṅụ si n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ma dịkwa mụrụmụrụ karịa mmanụ olive. Ọ̀ bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’omume ndị na-eduba ná mmekọahụ rụrụ arụ adịghị amalite n’ụzọ dị otú a? Dị ka ihe atụ, tụlee ahụmahụ nke otu odeakwụkwọ mara mma dị afọ 27 aha ya bụ Amy. Ọ na-akọ, sị: “Nwoke a nọ n’ebe m na-arụ ọrụ na-egosi m mmasị dị ukwuu ma na-aja m mma mgbe nile. Ọ na-enye obi ụtọ ịbụ onye e nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ma m pụrụ ịhụ nke ọma na mmasị o nwere n’ebe m nọ bụ kpọmkwem maka mmekọahụ. Agaghị m ekwe ka omume ya duhie m.” Okwu ịja mma efu nke onye nrafu na-adọrọkarị adọrọ, ọ gwụla ma anyị ghọtara ihe ha bụ n’ezie. N’ihi nke a, ọ dị anyị mkpa iji izuzu anyị eme ihe.

Ihe ndị na-esi n’omume rụrụ arụ apụta na-elu ilu dị ka wormwood ma dịkwa nkọ dị ka mma agha ihu abụọ—ọ na-egbu mgbu ma na-akpata ọnwụ. Akọ na uche ikpe mara, ime ọkwà, ma ọ bụ ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ na-abụkarị ihe ndị dị mwute na-esi n’omume dị otú ahụ apụta. Cheekwa banyere oké ihe mgbu nke uche nke di ma ọ bụ nwunye nke onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-enwe. Otu omume nke ekwesịghị ntụkwasị obi pụrụ iweta ihe mgbu dị omimi nke pụrụ ịdịru oge nile onye ahụ dị ndụ. Ee, omume rụrụ na-akpata mwute.

N’ikwu banyere ụzọ ndụ nke nwanyị na-ebi ndụ ọjọọ, eze ahụ nwere amamihe gara n’ihu, sị: “Ụkwụ ya abụọ na-arịda n’ọnwụ; ala mmụọ ka nzọụkwụ ya nile na-ejidesi ike; ka i wee ghara ime ka okporo ụzọ ndụ dị larịị: ụzọ ya nile emewo mkpatụ, ị gaghị ama ha.” (Ilu 5:5, 6) Ụzọ nke nwanyị na-ebi ndụ ọjọọ na-eduga ya n’ọnwụ—na-eduga nzọụkwụ ya na Sheol, bụ́ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Lee otú okwu ndị a siworo bụrụ eziokwu ka ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, karịsịa ọrịa AIDS, na-ejupụta ebe nile! Ihe ọ na-apụtara ya bụ otu ihe ahụ ọ na-apụtara ndị sonyere ya n’ụzọ ọjọọ ya.

Eze ahụ ji nchegbu sitere n’ezi obi na-agba ume, sị: “Ma ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị, unu esikwala n’okwu nile nke ọnụ m wezụga onwe unu. Mee ka ụzọ gị dị anya n’ebe ọ nọ, abịarukwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso.”Ilu 5:7, 8.

Ọ dị anyị mkpa ịnọ n’ebe dị anya ruo ókè o kwere mee pụọ ná mmetụta nke ndị na-eme omume rụrụ arụ. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji kpughepụ onwe anyị nye ụzọ ha dị iche iche site n’ige egwú na-emerụ emerụ, ikiri ihe ntụrụndụ na-emetọ emetọ, ma ọ bụ ikpughepụ onwe anyị nye ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ? (Ilu 6:27; 1 Ndị Kọrint 15:33; Ndị Efesọs 5:3-5) Leekwa ihe nzuzu ọ bụ ịdọta mmasị ha site n’ime mfegharị ma ọ bụ site n’iji ejiji na-adịghị mma!—1 Timoti 4:8; 1 Pita 3:3, 4.

Ọ Na-efu Ihe Dị Nnọọ Ukwuu

Olee ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ime ka ụzọ anyị dịrị n’ebe dị nnọọ anya pụọ na nke onye na-ebi ndụ ọjọọ? Solomọn na-aza, sị: “Ka i wee ghara inye ndị ọzọ ebube gị, ka i wee gharakwa inye onye na-enweghị obi ebere afọ gị nile: ka afọ wee ghara iju ndị na-abụghị ndị nke gị n’ume gị; ka ihe nile ị dọgburu onwe gị n’ọrụ inweta wee gharakwa ịdị n’ụlọ onye na-abụghị nke gị; i wee sụọ ude n’ikpeazụ gị, mgbe anụ ahụ gị na ahụ gị ga-agwụsị.”Ilu 5:9-11.

Solomọn si otú a kwusie okwu ike banyere ihe dị ukwuu ịdaba n’omume rụrụ arụ na-efu. Ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye na ire ùgwù onwe onye, na-agakọ. Ọ́ bụghị ihe na-eweda n’ala n’ezie anyị ịbụ nanị ndị e ji mejuo agụụ ihe ọjọọ nke anyị ma ọ bụ nke onye ọzọ? Ọ́ dịghị egosi enweghị ùgwù onwe onye iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye anyị enwe mmekọahụ?

Otú ọ dị, gịnị ka ‘inye ndị na-abụghị ndị nke anyị, afọ anyị, ume anyị, na ihe anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ inweta’ gụnyere? Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “Isi ihe dị n’amaokwu ndị a doro anya: Ihe ekwesịghị ntụkwasị obi na-efu pụrụ ịdị ukwuu; n’ihi na ihe nile mmadụ dọgburu onwe ya n’ọrụ inweta—ọkwá, ike, ọganihu—pụrụ ifunahụ ya ma ọ́ bụghị site n’ihe nwanyị ahụ ji anyaukwu na-achọ n’aka ya ọ bụrụ site n’ihe ndị obodo ji iti mkpu na-ekwu ka o mee n’ihi omume ahụ.” Mmekọahụ rụrụ arụ pụrụ ifu ọtụtụ ihe!

N’ịbụ onye reworo ùgwù ya ma mefusịa ihe onwunwe ya, onye nzuzu pụrụ ịsụ ude, na-asị: “Lee ka m siworo kpọọ ịdọ aka ná ntị asị nke ukwuu, ọ bụkwa ịba mba ka obi m lelịworo anya; egeghịkwa m ntị n’olu ndị ozizi m, ọ bụghịkwa n’ebe ndị na-ezi m ihe nọ ka m tọworo ntị m n’ala! Ọ fọdụrụ ihe nta ka m nọzuo n’ihe ọjọọ nile n’etiti mkpọkọta na nzukọ ndị nke m.”Ilu 5:12-14.

Ka oge na-aga, onye mmehie ahụ na-ekwu ihe otu onye ọkà mmụta kpọrọ “ọtụtụ ‘a sị nnọọ na’: a sị nnọọ na m gere nna m ntị; a sị nnọọ na m meghị ihe bụ́ uche m; a sị nnọọ na m naara ndụmọdụ ndị ọzọ nyere m.” Otú ọ dị, nghọta a na-abịa n’azụ oge. Onye ahụ na-adịghịzi ọcha emebiwo ndụ ya ma metọọ aha ya. Lee ka o si dị anyị mkpa ịtụle ihe dị ukwuu omume rụrụ arụ na-efu tupu ya erikpuo anyị!

“Ṅụọ Mmiri Sitere n’Olulu nke Aka Gị”

Bible ọ̀ na-agbachi nkịtị n’ihe banyere mmekọahụ? Ọ dịghị ma ọlị. Mmetụta uche nke ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ na-akpali na oké mmetụta nwoke na nwanyị na-enwe n’etiti onwe ha bụ onyinye sitere n’aka Chineke. Otú ọ dị, ọ bụ nanị ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe mmekọrịta a chiri anya. N’ihi ya, Solomọn na-agba nwoke lụrụ nwanyị ume, sị: “Ṅụọ mmiri sitere n’olulu nke aka gị, na mmiri na-eru eru site n’ime olulu mmiri nke aka gị. Isi iyi gị, hà ga-awasasị n’èzí? Ọ̀ bụ n’ámá ka iyi mmiri ga-awasasị? Ka ha dịrị nanị gị onwe gị, ma ka ndị na-abụghị ndị nke gị ghara isoro gị nwee ha.”Ilu 5:15-17.

“Olulu nke aka gị” na “olulu mmiri nke aka gị” bụ okwu uri ndị e ji eme ihe maka nwunye a hụrụ n’anya. E ji iso ya enwe mmekọahụ tụnyere ịṅụ mmiri na-enye ume ọhụrụ. N’adịghị ka mmiri ndị dị n’ámá, olulu mmiri bụ ihe mmadụ nwe n’onwe ya. A dụkwara nwoke ahụ ọdụ isoro nwunye ya mụọ ụmụ n’ụlọ kama ịghasasị mkpụrụ ya n’èzí, ya bụ, n’etiti ndị inyom ọzọ. N’ụzọ doro anya, ndụmọdụ a na-enye nwoke bụ ka o kwesị ntụkwasị obi nye nwunye ya.

Nwoke ahụ nwere amamihe gara n’ihu, sị: “Ka isi iyi gị bụrụ ihe a gọziri agọzi; ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa. Dị ka nne ele nke na-ahụ n’anya na nne ewu ọhịa mara mma, ka ara ya abụọ na-eju gị afọ na mgbe nile; nanị n’ịhụnanya ya ka ị ga na-awagharị mgbe nile.”Ilu 5:18, 19.

“Isi iyi,” na-ezo aka n’onye e ji emeju agụụ mmekọahụ. Mmadụ iso di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ bụ ihe “a gọziri agọzi”—ihe Chineke nyere. N’ihi ya, a gbara nwoke ume ịṅụrị ọṅụ na nwanyị ọ lụrụ n’okorobịa. Nye ya, ọ bụ onye a hụrụ n’anya na onye mara mma dị ka nne ele, bụrụkwa onye mara mma ma na-adọrọ adọrọ dị ka ewu ọhịa.

Solomọn jụziri ajụjụ abụọ na-akpali iche echiche: “Ma n’ihi gịnị ka ị ga-eji nwanyị na-abụghị nwunye gị wagharịa, nwa m? N’ihi gịnị ka ị ga-agbakụ nwanyị na-abụghị nwunye gị obi?” (Ilu 5:20) Ee, n’ihi gịnị ka a ga-eji raba onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye n’iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ site ná mkpakọrịta ndị ọ na-enwe n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ebe ọzọ?

Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst lụrụ di na nwunye ndụmọdụ a, sị: “Nke a ka m na-ekwu ụmụnna m, e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ, ka ndị nwere nwunye wee dị ka ha enweghị site n’ugbu a.” (1 Ndị Kọrint 7:29) Gịnị ka nke a na-agụnye? Ụmụazụ Jisọs Kraịst kwesịrị ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’ (Matiu 6:33) N’ihi ya, ndị lụrụ di na nwunye agaghị na-eche banyere onwe ha gabiga ókè nke itinye ọdịmma Alaeze n’ọnọdụ nke abụọ ná ndụ ha.

Mkpa Maka Njide Onwe Onye

A pụrụ ịchịkwa agụụ mmekọahụ. Ndị na-achọ nnwapụta Jehova aghaghị ime otú ahụ. “Nke a bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ka e doo unu nsọ, ka unu ghara ịkwa iko; ka onye ọ bụla n’ime unu mata otú ọ ga-enwe nwunye nke aka ya n’odido nsọ na nsọpụrụ,” ka Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3, 4.

Mgbe ahụ, ndị na-eto eto ekwesịghị ịmabanye n’alụmdi na nwunye mgbe mbụ ha nwere mkpali nke mmekọahụ. Alụmdi na nwunye chọrọ nraranye, imezukwa ibu ọrụ dị otú ahụ chọrọ ntozu okè. (Jenesis 2:24) Ọ ka mma ichere ruo mgbe mmadụ gafere “ntoju ntorobịa”—oge mkpali nke inwe mmekọahụ na-adị nnọọ ike, nweekwa ike ịkpaghasị uche mmadụ. (1 Ndị Kọrint 7:36, NW) Leekwa ihe nzuzu na mmehie ọ bụ onye toruworo ogo mmadụ ma nwee ọchịchọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye inwe mmekọahụ rụrụ arụ nanị n’ihi na ọ dịbeghị onye kwere nkwa ịlụ ya!

“Ajọ Omume Nile nke Aka Ya Ga-anwụde Onye ahụ Na-emebi Iwu”

Isi ihe mere mmekọahụ rụrụ arụ ji dị njọ bụ na Jehova—Onye Na-enye ndụ na Onye Na-enye mmadụ ikike nke mmekọahụ—kpọrọ ya asị. Ya mere, n’inye ihe mkpali kasị ike maka ịdị ọcha n’omume, Eze Solomọn na-ekwu, sị: “N’ihi na n’ihu anya Jehova ka ụzọ nile nke mmadụ dị, okporo ụzọ ya nile ka Ọ na-eme ka ha dị larịị.” (Ilu 5:21) Ee, ọ dịghị ihe zoro ezo n’anya Chineke, bụ́ “Onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.” (Ndị Hibru 4:13) Omume mmekọahụ ọ bụla na-adịghị ọcha, n’agbanyeghị otú e si mee ya na nzuzo, n’agbanyeghịkwa ihe ndị ọ rụpụtara n’ụzọ anụ ahụ nakwa ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ, ga-emebirịrị mmekọrịta anyị na Jehova. Lee ihe nzuzu ọ bụ imebi udo anyị na Chineke n’ihi ihe ụtọ rụrụ arụ na-adịru nwa oge!

Ụfọdụ ndị na-abanye n’ụzọ ndụ rụrụ arụ n’emeghị ihere pụrụ iyi ka ha na-eme ya na-enwetaghị ntaramahụhụ—ma ọ bụghị ruo ogologo oge. Solomọn na-ekwu, sị: “Ajọ omume nile nke aka ya ga-anwụde onye ahụ na-emebi iwu, a ga-ejikwa ụdọ nile nke mmehie ya jidesie ya ike. Onye ahụ ga-anwụ n’anaraghị ịdọ aka ná ntị; ọ bụkwa n’ịba ụba nke uche ya gbagọrọ agbagọ ka ọ na-awagharị.”Ilu 5:22, 23.

N’ihi gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị ga-ejitụdị wagharịa? E kwuwerị, akwụkwọ Ilu eburula ụzọ dọọ anyị aka ná ntị banyere ụzọ ndị na-adọrọ adọrọ nke ụwa. Ọ na-eme ka anyị mata ihe mmekọahụ rụrụ arụ na-efukarị—ahụ ike anyị, ihe onwunwe anyị, ume anyị, na ùgwù anyị. Site n’ilepụ anya n’ihu nke ọma n’ụzọ dị otú ahụ, ọ dịghị anyị mkpa ma ọlị ịnọ n’ọnọdụ anyị ga-eji kwuo ọtụtụ “a sị nnọọ na.” Ee, site n’itinye ndụmọdụ Jehova nyeworo n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ n’ọrụ, anyị pụrụ ịnọgide na-adị ọcha n’omume n’ime ụwa nke rụrụ arụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 E ji okwu ahụ bụ́ “onye ala ọzọ” mee ihe n’ebe ndị gbakụtara ihe Iwu ahụ kwuru azụ nọ ma si otú ahụ kewapụ onwe ha n’ebe Jehova nọ. N’ihi ya, a na-ezo aka na nwanyị akwụna dị ka “nwanyị ala ọzọ.”

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Ihe ndị na-esi n’omume rụrụ arụ apụta na-elu ilu dị ka wormwood

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

“Ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa”