Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikwusa Ozi Ọma ahụ n’Ubi Osikapa nke Taiwan

Ikwusa Ozi Ọma ahụ n’Ubi Osikapa nke Taiwan

Anyị Dị n’Etiti Ndị Kwere Ekwe

Ikwusa Ozi Ọma ahụ n’Ubi Osikapa nke Taiwan

TAIWAN na-enwekarị mmiri ozuzo n’ụba, bụ́ nke na-eme ka o nwee ike iwe nnọọ osikapa n’ubi ugboro abụọ kwa afọ. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, mmiri adịghị ezo mgbe o kwesịrị izo, mkpụrụ ya ndị ka pupụtara ọhụrụ na-anwụkwa. Mgbe nke a mere, ike ọ̀ na-agwụ onye ọrụ ubi? Ee e. Ọ maara na nnọgidesi ike dị mkpa. Ọ na-agha mkpụrụ ndị ọhụrụ ma kụghachi ha n’ubi ahụ. Ọ bụrụzie na ọnọdụ aka mma, onye ọrụ ubi ahụ na-ewe ihe ubi dị mma. Ịkụ mkpụrụ na iwe ihe ubi n’ụzọ ime mmụọ na-eyi nnọọ nke ahụ mgbe ụfọdụ.

Ịnọgidesi Ike n’Owuwe Ihe Ubi Ime Mmụọ

N’afọ ndị gafeworonụ, Ndịàmà Jehova nọ na Taiwan arụsiwo ọrụ ike n’ịkụ na n’iwe mkpụrụ nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ n’ubi n’ógbè ụfọdụ yiri ka ha adịghị amị mkpụrụ. Otu ihe atụ bụ Ógbè Miao-li. E meghachiwo omume n’ụzọ dị nta nye mgbalị ndị a na-eme mgbe ụfọdụ ịgba àmà n’ógbè ahụ. Ya mere na 1973, e kenyere otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ịrụ ọrụ n’ebe ahụ dị ka ndị nkwusa Alaeze oge nile. Ná mmalite, ụfọdụ gosipụtara mmasị n’ozi ọma ahụ. Otú ọ dị, mmasị ahụ kwụsịrị n’oge na-adịghị anya. E kenyeziri ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ahụ ọrụ n’ógbè ọzọ.

Na 1991, e kenyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ ọzọ ọrụ n’ebe ahụ. Ọzọkwa, ihe ndị merenụ gosiri na ọnọdụ e nwere n’ebe ahụ adịghị mma maka uto ime mmụọ. Mgbe afọ ole na ole gasịrị, e kenyegharịrị ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ahụ ọrụ n’ebe ndị e nwere olileanya na ha ga-abụ ubi na-amị mkpụrụ karị. N’ihi ya, ala ahụ tọgbọrọ nkịtị ruo oge ụfọdụ.

Mgbalị Ndị E Meghachiri Enwee Ihe Ịga nke Ọma

Na September 1998, e kpebiri na a ga-eme mgbalị ịchọpụta ógbè ndị ka amị mkpụrụ n’ókèala sara mbara a na-eketaghị ọrụ na Taiwan. Olee otú a ga-esi mezuo nke a? Ọ bụ site n’ikenye ihe dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge 40 ịrụ ọrụ n’ebe ndị mmadụ kasị bijupụta na ha n’ókèala ndị ahụ a na-eketaghị ọrụ.

Obodo abụọ e jikọtara ọnụ n’Ógbè Miao-li so n’ókèala ndị a họọrọ maka mkpọsa ahụ. Ụmụnna nwanyị anọ na-alụbeghị di gaje ịrụ ọrụ n’ebe ahụ ruo ọnwa atọ iji chọpụta otú ókèala ahụ dị. N’oge na-adịghị anya mgbe ha rutesịrị, ha dere akụkọ ndị na-akpali akpali banyere ọnụ ọgụgụ ndị nwere mmasị ha na-achọta. Ka ọ na-erule oge ha rụsịrị ọrụ ịsụ ụzọ ọnwa atọ ha n’ógbè ahụ, ha nọ na-eduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible ebe obibi. Ha guzobekwara ìgwè ọmụmụ akwụkwọ site n’enyemaka nke onye okenye si n’otu ọgbakọ dị nso.

Atọ n’ime ụmụnna nwanyị a mere ka o doo anya na ha ga-enwe mmasị ịnọgide na-elekọta ụmụ obere “mkpụrụ ndị ahụ ka puru ọhụrụ” bụ́ ndị na-eto nnọọ nke ọma. N’ihi ya, a họpụtara abụọ n’ime ha dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche oge nile, onye nke atọ nọgidekwara na-arụ ọrụ n’ebe ahụ dị ka ọsụ ụzọ oge nile. Otu onye okenye si n’ọgbakọ ahụ dị nso kwagara n’ógbè ahụ iji nyere ha aka. Ihe karịrị mmadụ 60 gara gee okwu ihu ọha mbụ e kwuru n’ógbè ahụ. Ugbu a, ọgbakọ ahụ dị ya nso na-enyere ìgwè ọhụrụ a aka inwechi nzukọ anya na Sunday, tinyere ọmụmụ akwụkwọ dị iche iche. N’oge na-adịghị anya, e nwere ike iguzobe ọgbakọ ọhụrụ n’ógbè ahụ.

Nnọgidesi Ike Eweta Ngọzi n’Akụkụ Ndị Ọzọ nke Taiwan

Ógbè ndị ọzọ meghachiri omume n’ụzọ yiri nke ahụ. N’Ógbè I-lan nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke àgwàetiti ahụ, e guzobere Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ọhụrụ n’ógbè ahụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge rụrụ ọrụ.

Ka ọ na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’otu uhuruchi, otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge zutere otu nwa okorobịa ma gosi ya mpempe akwụkwọ e depụtara nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ. Ọ jụrụ ozugbo, sị: “Àpụrụ m ịbịa nzukọ nke abalị echi? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka m kwesịrị iyi?” Onye ọsụ ụzọ a malitere iduziri mmadụ asatọ nwere mmasị ọmụmụ Bible kwa izu. N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ n’ime ndị ahụ ọ na-amụrụ Bible malitere ime atụmatụ ịghọ ndị nkwusa ozi ọma n’onwe ha, na-enwe ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ ndị e mere baptism.

Onye ọzọ nọ n’otu obodo ahụ agawo chọọchị ruo ọtụtụ afọ ma ọ pụghị ịhụ onye ga-akụziri ya Bible. Mgbe ọ nụrụ banyere ndokwa ahụ e mere maka ọmụmụ Bible, o jiiri ohere ahụ mee ihe. A gbara ya ume ịkwadebe ihe ọmụmụ ya tupu oge eruo. Mgbe ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge ahụ bịara iduziri ya ọmụmụ ihe, ọ hụrụ na nwanyị a emeela “ihe omume e nyere ya mee n’ụlọ” site n’ịzụrụ akwụkwọ e ji ede ihe bụ́ ebe o deturu ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ ahụ ọ ga-amụ. O depụtaziri azịza ya nye ajụjụ nke ọ bụla. O depụtakwara n’akwụkwọ o ji ede ihe, akụkụ akwụkwọ nsọ nile e zoro aka na ha n’ihe ọmụmụ ya. Ka ọ na-erule oge nwanna nwanyị ahụ rutere iduziri ya ọmụmụ ihe nke mbụ, nwanyị ahụ akwadebeworị ihe ọmụmụ atọ mbụ!

A hụrụ ihe ndị yiri nke ahụ n’obodo Dongshih nke dị n’etiti Taiwan. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge tinyere ihe karịrị broshuọ 2,000 n’ime ọnwa atọ ha rụrụ ọrụ n’ebe ahụ. Ka ọ na-erule n’ọnwa nke atọ, ha nọ na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi 16. Ala ọma jijiji nke mere n’etiti Taiwan na September 21, 1999, bibiri obodo ahụ n’ụzọ dị ukwuu, ma ụfọdụ ndị nwere mmasị nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ, n’agbanyeghị na ha aghaghị ime njem ruo ihe dị ka otu awa iji gaa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị nso. Ee, nnọgidesi ike dị mkpa iji nwee ezi owuwe ihe ubi, ma ọ̀ bụ nke nkịtị ma ọ bụ nke ime mmụọ.

[Map dị na peeji 8]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

CHINA

Ọwara Mmiri Taiwan

TAIWAN

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.