Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpagbu Akpalie Mmụba n’Antiọk

Mkpagbu Akpalie Mmụba n’Antiọk

Mkpagbu Akpalie Mmụba n’Antiọk

MGBE mkpagbu biiri ọkụ ka e gbusịrị Stifen n’ihi okwukwe ya, ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs si na Jerusalem gbapụ. Otu n’ime ebe ndị ha gbagara bụ Antiọk, Siria, nke dị ihe dị ka kilomita 550 n’ebe ugwu. (Ọrụ 11:19) Ihe ndị mere ebe ahụ mgbe e mesịrị gaje imetụta akụkụ nile nke akụkọ ihe mere eme nke ndị Kraịst. Iji ghọta ihe merenụ, ọ ga-aba uru ịmaratụ ihe ụfọdụ banyere Antiọk.

A bịahaala n’ihe banyere obodo ndị dị n’Alaeze Ukwu Rom, ọ bụ nanị Rom na Aleksandria karịrị Antiọk n’ibu, n’ọganihu, nakwa n’ịdị mkpa. Obodo ukwu a dị na Siria bụ obodo bụ́ isi n’akụkụ ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke osimiri Mediterranean. Antiọk (nke bụ́ Antakya, Turkey n’oge a) dị n’Osimiri Orontes nke ụgbọ mmiri na-aga na ya, bụ́ nke jikọtara ya na ọdụ ụgbọ mmiri ya, bụ́ Seleucia Pieria, nke ji kilomita 32 dịpụ adịpụ site n’ebe ahụ. Ọ na-achịkwa otu n’ime ụzọ azụmahịa ndị kasị mkpa bụ́ ndị dị n’agbata Rom na Ndagwurugwu Taịgris na Yufretis. Dị ka ógbè azụmahịa, o so alaeze ukwu ahụ dum zụkọọ ahịa ma hụ ọpụpụ na mbata nke ụdị mmadụ nile, bụ́ ndị wetara ozi banyere okpukpe dị iche iche n’ebe nile n’ógbè Rom.

Okpukpe na nkà ihe ọmụma ndị Gris amụbawo n’Antiọk. Ma “n’oge Kraịst,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Glanville Downey na-ekwu, “ka ndị mmadụ jiwere aka ha na-achọ okpukpe ga-emere ha ihe ha chọrọ maka nsogbu ha na oké ọchịchọ ha, òtù okpukpe ochie ahụ na nkà ihe ọmụma ndị ahụ ghọwara okwu onye mere otú nkwenkwe ya si dị.” (A History of Antioch in Syria) Ọtụtụ ndị chọtara afọ ojuju na nkwenkwe nke otu chi, ememe, na n’ụkpụrụ omume nke okpukpe ndị Juu.

Ọtụtụ ndị Juu ebiwo n’Antiọk kemgbe e guzobere obodo ahụ na 300 T.O.A. A na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ha dị site na 20,000 ruo 60,000, na-emejupụta ihe karịrị pasent 10 nke ndị bi na ya. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus na-ekwu na usoro ndị eze Seleucid gbara ndị Juu ume ibi n’obodo ahụ, na-enyezu ha ihe ndị ruuru ụmụ amaala. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, e nweela Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik. Nke a kpaliri ndị na-akwado ndị Juu inwe mmasị n’ọchịchọ ha na-achọsi Mesaịa ike. N’ihi ya, e nwewo ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu n’etiti ndị Gris. Ihe ndị a nile mere ka Antiọk bụrụ ubi na-emepụta ihe maka ime ndị na-eso ụzọ nke ndị Kraịst.

Ịgbara Ndị Jentaịl Àmà

Ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụazụ Jisọs a kpagburu, bụ́ ndị si Jerusalem gbasasịa, so nanị ndị Juu kerịta ihe ha kweere. Otú ọ dị, n’Antiọk, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ si Saịprọs na Saịrini gwara “ndị Grik” okwu. (Ọrụ 11:20) N’agbanyeghị na a nọwo na-eme nkwusa nye ndị Juu na-asụ asụsụ Grik na ndị na-eso ụzọ ndị Juu kemgbe Pentikọst nke 33 O.A., nkwusa ahụ e mere n’Antiọk yiri ka ọ bụ ihe ọhụrụ. Ọ bụghị nanị ndị Juu ka e meere ya. N’eziokwu, onye Jentaịl bụ́ Kọnịliọs na ezinụlọ ya aghọworị ndị na-eso ụzọ. Ma Jehova mere ka Pita onyeozi hụ ọhụụ tupu ya ekwenye na o ziri ezi ime nkwusa nye ndị Jentaịl, ma ọ bụ ndị mba ọzọ.—Ọrụ 10:1–48.

N’obodo nke nnukwu ìgwè ndị Juu bi na ya eri oge gboo, nke a na-enwechaghịkwa esemokwu n’etiti ndị Juu na ndị Jentaịl, a nọ na-agbara ndị na-abụghị ndị Juu àmà, ha nọkwa na-emeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi ọma ahụ dị. Ihe àmà na-egosi na Antiọk bụ ebe dị mma maka ihe omume dị otú ahụ, ‘oké ìgwè ghọkwara ndị kwere ekwe.’ (Ọrụ 11:21) Mgbe ndị na-eso ụzọ ndị Juu, bụ́ ndị na-efebu chi ndị ọgọ mmụọ ghọrọ ndị Kraịst, ha na-abụkwa ndị a kwadebere n’ụzọ pụrụ iche ịgbara ndị Jentaịl ndị ọzọ ka na-eme otú ahụ àmà.

Mgbe ha nụrụ banyere ihe ndị na-eme n’Antiọk, ọgbakọ dị na Jerusalem zigara Banabas n’ebe ahụ iji mee nchọpụta. Nhọrọ a họọrọ ya bụ nke amamihe dị na ya na nke ịhụnanya. Ọ bụ onye Saịprọs, dịkwa ka ụfọdụ n’ime ndị ahụ maliteworo ime nkwusa nye ndị na-abụghị ndị Juu, bụ. Ahụ ga-eruworị Banabas ala n’etiti ndị Jentaịl nke Antiọk. N’aka nke ha, ha ga-eleworị ya anya dị ka onye sitere n’ógbè ha maara nke ọma. * Ọ pụrụ ịghọta ọrụ ha na-arụ. Ya mere “mgbe ọ bịaruru, mgbe ọ hụkwara amara Chineke, ọ ṅụrịa; o wee rịọ ha nile, ka ha zube n’obi ha ịnọgide n’ebe Onyenwe anyị nọ,” “e wee tụkwasị oké ìgwè mmadụ nye Onyenwe anyị.”—Ọrụ 11:22–24.

“Ihe ezi uche dị na ha mere e ji nwee ihe ịga nke ọma n’ozi mbụ ahụ e jere n’Antiọk,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Downey na-atụ aro ya, “pụrụ ịbụwo na n’obodo a, ọ dịghị ndị ozi ala ọzọ ahụ mkpa ịtụ egwu ndị Juu na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè dị ka ha tụrụ na Jerusalem; ọzọkwa, na obodo ahụ, bụ́ isi obodo Siria, bụ nke ọchịagha na-achị, n’ihi ya kwa, e nwere udo n’ụzọ ka ukwuu n’etiti ọha mmadụ, e nwechaghịkwa ohere maka ìgwè mmadụ ime ihe ike dị ka e mere na Jerusalem, bụ́ ebe ndị na-achị Judia yiri ka (ma ọ dịghị ihe ọzọ n’oge ahụ) ha enwebeghị ike ịchịkwa ndị Juu ahụ na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè.”

N’ọnọdụ ndị dị mma otú ahụ, n’inwekwa ihe dị ukwuu ime, Banabas ma eleghị anya matara na enyemaka dị ya mkpa, o chetakwara enyi ya Sọl. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ Sọl, ma ọ bụ Pọl? Ihe àmà na-egosi na ọ bụ n’ihi na Pọl, ọ bụ ezie na ọ bụghị otu n’ime ndị ozi 12 ahụ, anatawo ikike dị ka onyeozi nke ndị mba ọzọ. (Ọrụ 9:15, 27; Ndị Rom 1:5; Mkpughe 21:14) N’ihi ya, Pọl kwesịrị nnọọ ekwesị ịbụ onye òtù ya n’ịkpọsa ozi ọma ahụ n’obodo Jentaịl ahụ bụ́ Antiọk. (Ndị Galetia 1:16) Ya mere Banabas gara Tasọs, chọta Sọl, ma kpọrọ ya gaa Antiọk.—Ọrụ 11:25, 26; lee igbe dị na peeji nke 26-27.

A Kpọrọ Ha Ndị Kraịst Site ná Nduzi Chineke

Ruo otu afọ zuru ezu, Banabas na Sọl ‘ziri oké ìgwè mmadụ ihe; ọ bụkwa n’Antiọk ka e buru ụzọ [site ná nduzi Chineke, NW] kpọọ ndị na-eso ụzọ Jisọs ndị Kraịst.’ O yighị ka ọ bụ ndị Juu bụ ndị mbụ kpọrọ ụmụazụ Jisọs ndị Kraịst (Grik) ma ọ bụ ndị Mesaịa (Hibru), n’ihi na ha jụrụ Jisọs dị ka Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst, n’ihi ya kwa, ha agaghị anakwere ya dị ka onye dị otú ahụ site n’ịkpọ ụmụazụ ya ndị Kraịst. Ụfọdụ na-eche na ndị ọgọ mmụọ bi n’obodo ahụ pụrụ inyewo ha utu aha bụ́ ndị Kraịst iji mee ha ihe ọchị ma ọ bụ ná nlelị. Otú ọ dị, Bible na-egosi na ọ bụ Chineke nyere aha ahụ bụ́ ndị Kraịst.—Ọrụ 11:26.

N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ngwaa e ji mee ihe maka aha ọhụrụ ahụ, bụ́ nke a na-asụgharịkarị “a kpọrọ,” bụ nke a na-ejikọta ya na ihe karịrị ike mmadụ, ihe sitere n’afa, ma ọ bụ ihe si n’aka Chineke. N’ihi ya, ndị ọkà mmụta na-asụgharị ya “ịgba afa,” “isi n’aka Chineke kpọsaa,” ma ọ bụ “inye iwu ma ọ bụ ndụmọdụ sitere n’aka Chineke, isi n’eluigwe zie ihe.” Ebe ọ bụ na a kpọrọ ụmụazụ Jisọs ndị Kraịst “site ná nduzi Chineke,” ọ pụrụ ịbụ na Jehova duziri Sọl na Banabas inye aha ahụ.

A nọgidere na-eji aha ọhụrụ ahụ eme ihe. A pụghịzi ịghọtahie ndị na-eso ụzọ Jisọs dị ka ịrọ òtù nke okpukpe ndị Juu, bụ́ nke ha dị nnọọ iche na ya. Ka ọ na-erule ihe dị ka 58 O.A., ndị ọchịchị Rom maara ndị Kraịst nke ọma. (Ọrụ 26:28) Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Tacitus si kwuo, ka ọ na-erule 64 O.A., ìgwè mmadụ nọ na Rom nabatakwara aha ahụ.

Jehova Na-eji Ndị Ya Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Eme Ihe

Oziọma ahụ nwere nnukwu ọganihu n’Antiọk. Site ná ngọzi Jehova na mkpebi ụmụazụ Jisọs mere ịnọgide na-eme nkwusa, Antiọk ghọrọ ebe bụ́ isi nke Iso Ụzọ Kraịst narị afọ mbụ. Chineke ji ọgbakọ dị ebe ahụ mee ihe dị ka ebe e si gbasaa ozi ọma ahụ ruo n’ala ndị dị anya. Dị ka ihe atụ, Antiọk bụ ebe Pọl onyeozi si mee nke ọ bụla n’ime njem ozi ala ọzọ ya a na-emetụbeghị mbụ.

N’oge a, ịnụ ọkụ n’obi na mkpebisi ike n’agbanyeghị mmegide abawokwa uru n’ịgbasa ezi Iso Ụzọ Kraịst, na-eme ka ọtụtụ ndị nwee ike ịnụ ozi ọma ahụ na igosipụta ekele maka ya. * Ya mere ọ bụrụ na i chee mmegide ihu n’ihi na ị na-akwado ofufe dị ọcha, buru n’uche na Jehova nwere ihe ndị mere o ji kwe ka ọ dịrị. Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, a ghaghị inye ndị mmadụ taa ohere ịnụ banyere Alaeze Chineke na iwere ọnọdụ ha n’ebe ọ dị. Mkpebi siri ike i mere ịnọgide na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi pụrụ ịbụ nnọọ ihe a chọrọ iji nyere otu onye aka ịbịaru mmazu nke eziokwu ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 N’ụbọchị ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ, a na-anọ n’Ugwu Casius, nke dị n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Antiọk ahụ àgwàetiti Saịprọs.

^ par. 18 Lee Ụlọ Nche, August 1, 1999, peeji nke 9; Teta!, May 8, 1999, peeji nke 17-18; 1999 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 250-252.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

“Afọ Ndị A Na-amaghị Ihe Banyere” Sọl

OGE ikpeazụ a kpọtụrụ Sọl aha n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi tupu ya agaa Antiọk n’ihe dị ka 45 O.A. bụ mgbe e mere ka atụmatụ e mere igbu ya na Jerusalem kụọ afọ n’ala, ndị kwere ekwe ibe ya ewee ziga ya Tasọs. (Ọrụ 9:28-30; 11:25) Ma nke ahụ mere afọ itoolu tupu mgbe ahụ, n’ihe dị ka 36 O.A. Gịnị ka o mere n’oge dị n’agbata afọ abụọ ahụ—oge a kpọrọ afọ ndị a na-amaghị ihe banyere Sọl?

Sọl si Jerusalem gaa n’ógbè ndị dị na Siria na Silisia, ọgbakọ ndị dị na Judia nụkwara na: “Onye ahụ nke na-esogbu anyị n’oge gara aga, ọ na-ezi ozi ọma ugbu a nke okwukwe ahụ nke ọ na-emebi n’oge gara aga.” (Ndị Galetia 1:21-23) Akụkọ ahụ pụrụ izowo aka n’ọrụ o so Banabas rụọ n’Antiọk, ma ọbụna tupu mgbe ahụ, obi abụọ adịghị ya na Sọl anọghị nkịtị. Ka ọ na-erule 49 O.A., e nwere ọgbakọ ụfọdụ na Siria na Silisia. Otu dị n’Antiọk, ma ụfọdụ na-eche na ndị ọzọ pụrụ ịbụwo n’ihi ọrụ Sọl rụrụ n’afọ ndị ahụ a sị na ọ bụ ndị a na-amaghị ihe banyere ya.—Ọrụ 11:26; 15:23, 41.

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na e kwesịrị ikwu na ihe ndị dị ịrịba ama mere ná ndụ Sọl mere n’oge ahụ. Ma ọ́ bụghị ya, o siri ike ikwu mgbe ọtụtụ ihe isi ike ndị o nwere dị ka ‘onye na-ejere Kraịst ozi’ mere n’ọrụ ozi ala ọzọ ya. (2 Ndị Kọrint 11:23-27) Olee mgbe ndị Juu pịara Sọl ube ụtarị 39? Ebee ka a nọ pịa ya ụtarị ugbo atọ? Ebee ka ọ ‘nọbigara ókè’ n’ụlọ mkpọrọ? Njichi e jichiri ya na Rom mere mgbe e mesịrị. Anyị nwere ihe ndekọ banyere otu ugbo e tiri ya ihe ma kpọchie ya—na Filipaị. Ma gịnị banyere ndị ọzọ? (Ọrụ 16:22, 23) Otu onye edemede na-ekwu na Sọl n’oge ahụ, nọ “na-agba àmà banyere Kraịst n’ime ụlọ nzukọ ndị dị n’Ógbè Ndị Juu n’ụzọ pụrụ ime ka ma ndị isi okpukpe ma ndị isi ọchịchị kpagbuo ya.”

Ụgbọ mmiri kpunahụrụ Sọl ugbo anọ, ma Akwụkwọ Nsọ nyere nkọwa banyere nanị otu, bụ́ nke mere mgbe o depụtasịrị ahụhụ ndị ọ tara, mgbe ọ na-edegara ndị Kọrint akwụkwọ. (Ọrụ 27:27-44) Ya mere, o yiri ka atọ ndị ọzọ hà kpunahụrụ ya mgbe o ji ụgbọ mmiri mee njem ndị anyị na-amaghị ihe ọ bụla banyere ha. Otu n’ime ihe ndị a ma ọ bụ ha nile pụrụ ime ‘n’afọ ndị ahụ a na-amaghị ihe banyere ha.’

A kọwara ihe ọzọ yiri ka o mere n’oge ahụ ná 2 Ndị Kọrint 12:2–5. Sọl kwuru, sị: ‘Amatara m otu mmadụ n’ime Kraịst, afọ iri na anọ gara aga, na e weliri mmadụ dị otú a na mberede ruo eluigwe nke atọ, na e weliri ya rịgoo na Paradaịs, o wee nụ okwu nke a na-apụghị ikwu, nke ọ na-ezighị ezi n’iwu ka mmadụ kwuo ha.’ N’ụzọ doro anya, Sọl na-ekwu banyere onwe ya. Ebe ọ bụ na o dere ihe a n’ihe dị ka 55 O.A., afọ 14 tupu mgbe ahụ ga-eduru anyị laghachi 41 O.A., n’etiti ‘afọ ndị ahụ a na-amaghị ihe banyere ha.’

Obi abụọ adịghị ya na ọhụụ ahụ nyere Sọl nghọta pụrụ iche. Ọ̀ bụ iji kwadebe ya ịbụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ”? (Ndị Rom 11:13) Ò metụtara ụzọ o si chee echiche, dee ihe, ma kwuo okwu mgbe nke ahụ gasịrị? Afọ ndị dị n’agbata ntọghata Sọl na ọkpụkpọ a kpọrọ ya n’Antiọk hà jere ozi inye ya ọzụzụ na ime ka o tozuo okè maka ibu ọrụ ndị ọ ga-enwe n’ọdịnihu? Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya bụ azịza nye ajụjụ ndị dị otú ahụ, anyị pụrụ ijide n’aka na mgbe Banabas kpọrọ ya inye aka ibute ụzọ n’ọrụ nkwusa ahụ n’Antiọk, Sọl bụ́ onye na-anụ ọkụ n’obi ruru eru nke ọma ịrụzu ọrụ ahụ.—Ọrụ 11:19-26.

[Map dị na peeji 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SIRIA

Orontes

Antiọk

Seleusia

SAỊPRỌS

OSIMIRI MEDITERRANEAN

Jerusalem

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

N’elu: Antiọk nke oge a

N’etiti: Seleusia ma a nọrọ n’Ebe Ndịda na-ele ya

N’okpuru: Mgbidi ọdụ ụgbọ mmiri Seleusia