Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-atụchasị Mmadụ Hà Enwewo Mmetụta n’Ebe Ị Nọ?

Ndị Na-atụchasị Mmadụ Hà Enwewo Mmetụta n’Ebe Ị Nọ?

Ndị Na-atụchasị Mmadụ Hà Enwewo Mmetụta n’Ebe Ị Nọ?

“ONYE na-atụchasị mmadụ bụ onye na-adịghị mgbe ọ na-ahụ àgwà ọma n’ebe mmadụ nọ, ma ọ na-ahụkarị nke ọjọọ. Ọ bụ ikwiikwii, bụ́ nke na-ahụ ụzọ n’ọchịchịrị, ma kpuo ìsì n’ìhè, na-achọgharị ụmụ ahụhụ, n’adịghị mgbe ọ na-ahụ anụ ndị gbara agba.” E kwuwo na ọ bụ onye America bụ ụkọchukwu nke narị afọ nke 19, bụ́ Henry Ward Beecher kwuru okwu a. Ọtụtụ ndị pụrụ iche na ọ kọwara àgwà nke onye na-atụchasị mmadụ nke oge a nke ọma. Ma okwu ahụ bụ́ “onye na-atụchasị mmadụ” malitere na Gris oge ochie, bụ́ ebe ọ na-apụtaghị nanị onye na-egosipụta àgwà dị otú ahụ. Ruo ọtụtụ narị afọ, e ji ya zoo aka n’ebe otu ìgwè ndị ọkà ihe ọmụma nọ.

Olee otú nkà ihe ọmụma nke òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ si malite? Gịnị ka ha kụziri? Ọ̀ ga-adị mma onye Kraịst inwe àgwà nke Onye Na-atụchasị Mmadụ?

Ndị Na-atụchasị Mmadụ nke Oge Ochie—Mmalite Ha na Nkwenkwe Ha

Gris oge ochie bụ ebe dị mma maka nkwurịta okwu na nrụrịta ụka. Eri ọtụtụ narị afọ ndị bu Oge Anyị ụzọ, ndị ikom dị ka Socrates, Plato, na Aristotle wepụtara nkà ihe ọmụma ndị mere ka ha bụrụ ndị a ma ama. Ozizi ha nwere mmetụta miri emi n’ebe ndị mmadụ nọ, a ka na-ahụkwa echiche ndị dị otú ahụ n’ọdịbendị nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.

Socrates (470-399 T.O.A.) rụrụ ụka na a gaghị achọta obi ụtọ na-adịgide adịgide ná nchụso nke ihe onwunwe ma ọ bụ ihe ụtọ. Ọ zọọrọ na a na-enweta ezi obi ụtọ site ná ndụ a raara nye nchụso nke omume ọma. Socrates lere omume ọma anya dị ka ihe kasị mma. Iji ruo ihe mgbaru ọsọ a, ọ jụrụ ibi ndụ okomoko na ịgba mbọ ndị na-enweghị isi n’ihi na o chere na ihe ndị a ga-adọpụ uche ya. Ọ kwadoro imeru ihe n’ókè na mmadụ ịnapụ onwe ya ihe, na-ebi ndụ dị mfe na nke emefusịghị ihe.

Socrates wepụtara usoro izi ihe a maara dị ka usoro Socrates. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-eche echiche nyere echiche nke ha ma kwuo okwu iji kwadoo ya, Socrates mere ihe dị iche. O gere ntị ná nchepụta echiche ndị ọkà ihe ọmụma ndị ọzọ ma gbalịa ikpughe ntụpọ ndị dị n’echiche ha. Ụzọ ime ihe a kwalitere àgwà nkatọ na nke enweghị nsọpụrụ n’ebe ndị ọzọ nọ.

Ọkà ihe ọmụma aha ya bụ Antisthenes (ihe dị ka 445-365 T.O.A.) so n’ime ndị na-eso ụzọ Socrates. Ya na ọtụtụ ndị ọzọ tinyekwuru ihe n’ozizi bụ́ isi nke Socrates site n’ikwu na ọ bụ nanị omume ọma dị mma. Nye ha, ịchụso ihe ụtọ abụghị nanị ihe na-adọpụ uche kama ọ bụ otu ụdị nke ihe ọjọọ. N’ịbụ ndị nwere n’ụzọ gabigara ókè, akparamàgwà ọha mmadụ kpọrọ asị, ha lelịrị ụmụ mmadụ ibe ha anya n’ụzọ dị ukwuu. A bịara mara ha dị ka òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ. A pụrụ inwetawo aha ahụ a sụgharịrị ịbụ Onye Na-atụchasị Mmadụ site n’okwu Grik bụ́ (ky·ni·kosʹ), bụ́ nke kọwara àgwà mgbachi ihu na nke mpako ha. Ọ pụtara ‘iyi nkịta.’ *

Mmetụta Ọ̀ Na-enwe n’Ụzọ Ndụ Ha

N’agbanyeghị na a pụrụ ilewo ihe ndị dị ka imegide ịhụ ihe onwunwe n’anya na imeju ọchịchọ onwe onye bụ́ ihe ndị mejupụtara nkà ihe ọmụma nke òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ anya dị ka ndị kwesịrị ịja mma, ozizi nke òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ gabigara ókè. Nke a pụtara ìhè ná ndụ nke otu onye a kasị mara amara n’òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ—ọkà ihe ọmụma bụ́ Diogenes.

A mụrụ Diogenes n’afọ 412 T.O.A. na Sinope, bụ́ obodo dị n’Osimiri Ojii. O so nna ya kwaga Atens, bụ́ ebe ọ nụrụ ozizi nke òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ. Ọ bụ Antisthenes kụziiri Diogenes ihe, nkà ihe ọmụma nke òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ rikwara Diogenes isi. Socrates biri ndụ dị mfe, Antisthenes bikwara ndụ mmadụ ịnapụ onwe ya ihe ụtọ. Otú ọ dị, Diogenes biri ndụ nke onye na-anapụ onwe ya ihe ụtọ nile. Iji mee ka ọjụjụ ọ jụrụ ntụsara ahụ n’ụzọ ihe onwunwe pụta ìhè, a sịrị na Diogenes biri n’ime ọ́kwá ịsa ahụ ruo mkpirikpi oge!

N’ịchọ ihe ọma kasịnụ, a sịrị na Diogenes ji oriọna a mụnyere ọkụ gagharịa gburugburu Atens n’ehihie, na-achọ onye ọma! Àgwà dị otú ahụ dọtara mmasị ndị mmadụ, ọ bụkwa ụzọ Diogenes na ndị ọzọ so n’òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ si na-ezi ihe. A sịrị na e nwere otu oge Alexander Onye Ukwu jụrụ Diogenes ihe ọ chọrọ karịsịa. A kọrọ na Diogenes sịrị na nanị ihe ya chọrọ bụ ka Alexander pụọrọ ya n’ụzọ iji ghara ịnọchi ìhè anyanwụ!

Diogenes na ndị ọzọ so n’òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ biri ndụ dị ka ndị arịrịọ. Ha enweghị oge maka mmekọrịta kwesịrị ekwesị nke mmadụ na ibe ya, ha jụkwara ọrụ ọha na eze. Ikekwe n’ịbụ ndị usoro ịrụ ụka Socrates metụtara, ha ghọrọ ndị na-adịghị akwanyere nnọọ ndị ọzọ ùgwù. Diogenes ghọrọ onye a maara n’ihi okwu mkparị ya na-agbakasị ahụ. A bịara mara òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ dị ka ndị “yiri nkịta,” ma e nyere Diogenes n’onwe ya utu aha bụ́ Nkịta. Ọ nwụrụ n’ihe dị ka 320 T.O.A. mgbe ọ gbara ihe dị ka afọ 90. E jiri nkume marble kpụọ ihe ncheta nwere ọdịdị nkịta, n’elu ili ya.

Òtù ndị ọzọ weghaara akụkụ ụfọdụ nke nkà ihe ọmụma nke òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ. Otú ọ dị, ka oge na-aga, omume gbapụrụ iche ndị e jikọrọ ha na Diogenes na ndị mesịrị soo ụzọ ya, mere ka òtù Ndị Na-atụchasị Mmadụ gharazie inwe aha ọma. N’ikpeazụ, ọ pụrụ n’anya kpam kpam.

Ndị Na-atụchasị Mmadụ nke Oge A —Ì Kwesịrị Igosipụta Àgwà Ha?

The Oxford English Dictionary na-akọwa onye na-atụchasị mmadụ nke oge a dị ka “onye nwere àgwà nke ịkpọ mmadụ iyi ma ọ bụ ịhụta ebe a na-emezighị emezi. . . . Onye nwere àgwà nke ekweghị na ebumnobi na omume ụmụ mmadụ ziri ezi ma ọ bụ dị mma ma na-egosipụtakarị nke a site n’ịkwa emo na n’okwu mkparị; onye na-eji ịkwa emo ahụchatakarị ebe a na-emezighị emezi.” A na-egosipụta àgwà ndị a n’ụwa gbara anyị gburugburu, ma n’ezie, ha ekwekọghị n’àgwà ndị Kraịst. Tụlee ozizi na ụkpụrụ Bible ndị na-esonụ.

“Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ na-abakwa ụba n’ebere. Ọ bụghị ruo mgbe nile ka Ọ ga na-ese okwu; Ọ bụghịkwa ruo mgbe ebighị ebi ka Ọ ga na-edebe iwe.” (Abụ Ọma 103:8, 9) A gwara ndị Kraịst ka ha “[bụrụ] ndị na-eṅomi Chineke.” (Ndị Efesọs 5:1) Ọ bụrụ na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile na-ahọrọ igosipụta obi ebere na ezi ịhụnanya dị ukwuu kama inwe àgwà nke ‘ịkpo ndị ọzọ iyi ma ọ bụ ịhụchatakarị ebe ha na-emezighị emezi,’ n’ezie ndị Kraịst kwesịrị ịgbalị ime otu ihe ahụ.

Jisọs Kraịst, bụ́ onye nọchitere anya Jehova kpọmkwem, ‘hapụụrụ anyị ihe ilereanya, ka anyị wee soo ijeụkwụ Ya nile.’ (1 Pita 2:21; Ndị Hibru 1:3) Mgbe ụfọdụ, Jisọs kpughere ụgha nke okpukpe ma gbaa akaebe banyere ọrụ ọjọọ nke ụwa. (Jọn 7:7) Ma, o kwuru ihe ndị dị mma banyere ndị nwere obi ziri ezi. Dị ka ihe atụ, o kwuru banyere Nataniel, sị: “Lee, onye Israel n’ezie, onye aghụghọ na-adịghị ya n’ahụ!” (Jọn 1:47) Mgbe Jisọs rụrụ ọrụ ebube, n’oge ụfọdụ o lekwasịrị anya n’okwukwe nke onye ọ na-arụrụ ya. (Matiu 9:22) Mgbe ndị ụfọdụ chekwara na onyinye otu nwanyị nyere iji gosi ekele bụ imefusị ihe, Jisọs atụchaghị ebumnobi ya kama ọ sịrị: “Ebe ọ bụla a ga-ekwusa ozi ọma nke a n’ụwa dum, a ga-ekwutekwa ihe nke nwanyị a mere, ka ọ bụrụ ihe ncheta ya.” (Matiu 26:6-13) Jisọs bụụrụ ụmụazụ ya enyi na-atụkwasị obi na onye ibe na-ahụ n’anya, ‘hụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.’—Jọn 13:1.

Ebe ọ bụ na Jisọs zuru okè, ọ pụrụ ịhụtawo n’ụzọ dị mfe ebe ndị mmadụ na-ezughị okè na-emezighị emezi. Otú ọ dị, kama igosipụta àgwà nke ekwetaghị ekweta na nke ịhụchata emezighị emezi, ọ gbalịrị ime ka ndị mmadụ nwee ume ọhụrụ.—Matiu 11:29, 30.

“[Ịhụnanya] na-ekwere ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7) Okwu ahụ dị iche kpọmkwem n’àgwà nke onye na-atụchasị mmadụ, bụ́ onye na-enyo ebumnobi na omume ndị ọzọ enyo. N’ezie, ụwa jupụtara n’ụmụ mmadụ ndị nwere ebumnobi na-ezighị ezi; ya mere ọ dị mkpa ịkpachara anya. (Ilu 14:15) Ka o sina dị, ịhụnanya na-adị njikere ikwere ihe n’ihi na ọ na-enwe ntụkwasị obi, ọ dịghị enyo mmadụ enyo n’ụzọ na-enweghị isi.

Chineke hụrụ ndị ohu ya n’anya, na-atụkwasịkwa ha obi. Ọ maara erughị eru ha ọbụna karịa ka ha maara. Otú ọ dị, Jehova adịghị enyo ndị ya enyo, ọ dịghịkwa achọ ihe karịrị ihe ha pụrụ nnọọ ime n’aka ha. (Abụ Ọma 103:13, 14) Ọzọkwa, Chineke na-achọ ebe ụmụ mmadụ na-emezi emezi, ọ na-ejikwa ntụkwasị obi enye ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe ihe ùgwù na ikike, n’agbanyeghị na ha ezughị okè.—1 Ndị Eze 14:13; Abụ Ọma 82:6.

“Mụ onwe m, bụ́ Jehova, na-enyocha obi, na-anwa akụrụ, ọbụna inye onye ọ bụla dị ka ụzọ ya nile si dị, dị ka mkpụrụ nke omume ya nile si dị.” (Jeremaịa 17:10) Jehova pụrụ ịmara ihe mmadụ bu n’obi n’ụzọ ziri ezi. Anyị apụghị ịma. Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịkpachara anya banyere ikwu okwu ka a ga-asị na anyị maara ihe ndị ọzọ bu n’uche.

Ikwe ka àgwà nke ịtụchasị mmadụ gbanye mkpọrọgwụ n’ime anyị ma mesịa mejupụta echiche anyị nwere ike ịkpata nkewa n’etiti anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị. Ọ pụrụ imebi udo nke ọgbakọ ndị Kraịst. Ya mere, ka anyị gbasoo ihe nlereanya Jisọs, bụ́ onye nwere ezi uche na echiche dị mma n’ụzọ o si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ ghọrọ enyi ha ha tụkwasịrị obi.—Jọn 15:11-15.

“Dị ka unu na-achọkwa ka mmadụ meere unu, unu onwe unu na-emekwa ha otú ahụ.” (Luk 6:31) E nwere ọtụtụ ụzọ a ga-esi etinye ndụmọdụ Jisọs Kraịst a n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, anyị nile na-ahọrọ ịbụ ndị e ji obiọma na nkwanye ùgwù na-agwa okwu. N’ezie, anyị kwesịziri ịgwa ndị ọzọ okwu n’ụzọ obiọma na nkwanye ùgwù. Ọbụna mgbe Jisọs ji nkwuwa okwu kpughee ozizi ụgha nke ndị ndú okpukpe, o meghị ya n’ụzọ ịtụchasị mmadụ ma ọlị.—Matiu 23:13-36.

Ụzọ Ndị A Pụrụ Isi Merie Àgwà nke Ịtụchasị Mmadụ

Ọ bụrụ na anyị enwetụwo ndakpọ olileanya, ọ pụrụ ịdị mfe ikwe ka àgwà nke ịtụchasị mmadụ metụta anyị. Anyị pụrụ ịlụso àgwà a ọgụ site n’ịghọta na Jehova na-eji ntụkwasị obi emeso ndị ya na-ezughị okè ihe. Nke a pụrụ inyere anyị aka ịnakwere ndị ọzọ na-efe Chineke ofufe otú ha dị—ụmụ mmadụ na-ezughị okè bụ́ ndị na-agbalị ime ihe ziri ezi.

Ahụmahụ ndị na-egbu mgbu pụrụ iduga ụfọdụ ndị n’ịghara ịtụkwasị ndị mmadụ obi. N’eziokwu, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ịtụkwasị ụmụ mmadụ na-ezughị okè obi kpam kpam. (Abụ Ọma 146:3, 4) Otú ọ dị, n’ọgbakọ ndị Kraịst, ọtụtụ ndị na-eji ezi obi achọ ịbụ ndị na-enye agbamume. Cheedị banyere ọtụtụ puku bụ́ ndị dị ka nne, nna, ụmụnne ndị inyom, ụmụnne ndị ikom, na ụmụ nye ndị na-enweghịzi ezinụlọ. (Mak 10:30) Chee banyere mmadụ ole ndị na-egosi na ha bụ ezi ndị enyi n’oge nsogbu. *Ilu 18:24.

Ọ bụghị àgwà nke ịtụchasị mmadụ kama ọ bụ ịhụnanya ụmụnna ka e ji amata ụmụazụ Jisọs, n’ihi na o kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ya mere, ka anyị gosi ịhụnanya, ka anyị lekwasịkwa anya n’àgwà ọma nke ndị Kraịst ibe anyị. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka izere àgwà nke Onye Na-atụchasị mmadụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ebe ọzọ aha ahụ a sụgharịrị ịbụ Onye Na-atụchasị Mmadụ pụrụ isite bụ n’okwu bụ́ Ky·noʹsar·ges, bụ́ otu ụlọ a na-eme egwuregwu na ya nke dị n’Atens bụ́ ebe Antisthenes kụziri ihe.

^ par. 27 Lee isiokwu bụ́ “Ọgbakọ Ndị Kraịst—Ebe E Si Enweta Enyemaka Na-ewusi Ike” n’Ụlọ Nche nke May 15, 1999.

[Foto dị na peeji nke 21]

Onye Na-atụchasị Mmadụ a kasị mara amara, bụ́ Diogenes

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ Great Men and Famous Women