Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ Gị Ọ̀ Pụrụ Inwe Nzube Ka Ukwuu?

Ndụ Gị Ọ̀ Pụrụ Inwe Nzube Ka Ukwuu?

Ndụ Gị Ọ̀ Pụrụ Inwe Nzube Ka Ukwuu?

EZI uru ihe bara adịghị adaberekarị n’otú ihe ahụ dị n’anya. Akwụkwọ ego ọnụ ahịa ya kasị ukwuu nke e ji eme ihe na United States bụ $10,000. Ma, ọnụ ahịa akwụkwọ e ji bie ya bụ nanị cent ole na ole.

Ì chetụwo echiche ma mpempe akwụkwọ ọnụ ahịa ha na-ehighị nne hà pụrụ ime ka ndụ gị nwee ezi nzube? Ọtụtụ mmadụ na-eche na ha pụrụ. Ọtụtụ nde mmadụ na-arụ ọrụ ehihie na abalị iji kpata ego ruo otú ike kwere ha. Mgbe ụfọdụ, ịchụ ego na-apụta ikwe ka ahụ ike ha, ndị enyi ha, na ọbụna ezinụlọ ha funahụ ha. Uru gịnị ka nke ahụ bara? Ego—ma ọ bụ ihe anyị na-eji ya azụta—ọ̀ pụrụ iweta ezi afọ ojuju na-adịgide adịgide?

Dị ka ndị nchọpụta si kwuo, ka anyị na-esikwu n’ihe onwunwe achọ inweta afọ ojuju, otú ahụ ka ọ na-abụkwu ihe na-eyighị ka anyị ga-achọta ya. Odeakụkọ bụ́ Alfie Kohn na-ekwubi na “a dịghị nnọọ eji ego azụta afọ ojuju. . . . Ndị weere ịba ọgaranya dị ka ihe mbụ ná ndụ yiri ka ha na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ nchegbu na obi ịda mbà a na-adịghị enwekebe nakwa ọ̀tụ̀tụ̀ dịkwu ala nke ahụ ọma n’ozuzu ya.”—International Herald Tribune.

Ọ bụ ezie na ndị nchọpụta pụrụ ịghọta na ọ bụghị nanị ego ka a chọrọ iji mee ka ndụ nwee nzube, ọtụtụ ndị echeghị otú ahụ. Nke a abụtụghị ihe ijuanya, ebe ọ bụ na a pụrụ imere ndị bi n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa mkpọsa ngwá ahịa ruru nnọọ 3,000 n’otu ụbọchị. Ma ọ̀ bụ ụgbọala ma ọ bụ ihe nracha ka a na-akpọsa, echiche bụ́ isi dị na ya bụ: ‘Zụọ ihe a, ị ga-enwekwa obi ụtọ karị.’

Gịnị si ná nkwalite a na-akwalite ihe onwunwe n’esepụghị aka apụta? Leenụ, a na-elegharakarị ihe ndị bara uru n’ụzọ ime mmụọ anya! Dị ka otu akụkọ dị na magazin bụ́ Newsweek si kwuo, achịbishọp nke Cologne, Germany, kwupụtara n’oge na-adịbeghị anya na “n’ọgbọ anyị, Chineke abụghịzi onye e ji emere isiokwu.”

Ikekwe i tinyewo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ume ọrụ gị nile n’inweta ihe e ji ebi ndụ. Ma eleghị anya ọ na-adị gị ka i nwere oge dị nta iji mee ihe ọ bụla ọzọ. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ịghọta na a ghaghị inwe ihe ọzọ a ga-eji ndụ mee karịa ịnọ na-arụ otu ọrụ mgbe nile ruo mgbe ahụ ike gị ma ọ bụ afọ ndụ gị ga-eme ka ị kwụsị.

Itinyekwu uche n’ihe ime mmụọ ọ̀ pụrụ iwetara gị afọ ojuju ka ukwuu? Gịnị ga-eme ka ndụ gị nwee nzube ka ukwuu?