Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya Mbilite N’ọnwụ Bụ Ihe E Ji N’aka!

Olileanya Mbilite N’ọnwụ Bụ Ihe E Ji N’aka!

Olileanya Mbilite N’ọnwụ Bụ Ihe E Ji N’aka!

“Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na mbilite n’ọnwụ . . . gaje ịdị.”—ỌRỤ 24:15.

1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee olileanya ná mbilite n’ọnwụ?

JEHOVA enyewo anyị ezi ihe ndị mere anyị ga-eji nwee olileanya ná mbilite n’ọnwụ. Ọ gwara anyị na ndị nwụrụ anwụ ga-esi n’ọnwụ bilie, na-ebili ọtọ ọzọ ịdị ndụ. Nzube ya kwa banyere ndị nọ n’ụra ọnwụ ga-emezurịrị. (Aịsaịa 55:11; Luk 18:27) N’ezie, Chineke adịworị mbụ gosipụta ikike o nwere ime ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie.

2. Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ pụrụ isi baara anyị uru?

2 Inwe okwukwe ná ndokwa Chineke mere maka ime ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie site n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, pụrụ ịkwagide anyị n’oge nrụgide. Iji olileanya mbilite n’ọnwụ n’aka pụkwara inyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Nna anyị nke eluigwe ọbụna ruo ọnwụ. O yikarịrị ka a ga-eme ka olileanya mbilite n’ọnwụ anyị sikwuo ike ka anyị na-atụle ihe banyere mmadụ ndị e weghachiri ná ndụ bụ́ ndị e dekọrọ n’ime Bible. E ji ike sitere n’aka Eze Onyenwe anyị Jehova rụzuo ọrụ ebube nile a.

Ha Natara Ndị Ha Ndị Nwụrụ Anwụ Site ná Mbilite n’Ọnwụ

3. Gịnị ka e nyere Elaịja ike ime mgbe nwa nwoke nke otu nwanyị di ya nwụrụ nke bi na Zarefat, nwụrụ?

3 Ná ntụleghachi na-akpali akpali ọ tụleghachiri okwukwe ndị àmà Jehova tupu oge ndị Kraịst gosipụtara, Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị inyom natara ndị ha ndị nwụrụ anwụ site ná mbilite n’ọnwụ.” (Ndị Hibru 11:35; 12:1) Otu n’ime ndị inyom ahụ bụ otu nwanyị di ya nwụrụ bụ́ ogbenye nke bi n’obodo Zarefat nke dị na Finisia. N’ihi ile onye amụma Chineke bụ́ Elaịja ọbịa, e ji ụzọ ọrụ ebube mee ka ụtụ ọka na mmanụ ya ghara ịgwụ agwụ n’oge ụnwụ nri nke gaara egbu ya na nwa ya. Mgbe nwata ahụ mesịrị nwụọ, Elaịja nyiwere ya n’ihe ndina, kpee ekpere, setịa onwe ya n’ahụ nwata nwoke ahụ ugboro atọ, ma rịọ, sị: “Biko, Jehova, bụ́ Chineke m, ka mkpụrụ obi nwata nke a bịaghachi n’ime ya.” Chineke mere ka mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ, nke nwata nwoke ahụ bịaghachi n’ime ya. (1 Ndị Eze 17:8-24) Cheedị echiche ọṅụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ nwere ka a kwụghachiri ya ụgwọ ọrụ n’ihi okwukwe ya site ná mbilite n’ọnwụ mbụ e dekọrọ edekọ—nke nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya!

4. Ọrụ ebube dị aṅaa ka Elaịsha rụrụ na Shunem?

4 Nwanyị ọzọ natara onye ya nwụrụ anwụ site ná mbilite n’ọnwụ biri n’obodo Shunem. Ọ bụ nwunye nke otu agadi nwoke, o gosipụtara obiọma n’ebe Elaịsha onye amụma na onye na-ejere ya ozi nọ. E ji nwa nwoke kwụọ ya ụgwọ ọrụ. Otú ọ dị, ka afọ ole na ole gasịrị, ọ kpọrọ onye amụma ahụ ka ọ bịa, bụ́ onye bịaruru wee hụ na nwata nwoke ahụ anwụwo n’ụlọ nwanyị ahụ. Mgbe Elaịsha kpesịrị ekpere ma mee ihe ụfọdụ, “anụ ahụ nwata ahụ wee dị ọkụ.” O “wee zee uzere ruo ugbo asaa, nwa okoro [ahụ] wee saghee anya ya abụọ.” Obi abụọ adịghị ya na mbilite n’ọnwụ a wetaara ma nne ahụ ma nwa ya oké ọṅụ. (2 Ndị Eze 4:8-37; 8:1-6) Ma lee nnọọ ka ha ga-esi enwe obi ụtọ karị mgbe a ga-akpọlite ha n’elu ala ná “mbilite n’ọnwụ ka mma”—nke ga-enye ha ohere nke anwụghị ọzọ ma ọlị! Lee ka nke a si bụrụ ihe na-eme ka e nwee ekele n’ebe Chineke nke mbilite n’ọnwụ bụ́ Jehova na-ahụ n’anya, nọ!—Ndị Hibru 11:35.

5. Olee otú Elaịsha si kere òkè n’otu ọrụ ebube ọbụna mgbe ọ nwụsịrị?

5 Ọbụna mgbe Elaịsha nwụsịrị, e lisịakwa ya, Chineke mere ka ọkpụkpụ ya nwee ikike site na mmụọ nsọ. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe [ụmụ Israel ụfọdụ] na-eli otu nwoke, lee, ha hụrụ usuu ndị [Moab] na-apụnara mmadụ ihe; ha wee tụba nwoke ahụ n’ili Elaịsha: nwoke ahụ [nwụrụ anwụ] wee daa, metụ ọkpụkpụ Elaịsha ahụ, wee dị ndụ, bilie guzo n’ụkwụ ya abụọ.” (2 Ndị Eze 13:20, 21) Lee ihe ijuanya na obi ụtọ nwoke ahụ na-aghaghị inwewo! Cheedị echiche banyere ọṅụ anyị ga-enwe mgbe a ga-eme ka ndị anyị hụrụ n’anya si n’ọnwụ bilie n’ikwekọ ná nzube na-adịghị agha agha nke Jehova Chineke!

Ọkpara Chineke Kpọlitere Ndị Nwụrụ Anwụ

6. Ọrụ ebube dị aṅaa ka Jisọs rụrụ na nso obodo Nain, oleekwa otú ihe omume a pụrụ isi metụta anyị?

6 Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, enyewo anyị ezi ihe ndị mere anyị ga-eji kwere na a pụrụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, na-enwe olileanya nke ndụ ebighị ebi. Otu ihe mere na nso obodo Nain pụrụ inyere anyị aka ịghọta na ọrụ ebube dị otú ahụ pụrụ ikwe omume site n’ike sitere n’aka Chineke. N’otu oge, Jisọs zutere ndị na-eru újú ka ha bu ozu otu nwa okorobịa na-aga ná mpụga obodo ahụ maka olili. Ọ bụ nanị nwa otu nwanyị di ya nwụrụ mụtara. Jisọs gwara ya, sị: “Akwala ákwá.” O wee metụzie ihe e ji buru ozu ahụ aka ma sị: “Nwa okorobịa, gị ka M na-asị, Bilie.” Mgbe o kwuru nke ahụ, nwa okorobịa ahụ wee nọlie ma kwuo okwu. (Luk 7:11-15) N’ezie, ọrụ ebube a na-eme ka anyị kwenyesikwuo ike na olileanya mbilite n’ọnwụ bụ ihe e ji n’aka.

7. Gịnị weere ọnọdụ n’ihe metụtara ada Jaịrọs?

7 Tụleekwa otu ihe omume metụtara Jaịrọs, bụ́ onyeisi ụlọ nzukọ dị na Kapanọm. Ọ rịọrọ Jisọs ka ọ bịa nyere ada ya ọ hụrụ n’anya nke dị afọ 12 aka, bụ́ onye nọ n’ọnụ ọnwụ. N’oge na-adịghị anya, e kwuru na nwata nwanyị ahụ anwụwo. N’ịgba Jaịrọs na-eru újú ume ka o nwee okwukwe, Jisọs sooro ya gaa n’ebe obibi ya, bụ́ ebe ìgwè mmadụ nọ na-akwa ákwá. Ha chịrị ọchị mgbe Jisọs gwara ha, sị: “Nwatakịrị ahụ anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra.” N’ezie, ọ nwụrụ anwụ, ma Jisọs gaje igosi na a pụrụ ime ka ndị mmadụ si n’ọnwụ bilie dị nnọọ ka a pụrụ ịkpọte ha n’ụra. N’ijide nwata nwanyị ahụ aka, o kwuru, sị: “Nwata nwanyị, bilie.” O biliri ozugbo, “ibobo wee nwụbiga ndị mụrụ ya ókè n’ahụ.” (Mak 5:35-43; Luk 8:49-56) N’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya, ‘ibobo ga-anwụbiga ndị òtù ezinụlọ n’ahụ ókè’ mgbe a ga-eme ka ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie n’ime ụwa paradaịs.

8. Gịnị ka Jisọs mere n’ili Lazarọs?

8 O ruola abalị anọ Lazarọs nwụrụ mgbe Jisọs bịaruru n’ili ya ma mee ka e wepụ nkume e ji dochie ọnụ ili ya. Mgbe o jisịrị olu dara ụda kpee ekpere ka ndị na-ekiri ihe na-emenụ wee nwee ike ịmara na ọ dabeere n’ike Chineke nyere ya, Jisọs kwuru n’olu dara ụda, sị: “Lazarọs, pụta n’èzí.” O wee pụta! Ákwà ili ozu e ji kee ya aka na ụkwụ ka dịcha ya, e jikwa ịchafu kechie ihu ya. “Tọpụnụ ya, gharakwa ya ka ọ laa,” ka Jisọs sịrị. Mgbe ha hụrụ ọrụ ebube a, ọtụtụ ndị bụ́ ndị bịara ịkasi ụmụnne nwanyị Lazarọs, bụ́ Meri na Mata, obi, kweere na Jisọs. (Jọn 11:1-45) Ihe ndekọ a ọ́ dịghị eme ka i nwee olileanya na a pụrụ ime ka ndị ị hụrụ n’anya si n’ọnwụ bilie n’ụwa ọhụrụ Chineke?

9. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jisọs pụrụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ugbu a?

9 Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptism nọ n’ụlọ mkpọrọ, Jisọs zigaara ya ozi a na-emesi obi ike, sị: “Ndị ìsì na-ahụ ụzọ, . . . a na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie.” (Matiu 11:4-6) Ebe ọ bụ na Jisọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ pụrụ n’ezie ime otú ahụ dị ka onye bụ́ mmụọ e kere eke bụ́ dike nke Chineke nyere ike. Jisọs bụ “mbilite n’ọnwụ na ndụ,” leekwa ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na n’ọdịnihu dị nso, “ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa”!—Jọn 5:28, 29; 11:25.

Mbilite n’Ọnwụ Ndị Ọzọ Na-ewusikwu Olileanya Anyị Ike

10. Olee otú ị ga-esi akọwa mbilite n’ọnwụ mbụ a kọrọ akụkọ ya nke sitere n’aka onyeozi?

10 Mgbe Jisọs zipụrụ ndị ozi ya dị ka ndị nkwusa nke Alaeze, o kwuru, sị: “Meenụ ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie.” (Matiu 10:5–8) N’ezie, iji mee nke a, ha aghaghị ịdabere n’ike Chineke. Na Jọpa na 36 O.A., nwanyị ahụ na-asọpụrụ Chineke bụ́ Dọkas (Tabita) dara n’ụra ọnwụ. Ezi ọrụ ndị ọ rụrụ gụnyere ịkwara ndị inyom di ha nwụrụ nọ ná mkpa ákwà, bụ́ ndị kwara ákwá nke ukwuu mgbe ọ nwụrụ. Ndị na-eso ụzọ kwadebere ya maka olili ma zie ozi ka a kpọọ Pita, ikekwe iji gụgụọ ha obi. (Ọrụ 9:32-38) Ọ chụpụrụ mmadụ nile n’ime ụlọ ahụ dị n’elu ụlọ, kpee ekpere, ma sị: “Tabita, bilie.” O wee saghee anya ya, nọlie, jide aka Pita, Pita wee selie ya elu. Mbilite n’ọnwụ a a kọrọ akụkọ ya bụ́ nke mbụ sitere n’aka onyeozi mere ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 9:39-42) Ọ na-enyekwa anyị ihe mere anyị ga-ejikwu nwee olileanya ná mbilite n’ọnwụ.

11. Olee mbilite n’ọnwụ ikpeazụ e dekọrọ na Bible?

11 Mbilite n’ọnwụ ikpeazụ e dekọrọ na Bible mere na Troas. Mgbe Pọl kwụsịtụrụ n’ebe ahụ n’oge ọ na-aga ozi ala ọzọ nke atọ ya, o kwugidere okwu ruo etiti abalị. N’ihi ike ọgwụgwụ na ikekwe n’ihi okpomọkụ nke ọtụtụ oriọna na ìgwè mmadụ ndị jupụtara n’ebe ahụ ha zukọrọ nke bịara karịa ya ike, ụra buuru otu nwa okorobịa aha ya bụ́ Yutikọs, o wee si n’otu windo dị n’okpukpu nke atọ nke ụlọ elu ahụ daa. “O mewo ozu mgbe ha buliri ya,” ọ bụghị amaghị onwe nkịtị. Pọl dakwasịrị Yutikọs, makụọ ya, ma gwa ndị na-ekiri ihe na-emenụ, sị: “Unu atụla ụ̀zụ̀; n’ihi na ndụ ya dị n’ime ya.” Ihe Pọl bu n’uche bụ na e weghachiwo ndụ nwa okoro ahụ. “Ọ bụghịkwa nkasi obi nta [ka] a kasiri” ndị nọ n’ebe ahụ. (Ọrụ 20:7-12) Taa, ndị ohu Chineke na-enweta oké nkasi obi n’ịmara na olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ ga-emezu n’ebe ndị ha na ha jekọbuuru Chineke ozi nọ.

Mbilite n’Ọnwụ —Olileanya Dịworo Eri Oge

12. Nkwenye dị aṅaa siri ike ka Pọl kwupụtara mgbe ọ nọ n’ihu Onye Ọchịchị Rom bụ́ Filiks?

12 Mgbe a na-ekpe Pọl ikpe n’ihu Onye Ọchịchị Rom bụ́ Filiks, ọ gbara akaebe, sị: “M kweere [n’ihe nile e setịpụrụ n’Iwu ahụ, NW], nke e dewokwara n’akwụkwọ ndị amụma; n’ihi na enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ, . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:14, 15) Olee otú akụkụ ụfọdụ nke Okwu Chineke, dị ka ‘Iwu ahụ,’ si ezo aka ná mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ?

13. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Chineke zoro aka ná mbilite n’ọnwụ mgbe o buru amụma mbụ ahụ?

13 Chineke n’onwe ya zoro aka ná mbilite n’ọnwụ mgbe o buru amụma mbụ n’Iden. Mgbe ọ na-ama “agwọ ochie ahụ,” bụ́ Setan Ekwensu, ikpe, Chineke kwuru, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Mkpughe 12:9; Jenesis 3:14, 15) Ichifịa ikiri ụkwụ nke mkpụrụ nwanyị ahụ pụtara igbu Jisọs Kraịst. Ọ bụrụ na Mkpụrụ ahụ ga-emesị chifịa isi agwọ ahụ, a ghaghị ime ka Kraịst si n’ọnwụ bilie.

14. Olee otú o si bụrụ na Jehova “[abụghị] Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama Ọ bụ nke ndị dị ndụ”?

14 Jisọs kwupụtara, sị: “Ma ọbụna Mosis gosiri na a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie, na-ekwu n’ime ebe e dere okwu banyere Osisi nta, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb. Ma Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama Ọ bụ nke ndị dị ndụ: n’ihi na ọ bụ n’ebe Ọ nọ ka mmadụ nile dị ndụ.” (Luk 20:27, 37, 38; Ọpụpụ 3:6) Abraham, Aịsak, na Jekọb nwụchara anwụ, ma nzube Chineke ịkpọlite ha bụ nnọọ ihe e ji n’aka nke na ha dị nnọọ ka ndị dị ndụ n’anya ya.

15. N’ihi gịnị ka Abraham ji nwee ihe mere ọ ga-eji kwere ná mbilite n’ọnwụ?

15 Abraham nwere ihe mere ọ ga-eji nwee olileanya ná mbilite n’ọnwụ, n’ihi na mgbe ya na nwunye ya, bụ́ Sera, kara nnọọ nká, ha nwụkwara anwụ n’ihe metụtara ikike ịmụta nwa, Chineke weghachiri ike ọmụmụ ha n’ụzọ ọrụ ebube. Nke a dị ka mbilite n’ọnwụ. (Jenesis 18:9-11; 21:1-3; Ndị Hibru 11:11, 12) Mgbe nwa ha, bụ́ Aịsak, gbara ihe dị ka afọ 25, Chineke gwara Abraham ka o were ya chụọ àjà. Otú ọ dị, ozugbo Abraham chọrọ igbu Aịsak, mmụọ ozi Jehova mere ka aka ya tọ n’elu. Abraham “[gụrụ] na Chineke pụrụ ime ka [Aịsak] si ọbụna ná ndị nwụrụ anwụ bilie; nke ọ naghachikwaara ya site n’ebe ahụ n’ime ilu.”—Ndị Hibru 11:17-19; Jenesis 22:1-18.

16. Gịnị ka Abraham nọ n’ụra ọnwụ ugbu a na-echere?

16 Abraham nwere olileanya ná mbilite n’ọnwụ n’okpuru ọchịchị Mesaịa ahụ, bụ́ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. Site n’ebe ọ nọ na-ekiri ihe na-aganụ tupu ọ ghọọ mmadụ, Ọkpara Chineke rịbara okwukwe Abraham ama. Ya mere, mgbe ọ bụ nwoke ahụ bụ́ Jisọs Kraịst, ọ gwara ndị Juu, sị: “Obi tọrọ nna unu Abraham ụtọ nke ukwuu ịhụ ụbọchị m.” (Jọn 8:56-58; Ilu 8:30, 31) Abraham nọ n’ụra ọnwụ ugbu a, na-echere mbilite n’ọnwụ n’ụwa n’okpuru Alaeze Mesaịa nke Chineke.—Ndị Hibru 11:8-10, 13.

Akaebe E Nwetara Site n’Iwu ahụ na n’Abụ Ọma

17. Olee otú “[ihe] nile e setịpụrụ n’Iwu ahụ” si ezo aka ná mbilite n’ọnwụ Jisọs Kraịst?

17 Olileanya mbilite n’ọnwụ Pọl nwere kwekọrọ “n’ihe nile e setịpụrụ n’Iwu ahụ.” Chineke gwara ụmụ Israel, sị: “Unu ga-ewetakwara onye nchụàjà ùkwù nke ihe mbụ nke owuwe ihe ubi unu; ọ ga-efekwa ùkwù ahụ n’ihu Jehova [na Nisan 16], ka unu wee bụrụ ihe na-atọ ụtọ.” (Levitikọs 23:9-14) Ikekwe, n’iburu iwu a n’uche, Pọl dere, sị: “E mewo ka Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, mkpụrụ mbụ nke ndị daworo n’ụra ọnwụ.” Dị ka “mkpụrụ mbụ,” a kpọlitere Jisọs n’ọnwụ na Nisan 16, 33 O.A. E mesịa, n’oge ọnụnọ ya, a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nke ‘mkpụrụ ndị ọzọ’—ụmụazụ ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ.—1 Ndị Kọrint 15:20-23; 2 Ndị Kọrint 1:21; 1 Jọn 2:20, 27.

18. Olee otú Pita si gosi na e buru mbilite n’ọnwụ Jisọs n’amụma n’Abụ Ọma?

18 Abụ Ọma na-akwadokwa mbilite n’ọnwụ. N’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., Pita onyeozi hotara ihe n’Abụ Ọma 16:8-11, na-asị: “Devid na-ekwu okwu banyere [Kraịst], sị, Ana m ahụrị Onyenwe anyị n’ihu m mgbe nile; n’ihi na Ọ nọ n’aka nri m, ka a ghara ime ka M mee mkpatụ: n’ihi nke a ọ tọrọ obi m ụtọ, obi na-atọkwa ire m ụtọ nke ukwuu; ọzọkwa, anụ ahụ m ga-ebikwa n’olileanya: n’ihi na Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Hedis, Ị gaghị enyekwa Onye nke Gị dị ọcha n’obi ka Ọ hụ ire ure.” Pita gbakwụnyere, sị: “Ebe [Devid] buru ụzọ hụ nke a o kwuru okwu banyere mbilite n’ọnwụ nke Kraịst ahụ, na a hapụghị Ya n’ime Hedis, anụ ahụ Ya ahụghịkwa ire ure. Jisọs nke a ka Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie.”—Ọrụ 2:25-32.

19, 20. Ole mgbe ka Pita hotara ihe n’Abụ Ọma 118:22, oleekwa otú o si jikọọ nke a na ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs?

19 Ụbọchị ụfọdụ mgbe e mesịrị, Pita guzoro n’ihu Sanhedrin, ọzọkwa o hotara ihe n’Abụ Ọma. Mgbe a jụrụ ya otú o si gwọọ otu onye ngwụrọ na-arịọ arịrịọ, onyeozi ahụ kwuru, sị: “Ka e mee ka unu nile na ndị Israel nile mara, na ọ bụ n’aha Jisọs Kraịst Onye Nazaret, Onye unu onwe unu kpọgidere [n’osisi, NW], Onye Chineke mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, ọ bụ n’aha nke a ka onye a ji ahụ dị mma guzo n’ihu unu n’ebe a. Onye ahụ [Jisọs] bụ nkume nke unu, bụ́ ndị na-ewu ụlọ, kpọrọ ihe efu, nke ghọrọ isi nkuku ụlọ. Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ: n’ihi na aha ọzọ dị iche adịghịkwa n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.”—Ọrụ 4:10-12.

20 N’ebe a, Pita hotara ihe n’Abụ Ọma 118:22, na-eji ihe o kwuru eme ihe n’ebe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs dị. N’ịbụ ndị ndị ndú okpukpe ha kpaliri, ndị Juu jụrụ Jisọs. (Jọn 19:14-18; Ọrụ 3:14, 15) ‘Ọjụjụ ndị ahụ na-ewu ụlọ jụrụ nkume ahụ’ kpatara ọnwụ Kraịst, ma ‘nkume ahụ ịghọ isi nkuku ụlọ’ pụtara mkpọlite a kpọlitere ya gaa n’inwe ebube nke mmụọ n’eluigwe. Dị ka ọbụ abụ ahụ buru n’amụma, “ọ bụ n’aka Jehova ka nke a sitere.” (Abụ Ọma 118:23) Ime “nkume” ahụ Isi nkuku ụlọ gụnyere ibuli ya elu dị ka Onye A Họpụtara Ịbụ Eze.—Ndị Efesọs 1:19, 20.

Ịbụ Ndị Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Na-akwagide

21, 22. Olileanya dị aṅaa ka Job kwupụtara dị ka e dekọrọ ya na Job 14:13-15, oleekwa otú nke a pụrụ isi kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi taa?

21 Ọ bụ ezie na anyị ejitụbeghị anya anyị hụ onye ọ bụla e mere ka o si n’ọnwụ bilie, anyị ahụwo ihe ndekọ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-emesi anyị obi ike na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ. Ya mere, anyị pụrụ inwe olileanya ahụ nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job kwupụtara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, ọ rịọrọ, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na I [Jehova] zobe m [na Sheol, NW], . . . ma a sị na Ị kpaara m ókè, wee cheta m! Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? . . . Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị: agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.” (Job 14:13-15) ‘Agụụ ọrụ aka Chineke ga-agụ Ya,’ na-enwe nnọọ ọchịchọ ịkpọlite Job. Lee olileanya nke ahụ na-enye anyị!

22 Onye òtù ezinụlọ na-atụ egwu Chineke pụrụ ịda oké ọrịa, dị ka Job dara, ọbụna onye iro bụ́ ọnwụ pụrụ igbu ya. Ndị ọ nwụnahụrụ pụrụ ịgba anya mmiri iru újú, ọbụna dị ka Jisọs bere ákwá n’ihi ọnwụ Lazarọs. (Jọn 11:35) Ma lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na Chineke ga-akpọ òkù, ndị nọkwa n’ike ncheta ya ga-aza! Ọ ga-adị nnọọ ka a ga-asị na ha si na njem lọta—n’enweghị ọrịa ma ọ bụ nkwarụ, kama na-enwe ahụ ike zuru ezu.

23. Olee otú ụfọdụ siworo gosipụta obi ike ha nwere n’olileanya mbilite n’ọnwụ?

23 Ọnwụ nke otu onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ onye meworo agadi kpaliri ndị kwere ekwe ibe ya ide, sị: “Biko o wutere anyị nke ukwuu na nne gị nwụrụ. Ọ gaghị adị nnọọ anya anyị anabataghachi ya—ọ ga-ama mma, gbasiekwa ike!” Otu nne na nna nwa ha nwụnahụrụ kwuru, sị: “Lee ka anyị si atụ anya ụbọchị Jason ga-eteta! Ọ ga-ele anya gburugburu ya ma hụ Paradaịs ahụ gụsiri ya nnọọ agụụ ike. . . . Lee ihe mkpali ọ ga-abụ anyị ndị hụrụ ya n’anya ịnọkwu n’ebe ahụ.” Ee, leekwa ka anyị pụrụ isi nwee ekele na olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ bụ ihe e ji n’aka!

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• Olee otú inwe okwukwe ná ndokwa Chineke mere ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie pụrụ isi baara anyị uru?

• Ihe omume ndị dị aṅaa e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya ná mbilite n’ọnwụ?

• N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na mbilite n’ọnwụ bụ olileanya dịworo eri oge?

• Olileanya dị aṅaa na-akwagide mmadụ ka anyị pụrụ inwe banyere ndị nwụrụ anwụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Site n’ike Jehova, Elaịja weghachiri ndụ nke nwa nwoke nke otu nwanyị di ya nwụrụ

[Foto dị na peeji nke 12]

Mgbe Jisọs mere ka ada Jaịrọs si n’ọnwụ bilie, ibobo nwụbigara ndị mụrụ ya ókè n’ahụ

[Foto dị na peeji nke 15]

N’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., Pita onyeozi ji nkwuwa okwu gbaa akaebe na e mewo ka Jisọs si n’ọnwụ bilie