Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Nwere Ike

Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Nwere Ike

Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Nwere Ike

“M yiri iyi ihe nile . . . ka m wee mara [Jisọs Kraịst], na ike nke mbilite n’ọnwụ Ya.”—NDỊ FILIPAỊ 3:8-10.

1, 2. (a) N’ọtụtụ afọ gara aga, olee otú otu onye ụkọchukwu si kọwaa mbilite n’ọnwụ? (b) Olee otú mbilite n’ọnwụ ga-esi ewere ọnọdụ?

NÁ MMALITE afọ ndị 1890, ụlọ ọrụ mgbasa akụkọ kọrọ banyere ozizi pụrụ iche nke otu onye ụkọchukwu ziri na Brooklyn, New York, U.S.A. O kwuru na mbilite n’ọnwụ ga-agụnye ịchịkọtaghachi na ime ka ọkpụkpụ na anụ ahụ nile ndị mejupụtaburu ahụ mmadụ dịghachi ndụ, ma ọ̀ bụ ọkụ rere ya ma ọ̀ nwụrụ n’ihe mberede, ma ọ̀ bụ anụ ọhịa riri ya ma ọ̀ ghọrọ nri ala. Onye ụkọchukwu ahụ kwuru na n’otu ụbọchị ga-enwe awa 24, mbara igwe ga-agbaji oji n’ihi aka, ogwe aka, ụkwụ, mkpịsị aka, ọkpụkpụ, akwara, na akpụkpọ ahụ nke ọtụtụ ijeri mmadụ nwụrụ anwụ. Akụkụ ahụ ndị a ga na-achọ akụkụ ahụ ndị ọzọ ha na ya sitere n’otu ahụ. Mkpụrụ obi dị iche iche ga-esizi n’eluigwe na hel bịa ịbanyeghachi n’ahụ ndị a a kpọlitere n’ọnwụ.

2 Mbilite n’ọnwụ site n’ịchịkọtaghachi ụmụ irighiri akụkụ ndị mejupụtaburu ahụ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya, ụmụ mmadụ enweghịkwa mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. (Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) Ọ dịghị Jehova, bụ́ Chineke nke mbilite n’ọnwụ mkpa ịchịkọtaghachi ụmụ irighiri akụkụ ndị mejupụtaburu ahụ mmadụ. Ọ pụrụ ịkpụ ahụ ọhụrụ nye ndị ahụ e si n’ọnwụ kpọlite. Jehova enyewo Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ikike ime ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie, na-enwe ohere nke ndụ ebighị ebi. (Jọn 5:26) Ya mere Jisọs kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:25, 26) Lee nkwa na-enye obi ụtọ nke a bụ! Ọ na-ewusikwu anyị ike ịtachi obi n’ọnwụnwa na ọbụna iche ọnwụ ihu dị ka Ndịàmà Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi.

3. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Pọl gbachitere mbilite n’ọnwụ?

3 Mbilite n’ọnwụ ekwekọghị n’ozizi bụ́ na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ—echiche nke onye Gris bụ́ ọkà ihe ọmụma bụ́ Plato nwere. Ya mere, gịnị mere mgbe Pọl onyeozi gbaara ndị Gris a ma ama àmà n’Areọpagọs dị n’Atens, zoo aka n’ebe Jisọs nọ, ma kwuo na Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ? “Ma,” ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu, “mgbe ha nụrụ okwu banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ụfọdụ weere ya mee ihe ọchị.” (Ọrụ 17:29-34) Ọtụtụ ndị hụworo Jisọs Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ka dị ndụ mgbe ahụ, n’agbanyeghịkwa ịkwa emo, ha gbara akaebe na e mewo ka o si n’ọnwụ bilie. Ma ndị ozizi ụgha bụ́ ndị so ọgbakọ dị na Kọrint na-akpakọrịta ekwetaghị ná mbilite n’ọnwụ. Ya mere, Pọl gbachiteere ozizi ndị Kraịst a n’ụzọ dị ike ná 1 Ndị Kọrint isi nke 15. Iji nlezianya tụlee ihe ndị o kwuru na-egosipụta n’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya na olileanya mbilite n’ọnwụ bụ ihe e ji n’aka na ihe nwere ike.

Ihe Akaebe Gbara Ọkpụrụkpụ nke Mbilite n’Ọnwụ Jisọs

4. Ihe akaebe dị aṅaa nke onye ji anya ya hụ ihe merenụ ka Pọl nyere banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs?

4 Rịba ama otú Pọl si malite okwu mgbachite ya. (1 Ndị Kọrint 15:1-11) Ndị Kọrint ga-ejigidesi ozi ọma nke nzọpụta ahụ ike, ọ gwụlakwa ma hà ghọrọ ndị kwere ekwe na nkịtị. Kraịst nwụrụ n’ihi mmehie anyị, e lie ya, e meekwa ka o si n’ọnwụ bilie. N’ezie, Jisọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ mere ka Kifas (Pita) hụ ya, “e mesịa O mere ka ndị ozi iri na abụọ ahụ hụ Ya anya.” (Jọn 20:19-23) Ihe dị ka mmadụ 500 hụrụ ya, ikekwe ọ bụ mgbe o nyere iwu, sị: ‘Gaanụ, mee ndị na-eso ụzọ.’ (Matiu 28:19, 20) Jemes hụrụ ya, dịkwa ka ndị ozi nile kwesịrị ntụkwasị obi. (Ọrụ 1:6-11) Na nso Damaskọs, Jisọs pụtara n’ihu Sọl “dị ka nwa a mụkworo amụkwo”— dị ka a ga-asị na e meworị ka Sọl si n’ọnwụ bilie gaa ná ndụ nke mmụọ. (Ọrụ 9:1-9) Ndị Kọrint ghọrọ ndị kwere ekwe n’ihi na Pọl kwusaara ha ozi ọma, ha nakwekwaara ozi ọma ahụ.

5. Olee ụzọ Pọl si rụọ ụka dị ka e dekọrọ ya ná 1 Ndị Kọrint 15:12-19?

5 Rịba ama ụzọ Pọl si rụọ ụka. (1 Ndị Kọrint 15:12-19) Ebe ọ bụ na ndị ji anya ha hụ ihe merenụ na-ekwusa na a kpọlitere Kraịst n’ọnwụ, olee otú a ga-esi kwuo na mbilite n’ọnwụ adịghị? Ọ bụrụ na e meghị ka Jisọs si n’ọnwụ bilie, nkwusa na okwukwe anyị bụ ihe efu, anyị bụkwa ndị na-agbagide Chineke àmà ụgha site n’ikwu na ọ kpọlitere Kraịst n’ọnwụ. Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie, ‘anyị ka nọ ná mmehie nile anyị,’ ndị nwụrụ anwụ n’ime Kraịst alawokwa n’iyi. Ọzọkwa, “a sị na ọ bụ nanị ná ndụ a ka anyị nweworo olileanya anyị n’ime Kraịst, anyị bụ ndị kwesịrị ebere karịa mmadụ nile.”

6. (a) Gịnị ka Pọl kwuru n’ịgba akaebe banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs? (b) Gịnị bụ “onye iro ikpeazụ,” oleekwa otú a ga-esi mee ka ọ ghara ịdị irè?

6 Pọl gbara akaebe banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs. (1 Ndị Kọrint 15:20-28) Ebe ọ bụ na Kraịst bụ “mkpụrụ mbụ” nke ndị nọ n’ụra ọnwụ, a ga-akpọlitekwa ndị ọzọ. Dị ka ọnwụ sitere ná nnupụisi nke nwoke ahụ bụ́ Adam, mbilite n’ọnwụ na-esite n’aka otu nwoke—Jisọs. A ga-akpọlite ndị nke ya n’oge ọnụnọ ya. Kraịst “[ga-eme] ka ọbụbụ isi nile na ịchịisi nile na ike nile” na-emegide ọbụbụeze Chineke “ghara ịdị irè,” ọ ga-achịkwa dị ka Eze ruo mgbe Jehova ga-edebe ndị iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya. Ọbụna a ga-eme ka “onye iro ikpeazụ”—ọnwụ e ketara n’aka Adam—ghara ịdị irè site n’uru nke àjà Jisọs. Mgbe ahụ Kraịst ga-enyefe Alaeze ahụ n’aka Chineke ya na Nna ya, na-edo onwe ya “n’okpuru Onye ahụ Nke doro ihe nile n’okpuru Ya, ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’ime ihe nile.”

Hà Bụ Ndị E Mere Baptism Ịbụ Ndị Nwụrụ Anwụ?

7. Ole ndị ka a “na-eme baptism n’ihi nzube nke ịbụ ndị nwụrụ anwụ,” gịnịkwa ka nke a pụtara nye ha?

7 A na-ajụ ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ, sị: “Gịnị ka ha ga-eme bụ́ ndị a na-eme baptism n’ihi nzube nke ịbụ ndị nwụrụ anwụ?” (1 Ndị Kọrint 15:29, NW) Pọl adịghị ekwu na a ga-eme ndị dị ndụ baptism n’ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, n’ihi na ndị na-eso ụzọ Jisọs n’otu n’otu aghaghị ịmụ ihe, kwere, ma bụrụ ndị e mere baptism. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 2:41) A “na-eme [ndị Kraịst e tere mmanụ] baptism n’ihi nzube nke ịbụ ndị nwụrụ anwụ” site na ha ịbanye n’ụzọ ndụ nke na-eduga n’ọnwụ na mbilite n’ọnwụ. Ụdị baptism a na-amalite mgbe mmụọ Chineke na-eme ka ha nwee olileanya ịga eluigwe ma gwụsịa mgbe e mere ka ha si n’ọnwụ bilie gaa ná ndụ anwụghị anwụ nke mmụọ n’eluigwe.—Ndị Rom 6:3-5; 8:16, 17; 1 Ndị Kọrint 6:14.

8. Gịnị ka ndị Kraịst pụrụ ijide n’aka ọbụna ma a sị na Setan na ndị na-ejere ya ozi egbuo ha?

8 Dị ka okwu Pọl na-egosi, olileanya mbilite n’ọnwụ na-eme ka ndị Kraịst nwee ike ịnagide ihe ize ndụ ha na-ezute kwa awa na ọnwụ ha na-eche ihu kwa ụbọchị n’ihi ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. (1 Ndị Kọrint 15:30, 31) Ha maara na Jehova pụrụ ịkpọlite ha n’ọnwụ ma ọ bụrụ na o kwe ka Setan na ndị na-ejere ya ozi gbuo ha. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ igbu mkpụrụ obi ha, ma ọ bụ ndụ ha, n’ime Gehena, bụ́ nke na-anọchi anya mbibi ebighị ebi.—Luk 12:5.

Mkpa Maka Ịnọ na Nche

9. Ọ bụrụ na olileanya mbilite n’ọnwụ ga-enwe ike na-akwagide akwagide ná ndụ anyị, gịnị ka anyị na-aghaghị izere?

9 Olileanya mbilite n’ọnwụ kwagidere Pọl. Mgbe ọ nọ n’Efesọs, ọ pụrụ ịbụ na ndị iro ya tụbara ya n’ọgbọ egwuregwu ka o soro anụ ọhịa lụọ ọgụ. (1 Ndị Kọrint 15:32) Ọ bụrụ na nke ahụ mere, a napụtara ya, ọbụna dị ka a napụtara Daniel n’aka ọdụm. (Daniel 6:16-22; Ndị Hibru 11:32, 33) Ebe ọ bụ na o nwere olileanya ná mbilite n’ọnwụ, Pọl emeghị omume dị ka ndị Juda si n’ezi ofufe dapụ n’oge Aịsaịa mere. Ha kwuru, sị: “Ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi anyị anwụọ.” (Aịsaịa 22:13, Septuagint) Ọ bụrụ na olileanya mbilite n’ọnwụ ga-enwe ike na-akwagide akwagide ná ndụ anyị dị ka o nwere ná ndụ Pọl, anyị aghaghị izere ndị nwere àgwà na-adịghị mma dị otú ahụ. “Unu ekwela ka e duhie unu,” ka Pọl dọrọ aka ná ntị. “Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) N’ezie, ụkpụrụ a na-emetụta akụkụ dị iche iche nke ndụ.

10. Olee otú a pụrụ isi mee ka olileanya mbilite n’ọnwụ anyị dịgide?

10 Pọl gwara ndị na-enwe obi abụọ banyere mbilite n’ọnwụ, sị: “Sinụ n’ụra mmanya teta n’ụzọ ezi omume, unu emehiekwala; n’ihi na ụfọdụ na-enwe amaghị ihe banyere Chineke: ana m ekwu nke a ka m mee unu ihere n’ihu.” (1 Ndị Kọrint 15:34) Na “mgbe ọgwụgwụ” a, ọ dị anyị mkpa ịkpa àgwà n’ụzọ kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma banyere Chineke na Kraịst. (Daniel 12:4; Jọn 17:3) Nke a ga-eme ka olileanya mbilite n’ọnwụ anyị dịgide.

À Kpọlitere Ha n’Ahụ Dị Aṅaa?

11. Olee otú Pọl si mee ihe atụ mbilite n’ọnwụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ?

11 Pọl zaziri ajụjụ ụfọdụ. (1 Ndị Kọrint 15:35-41) Ikekwe ná mgbalị ya ime ka e nwee obi abụọ banyere mbilite n’ọnwụ, onye na-ajụ ajụjụ pụrụ ịjụ, sị: “È si aṅaa eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie? ọ̀ bụkwa aha ahụ gịnị ka ha ji bịa?” Dị ka Pọl gosiri, mkpụrụ a kụrụ n’ala na-anwụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka ọ na-agbanwe ịghọ ome. N’ụzọ yiri nke ahụ, mmadụ e ji mmụọ nsọ mụta aghaghị ịnwụ. Dị nnọọ ka ihe ọkụkụ na-esi ná mkpụrụ pulite ghọọ ahụ ọhụrụ, otú ahụ, ahụ onye Kraịst e tere mmanụ nke e mere ka o si n’ọnwụ bilie na-adị iche n’ebe anụ ahụ mmadụ dị. Ọ bụ ezie na o nwere otu ụdị ndụ ahụ o nwere tupu ọ nwụọ, a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie dị ka onye ọhụrụ e kere eke nke nwere ahụ mmụọ nke nwere ike ibi n’eluigwe. Dị ka o kwesịrị ịdị, ndị a ga-akpọlite site n’ọnwụ ibi n’ụwa ga-enwe ahụ mmadụ.

12. Gịnị ka okwu ndị bụ́ “ahụ nke eluigwe” na “ahụ nke ụwa” pụtara?

12 Dị ka Pọl kwuru, anụ ahụ ụmụ mmadụ dị iche n’ebe nke ụmụ anụmanụ dị. Ọbụna anụ ahụ ụmụ anụmanụ dị n’ụdị n’ụdị. (Jenesis 1:20-25) Ebube nke “ahụ nke eluigwe” nke ihe ndị e kere eke bụ́ mmụọ dị iche na nke “ahụ nke ụwa” bụ́ anụ ahụ. E nwekwara ihe ndị dịgasị iche n’ịdị ebube nke anyanwụ, ọnwa, na kpakpando. Ma ndị e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ nwere nnọọ ebube ka ukwuu.

13. Dị ka 1 Ndị Kọrint 15:42-44 si kwuo, gịnị ka a na-agha, gịnịkwa ka a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie?

13 Ebe o kwuworo ndịrịta iche dịnụ, Pọl gbakwụnyere, sị: “Otú a ka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dịkwa.” (1 Ndị Kọrint 15:42-44) O kwuru, sị: “A na-agha ya n’ire ure; a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie n’ereghị ure.” N’ebe a Pọl pụrụ ibu n’uche ndị e tere mmanụ dị ka otu ìgwè. N’ịbụ nke a ghara n’ire ure n’ọnwụ, e mere ka o si n’ọnwụ bilie n’ereghị ure, n’enweghị mmehie. Ọ bụ ezie na ụwa mere ya ihe ihere, e mere ka o bilie gaa ná ndụ eluigwe, meekwa ka o soro Kraịst pụta ìhè n’ebube. (Ọrụ 5:41; Ndị Kọlọsi 3:4) N’ọnwụ, a na-agha ya dị ka “ahụ nke mkpụrụ obi na-achị” ma na-eme ka o si n’ọnwụ bilie dị ka “ahụ nke Mmụọ dị n’ime ya na-achị.” Ebe ọ bụ na nke a kwere omume n’ebe ndị Kraịst e ji ike mmụọ nsọ mụta nọ, anyị pụrụ ijide n’aka na a pụrụ ime ka ndị ọzọ si n’ọnwụ bilie n’ụwa.

14. Olee otú Pọl si gosi ọdịiche dị n’etiti Kraịst na Adam?

14 Pọl gosiziri ọdịiche dị n’etiti Kraịst na Adam. (1 Ndị Kọrint 15:45-49) Adam, bụ́ mmadụ mbụ, “ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) “Adam ikpeazụ”—Jisọs—“ghọrọ mmụọ nke na-enye ndụ.” O nyere ndụ ya ịbụ àjà mgbapụta, nke mbụ maka ụmụazụ ya e tere mmanụ. (Mak 10:45) Dị ka ụmụ mmadụ, ha ‘nwere onyinyo nke onye ahụ e ji ájá kpụọ,’ ma mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ, ha dị ka Adam ikpeazụ ahụ. N’ezie, àjà Jisọs ga-abara ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi uru, gụnyere ndị a ga-akpọlite n’ụwa.—1 Jọn 2:1, 2.

15. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst e tere mmanụ na-ejighị enwe anụ ahụ mgbe a na-akpọlite ha n’ọnwụ, oleekwa otú e si eme ka ha si n’ọnwụ bilie n’oge ọnụnọ Jisọs?

15 Mgbe ndị Kraịst e tere mmanụ nwụrụ, a naghị akpọlite ha n’ọnwụ n’anụ ahụ. (1 Ndị Kọrint 15:50-53) Ahụ na-ere ure bụ́ anụ ahụ na ọbara apụghị iketa ereghị ure na Alaeze eluigwe. Ụfọdụ ndị e tere mmanụ agaghị anọ n’ụra ọnwụ ruo ogologo oge. Mgbe ha jesịrị ozi elu ala ha n’ikwesị ntụkwasị obi n’oge ọnụnọ Jisọs, “a ga-enwo [ha] nile, n’oge dịkarịsịrị nta, n’otu ntabi anya.” A ga-eme ka ha si n’ọnwụ bilie n’egbughị oge gaa ná ndụ mmụọ n’ereghị ure nakwa n’ebube. N’ikpeazụ, ọnụ ọgụgụ nke “nwanyị ahụ [Kraịst] na-alụ ọhụrụ” ga-adị 144,000.—Mkpughe 14:1; 19:7-9; 21:9; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:15-17.

Imeri Ọnwụ!

16. Dị ka Pọl na ndị amụma bu ya ụzọ si kwuo, gịnị ga-eme ọnwụ e ketara n’aka Adam mere mmehie?

16 Pọl ji ọṅụ kwupụta na a ga-elo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. (1 Ndị Kọrint 15:54-57) Mgbe ihe na-ere ure ma na-anwụ anwụ ga-eyikwasị ereghị ure na anwụghị anwụ, a ga-emezu okwu ndị a: “E loro ọnwụ ruo mmeri. Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ọgbụgba gị dị?” (Aịsaịa 25:8; Hosea 13:14) Ihe ọgbụgba na-akpata ọnwụ bụ mmehie, ikike mmehie bụkwa Iwu ahụ, bụ́ nke mara ndị mmehie ikpe ọnwụ. Ma n’ihi àjà na mbilite n’ọnwụ Jisọs, ọnwụ e ketara n’aka Adam mere mmehie agaghịzi enwe mmeri.—Ndị Rom 5:12; 6:23.

17. Olee otú okwu ndị dị ná 1 Ndị Kọrint 15:58 si daba adaba taa?

17 “Ya mere, ụmụnna m m hụrụ n’anya,” ka Pọl kwuru, “guzosienụ ike, bụrụnụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ, ndị na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:58) Okwu ndị ahụ metụtara ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ taa nakwa “atụrụ ọzọ” Jisọs, ọbụna ma a sị na ha anwụọ na mgbe ikpeazụ a. (Jọn 10:16) Ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ dị ka ndị na-akpọsa Alaeze ahụ abụghị n’efu, n’ihi na mbilite n’ọnwụ na-echere ha. Dị ka ndị ohu Jehova, ka anyị na-arụsizi ọrụ Onyenwe anyị ike ka anyị na-echere ụbọchị ahụ bụ́ mgbe anyị pụrụ iji ọṅụ tie mkpu, sị: “Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị?”

E Mezuo Olileanya Mbilite n’Ọnwụ!

18. Olee ókè olileanya Pọl nwere ná mbilite n’ọnwụ siruru ike?

18 Okwu Pọl ndị e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint isi nke 15 na-eme ka ọ pụta ìhè na olileanya mbilite n’ọnwụ nwere ike ná ndụ ya. O nwere obi ike zuru ezu na e mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie nakwa na a ga-atọhapụkwa ndị ọzọ n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ì kwenyesiri ike otú ahụ? Pọl lere abamuru nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị anya dị ka “ihe mkpofu” ‘yiekwa iyi ihe nile’ ka o wee nwee ike ‘ịmara Kraịst, na ike nke mbilite n’ọnwụ Ya.’ Onyeozi ahụ dị njikere ịnwụ ọnwụ yiri nke Kraịst, na-enwe olileanya nke inweta “mbilite n’ọnwụ bu ụzọ” (NW). A na-akpọkwa ya “mbilite n’ọnwụ mbụ,” ọ bụ ụmụazụ Jisọs dị 144,000, bụ́ ndị e tere mmanụ na-enweta ya. Ee, a na-eme ka ha si n’ọnwụ bilie gaa ná ndụ nke mmụọ n’eluigwe, ma a ga-akpọlite “ndị fọdụrụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ” ibi n’ụwa.—Ndị Filipaị 3:8-11; Mkpughe 7:4; 20:5, 6.

19, 20. (a) Ndị dị aṅaa e dekọrọ na Bible ka a ga-eme ka ha si n’ọnwụ bilie ibi n’ụwa? (b) Mbilite n’ọnwụ ònye ka ị na-atụ anya ya?

19 Olileanya mbilite n’ọnwụ aghọwo ihe dị ebube e ji n’aka nye ndị e tere mmanụ bụ́ ndị kwesịworo ntụkwasị obi ruo ọnwụ. (Ndị Rom 8:18; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:15-18; Mkpughe 2:10) Ndị ga-alanarị ‘oké mkpagbu ahụ’ ga-ahụ ka e mezuru olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ n’ụwa mgbe ‘oké osimiri ga-enyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya; ọnwụ na Hedis enyeghachikwa ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha.’ (Mkpughe 7:9, 13, 14; 20:13) Job, bụ́ onye ụmụ ya ndị ikom asaa na ndị inyom atọ nwụnahụrụ, ga-eso ná ndị ahụ a ga-eme ka ha si n’ọnwụ bilie n’ụwa. Cheedị banyere ọṅụ ọ ga-enwe ịnabataghachi ha—na obi ụtọ ha ga-enwe na ha nwekwuru ụmụnne ndị nwoke asaa na ụmụnne ndị nwanyị atọ ọzọ mara mma!—Job 1:1, 2, 18, 19; 42:12-15.

20 Lee ngọzi ọ ga-abụ mgbe a ga-eme ka Abraham na Sera, Aịsak na Rebeka—ee, na ọtụtụ ndị ọzọ, gụnyere “ndị amụma nile”—si n’ọnwụ bilie ibi n’ụwa! (Luk 13:28) Otu n’ime ndị amụma ahụ bụ Daniel, bụ́ onye e kwere nkwa mbilite n’ọnwụ n’okpuru ọchịchị Mesaịa. Ruo ihe dị ka afọ 2,500, Daniel ezuwo ike n’ili, ma site n’ike nke mbilite n’ọnwụ, n’oge na-adịghị anya, ọ ‘ga-eguzo ọtọ n’ebe e keworo nye ya’ dị ka otu n’ime “ndị isi n’ụwa nile.” (Daniel 12:13; Abụ Ọma 45:16) Lee ihe na-akpali akpali ọ ga-abụ ịnabataghachi ọ bụghị nanị ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie kamakwa nna gị, nne gị, nwa gị nwoke, nwa gị nwanyị, ma ọ bụ ndị ọzọ ị hụrụ n’anya bụ́ ndị onye iro bụ́ ọnwụ naara gị!

21. Gịnị mere anyị ekwesịghị igbu oge n’imere ndị ọzọ ihe ọma?

21 Ụfọdụ n’ime ndị enyi anyị na ndị anyị hụrụ n’anya pụrụ ijeworo Chineke ozi ruo ọtụtụ iri afọ ma bụrụ ndị kataworo nnọọ ahụ. Ịka nká pụrụ ime ka ọ na-esiri ha ike ịnagide ihe ịma aka dị iche iche nke ndụ. Lee ka o si bụrụ ịhụnanya inyere ha aka n’ụzọ ọ bụla anyị nwere ike ugbu a! Mgbe ahụ anyị agaghị akwa ụta ọ bụla banyere ịbụ ndị na-emezughị, n’ụzọ ụfọdụ, ihe ndị anyị kwesịrị imere ha ma ọ bụrụ na ọnwụ egbuo ha. (Eklisiastis 9:11; 12:1-7; 1 Timoti 5:3, 8) Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova agaghị echefu ezi ihe ndị anyị na-emere ndị ọzọ, n’agbanyeghị afọ ndụ na ọnọdụ ha ná ndụ. “Otú anyị nwere oge,” ka Pọl dere, “ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.”—Ndị Galetia 6:10; Ndị Hibru 6:10.

22. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime ruo mgbe a ga-emezu olilieanya mbilite n’ọnwụ ahụ?

22 Jehova bụ “Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile.” (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Okwu ya na-akasi anyị obi, na-enyekwara anyị aka iji olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ dị ike na-akasi ndị ọzọ obi. Ka anyị dị ka Pọl, bụ́ onye nwere okwukwe ná mbilite n’ọnwụ, ruo mgbe anyị ga-ahụ mmezu nke olileanya ahụ site n’omume a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie ịdị ndụ n’ụwa. Ka anyị ṅomie Jisọs karịsịa, bụ́ onye e mezuru olileanya o nwere n’ike Chineke nwere ịkpọlite ya n’ọnwụ. Ndị nọ n’ili ncheta ga-anụ olu Kraịst n’oge na-adịghị anya ma pụta. Ka nke a wetara anyị nkasi obi na ọṅụ. Karịsịa, ka anyị nwee ekele n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye meworo ka imeri ọnwụ kwe omume site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst!

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• Ihe àmà dị aṅaa nke onye jiri anya ya hụ ihe merenụ ka Pọl nyere banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs?

• Gịnị bụ “onye iro ikpeazụ,” oleekwa otú a ga-esi mee ka ọ ghara ịdị irè?

• N’ihe banyere ndị Kraịst e tere mmanụ, gịnị ka a ghara dị ka mkpụrụ, gịnịkwa ka e mere ka o si n’ọnwụ bilie?

• Mmadụ ndị dị aṅaa e dekọrọ na Bible ka ị ga-enwe mmasị izute mgbe e mere ka ha si n’ọnwụ bilie ibi n’ụwa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Pọl onyeozi gbachiteere mbilite n’ọnwụ n’ụzọ siri ike

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Mbilite n’ọnwụ Job, ezinụlọ ya, na ọtụtụ ndị ọzọ ga-abụ ihe na-eweta ọṅụ na-enweghị ọgwụgwụ!