Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ndụ Gị Pụrụ Isi Nwee Nzube Ka Ukwuu

Otú Ndụ Gị Pụrụ Isi Nwee Nzube Ka Ukwuu

Otú Ndụ Gị Pụrụ Isi Nwee Nzube Ka Ukwuu

OTU ilu oge ochie na-asị: “Adọgbula onwe gị n’ọrụ ịbụ ọgaranya; site ná nghọta gị haa ya aka. Ị̀ ga-atụkwasị anya gị abụọ na ya? ọ dịghịkwa: n’ihi na akụ̀ na-emere onwe ya nkù n’ezie, dị ka ugo ka ọ na-efesị n’eluigwe.” (Ilu 23:4, 5) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụghị ihe amamihe dị na ya ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ịnwa ịba ọgaranya, n’ihi na akụ̀ na ụba pụrụ ifefu dị ka ọ̀ nọ na nkù ugo.

Dị ka Bible na-egosi, akụ̀ na ụba nkịtị pụrụ imi ala ngwa ngwa. Ọ pụrụ ịpụ n’anya na mberede n’ihi ọdachi meere onwe ya, ndakpọ akụ̀ na ụba, ma ọ bụ ihe ndabara ndị ọzọ. Ọzọkwa, ọbụna ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe na-enwe ndakpọ olileanya mgbe mgbe. Tụlee ihe banyere John, bụ́ onye ọrụ ya gụnyere ime ndị ọchịchị, ndị a ma ama na-eme egwuregwu, na ndị eze, obi ụtọ.

John na-ekwu, sị: “Araara m onwe m nye ọrụ m. Enwere m ọganihu n’ụzọ ego, nọọ n’ụlọ oriri ndị oké ozu, mgbe ụfọdụ kwa, ana m eji ọbụna ụgbọelu jet onwe onye aga ọrụ. Na mbụ, ọ tọrọ m ụtọ, ma nke nta nke nta ọ gbụrụ m. Ndị m gbalịrị ime obi ụtọ yiri ndị na-enweghị mmetụta. Ndụ m enweghị nzube.”

Dị ka John chọpụtara, ndụ nke ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe adịghị eweta afọ ojuju. N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jisọs Kraịst gosipụtara otú e si enweta obi ụtọ na-adịgide adịgide. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, ebe ọ bụ na alaeze nke eluigwe bụ nke ha.” (Matiu 5:3, NW) Mgbe ahụ, o doro anya na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ibute ihe ime mmụọ ụzọ ná ndụ. Otú ọ dị, ihe ndị ọzọ pụkwara inye aka ime ka ndụ nwee nzube ka ukwuu.

Ezinụlọ na Ndị Enyi Gị Dị Mkpa n’Ezie

Ị̀ ga-anụ ụtọ ndụ ma ọ bụrụ na gị na ezinụlọ gị adịghị enwe mmekọrịta, ma ọ bụrụkwa na i nweghị ezi ndị enyi? Ọ dịghị ma ọlị. Onye Okike anyị kenyere anyị mkpa nke ịhụ n’anya na nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya. Nke ahụ bụ otu n’ime ihe ndị mere Jisọs ji mee ka mkpa nke ‘ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị’ pụta ìhè. (Matiu 22:39) Ezinụlọ bụ onyinye sitere n’aka Chineke nke na-eme ka e nwee ọnọdụ magburu onwe ya maka igosipụta ịhụnanya nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị.—Ndị Efesọs 3:14, 15.

Olee otú ezinụlọ anyị pụrụ isi mee ka ndụ anyị nwee nzube ka ukwuu? A pụrụ iji ezinụlọ dị n’otu tụnyere ọmarịcha ogige bụ́ ebe a na-enweta nchebe na-enye ume ọhụrụ pụọ ná nchekasị nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. N’otu aka ahụ, n’ime ezinụlọ, anyị pụrụ ịchọta mkpakọrịta na-enye ume ọhụrụ na nke ịhụnanya bụ́ ndị na-eme ka anyị ghara inwe owu ọmụma. N’ezie, ezinụlọ adịghị eweta ebe izu ike dị otú ahụ n’etinyeghị mgbalị. Otú ọ dị, ka anyị na-ewusikwu nkekọ ezinụlọ ike, anyị na-abịarukwu ibe anyị nso, ndụ na-enwekwa nzube karị. Dị ka ihe atụ, oge na uche anyị na-etinye n’igosi ịhụnanya na nkwanye ùgwù n’ebe onye òtù ọlụlụ anyị nọ bụ àjà ndị a na-achụ kwa ụbọchị bụ́ ndị pụrụ ịmụpụta ihe dị ukwuu n’ikpeazụ.—Ndị Efesọs 5:33.

Ọ bụrụ na anyị nwere ụmụaka, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ime ka e nwee ọnọdụ dị mma anyị ga-anọ na ya zụlite ha. Isoro ha na-anọkọ, ime ka anyị na ha na-enwe nkwurịta okwu, na inye ha ntụziaka ime mmụọ pụrụ ịchọ ihe dị ukwuu n’aka anyị. Ma oge na mgbalị dị otú ahụ pụrụ ime ka anyị nwee afọ ojuju n’ụzọ dị ukwuu. Ndị nne na nna na-enwe ihe ịga nke ọma na-ele ụmụ anya dị ka ngọzi, dị ka ihe nketa si n’aka Chineke bụ́ nke e kwesịrị ilekọta anya nke ọma.—Abụ Ọma 127:3.

Ezi ndị enyi na-atụnyekwa ụtụ ná ndụ na-eju afọ na nke nwere nzube. (Ilu 27:9) Anyị pụrụ inweta ọtụtụ ndị enyi site n’ichebara ibe anyị echiche. (1 Pita 3:8) Ezi ndị enyi na-enye aka ikulite anyị mgbe anyị dara. (Eklisiastis 4:9, 10) “Enyi na-ahụ n’anya . . . [bụkwa] nwanne banyere ahụhụ.”—Ilu 17:17.

Lee ka ezi ọbụbụenyi pụrụ isi bụrụ ihe na-enye afọ ojuju! Ọdịda nke anyanwụ na-aka ama mma, ihe oriri na-aka adị ụtọ, egwú na-akakwa atọ ụtọ mgbe anyị sooro enyi anyị kirie, rie, ma ọ bụ gee ha. N’ezie, ezinụlọ dị n’otu na ndị enyi a pụrụ ịtụkwasị obi bụ nnọọ akụkụ abụọ nke ndụ nwere nzube. Olee ihe ndị ọzọ Chineke nyere bụ́ ndị pụrụ ime ka ndụ anyị nwee nzube ka ukwuu?

Igbo Mkpa Ime Mmụọ Anyị

Dị ka e kwuru ná mmalite, Jisọs Kraịst jikọtara obi ụtọ na anyị ịma mkpa ime mmụọ anyị. E kere anyị inwe ma ikike ime mmụọ ma nke omume. N’ihi ya, Bible na-ezo aka n’ebe “onye Mmụọ Nsọ na-achị” nakwa n’ebe “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi” nọ.—1 Ndị Kọrint 2:15; 1 Pita 3:3, 4.

Dị ka An Expository Dictionary of New Testament Words, nke W. E. Vine dere si kwuo, obi ihe atụ na-anọchi anya “echiche na omume nile nke mmadụ, ihe ndị mejupụtara ma nghọta ma mmetụta uche.” N’ụzọ nkọwa, Vine na-agbakwụnye, sị: “N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a na-eji obi eme ihe n’ụzọ ihe atụ maka isi iyi nile zoro ezo nke ndụ onwe onye.” Otu akwụkwọ ahụ na-ekwukwa na “obi, dị ka ihe dị nnọọ n’ime, bụ ebe ‘mmadụ zoro ezo’ dị . . . mmadụ bụ́ ezigbo ya.”

Olee otú anyị pụrụ isi gboo mkpa nke “onye Mmụọ Nsọ na-achị,” ma ọ bụ “mmadụ zoro ezo,” ya bụ, “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi”? Anyị na-ewere nzọụkwụ dị mkpa n’ime nke a nakwa n’igbo mkpa ime mmụọ anyị mgbe anyị ghọtara isi ihe ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ na-ekwu bụ́ onye bụrụ, sị: “Maranụ na Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke: Ya onwe ya emewo anyị, ọ bụkwa Ya nwe anyị; anyị bụ ndị Ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ Ya.” (Abụ Ọma 100:3) Ịmata nke a na-eduga anyị n’ikwubi n’ụzọ ezi uche dị na ya na anyị ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a gụnye anyị n’etiti “ndị Ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ Ya,” anyị aghaghị ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu ya, bụ́ Bible.

Nke ahụ ọ̀ dị njọ? Ee e, n’ihi na anyị ịmara na omume anyị na-emetụta Chineke na-eme ka ndụ anyị nwekwuo nzube. Ọ na-agba anyị ume ịbụ ezi ndị mmadụ karị—ihe mgbaru ọsọ kwesịrị ekwesị n’ezie. “Onye ihe na-agara nke ọma ka nwoke ahụ bụ nke na-atụ egwu Jehova, nke ihe nile O nyere n’iwu na-atọ ụtọ nke ukwuu,” ka Abụ Ọma 112:1 na-ekwu. Ịtụ Chineke egwu nsọpụrụ na iji ezi obi na-erube isi n’ihe ndị o nyere n’iwu pụrụ ime ka ndụ anyị nwee nzube ka ukwuu.

N’ihi gịnị ka irubere Chineke isi ji enye anyị afọ ojuju? Ọ bụ n’ihi na anyị nwere akọ na uche, bụ́ onyinye Chineke nyeworo ihe nile a kpọrọ mmadụ. Akọ na uche bụ ihe na-enyocha omume, nke na-akwado ma ọ bụ na-ajụ ihe anyị mere ma ọ bụ nke anyị na-atụle ime. Anyị nile enwewo obi erughị ala nke ikpe ọmụma akọ na uche. (Ndị Rom 2:15) Ma akọ na uche anyị pụkwara inye anyị ụgwọ ọrụ. Mgbe anyị mesoro Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị ihe n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị, anyị na-enwe afọ ojuju na obi ụtọ. Anyị na-ahụ na “ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) E nwere ihe dị mkpa kpatara nke a.

Onye Okike anyị kere anyị n’ụdị nke na ọchịchọ na mkpa ụmụ mmadụ ibe anyị na-emetụta anyị. Inyere ndị ọzọ aka na-eme ka obi anyị ṅụrịa. Tụkwasị na nke ahụ, Bible na-emesi anyị obi ike na mgbe anyị nyere onye nọ ná mkpa ihe, Chineke na-ewere ya na ọ bụ ya ka e meere amara ahụ.—Ilu 19:17.

E wezụga ime ka anyị nwee afọ ojuju n’ime onwe anyị, ilebara mkpa ime mmụọ anyị anya ọ̀ pụrụ inyere anyị aka n’ụzọ nkịtị? Otu onye ọchụ ntá ego nọ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nke aha ya bụ Raymond kweere na ọ pụrụ. “Ihe mgbaru ọsọ m nile bụ inwe ego,” ka ọ na-ekwu. “Ma site n’oge m nakweere n’obi m na e nwere Chineke nakwa na Bible na-ekwupụta ọchịchọ ya, agbanwere m. Inweta ihe e ji ebi ndụ na-ewerezi ọnọdụ nke abụọ ná ndụ m. Site n’ịgbalị ime Chineke obi ụtọ, e mewo ka m zere mmetụta na-ebibi ihe nke ịkpọasị. Ọ bụ ezie na nna m nwụrụ n’oge a na-alụ ọgụ, enweghị m ọchichọ ịbọ ọ́bọ̀ n’isi ndị gburu ya.”

Dị ka Raymond chọpụtara, ilebara mkpa nke “onye Mmụọ Nsọ na-achị” anya nke ọma pụrụ ime ka oké ihe mgbu nke uche kwụsị. Otú ọ dị, ọ gwụla ma anyị na-anagide nsogbu ndị anyị na-enwe kwa ụbọchị, anyị agaghị enwecha afọ ojuju ná ndụ.

Anyị Pụrụ Inwe “Udo nke Chineke”

N’ụwa a jupụtara n’ọgba aghara, ọ bụ ụbọchị ole na ole na-agafe n’enweghị nsogbu. Ihe ọghọm na-eme, atụmatụ na-akụ afọ n’ala, ndị mmadụ na-emechukwa anyị ihu. Ihe ndọghachi azụ ndị a pụrụ ịnapụ anyị obi ụtọ. Otú ọ dị, nye ndị na-ejere Jehova Chineke ozi, Bible na-ekwe nkwa obi iru ala—“udo nke Chineke.” Olee otú anyị si enweta udo a?

Pọl onyeozi dere, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Kama ịnwa iburu nsogbu anyị nanị anyị, ọ dị anyị mkpa ikpesi ekpere ike, na-atụkwasị Chineke ibu arọ ndị anyị na-enwe kwa ụbọchị. (Abụ Ọma 55:22) Okwukwe anyị nwere na ọ ga-esi n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, zaa ekpere dị otú ahụ ga-amụba ka anyị na-eto n’ụzọ ime mmụọ ma na-aghọta otú Chineke si enyere anyị aka.—Jọn 14:6, 14; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:3.

Mgbe anyị wulitesịrị obi ike anyị n’ebe Jehova Chineke nọ, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” anyị ga-enwe ike ịnagide n’ụzọ ka mma ule ndị dị ka ọrịa ndị na-adịghị ala ngwa ngwa, ịka nká, ma ọ bụ ọnwụ nke ndị anyị hụrụ n’anya. (Abụ Ọma 65:2) Otú ọ dị, iji bie ndụ nwere nzube n’ezie, anyị aghaghịkwa ichebara ọdịnihu echiche.

Ṅụrịa n’Olileanya Dị n’Ihu

Bible na-ekwe nkwa “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” bụ́ ọchịchị eluigwe nke ezi omume na nke ga-egbo mkpa anyị, nke ga-achị ezinụlọ mmadụ na-erube isi. (2 Pita 3:13) N’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke Chineke kwere ná nkwa, a ga-eji udo na ikpe ziri ezi dochie agha na ikpe na-ezighị ezi. Nke a abụghị ọchịchọ nkịtị na-agabiga ngwa ngwa, kama ọ bụ nkwenye nke pụrụ isikwu ike kwa ụbọchị. Ọ bụ ozi ọma n’ezie, ọ bụkwa ihe na-akpata ịṅụrị ọṅụ n’ezie.—Ndị Rom 12:12; Taịtọs 1:2.

John, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-enwezi mmetụta na ndụ ya nwere nzube ka ukwuu. “Ọ bụ ezie na ejibughị m okpukpe kpọrọ ihe, ekweere m na Chineke kemgbe,” ka ọ na-ekwu. “Ma ọ dịghị ihe m mere banyere ihe a m kweere ruo mgbe mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ m. Ajụkasịrị m ha ajụjụ ahụ, dị ka, ‘Gịnị ka anyị na-eme n’ebe a? Ebee ka anyị na-aga?’ Azịza na-eju afọ ha ji Akwụkwọ Nsọ nye m mere ka m nwee echiche na nke mbụ ya, na ndụ m nwere nzube. Nke ahụ bụ nanị mmalite ya. Azụlitere m mmasị n’ebe eziokwu ahụ dị bụ́ nke dugara m n’ime mgbanwe n’ihe ndị m ji kpọrọ ihe. Ọ bụ ezie na abaghịzi m ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe, ọ dị m ka m bụ aka ji akụ̀ n’ụzọ ime mmụọ.”

Dị ka John, ikekwe i jibeghị ikike ime mmụọ gị rụọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ. Otú ọ dị, site n’ịzụlite “obi amamihe,” ị pụrụ ime ka ọ maliteghachi ọrụ. (Abụ Ọma 90:12) Site n’ime mkpebi siri ike na itinye mgbalị, ị pụrụ inwe ezigbo ọṅụ, udo, na olileanya. (Ndị Rom 15:13) Ee, ndụ gị pụkwara inwe nzube ka ukwuu.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ekpere pụrụ iwetara anyị “udo nke Chineke”

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ị̀ maara ihe pụrụ ime ka ndụ ezinụlọ bụrụ ihe na-enyekwu afọ ojuju?