Ịkwanyere Ịbụisi Ùgwù—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Ụkọ?
Ịkwanyere Ịbụisi Ùgwù—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Ụkọ?
“Otu ụbọchị, a pụrụ nnọọ iwere nguzo a na-eguzogide ịbụisi e guzobere eguzobe, nke okpukpe na nke nkịtị, nke obodo na nke ọchịchị, bụ́ nsogbu zuru ụwa ọnụ, dị ka ihe omume pụtara ìhè nke iri afọ gara aga.”
ỌTỤTỤ afọ agafewo kemgbe afọ ndị 1960, bụ́ iri afọ nke ọkọ akụkọ ihe mere eme na ọkà mmụta ahụ bụ́ Hannah Arendt na-ezo aka na ya n’ebe a. Taa, ọ̀tụ̀tụ̀ nke akwanyeghịrị ịbụisi ùgwù na-aka njọ karịa ka ọ dịtụworo.
Dị ka ihe atụ, otu akụkọ a kọrọ na nso nso a n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na-ekwu, sị: “Ndị nne na nna ụfọdụ adịghị anabata ikike onye nkụzi nwere n’ebe nwa ha nọ, e meekwa mgbalị ịdọ nwa ha aka ná ntị, ha emewe mkpesa.” Ugboro ugboro, mgbe a dọrọ nwa ha aka ná ntị n’ụlọ akwụkwọ, ndị nne na nna na-aga n’ebe ahụ, ọ bụghị nanị iji yie ndị nkụzi egwu kama iji wakpo ha.
E hotara na ọnụ na-ekwuchitere Òtù Ndị Isi Ndị Nkụzi dị na Britain kwuru, sị: “Ọha mmadụ na-ekwu sị, ‘E nwere ihe ndị ruuru m,’ kama ịsị ‘E nwere ibu ọrụ ndị dịịrị m.’” Tụkwasị na ha adịghị akụnye n’ime ụmụ ha àgwà dị mma nke ịkwanyere ịbụisi ùgwù, ndị nne na nna ụfọdụ adịghị agbazi ụmụ ha—ha adịghịkwa ekwe ka ndị ọzọ mee otú ahụ. A na-ahapụ ụmụaka ndị na-azọrọ na ha nwere “ihe ndị ruuru” ha ka ha na-eleda ịbụisi nke ma ndị nne na nna ma ndị nkụzi, anya, a pụkwara ịkọta ihe ga-esi na ya pụta—“ọgbọ ọhụrụ nke na-adịghị akwanyere ịbụisi ùgwù, nke makwaara ihe dị nta banyere ezi ihe na ihe ọjọọ,” ka Margarette Driscoll, bụ́ onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ, dere.
Magazin bụ́ Time, n’isiokwu ya bụ́ “Ọ́gbọ̀ Furu Efu” mere ka ndakpọ olileanya nke ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Russia na-enwe pụta ìhè site n’ihota otu onye a ma ama na-agụ egwú rap bụ́ onye kwuru, sị: “Olee otú onye a mụrụ n’ụwa a, bụ́ ebe ọ na-adịghị ihe na-adịte aka, ebe ọ na-adịghịkwa ihe ziri ezi, pụrụ isi nwee obi ike n’ebe ọha mmadụ nọ?” Ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Mikhail Topalov, kwadoro echiche a: “Ụmụaka a adịghị iberibe. Ha ahụwo ebe ndị ọchịchị ghaara nne na nna ha ụgha, ha ahụwo ka ego ndị nne na nna ha chekwara na ọrụ ha funahụrụ ha. Ànyị pụrụ ịtụ anya ka ha kwanyere ịbụisi ùgwù?”
Otú ọ dị, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ikwubi na ọ bụ nanị ndị na-eto eto ka e ji àgwà nke enweghị ntụkwasị obi n’ebe ịbụisi dị, mara. Taa, ndị mmadụ nọ n’afọ ndụ nile na-ele ụdị ịbụisi ọ bụla anya n’ụzọ enweghị ntụkwasị obi, ọbụna n’ụzọ nlelị. Nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị ịbụisi ọ bụla a pụrụ ịtụkwasị obi? Ọ bụrụ na e jiri ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ịbụisi, bụ́ nke a kọwara dị ka “ikike ịchịkwa ndị ọzọ, ikpe ha ikpe, ma ọ bụ ịmachi ha ime ihe,” pụrụ ịbụ ikike na-eweta ihe ọma. Ọ pụrụ ịbara ma ụmụ mmadụ n’otu n’otu ma ndị obodo uru. Isiokwu na-esonụ ga-atụle otú nke a si dị otú ahụ.