Gịnị Mere Ha Enweghị Ụmụ?
Gịnị Mere Ha Enweghị Ụmụ?
DELE na Fola, * ndị bụ́ di na nwunye, bibu ma na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society nke dị na Nigeria. N’oge na-adịghị anya ha malitesịrị ije ozi n’ebe ahụ, nne Fola bịara leta ha. O si n’ebe dị anya bịa iji soro ha kwurịta ihe na-echegbu ya nke ukwuu, bụ́ nke chuworo ya ụra ọtụtụ ugbo.
“Unu na-emere m nnọọ ihe ọma,” ka ọ gwara ha. “Unu na-ezitere m onyinye, unu na-eletakwa m. Ngosipụta ịhụnanya ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa nye m. Ma ha na-enyekwa m nsogbu n’obi n’ihi na mgbe nile, ana m eche onye ga-emere unu ihe ndị dị otú ahụ mgbe unu ga-eme agadi ka m? Unu alụọla ruo afọ abụọ ugbu a, ma unu enwebeghị ụmụ. Ọ̀ bụ unu echeghị na oge eruwo ka unu hapụ Betel ma malite ezinụlọ?”
Nne ahụ chere echiche otú a: Dele na Fola anọzuola na Betel. Oge eruwo ugbu a ka ha chewe banyere ọdịnihu ha. N’ezie, ndị ọzọ pụrụ ịrụ ọrụ ha na-arụ. Ọ dịghị mkpa ka Dele na Fola kwụsị ozi oge nile, ma ha pụrụ ịmalite ụdị ọzọ nke ije ozi, bụ́ nke pụrụ inye ha ohere inwe ụmụ na inwe ọṅụ nke ịbụ nne na nna.
Nchegbu nke Nne Ahụ
Nchegbu nke nne ahụ kwere nghọta. Ọchịchọ ịmụ ụmụ bụ ihe gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na ihe a na-ahụ n’ọdịbendị nile nakwa n’ọgbọ nile. Ịmụ nwa na-akpalị mmetụta miri emi nke ọṅụ na olileanya. “Ụgwọ ọrụ Ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ,” ka Bible na-ekwu. Ee, ikike ịmụ ụmụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa nke sitere n’aka Onye Okike anyị na-ahụ n’anya.—Abụ Ọma 127:3.
N’ọtụtụ ógbè, ndị mmadụ na-arụgide ndị di na nwunye n’ụzọ dị ukwuu ka ha mụọ ụmụ. Dị ka ihe atụ, na Nigeria, bụ́ ebe nwanyị na-amụkarị ụmụ isii, ọ bụ ihe na-emekarị n’agbamakwụkwọ bụ́ ịnụ ka ndị na-echere ndị ahụ lụrụ di na nwunye ọhụrụ echiche ọma na-agwa ha, sị: “Ọnwa itoolu site n’ugbu a, anyị na-atụ anya ịnụ ákwá nwatakịrị n’ụlọ unu.” Ndị ahụ lụrụ di na nwunye ọhụrụ pụrụ inweta ihe ndina ụmụaka dị ka onyinye agbamakwụkwọ. Ndị nne ha na-anọgide na-agụ ọnwa. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ a lụrụ ọhụrụ amụghị nwa n’ime otu afọ ma ọ bụ ihe yiri ya, ha na-enyonyewa anya iji hụ ma e nwere nsogbu ọ bụla ha pụrụ inye aka dozie.
Nye ọtụtụ ndị nne, ihe mere nwoke na nwanyị ji alụ bụ iji mụta ụmụ na iji buru usoro ọmụmụ ezinụlọ gaa n’ihu. Nne Fola gwara ya, sị: “N’ihi gịnị ka i ji lụọ di ma ọ bụrụ na ị gajeghị ịmụ ụmụ? Ọ bụ mmadụ mụrụ gị; i kwesịrị ịmụ ụmụ nke gị.”
E wezụga nke ahụ, e nwere ihe ndị bara uru a ga-atụle. N’ọtụtụ mba ndị dị n’Africa, ọ bụ ndokwa ole na ole ka gọọmenti na-eme iji lekọta ndị agadi. Dị ka omenala si dị, ọ bụ ụmụaka na-elekọta nne na nna ha mere agadi, dị nnọọ ka nne na nna ahụ lekọtara ha mgbe ha bụ ụmụaka. Ya mere, nne Fola chere echiche na ọ gwụla ma ụmụ ya hà nwere ụmụ nke aka ha, ha ga-etinye onwe ha, mgbe ha mere agadi, n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị owu na-ama, ndị a jụrụ ajụ, na ndị na-enweghị ndị inyeaka, ndị na-enweghị ndị ga-eli ha mgbe ha nwụrụ.
Gbaa gburugburu ihe ka ukwuu n’Africa, a na-ewere enweghị ụmụ dị ka ọbụbụ ọnụ. N’ógbè ụfọdụ, a na-atụ anya ọbụna ka ndị inyom gosipụta na ha nwere ikike ịmụ nwa tupu
ha alụọ di. Ọtụtụ ndị inyom bụ́ ndị na-apụghị ịtụrụ ime na-eji anya ọkụ achọ ọgwụ na ọgwụgwọ iji gbalịa ịgbanwe ọnọdụ àgà ha.N’ihi omume ndị a, a na-ewere ya na di na nwunye bụ́ ndị kpachapụrụ anya jụ ịmụ ụmụ na-anapụ onwe ha ezigbo ihe. A na-elekarị ha anya dị ka ndị gbapụrụ iche, ndị na-adịghị elepụ anya n’ihu, na ndị e kwesịrị imere ebere.
Ọṅụ na Ibu Ọrụ
Ndị Jehova na-aghọta na ọ bụ ezie na ọṅụ dị n’ịzụ ụmụ, ibu ọrụ dịkwa na ya. Bible na-ekwu na 1 Timoti 5:8, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnahụwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.”
Ndị nne na nna aghaghị igbo mkpa ezinụlọ ha ma n’ụzọ ihe onwunwe ma n’ụzọ ime mmụọ, nke a na-ewekwa oge na mgbalị dị ukwuu. Ha adịghị enwe àgwà bụ́ na ebe ọ bụ Chineke na-enye ụmụ, ọ bụ Chineke ka ọ dị n’aka ilekọta ha. Ha na-aghọta na ịzụlite ụmụ dị ka ụkpụrụ Bible si dị bụ ibu ọrụ na-adịgide adịgide bụ́ nke Chineke nyere ndị nne na nna; ọ bụghị nke e kwesịrị inyefe ndị ọzọ n’aka.—Deuterọnọmi 6:6, 7.
Ọrụ ịzụ ụmụ bụ ihe tara akpụ karịsịa na “mgbe ikpeazụ” nke “oge [a] dị oké egwu.” (2 Timoti 3:1-5) E wezụga ọnọdụ akụ̀ na ụba na-akawanye njọ, ịba ụba nke omume asọpụrụghị Chineke nke ọha mmadụ na-atụnye ụtụ n’ihe ịma aka nke ịzụ ụmụ taa. N’agbanyeghị nke ahụ, gbaa ụwa gburugburu, ọnụ ọgụgụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nke ndị Kraịst lụrụ di na nwunye amalitewo ọrụ a, ha na-enwekwa ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụaka na-asọpụrụ Chineke “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Jehova hụrụ ndị nne na nna a n’anya ma na-agọzi ha maka nrụsi ọrụ ike ha.
Ihe Mere Ụfọdụ Ji Anọgide n’Enweghị Nwa
N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị Kraịst lụrụ di na nwunye enweghị ụmụ. Ụfọdụ apụghị ịmụ nwa ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha ekuchighị ụmụ. Di na nwunye ndị ọzọ bụ́ ndị nwere ike ịmụ nwa kpebiri ịghara ime otú ahụ. Ndị di na nwunye dị otú ahụ anọgideghị n’amụghị nwa n’ihi na ha na-agbara ibu ọrụ ọsọ ma ọ bụ na-atụ ụjọ izute ihe ịma aka nke ịbụ nne na nna. Kama nke ahụ, ha ekpebisiwo ike itinyezu uche n’akụkụ dị iche iche nke ozi oge nile bụ́ ndị ịzụ ụmụ na-agaghị enye ha ohere ikere òkè na ha. Ụfọdụ na-eje ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ. Ndị ọzọ na-ejere Jehova ozi n’ọrụ njegharị ma ọ bụ na Betel.
Dị ka ndị Kraịst nile, ha na-aghọta na e nwere ọrụ chọrọ ka a rụọ ya ngwa ngwa. Jisọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” A na-arụ ọrụ a taa. Ọ bụ ọrụ dị mkpa, ebe ọ bụ na “ọgwụgwụ ihe nile” ga-apụta mbibi nye ndị na-aṅaghị ntị n’ozi ọma ahụ.—Matiu 24:14; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8.
Oge anyị yiri oge ahụ Noa na ezinụlọ ya wuru akatamkpo ụgbọ ahụ chebere ha gafere oké Iju Mmiri ahụ. (Jenesis 6:13–16; Matiu 24:37) Ọ bụ ezie na ụmụ atọ Noa lụchara nwanyị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha mụrụ ụmụ ruo mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. Otu ihe kpatara ya pụrụ ịbụwo na ndị di na nwunye a chọrọ itinyezu uche ha na ume ọrụ ha n’ọrụ ahụ ha ji n’aka. Ihe ọzọ kpatara ya pụrụ ịbụwo na ha achọghị ịmụ ụmụ n’ime ụwa nke rụrụ arụ ma na-eme ihe ike bụ́ ebe “ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne . . . nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.”—Jenesis 6:5.
Ọ bụ ezie na nke a apụtaghị na ọ dị njọ inwe ụmụ taa, ọtụtụ ndị Kraịst lụrụ di na nwunye na-ajụ inwe ụmụ iji kerezuo òkè n’ọrụ ahụ chọrọ ka a rụọ ya ngwa ngwa bụ́ nke Jehova nyeworo ndị ya ịrụ. Ụfọdụ ndị lụrụ di na nwunye echerewo ruo oge ụfọdụ tupu ha amalite ịmụ ụmụ; ndị ọzọ ekpebiwo ịnọgide n’amụghị nwa ma na-atụle ma ọ̀ ga-ekwe ha omume ịmụ ụmụ n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Jehova. Nke a ọ̀ bụ elepụghị anya n’ihu? Ohere ọma ọ̀ na-efunahụ ha ná ndụ? Hà bụ ndị e kwesịrị imere ebere?
Ndụ Dị Nchebe Ma Na-enye Ọṅụ
Dele na Fola, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha ná mmalite, abụwo di na nwunye ruo ihe karịrị afọ iri ugbu a, ha ka kpebisikwara ike ịnọgide
n’amụghị nwa. “Ndị ikwu anyị ka na-arụgide anyị ịmụ ụmụ,” ka Dele na-ekwu. “Nchegbu ha bụ́ isi bụ ka anyị nwee nchebe n’ọdịnihu. Anyị na-egosipụta ekele mgbe nile maka nchegbu ha, ma anyị na-eji ụzọ akọ akọwara ha na obi dị anyị ụtọ nke ukwuu n’ihe anyị na-eme. Banyere ịnọ ná nchebe, anyị na-eme ka ọ pụta ìhè na ntụkwasị obi anyị bụ n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye na-echebara ọdịmma nke ndị nile nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-eguzosi ike n’ihe nye ya, echiche. Anyị na-akọwakwara ha na inwe ụmụ adịghị eme ka ndị nne na nna jide n’aka na ụmụ ha ga-elekọta ha mgbe ha mere agadi. Ụfọdụ ndị adịghị echebachara nne na nna ha echiche, ndị ọzọ adịghị enwe ike inye aka, ebe ndị ọzọ na-ebukwa ndị mụrụ ha ụzọ anwụ. N’aka nke ọzọ, ọdịnihu anyị bụ ihe e ji n’aka n’ebe Jehova nọ.”Dele na ndị ọzọ dị ka ya na-eji obi ike atụkwasị obi ná nkwa Jehova kwere ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi, sị: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) Ha na-ekwerekwa na “aka Jehova adịghị mkpụmkpụ karị ịzọpụta; ntị Ya adịghịkwa arọ karị ịnụ ihe.”—Aịsaịa 59:1.
Ịhụ otú Jehova si akwagide ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi bụ ihe ọzọ mere a ga-eji enwe obi ike. Eze Devid dere, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya.” Cheedị echiche banyere nke ahụ. Ọ̀ dị onye ọ bụla na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ị maara “a hapụrụ”?—Abụ Ọma 37:25.
Kama ịdị na-eleghachi anya azụ n’ịkwa ụta, ndị jiworo ndụ ha jeere Jehova na ndị Kraịst ibe ha ozi na-enwe afọ ojuju mgbe ha na-atụgharị uche na ya. Nwanna Iro Umah anọwo n’ozi oge nile ruo afọ 45, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na Nigeria. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na mụ na nwunye m amụghị nwa, anyị na-eburu n’uche na Jehova anọwo na-elekọta anyị mgbe nile ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ ihe onwunwe. Ọ dịbeghị ihe kọrọ anyị. Ọ gaghị agbahapụ anyị ka anyị na-eme agadi. Afọ ndị a anyị nọworo n’ozi oge nile abụwo ndị anyị kasị nwee obi ụtọ na ha ná ndụ. Obi dị anyị ụtọ na anyị pụrụ ijere ụmụnna anyị ozi, ụmụnna anyị na-enwekwa ekele maka ozi anyị na-eje, ha na-enyekwara anyị aka.”
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị lụrụ di na nwunye amụtaghị ụmụ nkịtị, ha amụtawo ụdị ụmụ dị iche: ndị Kraịst na-eso ụzọ bụ́ ndị na-efe Jehova. Jọn onyeozi gbara ihe dị ka 100 afọ mgbe o dere, sị: “Enweghị m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, bụ́ ịnụ ka ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Ikwesị ntụkwasị obi nke “ụmụ” Jọn—bụ́ ndị o mere ka ha mara ‘eziokwu ahụ’—wetaara ya ọṅụ dị ukwuu.
Ọṅụ dị otú ahụ hikwara nne taa. Bernice, bụ́ onye Nigeria, alụwo di ruo afọ 19 ma họrọ ịnọgide n’amụghị nwa. Ruo afọ 14 gara aga, o jewo ozi dị ka ọsụ ụzọ. Ka ọ na-eru afọ ndụ ọ na-agaghịzi ekwe ya omume ịmụ ụmụ nke aka ya, ọ dịghị akwa ụta banyere itinye ndụ ya n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Ọ na-ekwu, sị: “Ana m enwe obi ụtọ ịhụ ụmụ ime mmụọ m ka ha na-etolite. Ọ bụrụgodị na m nwere ụmụ nke aka m, amaghị m ma mmekọrịta mụ na ha ọ̀ gaara echi anya karịa nke mụ na ndị m nyewooro aka ịmụta eziokwu ahụ. Ha na-emeso m ihe dị ka a ga-asị na m bụ nne mụrụ ha, ha na-akọrọ m ọṅụ na nsogbu ndị ha na-enwe ma na-agwa m ka m nye ha ndụmọdụ. Ha na-edetara m akwụkwọ ozi, anyị na-eletakwa onwe anyị.
“Ụfọdụ na-ele mmadụ enweghị ụmụ nke aka ya anya dị ka ọbụbụ ọnụ. Ha na-asị na ị ga-ahụsi anya mgbe i mere agadi. Ma ọ bụghị otú ahụ ka m si ahụ ya. Amaara m na ọ bụrụhaala na m ejiri mkpụrụ obi m nile na-ejere Jehova ozi, ọ ga-akwụghachi m ụgwọ ma lekọta m. Ọ gaghị atụfu m ma ọlị mgbe m mere agadi.”
Ndị Chineke Hụrụ n’Anya Ma Jiri Ha Kpọrọ Ihe
Ndị mụrụ ma zụlite ụmụ ndị “na-ejegharị n’eziokwu ahụ” nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji na-enwe ekele. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji na-asị: “Nna nke onye ezi omume ga-etegharị egwú ọṅụ nke ukwuu: onye na-amụkwa onye maara ihe ga-aṅụrị ọṅụ na ya. Ka nna gị na nne gị ṅụrịa, ka nwanyị mụworo gị tegharịakwa egwú ọṅụ”!—Ilu 23:24, 25.
Ndị Kraịst ahụ na-enwebeghị ọṅụ nke ịmụbata ụmụ n’ime ụwa abụrụwo ndị a gọziri n’ụzọ
ndị ọzọ. Ọtụtụ n’ime ndị di na nwunye a ekerewo òkè dị mkpa n’ime ka ọdịmma Alaeze ahụ gaa n’ihu n’ụzọ dị ukwuu. N’afọ ndị gafeworonụ, ha enwetawo ahụmahụ, amamihe, na nkà ndị na-eme ka ha nwee ike ikere òkè bara uru n’ọrụ Alaeze ahụ. Ọtụtụ na-ebute ụzọ n’ọrụ ahụ.Ọ bụ ezie na ha anọgidewo n’amụghị nwa n’ihi ọdịmma Alaeze ahụ, Jehova ejiriwo ezinụlọ ime mmụọ na-ahụ n’anya bụ́ nke na-enwe ekele miri emi maka àjà ndị ha chụworo, gọzie ha. Ọ bụ nnọọ dị ka Jisọs kwuru: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ [n’ụzọ nkịtị, “gbahapụrụ”] ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi ozi ọma nke m, ma ọ́ bụghị na ọ ga-anata [okpukpu otu narị] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne, na ụmụ, na ubi, . . . ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.”—Mak 10:29, 30.
Lee ka ndị nile na-ekwesị ntụkwasị obi si dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova! Pọl onyeozi na-emesi ndị nile dị otú ahụ na-eguzosi ike n’ihe, obi ike, ma ndị nwere ụmụ ma ndị na-enweghị, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị, ebe unu jeere ndị nsọ ozi, na-ejekwara ha ozi.”—Ndị Hibru 6:10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 A gbanwewo aha.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
E jiriwo ezinụlọ ime mmụọ na-ahụ n’anya gọzie ndị di na nwunye na-amụghị nwa