Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Jehova Ka Ndị Hụrụ Ya n’Anya Bụ

Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Jehova Ka Ndị Hụrụ Ya n’Anya Bụ

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Jehova Ka Ndị Hụrụ Ya n’Anya Bụ

LEBANỌN abụwo ebe a ma ama eri oge Bible n’ihi ihe ndị sitere n’okike dị na ya. (Abụ Ọma 72:16; Aịsaịa 60:13) Ihe dị oké ọnụ karịsịa bụ nnukwute osisi cedar ya, bụ́ nke a chọsiri ike dị ka ihe e ji ewu ihe owuwu n’ihi ịma mma, ísìsì ọma, na ịnọte aka ya. Na narị afọ mbụ, e nwetara ihe ka oké ọnụ ahịa na Lebanọn. Oziọma Mak na-akọ na site na Taịa na Saịdọn, n’ókèala ochie nke Lebanọn, ‘oké ọtụtụ mmadụ bịakwutere Jisọs, mgbe ha nụrụ ihe nile ọ na-eme, ka ha hà.’—Mak 3:8.

N’otu aka ahụ taa, Lebanọn nọgidere na-amị mkpụrụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. Ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosipụta nke a.

• A gwara otu Onyeàmà na-eto eto aha ya bụ Wissam ka ọ gwa ụmụ klas ya n’ụlọ akwụkwọ okwu ruo minit 30. Wissam kpebiri na ọ ga-abụ ohere dị mma iji gbaa àmà. Ya mere, o ji akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? mee ihe ma kwadebe okwu dabeere n’isiokwu banyere okike. Otú ọ dị, mgbe onye nkụzi Wissam hụrụ okwu ahụ ọ kwadebere, o kwuru na ebe ọ bụ isiokwu dị nnọọ mkpa, na Wissam pụrụ ikwuru okwu ya minit 45.

Mgbe Wissam malitere okwu ya, onye nkụzi ya kwụsịrị ya ma zie ka a kpọọ onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ. N’oge na-adịghị anya, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ bịarutere, Wissam maliteghachikwara n’isi. Ka onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ gere ntị n’ajụjụ ndị Wissam jụrụ ná mmalite nke okwu ya, a kpaliri mmasị ya, o wee kwuo na ụmụ akwụkwọ nile kwesịrị inweta mbipụtaghachi nke okwu ahụ.

N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, onye nkụzi ọzọ, bụ́ onye na-agafenụ hụrụ na e nwere oké mkpali n’ọnụ ụlọ klas ahụ, o wee jụọ ihe na-emenụ. Mgbe a gwara ya, ọ jụrụ ma Wissam ọ̀ na-agbalị ịnwapụta ịbụ eziokwu nke okike ka ọ̀ bụ evolushọn. “Okike,” ka a zara ya. Mgbe ọ matara na Wissam bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, onye nkụzi ahụ gwara ndị klas ahụ, sị: “Unu ga-ahụ site n’okwu ya na sayensị na-akwado okike, ọ bụghị evolushọn.”

O mesịrị bụrụ na onye nkụzi a nwere akwụkwọ Creation ahụ, ọ nọwokwarị na-eji ya akụzi ihe na mahadum! Tupu ọ pụọ, ọ jụrụ ma ya pụrụ ịkpọrọ ụmụ akwụkwọ ya lọghachi n’echi ya ka Wissam nwee ike ịgwa ha okwu. Ihe si na nke ahụ pụta bụ ezi àmà ọzọ a gbaara Jehova.

• Akpịrị mmiri nke eziokwu ahụ nọ na-akpọ Nina bụ́ onye dị afọ 22 nkụ. Otu ụbọchị, nwa nwanne nna ya nke nwanyị nyere ya Bible ma kpọrọ ya gaa Chọọchị Pentikọstal. Nina ji obi ụtọ gụọ Bible ahụ ma mụta site n’ihe ọ gụrụ na ndị Kraịst kwesịrị ime nkwusa, ya mere ọ malitere ịgwa ndị enyi ya okwu. Onye ọ bụla ọ gwara okwu jụrụ ya, sị: “Ị̀ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?” Nke ahụ juru ya anya.

Afọ isii mgbe nke ahụ gasịrị, Ndịàmà Jehova gara n’ebe obibi Nina ma gwa ya banyere Alaeze Chineke. Na mbụ, ọ nwara ịchọpụta ebe ozizi ha na-ezighị ezi. Otú ọ dị, ọ chọpụtara na azịza ha nile bụ ndị ezi uche dị na ha, bụrụkwa ndị dabeere na Bible.

Ihe Nina mesịrị mụta—aha Chineke, bụ́ Jehova; ngọzi nke Alaeze ahụ; na ihe ndị ọzọ—mere ka o kwenyesie ike na ya achọtawo eziokwu ahụ. Ọ raara ndụ ya nye Chineke, e meekwa ya baptism. N’ime afọ asaa gafeworonụ, Nina ejewo ozi dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile. N’ezie, Jehova na-agọzi ndị nwere ezi ịhụnanya n’ebe ọ nọ.—1 Ndị Kọrint 2:9.