Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“N’ebe Ndị Maara Ebe Ike Ha Ruru Nọ Ka Amamihe Dị”

“N’ebe Ndị Maara Ebe Ike Ha Ruru Nọ Ka Amamihe Dị”

“N’ebe Ndị Maara Ebe Ike Ha Ruru Nọ Ka Amamihe Dị”

“Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị . . . [ịma ebe ike gị ruru n’iso] Chineke gị na-eje ije?”—MAỊKA 6:8.

1, 2. Gịnị bụ mmadụ ịma ebe ike ya ruru, oleekwa otú o si dị iche n’ịdị nganga?

OTU onyeozi a ma ama ajụ ịdọrọ uche gaa n’ebe ya onwe ya nọ. Otu onyeikpe Israel nwere obi ike akpọọ onwe ya onye pekasịrị mpe n’ụlọ nna ya. Nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ ekweta na ya enweghị ikike a na-akparaghị ókè. Nke ọ bụla n’ime ndị ikom a gosipụtara na ọ maara ebe ike ya ruru.

2 Mmadụ ịma ebe ike ya ruru dị iche na nganga. Onye maara ebe ike ya ruru adịghị ele ikike ya na uru ọ bara anya n’ụzọ gabigara ókè, ọ dịghịkwa adị mpako ma ọ bụ okomoko. Kama ịdị mpako, itu ọnụ, ma ọ bụ inwe oké ọchịchọ, onye maara ebe ike ya ruru na-ama ihe ndị a kpaara ya ókè na ha mgbe nile. N’ihi ya, ọ na-akwanyere mmetụta na echiche nke ndị ọzọ ùgwù ma na-echebara ha echiche n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

3. N’ụzọ dị aṅaa ka amamihe si dịrị “n’ebe ndị maara ebe ike ha ruru nọ”?

3 E nwere ezi ihe mere Bible ji na-asị: “N’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.” (Ilu 11:2) Onye maara ebe ike ya ruru na-enwe amamihe n’ihi na ọ na-agbaso ụzọ Chineke kwadoro, ọ na-ezerekwa mmụọ nganga bụ́ nke na-akpata nlelị. (Ilu 8:13; 1 Pita 5:5) Ụzọ ọtụtụ ndị ohu Chineke si bie ndụ na-akwado na mmadụ ịma ebe ike ya ruru bụ ihe amamihe dị na ya. Ka anyị tụlee ihe atụ atọ ahụ e zoro aka na ha na paragraf nke mbụ.

Pọl—‘Onye Na-eje Ozi’ na ‘Onye Nlekọta Ụlọ’

4. Ihe ùgwù ndị dị aṅaa pụrụ iche ka Pọl nwere?

4 Pọl bụ onye a ma ama n’etiti ndị Kraịst oge mbụ, o dokwara anya ihe mere o ji dị otú ahụ. N’oge ọ na-eje ozi ya, o ji ụgbọ mmiri na ụkwụ mee njem ruru ọtụtụ puku kilomita, o guzobekwara ọtụtụ ọgbakọ. Tụkwasị na nke ahụ, Jehova ji ọhụụ dị iche iche na onyinye nke ịsụ asụsụ ndị mba ọzọ gọzie Pọl. (1 Ndị Kọrint 14:18; 2 Ndị Kọrint 12:1-5) O nyekwara Pọl ike mmụọ nsọ ide akwụkwọ ozi 14 ndị sozi n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ụzọ doro anya, a pụrụ ikwu na ọrụ Pọl rụrụ karịrị nke ndị ozi ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrint 15:10.

5. Olee otú Pọl si gosi na ọ na-ele onwe ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

5 Ebe ọ bụ na Pọl nọ n’isi nke ọrụ ndị Kraịst, ụfọdụ pụrụ ịtụ anya ịhụ ya ka onwe ya juru ya afọ n’ihi ịbụ onye a ma ama, ọbụna na-eme ka a hụ na o nwere ikike. Otú ọ dị, ọ dịghị otú ahụ n’ihi na Pọl maara ebe ike ya ruru. Ọ kpọrọ onwe ya “[onye] dịkarịsịrị nta n’etiti ndị ozi,” na-agbakwụnye, sị: “[Erughị m] ka a kpọọ m onyeozi, n’ihi na esogburu m nzukọ Chineke.” (1 Ndị Kọrint 15:9) Dị ka onye kpagbuburu ndị Kraịst, ọ dịghị mgbe Pọl chefuru na ọ bụ nanị site n’obiọma na-erughịrị mmadụ ka o ji nwee ike isotụdị Chineke nwee mmekọrịta, ma ya fọdụzie inwe ihe ùgwù ije ozi ndị pụrụ iche. (Jọn 6:44; Ndị Efesọs 2:8) N’ihi ya, Pọl echeghị na ihe ndị pụrụ iche ọ rụzuru n’ozi ya mere ka ọ ka ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrint 9:16.

6. Olee otú Pọl si gosi na ọ maara ebe ike ya ruru n’ụzọ o si mesoo ndị Kọrint ihe?

6 Ọmụma Pọl maara ebe ike ya ruru pụtara ìhè karịsịa n’ụzọ o si mesoo ndị Kọrint ihe. Ihe àmà na-egosi na ụfọdụ n’ime ha nwere oké mmasị n’ebe ndị ha chere na ha bụ ndị nlekọta a ma ama nọ, gụnyere Apọlọs, Kifas, na Pọl n’onwe ya. (1 Ndị Kọrint 1:11-15) Ma Pọl anwaghị ime ka ndị Kọrint jaa ya mma, o jighịkwa ùgwù ha na-akwanyere ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Mgbe ọ na-eleta ha, o jighị ‘ọkà okwu ma ọ bụ ọkà amamihe’ gosipụta onwe ya. Kama nke ahụ, Pọl kwuru banyere onwe ya na ndị ibe ya, sị: “Ka mmadụ na-agụ anyị otú a, dị ka ndị na-ejere Kraịst ozi, ndị bụ́kwa ndị [nlekọta ụlọ, NW] n’ihe omimi nke Chineke.” *1 Ndị Kọrint 2:1-5; 4:1.

7. Olee otú Pọl si gosipụta na ọ maara ebe ike ya ruru ọbụna mgbe ọ na-enye ndụmọdụ?

7 Ọbụna Pọl gosipụtara na ọ maara ebe ike ya ruru mgbe ọ na-aghaghị inye ndụmọdụ na ntụziaka siri ike. O ji “obi ebere nile nke Chineke” nakwa “n’ihi ịhụnanya ahụ” rịọ ndị Kraịst ibe ya arịrịọ kama igosipụta ịdị ukwuu nke ikike ya dị ka onyeozi. (Ndị Rom 12:1, 2; Faịlimọn 8, 9) N’ihi gịnị ka Pọl ji mee nke a? Ọ bụ n’ihi na o lere onwe ya anya n’ezie dị ka ‘onye so ụmụnna ya na-arụkọ ọrụ,’ ọ bụghị dị ka ‘onye nwe okwukwe ha.’ (2 Ndị Kọrint 1:24) Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ ọmụma Pọl maara ebe ike ya ruru nyere aka mee ka ọgbakọ ndị Kraịst narị afọ mbụ hụ ya n’anya karịsịa.—Ọrụ 20:36-38.

Ile Ihe Ùgwù Anyị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

8, 9. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ile onwe anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị? (b) Olee otú ndị nwere ibu ọrụ ụfọdụ pụrụ isi gosipụta na ha maara ebe ike ha ruru?

8 Pọl setịpụụrụ ndị Kraịst taa ezi ihe nlereanya. N’agbanyeghị ihe ùgwù ndị e nyefeworo anyị, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iche na ọ karịrị ndị ọzọ. “A sị na mmadụ na-eche na ya bụ ihe, mgbe ọ na-abụghị ihe ọ bụla,” ka Pọl dere, “ọ na-aghọ onwe ya aghụghọ n’obi.” (Ndị Galetia 6:3) N’ihi gịnị? N’ihi na “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23; 5:12, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, anyị ekwesịghị ichefu ma ọlị na anyị nile eketawo mmehie na ọnwụ n’aka Adam. Ihe ùgwù ndị pụrụ iche adịghị ebuli anyị gabiga ọnọdụ mmehie anyị na-eweda n’ala. (Eklisiastis 9:2) Dị ka ọ dị n’ebe Pọl nọ, ọ bụ nanị site n’obiọma na-erughịrị mmadụ ka ụmụ mmadụ pụrụ isotụdị Chineke na-enwe mmekọrịta, ma ya fọdụkwa ijere ya ozi n’ọnọdụ ihe ùgwù ụfọdụ.—Ndị Rom 3:12, 24.

9 N’ịmara nke a, onye maara ebe ike ya ruru adịghị abụ onye onwe ya juru afọ n’ihi ihe ùgwù ndị o nwere, ọ dịghịkwa eji ihe ndị ọ rụzuru etu ọnụ. (1 Ndị Kọrint 4:7) Mgbe ọ na-enye mmadụ ndụmọdụ ma ọ bụ ntụziaka, ọ na-enye ya dị ka onye ya na ya na-arụkọ ọrụ—ọ bụghị dị ka onye nwe ya. N’ezie, ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya bụ́ onye kasị eme nke ọma n’ọrụ ụfọdụ ịnwa ime ka ndị kwere ekwe ibe ya jaa ya mma ma ọ bụ jiri ùgwù ha na-akwanyere ya na-eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. (Ilu 25:27; Matiu 6:2-4) Okwu ịja mma nke nanị ya bara uru na-esi n’aka ndị ọzọ abịa—o kwesịghịkwa ịbụ nke onye ahụ ji aka ya mee ka a jaa ya. Ọ bụrụ na a jaa anyị mma, anyị ekwesịghị ikwe ka o mee ka anyị na-eche banyere onwe anyị karịa otú o kwesịrị.—Ilu 27:2; Ndị Rom 12:3.

10. Kọwaa otú ụfọdụ bụ́ ndị pụrụ iyi ka ha dị ala pụrụ isi bụrụ “ọgaranya n’okwukwe” n’ezie.

10 Mgbe e nyere anyị ibu ọrụ ụfọdụ, ịma ebe ike anyị ruru ga-enyere anyị aka izere ịdị na-adọrọ uche gaa n’ebe anyị onwe anyị nọ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na-enye echiche na ọ bụ nanị n’ihi mgbalị na ikike anyị ka ọgbakọ ji na-aga nke ọma. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ inwe onyinye nke izi ihe nke ọma karịa ndị ọzọ. (Ndị Efesọs 4:11, 12) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị maara ebe ike anyị ruru, anyị aghaghị ịghọta na ụfọdụ n’ime ihe ndị kasị ukwuu a na-amụta ná nzukọ ọgbakọ abụghị n’ikpo okwu ka a na-ekwu ha. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ na ọ dịghị abụrụ gị ihe agbamume mgbe ị hụrụ ndị nne ma ọ bụ ndị nna na-azụ ụmụ nanị ha bụ́ ndị na-akpọrọ ụmụ ha abịa Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe nile? Ma ọ bụ ndị dara mbà n’obi bụ́ ndị na-eji ikwesị ntụkwasị obi abịa nzukọ n’agbanyeghị mmetụta ha na-enwe mgbe nile na ha abaghị n’ihe? Ma ọ bụ ndị ntorobịa bụ́ ndị na-anọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ n’agbanyeghị mmetụta ọjọọ ndị ha na-enweta n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe ndị ọzọ? (Abụ Ọma 84:10) E nwere ike mmadụ ndị a abụghị ndị a ma ama. Ndị ọzọ adịghị ahụ ihe ka ukwuu n’ule iguzosi ike n’ezi ihe ndị ha na-eche ihu. Ma, ha pụrụ ịbụ “ọgaranya n’okwukwe” dị ka ndị ahụ a ma ama karị. (Jemes 2:5) E kwuwerị, n’ikpeazụ, ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi ka e ji enweta ihu ọma Jehova.—Matiu 10:22; 1 Ndị Kọrint 4:2.

Gideọn—“Onye Pekasịrị Mpe” n’Ụlọ Nna Ya

11. N’ụzọ dị aṅaa ka Gideọn si gosipụta na ọ maara ebe ike ya ruru mgbe ya na mmụọ ozi Chineke na-ekwurịta okwu?

11 Gideọn, bụ́ nwa okorobịa siri ike nke si n’ebo Manase, biri ndụ n’oge e nwere ọgba aghara n’akụkọ ihe mere eme nke Israel. Ruo afọ asaa, ndị Chineke hụsiri anya n’okpuru mmegide ndị Midian. Otú ọ dị, oge ruziri ka Jehova napụta ndị ya. N’ihi ya, otu mmụọ ozi mere ka Gideọn hụ ya anya ma kwuo, sị: “Jehova nọnyeere gị, gị dike bụ́ dimkpa.” Gideọn maara ebe ike ya ruru, n’ihi ya, o kweghị ka onwe ya ju ya afọ n’ihi otuto dị n’okwu ịja mma a ọ na-atụghị anya ya. Kama nke ahụ, o ji nkwanye ùgwù gwa mmụọ ozi ahụ, sị: “Biko, onyenwe m, ọ bụrụ na Jehova nọnyeere anyị, n’ihi gịnịkwa ka ihe a nile dakwasịworo anyị?” Mmụọ ozi ahụ mere ka ihe doo anya ma gwa Gideọn, sị: “[Ị ga-azọpụta] Israel n’aka Midian.” Olee otú Gideọn si meghachi omume? Kama iji ịnụ ọkụ n’obi nakwere ọrụ ahụ e kenyere ya dị ka ohere o nwere iji mee onwe ya dike n’obodo ya, Gideọn zaghachiri, sị: “Biko, Onyenwe anyị, M ga-eji gịnị zọpụta Israel? lee, [otu puku ndị ikom] nke m bụ nke na-enweghị ike n’ime Manase, mụ onwe m bụkwa onye pekasịrị mpe n’ụlọ nna m.” Lee mmadụ ịma ebe ike ya ruru nke ahụ bụ!—Ndị Ikpe 6:11-15.

12. Olee otú Gideọn si gosi ezi uche n’ịrụ ọrụ e nyere ya?

12 Tupu Jehova ezipụ Gideọn ịlụ agha, ọ nwalere ya? N’ụzọ dị aṅaa? A gwara Gideọn ka ọ kwadaa ebe ịchụàjà nna ya wuuru Beal ma gbutuo Ashera nke dị n’akụkụ ya. Ọrụ a ga-achọ obi ike, ma Gideọn gosipụtara na ọ maara ebe ike ya ruru na ezi uche n’ụzọ o si rụọ ya. Kama ime ka ọha na eze hụ ya, Gideọn rụrụ ya n’abalị mgbe o yikarịrị ka ọ dịghị onye ga-ahụ ya. Ọzọkwa, Gideọn ji akọ kwesịrịnụ rụọ ọrụ ahụ e nyere ya. Ọ kpọọrọ ndị ohu iri—ikekwe ọ bụ ka ụfọdụ wee nwee ike iguzo na-eche nche ka ndị ọzọ na-enyere ya aka ibibi ebe ịchụàjà na Ashera ahụ. * Ka o sina dị, site ná ngọzi Jehova, Gideọn rụzuru ọrụ e nyere ya, ka oge na-agakwa, Chineke ji ya mee ihe n’ịtọhapụ Israel site n’aka ndị Midian.—Ndị Ikpe 6:25-27.

Mmadụ Igosipụta na Ya Maara Ebe Ike Ya Ruru na Inwe Ezi Uche

13, 14. (a) Ànyị pụrụ isi aṅaa gosi na anyị maara ebe ike anyị ruru mgbe a na-enye anyị ihe ùgwù ije ozi? (b) Olee otú Nwanna A. H. Macmillan si setịpụ ezi ihe nlereanya nke mmadụ igosipụta na ọ maara ebe ike ya ruru?

13 Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ọmụma Gideọn maara ebe ike ya ruru. Dị ka ihe atụ, olee otú anyị si emeghachi omume mgbe e nyere anyị ihe ùgwù ije ozi? Ànyị na-ebu ụzọ eche banyere ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ùgwù ga-esi na ya pụta? Ka ànyị na-eweda onwe anyị ala ma jiri ekpere na-atụle ma ànyị pụrụ ịrụzu ihe ọrụ ahụ ga-achọ n’aka anyị? Nwanna A. H. Macmillan, bụ́ onye jesịrị ozi elu ala ya na 1966, setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a. N’otu oge, C. T. Russell, bụ́ onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, jụrụ Nwanna Macmillan onye o chere pụrụ ilekọta ọrụ ahụ mgbe ya na-anọghị ya. Ná mkparịta ụka sochirinụ, ọ dịghị mgbe Nwanna Macmillan tụrụ aro ka ọ bụrụ ya onwe ya, n’agbanyeghị na ọ gaara adịrị ya nnọọ mfe ime otú ahụ. N’ikpeazụ, Nwanna Russell gbara Nwanna Macmillan ume ịtụle ịnakwere ọrụ ahụ. “Eguzo m ebe ahụ n’enweghị ọnụ okwu,” ka Nwanna Macmillan dere ọtụtụ afọ mgbe nke a gasịrị. “Echebasiiri m ya nnọọ echiche ike, ma kpee ekpere banyere ya ruo oge ụfọdụ tupu m gwa ya n’ikpeazụ na obi ga-adị m ụtọ ime ihe ọ bụla m pụrụ ime iji nyere ya aka.”

14 N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Nwanna Russell nwụrụ, na-ahapụ ọnọdụ nke onyeisi oche Watch Tower Society n’enweghị onye nọ ya. Ebe ọ bụ na ọ bụ Nwanna Macmillan na-elekọta ọrụ ahụ n’oge Nwanna Russell mere njem nkwusa ikpeazụ ya, otu nwanna gwara ya, sị: “Mac, i nwere ezigbo ohere ịbanye n’ọnọdụ a n’onwe gị. Ị bụ onye nnọchianya pụrụ iche nke Nwanna Russell mgbe ọ na-anọghị ya, ọ gwakwara anyị nile ka anyị na-eme otú i kwuru. Ọ pụrụ ma ọ lọghachighị ma ọlị. O yiri ka ọ bụ gị ga-eburu ọrụ a gaa n’ihu.” Nwanna Macmillan zaghachiri, sị: “Nwanna, nke ahụ abụghị ụzọ e kwesịrị isi lee okwu a anya. Ihe a bụ ọrụ Onyenwe anyị, ọ bụkwa nanị ọnọdụ Onyenwe anyị lere anya dị ka nke kwesịrị ekwesị inye gị ka ị na-enweta ná nzukọ ya; ejikwa m n’aka na ọ bụghị m ka ọrụ ahụ ruuru.” E mesịa, Nwanna Macmillan tụrụ aro ka e nye onye ọzọ ọnọdụ ahụ. Dị ka Gideọn, o lere onwe ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị—ụzọ ile onwe onye anya anyị ga-eme nke ọma ịgbaso.

15. Olee ụzọ ụfọdụ dị irè anyị pụrụ isi jiri nghọta na-eme ihe mgbe anyị na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma?

15 Anyị onwe anyị kwa kwesịrị igosipụta na anyị maara ebe ike anyị ruru n’ụzọ anyị si arụ ọrụ e kenyere anyị. Gideọn nwere ezi uche, ọ gbalịsikwara ike ịghara ịkpasu ndị na-emegide ya iwe n’ụzọ na-enweghị isi. N’otu aka ahụ, n’ọrụ nkwusa anyị, anyị kwesịrị iji ọmụma anyị maara ebe ike anyị ruru na ezi uche na-eme ihe mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ okwu. N’eziokwu, anyị na-alụ agha ime mmụọ iji kwada “ebe e wusiri ike” na “ihe a na-atụle n’obi.” (2 Ndị Kọrint 10:4, 5) Ma anyị ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ okwu n’ụzọ nlelị ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ga-eme ka ha wewa iwe megide ozi anyị. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịkwanyere echiche ha ùgwù, mesie ihe anyị na ha kwekọrịtara ike, ma lekwasịzie anya n’akụkụ ndị na-enye olileanya nke ozi anyị.—Ọrụ 22:1–3; 1 Ndị Kọrint 9:22; Mkpughe 21:4.

Jisọs—Ihe Nlereanya Kasịnụ nke Mmadụ Ịma Ebe Ike Ya Ruru

16. Olee otú Jisọs si gosi na ọ na-ele onwe ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

16 Ihe nlereanya kasị mma nke mmadụ ịma ebe ike ya ruru bụ nke Jisọs Kraịst. * N’agbanyeghị mmekọrịta chiri anya ya na Nna ya nwere, Jisọs alaghị azụ n’ikweta na ihe ụfọdụ karịrị ike ya. (Jọn 1:14) Dị ka ihe atụ, mgbe nne Jemes na Jọn rịọrọ ka ụmụ ya ndị ikom abụọ nọdụ n’akụkụ Jisọs n’Alaeze ya, Jisọs kwuru, sị: “Ịnọdụ n’aka nri m, na n’aka ekpe m, abụghị nke m inye.” (Matiu 20:20-23) N’oge ọzọ, Jisọs kwetara hoo haa, sị: “Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m . . . etughị m ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ihe Onye zitere m na-achọ.”—Jọn 5:30; 14:28; Ndị Filipaị 2:5, 6.

17. Olee otú Jisọs si gosipụta na ọ na-emeru ihe n’ókè n’ụzọ o si mesoo ndị ọzọ ihe?

17 Jisọs karịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’ụzọ nile, o nwetakwara ikike na-enweghị atụ site n’aka Nna ya, bụ́ Jehova. Otú o sina dị, Jisọs meruru ihe n’ókè ná mmeso o mesoro ụmụazụ ya. O gosipụtaghị na ọ maara ihe site n’izi ha ihe gabiga ókè. O gosipụtara mmetụta na ọmịiko ma chebara mkpa ndị ha nwere dị ka ụmụ mmadụ echiche. (Matiu 15:32; 26:40, 41; Mak 6:31) N’ihi ya, ọ bụ ezie na Jisọs zuru okè, ọ bụghị onye na-achọkarị izu okè. Ọ dịghị mgbe ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya mee ihe ha na-agaghị emeli, ọ dịghịkwa mgbe o bokwasịrị ha ihe ha na-agaghị ebuli. (Jọn 16:12) Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ mmadụ ji hụta ya dị ka onye na-eme ka e nwee izu ike!—Matiu 11:29.

Ṅomie Ihe Nlereanya Jisọs nke Mmadụ Ịma Ebe Ike Ya Ruru

18, 19. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ọmụma Jisọs maara ebe ike ya ruru (a) n’ụzọ anyị si ele onwe anyị anya, nakwa (b) n’ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ ihe?

18 Ọ bụrụ na nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ gosipụtara na ọ maara ebe ike ya ruru, anyị kwesịrị ime otú ahụ karị. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè anaghị adịkarị njikere ikweta na ha enweghị nnọọ ikike n’ụzọ zuru ezu. Otú ọ dị, n’iṅomi Jisọs, ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịma ebe ike ha ruru. Ha adịghị eji nnọọ mpako ala azụ n’iwere ibu ọrụ nye ndị ruru eru inweta ya; ha abụghị ndị na-ebuli onwe ha elu na ndị na-adịghị njikere ịnara ntụziaka n’aka ndị e nyere ikike inye ya. N’ịbụ ndị na-egosipụta mmụọ imekọ ihe ọnụ, ha na-ekwe ka ihe nile n’ọgbakọ na-ewere ọnọdụ “n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.”—1 Ndị Kọrint 14:40.

19 Anyị ịma ebe ike anyị ruru ga-enyekwara anyị aka inwe ezi uche banyere ihe ndị anyị na-atụ anya ya n’aka ndị ọzọ nakwa ichebara mkpa ha echiche. (Ndị Filipaị 4:5, NW) Anyị pụrụ inwe ụfọdụ nkà na ikike ndị ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ enweghị. Ma, ọ bụrụ na anyị maara ebe ike anyị ruru, anyị agaghị na-atụkarị anya ka ndị ọzọ na-eme ihe dị ka ọ ga-amasị anyị ka ha mee. N’ịmara na onye ọ bụla nwere erughị eru nke ya, anyị ga-eji ọmụma anyị maara ebe ike anyị ruru na-enye ohere maka adịghị ike nke ndị ọzọ. Pita dere, sị: “Nke bụ́ isi ihe nile meenụ ka ịhụnanya ahụ unu na-ahụrịta onwe unu dị ike; n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8.

20. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji merie àgwà ọ bụla ga-eduga n’amaghị ebe ike anyị ruru?

20 Dị ka anyị mụtaworo, n’ebe ndị maara ebe ike ha ruru nọ ka amamihe dị n’ezie. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ị chọpụta na i nwere àgwà ndị na-eduga ná mmadụ amaghị ebe ike ya ruru ma ọ bụ nganga? Enwela nkụda mmụọ. Kama nke ahụ, gbasoo ihe nlereanya Devid, bụ́ onye kpere ekpere, sị: “Gbochiekwa ohu Gị ná mmehie nganga; ekwela ka ha na-achị m.” (Abụ Ọma 19:13) Site n’iṅomi okwukwe nke ndị ikom dị ka Pọl, Gideọn, na—karịa onye ọ bụla ọzọ—Jisọs Kraịst, anyị ga-ahụ n’onwe anyị eziokwu dị n’okwu ahụ bụ́: “N’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.”—Ilu 11:2.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘ndị na-eje ozi’ pụrụ izo aka n’ohu nke na-anọ n’oche ka ala soro na-akwọ nnukwu ụgbọ mmiri. N’ụzọ dị iche, a pụrụ inyefe ibu ọrụ ka ukwuu n’aka “ndị nlekọta ụlọ,” ikekwe ilekọta ala na ụlọ. Ka o sina dị, n’anya ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nwe mmadụ, onye nlekọta ụlọ bụ ohu otú ohu nke na-akwọ ụgbọ mmiri bụkwa.

^ par. 12 E kwesịghị iwere ezi uche na ịdị akọ Gideọn dị ka ihe àmà nke ịtụ ụjọ. N’ụzọ dị iche, Ndị Hibru 11:32–38, bụ́ nke gụnyere Gideọn n’etiti ndị ‘e mere ka ha dị ike’ na ndị “dị ike n’agha,” na-akwado na o nwere obi ike.

^ par. 16 A kparaghị ike Jehova ókè. Ya mere, a pụghị izi ezi ikwu na o nwere ebe ike ya ruru. Otú ọ dị, ọ dị umeala n’obi.—Abụ Ọma 18:35.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị bụ mmadụ ịma ebe ike ya ruru?

• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ọmụma Pọl maara ebe ike ya ruru?

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere mmadụ ịma ebe ike ya ruru site n’ihe nlereanya Gideọn?

• Olee otú Jisọs si setịpụ ihe nlereanya kasịnụ nke mmadụ ịma ebe ike ya ruru?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọmụma Pọl maara ebe ike ya ruru mere ka ndị Kraịst ibe ya hụ ya n’anya

[Foto dị na peeji nke 17]

Gideọn ji ezi uche mee ihe n’imezu uche Chineke

[Foto dị na peeji nke 18]

Jisọs, bụ́ Ọkpara Chineke, na-egosi na ọ maara ebe ike ya ruru n’ihe nile ọ na-eme