Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nganga Na-eduga ná Nlelị

Nganga Na-eduga ná Nlelị

Nganga Na-eduga ná Nlelị

“Nganga bịa, nlelị abịakwa: ma n’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.”—ILU 11:2.

1, 2. Gịnị bụ nganga, n’ụzọ ndị dịkwa aṅaa ka o siworo duga n’ọdachi?

OTU onye Livaị bụ́ onye ekworo eduru otu ìgwè ndị nnupụisi gaa imegide ndị Jehova họpụtara ịchị isi. Otu nwa eze nke nwere oké ọchịchọ akpaa nkata aghụghọ iji weghara ocheeze nna ya. Otu eze na-enweghị ndidi eleghara ndụmọdụ doro anya nke onye amụma Chineke anya. E nwere otu àgwà ndị Israel atọ a nwechara: nganga.

2 Nganga bụ àgwà na-esi n’obi amalite nke na-eyi mmadụ nile egwu n’ụzọ dị ukwuu. (Abụ Ọma 19:13) Onye nganga na-eji anyaike eme ihe na-erughịrị ya, n’anataghị ikike ime otú ahụ. Nke a na-edugakarị n’ọdachi. N’ezie, nganga alawo ndị eze n’iyi, meekwa ka alaeze ukwu dị iche iche daa. (Jeremaịa 50:29, 31, 32; Daniel 5:20) O mewo ọbụna ka ụfọdụ ndị ohu Jehova ma n’ọnyà ma duga n’ọnwụ ha.

3. Ànyị pụrụ isi aṅaa mata ihe ize ndụ ndị dị na nganga?

3 E nwere ezi ihe mere Bible ji na-asị: “Nganga bịa, nlelị abịakwa: ma n’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.” (Ilu 11:2) Bible na-enye anyị ihe atụ ndị na-akwado ịbụ eziokwu nke ilu a. Ịtụle ụfọdụ n’ime ha ga-enyere anyị aka ịhụ ihe ize ndụ dị n’ịgafe ókè ndị kwesịrị ekwesị. N’ihi ya, ka anyị tụlee otú ekworo, oké ọchịchọ, na enweghị ndidi si mee ka ndị ikom atọ ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite jiri nganga mee omume, bụ́ nke dugara ná nlelị e lelịrị ha.

KoraOnye Nnupụisi Na-ekwo Ekworo

4. (a) Ònye bụ Kora, ihe omume ndị dịkwa aṅaa mere ihe akụkọ ka obi abụọ na-adịghị ya na o keere òkè na ha? (b) Omume ọjọọ dị aṅaa ka Kora kpalitere n’afọ ndụ ya ndị sochirinụ?

4 Kora bụ onye Livaị nke si n’usoro ọmụmụ Kohat, bụrụkwa nwa nwanne nna Mosis na Erọn. Ihe àmà na-egosi na o guzosiri ike n’ihe nye Jehova ruo ọtụtụ iri afọ. Kora nwere ihe ùgwù nke iso ná ndị ahụ e si n’Osimiri Uhie napụta n’ụzọ ọrụ ebube, o yikwara ka o keere òkè n’imezu ihe Jehova kpere n’ikpe megide ndị Israel ahụ fere chi nwa ehi n’Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 32:26) Otú ọ dị, n’ikpeazụ, Kora ghọrọ onye duziri nnupụisi megide Mosis na Erọn bụ́ nke ndị Reuben bụ́ Detan, Abaịram, na On, tinyere ndị isi Israel 250, so na ya. * “O zuworo unu,” ka ha gwara Mosis na Erọn, “n’ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n’otu n’otu, dị nsọ, ọ bụkwa n’etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bụkwa gịnị mere unu na-ebuli onwe unu karịa mkpọkọta nke Jehova?”—Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3.

5, 6. (a) N’ihi gịnị ka Kora ji nupụrụ Mosis na Erọn isi? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na o yiri ka Kora ò ledara ọnọdụ ya ná ndokwa Chineke anya?

5 N’ihi gịnị ka Kora ji nupụ isi mgbe o kwesịworo ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ? N’ezie, Mosis ejighị aka ike duo ụmụ Israel, n’ihi na ọ “dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Ma, o yiri ka Kora ò kwosoro Mosis na Erọn ekworo ma wee iwe n’ihi ọbụbụ ha bụ ndị a ma ama, nke a dugakwara ya n’ikwu—n’ụzọ na-ezighị ezi—na ha ejiriwo aka ike na ịchọ ọdịmma onwe ha nanị na-ebuli onwe ha karịa mkpọkọta ahụ.—Abụ Ọma 106:16.

6 O yiri nnọọ ka otu n’ime nsogbu Kora ọ̀ bụ ejighị ihe ùgwù ndị o nwere ná ndokwa Chineke kpọrọ ihe. N’eziokwu, ndị Livaị si n’usoro ọmụmụ Kohat abụghị ndị nchụàjà, ma ha bụ ndị nkụzi nke Iwu Chineke. Ha na-ebukwa arịa ndị dị n’ụlọikwuu ahụ mgbe ọ bụla a chọrọ ibufe ha ebe ọzọ. Nke ahụ abụghị ọrụ dị ala, n’ihi na ọ bụ nanị ndị dị ọcha n’ụzọ okpukpe na n’omume pụrụ ibu arịa nsọ ndị ahụ. (Aịsaịa 52:11) N’ihi ya, mgbe Mosis gakwuuru Kora, ọ nọ na-ajụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị, Ị̀ na-ele ọrụ e kenyere gị anya dị ka ihe dị nnọọ ala nke na ị ghaghịkwa isonye n’òtù ndị nchụàjà? (Ọnụ Ọgụgụ 16:9, 10) Kora aghọtaghị na ihe ùgwù kasịnụ bụ ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi dị ka ndokwa ya si dị—ọ bụghị inweta ọkwá ma ọ bụ ọnọdụ ụfọdụ pụrụ iche.—Abụ Ọma 84:10.

7. (a) Olee otú Mosis si mesoo Kora na ndị ikom ya ihe? (b) Olee otú e si weta nnupụisi Kora ná njedebe n’ụzọ dị egwu?

7 Mosis gwara Kora na ndị ikom ya ka ha chịrị ihe ịgụ ọkụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ gbakọta n’ụlọikwuu nzute n’ụtụtụ echi ya. E nyeghị Kora na ndị ikom ya ikike isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ebe ọ bụ na ha abụghị ndị nchụàjà. Ọ bụrụ na ha achịrị ihe ịgụ ọkụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ bịa, nke a ga-egosi n’ụzọ doro anya na ndị ikom a ka chere na ọ bụ ihe ruuru ha ije ozi dị ka ndị nchụàjà—ọbụna mgbe ha nwesịworo ohere iji abalị dum tụleghachi okwu ahụ. Mgbe ha bịara n’echi ya, Jehova gosipụtara iwe ya n’ụzọ ziri ezi. Ma ndị Reuben, “ala [saghere] ọnụ ya, lodaa ha.” Ọkụ sitere n’ebe Chineke nọ ripịara ndị ọzọ, gụnyere Kora. (Deuterọnọmi 11:6; Ọnụ Ọgụgụ 16:16–35; 26:10) Nganga Kora dugara ná nlelị kasịnụ—enweghị ihu ọma Chineke!

Guzogide ‘Ụzọ Ekworo’

8. Olee otú ‘ụzọ ekworo’ pụrụ isi pụta ìhè n’etiti ndị Kraịst?

8 Ihe ndekọ banyere Kora bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị. Ebe ọ bụ na ‘ụzọ ekworo’ dị n’ime ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ọ pụrụ ịpụta ìhè ọbụna n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Jemes 4:5) Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịbụ ndị ji ọnọdụ kpọbigara ihe ókè. Dị ka Kora, anyị pụrụ ikwoso ndị nwere ihe ùgwù ndị anyị na-achọ inweta ekworo. Ma ọ bụ, anyị pụrụ ịdị ka onye Kraịst narị afọ mbụ aha ya bụ Dịọtrefis. Ọ na-akatọkarị ikike ndị ozi, ihe àmà na-egosi na ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ịbụ onyeisi. N’ezie, Jọn dere na “ọ na-atọ [Dịọtrefis] ụtọ ịbụ onyeisi.”—3 Jọn 9.

9. (a) Àgwà dị aṅaa n’ebe ibu ọrụ dị iche iche nke ọgbakọ dị ka anyị kwesịrị izere? (b) Olee ụzọ kwesịrị ekwesị anyị ga-esi na-ele ọnọdụ anyị ná ndokwa Chineke anya?

9 N’ezie, ọ dịghị njọ nwoke bụ́ onye Kraịst iru eru maka ibu ọrụ dị iche iche nke ọgbakọ. Ọbụna Pọl gbara ume ka e nwee omume dị otú ahụ. (1 Timoti 3:1) Otú ọ dị, anyị ekwesịtụghị ile ihe ùgwù ije ozi anya dị ka ihe e ji amata ndị rụpụtara ihe, dị ka a ga-asị na site n’inweta ha, anyị arịala n’ọkwá nke ihe ịga nke ọma. Cheta na Jisọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwu n’etiti unu, ọ ga-abụ onye na-ejere unu ozi; ọzọ, onye ọ bụla nke na-achọ ka ọ bụrụ onyeisi n’etiti unu, ọ ga-abụ ohu unu.” (Matiu 20:26, 27) N’ụzọ doro anya, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ikwoso ndị nwere ibu ọrụ ka ukwuu ekworo, dị ka a ga-asị na uru anyị bara n’anya Chineke na-adabere ‘n’ọkwá’ anyị nọ na ya ná nzukọ ya. Jisọs kwuru, sị: “Unu nile bụ ụmụnna.” (Matiu 23:8) Ee, ma hà bụ ndị nkwusa ma hà bụ ndị ọsụ ụzọ, ndị ọhụrụ e mere baptism ma ọ bụ ndị guzosiworo ike n’ezi ihe ruo ọtụtụ afọ—ndị nile ji mkpụrụ obi ha dum na-ejere Jehova ozi nwere ọnọdụ dị oké ọnụ ahịa ná ndokwa ya. (Luk 10:27; 12:6, 7; Ndị Galetia 3:28; Ndị Hibru 6:10) Ọ bụ ngọzi n’ezie iso ọtụtụ nde ndị mmadụ na-arụkọ ọrụ bụ́ ndị na-agbalịsi ike itinye n’ọrụ ndụmọdụ Bible bụ́: “Were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi.”—1 Pita 5:5.

AbsalọmOnye Nrigbu Nwere Oké Ọchịchọ

10. Ònye bụ Absalọm, oleekwa otú o si nwaa inweta ihu ọma nke ndị na-abịakwute eze maka ikpe?

10 Ụzọ ndụ nke nwa nwoke nke atọ nke Eze Devid, bụ́ Absalọm, na-akụzi ihe gbara ọkpụrụkpụ banyere oké ọchịchọ. Onye nrigbu a na-eme atụmatụ ọjọọ nwara inweta ihu ọma nke ndị na-abịakwute eze maka ikpe. Na mbụ, o ji aghụghọ kwuo na Devid enweghị mmasị ná mkpa ha. E mesịa, ọ hapụrụ ụzọ aghụghọ ya ma kpughee ihe bụ́ nzube ya kpọmkwem. “Ònye ga-edo m onyeikpe n’ala nke a,” ka Absalọm kwuru, “ka nwoke ọ bụla nke nwere okwu ma ọ bụ ikpe wee bịakwute m, m wee kpọọ ya onye ezi omume!” Atụmatụ aghụghọ Absalọm gabigara ókè. “Mgbe nwoke ọ bụla bịaruru ya nso ịkpọ isiala nye ya,” ka Bible na-ekwu, “na o setịrị aka ya, jide ya, sutụ ya ọnụ. Absalọm wee meere Israel nile dị ka okwu a si dị, bụ́ ndị bịakwutere eze ka e kpee ha ikpe.” Gịnị si na ya pụta? “Absalọm wee zuru obi ndị ikom Israel n’ohi.”—2 Samuel 15:1-6.

11. Olee otú Absalọm si nwaa iweghara ocheeze Devid?

11 Absalọm kpebisiri ike iweghara ọbụbụeze nna ya. Afọ ise tupu mgbe ahụ, o mere ka e gbuo diọkpara Devid, bụ́ Amnọn, o yiri ka ọ bụ n’ịbọ ọ́bọ̀ maka ndina o dinara nwanne nwanyị Absalọm bụ́ Tema, n’ike. (2 Samuel 13:28, 29) Otú ọ dị, ọbụna n’oge ahụ, anya Absalọm pụrụ ịdịwo n’ocheeze ahụ, o wee na-ele ogbugbu e gburu Amnọn anya dị ka ụzọ dị mfe isi wepụ onye ya na ya gaara azọ ya. * Ka o sina dị, mgbe oge ruru, Absalọm malitere ime ihe. O mere ka a kpọsaa gburugburu ala ahụ na ya abụrụla eze.—2 Samuel 15:10.

12. Kọwaa otú nganga Absalọm si duga n’ilelị ya.

12 Ihe gaara Absalọm nke ọma ruo oge ụfọdụ, n’ihi na “nkekọta ahụ [nọgidere na-adị] ike; ndị Israel na-abakwa ụba na-eje n’ihu n’ihu n’aka Absalọm.” Ka oge na-aga, a manyere Eze Devid ịgba ọsọ ndụ. (2 Samuel 15:12-17) Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, nchụso Absalọm jedebere mgbe Joab gburu ya, tụba ya n’otu olulu, ma were nkume kpuchie ya. Cheedị echiche—e lighịdị nwoke a nwere oké ọchịchọ nke chọrọ ịbụ eze n’ụzọ dị mma mgbe ọ nwụrụ! * N’ezie, nganga dugara ná nlelị e lelịrị Absalọm.—2 Samuel 18:9-17.

Jụ Oké Ọchịchọ nke Ịchọ Ọdịmma Onwe Onye Nanị

13. Olee otú àgwà nke oké ọchịchọ pụrụ isi gbanye mkpọrọgwụ n’obi onye Kraịst?

13 Nrịgo Absalọm rịgoro n’ọchịchị na ọdịda sochiri ya bụụrụ anyị ihe mmụta. N’ụwa taa nke omume ọjọọ jupụtara, ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ ndị mmadụ ịgwa ndị ka ha elu okwu ịja mma efu, na-anwa inweta ihu ọma ha nanị iji mee ka ha mara na ha nọ ya ma ọ bụ ikekwe iji nweta ụdị ihe ùgwù ma ọ bụ mbuli n’ọkwá ụfọdụ. N’otu oge ahụ, ha pụrụ ituru ndị nọ n’okpuru ha ọnụ, na-enwe olileanya inweta ihu ọma na nkwado ha. Ọ bụrụ na anyị akpachapụghị anya, àgwà nke oké ọchịchọ dị otú ahụ pụrụ ịgbanye mkpọrọgwụ n’obi anyị. Ihe àmà na-egosi na ọ dị otú a n’etiti ụfọdụ ndị na narị afọ mbụ, na-eme ka ọ dị mkpa ka ndị ozi nye ịdọ aka ná ntị siri ike megide ndị dị otú ahụ.—Ndị Galetia 4:17; 3 Jọn 9, 10.

14. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izere àgwà nke oké ọchịchọ na nke ibuli onwe onye elu?

14 Jehova enweghị ọnọdụ ọ bụla n’ime nzukọ ya maka ndị na-eme atụmatụ ọjọọ bụ́ ndị na-ebuli onwe ha elu, ndị na-anwa ‘igwupụta ala nsọpụrụ ha.’ (Ilu 25:27) N’ezie, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ka Jehova bipụ egbugbere ọnụ nile nke na-ekwu okwu ire ụtọ, na ire nke na-ekwu oké ihe.” (Abụ Ọma 12:3) Absalọm nwere ire ụtọ. Ọ gwara ndị ọ na-achọ ihu ọma ha okwu na-ebu isi—nanị iji nweta ọnọdụ ịbụisi ọ na-achọsi ike bụ́ nke na-erughịrị ya. N’ụzọ dị iche, lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi ịnọ n’etiti òtù ụmụnna na-agbaso ndụmọdụ Pọl, bụ́: “Unu emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma.”—Ndị Filipaị 2:3.

Sọl—Eze Na-enweghị Ndidi

15. Olee otú Sọl si gosi n’otu oge na ya wedara onwe ya ala?

15 N’otu oge, Sọl, bụ́ onye mesịrị ghọọ eze Israel, wedara onwe ya ala. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mere n’oge ọ bụ nwa okorobịa. Mgbe onye amụma Chineke bụ́ Samuel kwuru okwu ọma banyere ya, Sọl ji obi umeala zaghachi, sị: “Ọ́ bụghị onye Benjamin ka m bụ, sitere n’ebo Israel nke dịkarịsịrị nta? agbụrụ m, ó pekarịsịghị mpe n’etiti agbụrụ nile nke ebo Benjamin? n’ihi gịnịkwa ka ị gwaworo m okwu dị ka okwu a si dị?”—1 Samuel 9:21.

16. N’ụzọ dị aṅaa ka Sọl si gosipụta àgwà nke enweghị ndidi?

16 Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, Sọl ewedaghịzi onwe ya ala. Mgbe ha na ndị Filistia na-alụ agha, ọ gara Gilgal, bụ́ ebe a tụrụ anya ka ọ nọrọ chere ka Samuel bịa rịọ Chineke arịrịọ site n’ịchụ àjà. Mgbe Samuel na-abịaghị n’oge a kara aka, Sọl ji nganga chụọ àjà nsure ọkụ ahụ n’onwe ya. Ozugbo o mechara, Samuel bịarutere. “Gịnị ka i meworo?” ka Samuel jụrụ. Sọl zara, sị: “Ahụrụ m na ndị Israel esiwo n’ebe m nọ gbasaa, ma gị onwe gị abịaghị n’ụbọchị a kara aka, . . . m wee jisie onwe m ike, wee suree àjà nsure ọkụ ahụ.”—1 Samuel 13:8-12.

17. (a) E lee ya anya n’elu elu, n’ihi gịnị ka ihe Sọl mere pụrụ iji yie ihe ziri ezi? (b) N’ihi gịni ka Jehova ji katọọ Sọl maka omume enweghị ndidi ya?

17 E lee ya anya n’elu elu, ihe Sọl mere pụrụ iyi ihe ziri ezi. E kwuwerị, “mkpa na-akpa” ndị Chineke, “a na-achị [ha] n’ihe ike,” ha na-amakwa jijiji n’ihi ọnọdụ enweghị olileanya ha nọ na ya. (1 Samuel 13:6, 7) N’ezie, ọ dịghị njọ ime ihe ụfọdụ n’onwe anyị mgbe e nwere ihe ndị mere a ga-eji mee otú ahụ. * Otú ọ dị, cheta na Jehova pụrụ ịma ihe dị anyị n’obi na ịchọpụta ebumnobi anyị ndị dị n’ime ime obi. (1 Samuel 16:7) N’ihi ya, ọ ghaghị ịhụwo ihe ụfọdụ banyere Sọl bụ́ ndị a na-ekwughị kpọmkwem n’ihe ndekọ Bible ahụ. Dị ka ihe atụ, Jehova pụrụ ịhụwo na ọ bụ nganga kpaliri enweghị ndidi Sọl. Ikekwe iwe were Sọl nke ukwuu na ya—eze Israel nile—aghaghị ichere onye o lere anya dị ka onye amụma merela agadi, nke na-eyigharị ihe! Ka o sina dị, Sọl chere na oge Samuel gburu nyere ya ikike ime ihe n’onwe ya na ileghara ntụziaka doro anya e nyeworo ya anya. Gịnị si na ya pụta? Samuel ajaghị Sọl mma maka ime ihe ahụ n’onwe ya. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ baara Sọl mba, na-asị: “Alaeze gị agaghị eguzosi ike . . . n’ihi na i debeghị ihe ahụ nke Jehova nyere gị n’iwu.” (1 Samuel 13:13, 14) Ọzọkwa, nganga dugara ná nlelị.

Zere Enweghị Ndidi

18, 19. (a) Kọwaa otú enweghị ndidi pụrụ isi mee ka onye na-ejere Chineke ozi n’oge a dị nganga. (b) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere otú ọgbakọ ndị Kraịst si arụ ọrụ?

18 E dekọwo omume nganga Sọl n’Okwu Chineke maka abamuru anyị. (1 Ndị Kọrint 10:11) Ọ dịịrị anyị nnọọ mfe iwe iwe n’ihi ezughị okè nke ụmụnna anyị. Dị ka Sọl, anyị pụrụ ịbụ ndị na-adịghị enwe ndidi, na-eche na ọ bụrụ na a ga-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, anyị aghaghị ime ya n’onwe anyị. Dị ka ihe atụ, were ya na otu nwanna kasị nwee nkà n’ịhazi ihe. Ọ na-abịa n’oge, na-agbasochi usoro ọgbakọ ji eme ihe anya, nweekwa onyinye n’ikwu okwu nakwa n’izi ihe. N’otu oge ahụ, ya achọpụta na ndị ọzọ adịghị eru ụkpụrụ ya ndị dị elu, nakwa na ha enwerutụghị nkà otú ọ ga-achọ ka ha nweruo. Nke a ọ̀ na-eme ka o zie ezi ịghara inwe ndidi? Ò kwesịrị ịkatọ ụmụnna ya, ikekwe na-enye echiche na a sị na ọ bụghị n’ihi mgbalị ndị ya na-eme, ọ dịghị ihe a ga-eme nakwa na ọgbakọ ahụ ga-ada? Nke a ga-abụ nganga!

19 N’ezie, gịnị na-ejikọta ọgbakọ ndị Kraịst ọnụ? Ọ̀ bụ nkà nke ịhazi ihe? ọ̀ bụ ịdị nkọ? ọ̀ bụ otú ihe ọmụma haruru? N’eziokwu, ihe ndị a bara uru ka ihe wee na-aga werewere n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 14:40; Ndị Filipaị 3:16; 2 Pita 3:18) Otú ọ dị, Jisọs sịrị na ihe bụ́ isi a ga-eji mata ụmụazụ ya bụ ịhụnanya. (Jọn 13:35) Ọ bụ ya mere ndị okenye na-ahụ n’anya, n’agbanyeghị na ha na-eme ihe n’usoro, ji aghọta na ọgbakọ abụghị achụmnta ego nke chọrọ iji aka ike na-elekọta ya; kama, ọ bụ nke ìgwè atụrụ chọrọ nlekọta ọmịiko mejupụtara. (Aịsaịa 32:1, 2; 40:11) Iji nganga eleghara ụkpụrụ ndị dị otú ahụ anya na-akpatakarị esemokwu. N’ụzọ dị iche, ime ihe n’usoro n’ụzọ na-enye Chineke nsọpụrụ na-eweta udo.—1 Ndị Kọrint 14:33; Ndị Galetia 6:16.

20. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Ihe ndekọ Bible banyere Kora, Absalọm, na Sọl na-egosi n’ụzọ doro anya na nganga na-eduga ná nlelị, dị ka e kwuru n’Ilu 11:2. Otú ọ dị, otu amaokwu Bible ahụ na-agbakwụnye, sị: “N’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.” Gịnị bụ mmadụ ịma ebe ike ya ruru? Ihe atụ ndị dị aṅaa sitere na Bible pụrụ inye aka ime ka a hụ àgwà a nke ọma, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị maara ebe ike anyị ruru taa? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ebe ọ bụ na Reuben bụ diọkpara Jekọb, ụmụ ya ndị ahụ Kora ratara inupụ isi pụrụ iwewo iwe na Mosis—nwa Livaị—nwere ikike ịbụisi n’ebe ha nọ.

^ par. 11 A kpọtụghị Kileab, bụ́ nwa nwoke nke abụọ Devid aha ọzọ mgbe a mụsịrị ya. Ọ pụrụ ịbụ na ọ nwụrụ tupu nnupụisi Absalọm.

^ par. 12 N’oge Bible, olili ozu bụ ihe omume dị nnọọ mkpa. N’ihi ya, ịbụ onye a na-elighị eli bụ ajọ ihe, ọ na-abụkarịkwa ngosipụta nke enweghị ihu ọma Chineke.—Jeremaịa 25:32, 33.

^ par. 17 Dị ka ihe atụ, Fineas mere ihe ngwa ngwa iji kwụsị ihe otiti nke gburu ọtụtụ iri puku ụmụ Israel, Devid gbakwara ndị ikom ya agụụ na-agụgbu ume iso ya rie achịcha nke ihu Chineke bụ́ nke dị “n’ụlọ Chineke.” Chineke akatọghị omume abụọ ahụ dị ka nganga.—Matiu 12:2-4; Ọnụ Ọgụgụ 25:7-9; 1 Samuel 21:1-6.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị bụ nganga?

• Olee otú ekworo si mee ka Kora jiri nganga mee omume?

• Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe ndekọ banyere Absalọm onye oké ọchịchọ?

• Olee otú anyị pụrụ isi zere àgwà nke enweghị ndidi nke Sọl gosipụtara?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Sọl ghọrọ onye na-enweghị ndidi ma jiri nganga mee omume