Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Anyị Ga-eji Na-enwe Ezi Uche n’Atụmanya Anyị?

N’ihi Gịnị Ka Anyị Ga-eji Na-enwe Ezi Uche n’Atụmanya Anyị?

N’ihi Gịnị Ka Anyị Ga-eji Na-enwe Ezi Uche n’Atụmanya Anyị?

IMEZU ihe ndị anyị lere anya ha na inweta ihe ndị anyị chọrọ na-eme ka anyị nwee afọ ojuju. Otú ọ dị, n’ezie, ọtụtụ n’ime ọchịchọ na atụmanya anyị adịghị agazi otú anyị si chọọ. Ndakpọ olileanya ndị a na-enwe mgbe mgbe ná ndụ pụrụ ime ka anyị wesawa onwe anyị na ọbụna ndị ọzọ iwe. Otu nwoke maara ihe kwuru n’ụzọ dabara adaba, sị: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa.”—Ilu 13:12.

Olee ihe ụfọdụ ndị pụrụ iduga n’inwe mmetụta nke ndakpọ olileanya? Olee otú anyị pụrụ isi rụọ ọrụ iji na-enwe ezi uche n’atụmanya anyị? Ọzọkwa, n’ihi gịnị ka ime otú ahụ ji bụrụ maka abamuru anyị?

Atụmanya na Ndakpọ Olileanya

N’ihi ndụ gbalụ gbalụ a na-adị taa, ruo ókè anyị na-agbalịru ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’oge a, ókè ahụ ka ọ na-eyi ka ànyị na-adaghachiru azụ. Ihe ndị na-achọ oge na ume ọrụ anyị pụrụ ịnọgide na-apụta, mgbe anyị na-enweghịkwa ike ịrụzu ihe anyị malitere ịrụ, anyị pụrụ ịmawa onwe anyị ikpe. Ọbụna anyị pụrụ ịmalite iche na anyị na-emechu ndị ọzọ ihu. Cynthia, onye bụ́ nwunye na nne nke maara nrụgide ndị ịzụ ụmụ na-eweta, na-ekwu, sị: “Ịbụ onye na-adịghị anọgide na-agbazi ụmụ ya na iche na adịghị m enye ha ọzụzụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-akpasụ m iwe.” Stephanie, bụ́ onye dị afọ iri na ụma, na-ekwu banyere agụmakwụkwọ ya, sị: “Oge adịghị ezuru m ime ihe nile m chọrọ ime, nke ahụ na-emekwa ka m ghara inwe ndidi.”

Atụmanya ndị dị elu n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ha na-aghọ ịchọkarị izu okè n’ụzọ dị mfe, nke a pụkwara ịdị na-eweta obi nkoropụ karịsịa. Ben, bụ́ nwa okorobịa lụworo nwanyị, na-ekwupụta, sị: “Mgbe m tụlere ihe ndị m na-eme, echiche m, ma ọ bụ mmetụta m, ana m ahụkarị otú ha pụrụ isiwo ka mma. Ana m achọkarị izu okè mgbe nile, nke a na-edugakwa m n’enweghị ndidi, n’inwe obi nkoropụ, nakwa ná ndakpọ olileanya.” Gail, bụ́ onye Kraịst bụ́ nwunye, na-ekwu, sị: “Echiche nke ịchọkarị izu okè adịghị anabata ọdịda. Anyị na-achọ ịbụ ndị nne na ndị nwunye ọkasị mma. Anyị aghaghị ịdị na-arụpụta ihe iji na-enwe obi ụtọ, n’ihi ya, mgbalị ndị lara n’iyi na-agbakasị anyị ahụ.”

Ma isi ihe ọzọ nke pụrụ iduga ná mmadụ inwe ndakpọ olileanya bụ ahụ ike na-adịwanye njọ na ịka nká. Enwechaghị ike ịgagharị agagharị na ume ọrụ belatara ebelata na-eme ka erughị eru anyị pụta ìhè ma na-eme ka anyị na-enwekwu obi nkoropụ. “Ana m ewesa onwe m iwe n’ihi enweghị ike ịrụzu ihe ndị na-adịburu m nnọọ mfe ịrụ tupu m daa ọrịa,” ka Elizabeth na-ekweta.

Ihe ndị ahụ e kwuru n’elu bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị pụrụ ịkpalite mmetụta nke ndakpọ olileanya. Ọ bụrụ na a hapụ ya n’achịkwaghị ya achịkwa, mmetụta ndị dị otú ahụ pụrụ ọbụna iduga n’anyị ikwere na ndị ọzọ adịghị enwe mmasị n’ebe anyị nọ. Ya mere, olee nzọụkwụ ndị dị mma anyị pụrụ iwere iji nagide ndakpọ olileanya ma na-enwe atụmanya ndị ezi uche dị na ha?

Ụzọ Ndị A Pụrụ Isi Na-enwe Atụmanya Ndị Ezi Uche Dị na Ha

Nke mbụ, cheta na Jehova nwere ezi uche ma na-egosipụta nghọta. Abụ Ọma 103:14 na-echetara anyị, sị: “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” N’ịmara ike na erughị eru anyị, ọ bụ nanị ihe anyị ga-emeli ka Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị. Otu n’ime ihe ndị ọ na-achọkwa n’aka anyị bụ “iji obi umeala soro Chineke [anyị] na-eje ije.”—Maịka 6:8.

Jehova na-agbakwa anyị ume ichigharịkwute ya n’ekpere. (Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Otú ọ dị, olee otú nke ahụ si enyere anyị aka? Ekpere na-eme ka echiche anyị dịzie adịzie. Ikpesi ekpere ike bụ ihe na-egosi na anyị kwetara na enyemaka dị anyị mkpa—ọ bụ ihe àmà nke ịdị umeala n’obi na ịma ebe ike anyị ruru. Jehova na-achọsi ike ịza ekpere anyị site n’inye anyị mmụọ nsọ ya, bụ́ nke mkpụrụ ya gụnyere ịhụnanya, obiọma, ịdị mma, na imeru ihe n’ókè. (Luk 11:13; Ndị Galetia 5:22, 23) Ekpere na-ebelatakwa nchekasị na obi nkoropụ. Site n’ekpere, “ị na-enweta nkasi obi nke na-adịghị esite n’ebe ọ bụla ọzọ,” ka Elizabeth na-ekwu. Kevin na-ekwenye, sị: “Ana m ekpe ekpere maka obi iru ala na enweghị nchekasị ka m wee nwee ike ịchịkwa nsogbu. Jehova adịghị emechu m ihu ma ọlị.” Pọl onyeozi maara uru dị ukwuu ekpere bara. Ọ bụ ya mere o ji tụọ aro, sị: “Meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ee, iso Jehova na-ekwurịta okwu na-enyere anyị aka n’ezie ịtụ anya ihe ndị ezi uche dị na ha n’aka onwe anyị nakwa n’aka ndị ọzọ.

Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, mmesi obi ike e nyere ozugbo na-adị anyị mkpa. Okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị mma. Okwu nzuzo anyị so enyi tozuru okè nke anyị tụkwasịrị obi kwurịta pụrụ inyere anyị aka inwe echiche ọhụrụ banyere ihe na-akpatara anyị ndakpọ olileanya ma ọ bụ nchekasị. (Ilu 15:23; 17:17; 27:9) Ndị ntorobịa bụ́ ndị na-agbaso obi nkoropụ mgba na-achọpụta na ịchọ ndụmọdụ nne na nna na-enyere ha aka inwe ezi nguzo. Kandi ji ekele na-ekweta, sị: “Nduzi ịhụnanya sitere n’aka nne na nna m emewo ka m nwekwuo ezi uche na nguzozi, meekwa ka m bụrụ onye ndị mmadụ na-enwekwu mmasị iso na-akpakọrịta.” Ee, ihe ncheta ahụ dị n’ilu 1:8, 9 kwekọrọ nnọọ n’oge a karịsịa: “Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị: n’ihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, ihe ịnya olu ka ha ga-abụrụ olu gị.”

A chịkọtara ihe ndị na-esi n’inwe echiche nke ịchọkarị izu okè apụta nke ọma n’okwu a na-ekwukarị bụ́: “Ịtụ anya ka ndụ dị otú anyị si chọọ bụ ịkpọ obi nkoropụ òkù.” Iji zere nke a, ọ dị mkpa ime mgbanwe n’echiche. Ịma ebe ike anyị ruru na ịdị umeala n’obi—inwe echiche ziri ezi banyere erughị eru anyị—ga-eme nnọọ ka anyị zụlite atụmanya ndị ziri ezi na ndị ezi uche dị na ha. N’ụzọ dabara adaba, Ndị Rom 12:3 na-adọ anyị aka ná ntị ‘ịghara ịtụkwasị uche n’onwe anyị karịa nke anyị kwesịrị ịtụkwasị uche.’ Tụkwasị na nke a, Ndị Filipaị 2:3 na-agba anyị ume ịdị umeala n’obi na ile ndị ọzọ anya dị ka ndị ka anyị.

Elizabeth, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, wesara onwe ya iwe n’ihi ọrịa ya. Ọ ga-ewe ya oge iji mata otú Jehova si ele ihe anya na inweta nkasi obi n’ịmara na ọ dịghị echefu ozi anyị na-eje. Colin enweghịzi ike ịgagharị agagharị n’ihi ọrịa na-agwụ ike. Na mbụ, o chere na ozi ya fọrọ nke nta ka ọ ghara ịba uru ma e were ya tụnyere ihe ndị ọ nọ na-arụzu mgbe ahụ siri ya ike. Site n’ịtụgharị uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka 2 Ndị Kọrint 8:12, ọ bịara nwee ike iwepụ echiche ndị a n’uche ya. Amaokwu a na-ekwu, sị: “A sị na obi dị ọkụ dị ya, ọ bụ ihe a ga-anara nke ọma dị ka ihe ọ bụla mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe ọ na-enweghị.” “N’agbanyeghị na adịghị m eme ihe dị ukwuu,” ka Colin na-ekwu, “m ka pụrụ imetụ eme, Jehova na-anabatakwa nke ahụ.” Ná Ndị Hibru 6:10, a na-echetara anyị, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.”

Oleezinụ otú anyị pụrụ isi chọpụta ma atụmanya anyị ọ̀ bụ nke ezi uche dị na ya? Jụọ onwe gị, sị, ‘Atụmanya ndị m na-enwe hà na-ekwekọ n’atụmanya ndị nke Chineke?’ Ndị Galetia 6:4 na-ekwu, sị: “Ma ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ.” Cheta na Jisọs kwuru, sị: “Yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” Ee, dị ka ndị Kraịst, anyị nwere yoke anyị ga-anya, ma ọ ‘dịghị egbu mgbu,’ ọ “dịkwa mfe,” Jisọs kwekwara nkwa na ọ ga-abụ ihe na-enye ume ọhụrụ ma ọ bụrụ anyị amụta ịnyara ya nke ọma.—Matiu 11:28-30.

Atụmanya Ndị Ezi Uche Dị na Ha Na-eweta Ụgwọ Ọrụ

A na-enweta ụgwọ ọrụ ndị na-abịa ngwa ngwa ma na-adịte aka site n’ige ntị na ndụmọdụ nke Okwu Chineke na itinye ya n’ọrụ ka anyị na-arụ ọrụ iji na-enwe atụmanya ndị ezi uche dị na ha. Otu ihe bụ na nke a na-enwe mmetụta dị mma n’ebe anyị nọ n’ụzọ anụ ahụ. Jennifer, bụ́ onye riteworo uru site n’ihe ncheta Jehova, na-ekweta, sị: “Enwekwuru m ume na mmasị ịdị ndụ.” N’ụzọ dabara adaba, Ilu 4:21, 22 na-agba anyị ume iji anya na obi anyị na-aṅa ntị n’okwu Jehova, “n’ihi na ndụ ka ha bụụrụ ndị na-achọta ha, ha bụkwa ihe na-agwọ anụ ahụ ha nile.”

Ụgwọ ọrụ ọzọ bụ inwe uche dị jụụ. “Mgbe m tinyere obi m na uche m n’Okwu Chineke, ana m achọpụta na m na-aka enwe obi ụtọ,” ka Theresa na-ekwu. N’eziokwu, anyị ka ga-enweta ndakpọ olileanya ná ndụ. Ma, anyị ga aka-enwe ike ịnagide ha n’ụzọ dị mfe. “Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso,” ka Jemes 4:8 na-agba ume ya. Jehova na-ekwekwa nkwa ime ka anyị nwekwuo ike iche ihe ịma aka nke ndụ ihu nakwa iji udo gọzie anyị.—Abụ Ọma 29:11.

Inwe atụmanya ndị ezi uche dị na ha na-eme ka anyị nwee ike ịnọgide na-akwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ. Nke a kwa bụ ngọzi. Anyị pụrụ ilekwasị anya nke ọma n’ihe ndị ka mkpa ná ndụ. (Ndị Filipaị 1:10) Mgbe ahụ ihe mgbaru ọsọ anyị na-abụ ndị ezi uche dị na ha na ndị a pụrụ iru eru, bụ́ nke na-eweta ọṅụ na afọ ojuju ka ukwuu. Anyị ga-adịkwu njikere inyefe onwe anyị n’aka Jehova, na-amara na ọ ga-eme ka ihe gaziere anyị. “Ya mere wedaanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka O wee welie unu elu n’oge nke Ya,” ka Pita na-ekwu. (1 Pita 5:6) À pụrụ inwe ihe ọzọ na-aka akwụghachi ụgwọ karịa ịbụ onye Jehova kwanyeere ùgwù?

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Inwe atụmanya ndị ezi uche dị na ha pụrụ inyere anyị aka ịnagide obi nkoropụ na ndakpọ olileanya