Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Site n’Irụpụta Ngwá Agha Gaa n’Ịzọpụta Ndụ

Site n’Irụpụta Ngwá Agha Gaa n’Ịzọpụta Ndụ

Akụkọ Ndụ

Site n’Irụpụta Ngwá Agha Gaa n’Ịzọpụta Ndụ

DỊ KA ISIDOROS ISMAILIDIS SI KỌỌ

Egbusara m ikpere n’ala ka anya mmiri na-asọda na ntì m. “Oo, Chineke, akọ na uche m na-agwa m na m pụghị ịnọgide na-arụpụta ngwá agha,” ka m kwuru n’ekpere. “Agbalịsiwo m ike ịchọta ọrụ ọzọ, ma enwebeghị m ike ịchọta. Echi, aga m etinye akwụkwọ ịgba arụkwaghị m. Biko, Jehova, ekwela ka agụụ gụgbuo ụmụ anyị anọ.” Olee otú m si rute n’ọnọdụ a?

NDỤ dị nnọọ jụụ ma dị mfe na Drama, n’ebe ugwu Gris, bụ́ ebe a mụrụ m na 1932. Nna m na-agwakarị m ihe ọ chọrọ ka m mee. Ọ gbara m ume ịga United States gụọ akwụkwọ. Mgbe a lụkọrọsịịrị ihe onwunwe ndị Gris n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ihe a na-ekwukarị n’ebe nile n’etiti ndị Gris bụ: “Unu pụrụ izuru ihe onwunwe anyị, ma unu apụghị izuru ihe ndị dị anyị n’obi ma ọlị.” Ekpebisiri m ike ịchụso agụmakwụkwọ dị elu ma nweta ihe ọ na-adịghị onye ọ bụla nwere ike izuru ma ọlị.

Site n’oge m bụ nwata, esonyeere m òtù ndị ntorobịa dị iche iche ndị Chọọchị Ọtọdọks nke Gris na-elekọta. N’ebe ahụ, a gwara anyị ka anyị na-ezere ịrọ òtù ndị dị ize ndụ. Ana m echeta kpọmkwem otu òtù—Ndịàmà Jehova—a na-akpọkarị aha, ebe ọ bụ na e kweere na ha na-anọchite anya ndị na-emegide Kraịst.

Mgbe m gụsịrị akwụkwọ n’otu ụlọ akwụkwọ nkà na ụzụ n’Atens na 1953, agara m Germany iji hụ ma m pụrụ ịchọta ọrụ ma na-aga ụlọ akwụkwọ n’otu oge ahụ. Ma nke ahụ adabaghị, ya mere agara m mba ndị ọzọ. Mgbe izu ole na ole gasịrị, anọ m n’otu ọdụ ụgbọ mmiri dị na Belgium chọpụta na ejighịzi m ego ọ bụla. Ana m echeta na m bara n’otu chọọchị, nọdụ ala, ma na-akwasi nnọọ ákwá ike nke na anya mmiri tasịrị n’ala n’ihu m. Ekpere m ekpere na ọ bụrụ na Chineke enyere m aka ịgaru United States, agaghị m achụso ihe onwunwe kama aga m agụ akwụkwọ ma gbalisie ike ịbụ ezi onye Kraịst na ezi nwa amaala. N’ikpeazụ, agaruru m ebe ahụ na 1957.

Ndụ Ọhụrụ na United States

Ibi ndụ na United States siri ike nye onye si mba ọzọ kwabata bụ́ onye na-amaghị asụsụ ha nakwa onye na-ejighị ego. Ana m arụ ọrụ abụọ n’abalị ma na-adọlị ịga ụlọ akwụkwọ mgbe chi bọrọ. Agara m ọtụtụ kọleji ma nweta akara ugo nke obere. E mesịa, agara m Mahadum California dị na Los Angeles ma nweta akara ugo mmụta dị elu n’ihe ọmụmụ physics. Okwu nna m gwara m banyere ịgụ akwụkwọ kwagidere m n’afọ ndị a tara akpụ.

N’ihe dị ka n’oge a, ezutere m ọmarịcha nwa agbọghọ bụ́ onye Gris, bụ́ Ekaterini, anyị lụkwara na 1964. A mụrụ nwa mbụ anyị mgbe afọ atọ gasịrị, n’ihe na-erughịkwa afọ anọ, anyị nwekwuru ụmụ nwoke atọ ọzọ na otu nwanyị. N’ezie, ọ bụ ihe ịma aka igbo mkpa ezinụlọ ma n’otu oge ahụ na-agụ akwụkwọ na mahadum.

Anọ m na-arụrụ Ndị Agha Ụgbọelu nke United States ọrụ n’ụlọ ọrụ na-arụpụta mgbọ ogbunìgwè na ngwá ndị e ji enyocha mbara igwe nke dị na Sunnyvale, California. Ekeere m òkè n’ịrụpụta ụgbọelu na ụgbọ mbara igwe dị iche iche, gụnyere usoro ihe omume nke ịga n’ọnwa bụ́ ndị a kpọrọ Agena na Apollo. Ọbụna enwetara m ihe nrite n’ihi ụtụ m tụnyere na njem nke Apollo 8 na Apollo 11. Mgbe nke ahụ gasịrị, agụụrụ m akwụkwọ m gawa ma kere nnọọ òkè n’ọrụ agha dị iche iche a rụrụ na mbara igwe. N’oge a, echere m na m nwere ihe nile—ọmarịcha nwunye, ụmụ anọ na-enye ọṅụ, ọrụ dị ùgwù, na ụlọ mara mma.

Enyi Na-anọgidesi Ike

Ná mmalite 1967, n’ebe ọrụ, ezutere m Jim, bụ́ nwoke dị nnọọ obi umeala ma nwee obiọma. Jim na-eyikarị onye na-amụmụ ọnụ ọchị, ọ dịbeghịkwa mgbe ọ jụrụ òkù m kpọrọ ya iso m gaa ṅụọ kọfị n’oge nkwụsịtụ ọrụ. Ọ na-eji ohere ndị a eso m ekerịta ihe ọmụma ndị sitere na Bible. Jim gwara m na ya anọwo na-eso Ndịàmà Jehova amụ ihe.

Ọ wụrụ m akpata oyi n’ahụ ịnụ na Jim esowela òtù okpukpe a. Olee otú o si dịrị ịrọ òtù ahụ na-emegide Kraịst mfe ịghọgbute nwoke ọma dị otú a? Otú ọ dị, mmasị onwe onye Jim nwere n’ebe m nọ na obiọma ọ na-egosi m na-adọta m n’ebe ọ nọ. O yiri ka ọ na-enwe ihe dị iche m ga-agụ kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị, ọ bịara n’ọfịs m ma kwuo, sị: “Isidoros, isiokwu a dị n’Ụlọ Nche na-ekwu banyere iwusikwu ndụ ezinụlọ ike. Were ya laa, ma soro nwunye gị gụọ ya.” Agwara m ya na m ga-agụ isiokwu ahụ, ma mgbe e mesịrị, agara m n’ụlọ mposi ma dọrisie magazin ahụ ma wụba ha n’ihe mkpofu ihe.

Ruo afọ atọ, ebibiri m akwụkwọ na magazin ọ bụla Jim nyere m. N’ịbụ onye nwere ajọ mbunobi megide Ndịàmà Jehova ma na-agbalị ịnọgide na-abụ enyi Jim, echere m na ọ kasị mma ige ntị n’ihe o nwere ikwu ma chefuo ya ozugbo.

Otú ọ dị, site ná nkwurịta okwu ndị ahụ, ahụrụ m na ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị m kweere na ihe ndị m na-eme adabereghị na Bible. Aghọtara m na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ozizi nke Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, na anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. (Eklisiastis 9:10; Ezikiel 18:4; Jọn 20:17) Dị ka onye Ọtọdọks nke Gris dị mpako, achọghị m ikwupụta na ihe Jim na-ekwu bụ eziokwu. Ma ebe ọ bụ na ọ na-eji Bible eme ihe mgbe nile, n’adịghịkwa mgbe ọ na-ekwu echiche nke aka ya, emesịrị m ghọta na nwoke a nwere ozi bara uru si na Bible maka m.

Nwunye m ghọtara na o nwere ihe na-emenụ, o wee jụọ ma mụ na enyi m nke ya na Ndịàmà na-akpakọ ò kwurịtawo okwu. Mgbe m zara ee, o kwuru, sị: “Ka anyị gaa chọọchị ọ bụla ọzọ ma e wezụga Ndịàmà Jehova.” Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, mụ na nwunye m na ụmụ anyị malitere ịgachi nzukọ Ndịàmà anya.

Mkpebi Tara Akpụ

Ka m na-amụ Bible, agụtara m okwu ndị a nke Aịsaịa onye amụma kwuru: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4) Ajụrụ m onwe m, sị, ‘Olee otú onye na-ejere Chineke nke hụrụ udo n’anya ozi pụrụ isi na-arụ ọrụ ịrụpụta ngwá agha ndị na-emebi ihe?’ (Abụ Ọma 46:9) O weghị m oge ikwubi na aghaghị m ịgbanwe ọrụ m.

N’ụzọ kwere nghọta, nke a bụ́ ihe ịma aka gbara ọkpụrụkpụ. Enwere m ọrụ dị ùgwù. Adọlịwo m gabiga ọtụtụ afọ nke ịrụsi ọrụ ike, agụmakwụkwọ, na ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà iji rute n’ọnọdụ a. Arịgowo m n’ọkwá dị elu, ma ugbu a, lee ka m na-aga ịhapụ ọrụ m. Otú ọ dị, ịhụnanya miri emi m nwere n’ebe Jehova nọ na ọchịchọ siri ike ime uche ya mesịrị merie.—Matiu 7:21.

Ekpebiri m ịchọ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ dị na Seattle, Washington. Otú ọ dị, enwere m ndakpọ olileanya mgbe m chọpụtara n’oge na-adịghị anya na m na-ekere òkè ọbụna karị n’ọrụ na-ekwekọghị n’Aịsaịa 2:4. Mgbalị ndị m tinyere ịrụ ọrụ ná ngalaba ndị ọzọ kụrụ afọ n’ala, ọzọkwa, akọ na uche m nyere m nsogbu. Ahụrụ m n’ụzọ doro anya na apụghị m ịnọgide na-arụ ọrụ m ma n’otu oge ahụ nọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha.—1 Pita 3:21.

Ọ bịara doo m anya na anyị gaje ime mgbanwe ndị dị mkpa. N’ihe na-erughị ọnwa isii, anyị gbanwere ụzọ ndụ anyị ma belata mmefu ezinụlọ anyị ruo ọkara. E mesịa, anyị rere ụlọ ndị oké ozu anyị ma zụta nke obere na Denver, Colorado. Adịzi m njikere iwere nzọụkwụ nke ikpeazụ—ịkwụsị ọrụ m. Edere m akwụkwọ ịgba arụkwaghị m, na-akọwa nguzo m n’ihi akọ na uche m. N’abalị ahụ, mgbe ụmụ anyị lakpuchara ụra, mụ na nwunye m gbusara ikpere n’ala ma kpegara Jehova ekpere, dị ka m kọwara ná mmalite nke isiokwu a.

N’ihe na-erughị otu ọnwa, anyị kwagara Denver, izu abụọ mgbe nke ahụ gasịkwara, na July 1975, e mere mụ na nwunye m baptism. Achọtalighị m ọrụ ruo ọnwa isii, anyị nọkwa na-erida ego anyị chekwara nke nta nke nta. Ka ọ na-erule n’ọnwa nke asaa, ihe fọdụrụ n’ego anyị chekwara n’ụlọ akụ̀ erughị ụgwọ anyị na-akwụ n’ọnwa maka ụlọ anyị. Amalitere m ịchọ ọrụ nkịtị ọ bụla m pụrụ inweta, ma ozugbo nke ahụ gasịrị, enwetara m ọrụ injinịa. Ihe a na-akwụ m bụ ọkara nke ihe m na-akpatabu; n’agbanyeghị nke ahụ, ọ karịrị nnọọ ihe m rịọrọ Jehova. Lee obi ụtọ m nwere na ebutewo m ọdịmma ime mmụọ ụzọ!—Matiu 6:33.

Ịzụlite Ụmụ Anyị Ịhụ Jehova n’Anya

Ka ọ dịgodị, mụ na Ekaterini nọ na-arụsi ọrụ ahụ na-ama aka ike, bụ́ ịzụlite ụmụ anọ anyị n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, site n’enyemaka Jehova, anyị ahụwo ha nile ka ha ghọrọ ndị Kraịst tozuru okè, na-etinye ndụ ha n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ ahụ dị mkpa nke ikwusa banyere Alaeze ahụ. Ụmụ anyị ndị nwoke atọ, bụ́ Christos, Lakes, na Gregory, agụchawo akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, ha na-ejekwa ozi ugbu a n’ebe dị iche iche e kenyere ha ọrụ, na-eleta ma na-ewusi ọgbakọ dị iche iche ike. Toula, bụ́ ada anyị, na-arụ ọrụ dị ka onye ọrụ afọ ofufo n’isi ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na New York. Obi tọrọ anyị ụtọ mgbe anyị hụrụ ka ha nile chụrụ ọrụ ndị bụ́ ịgba bụ́ ndị na-eweta ego dị ukwuu n’àjà, iji jeere Jehova ozi.

Ọtụtụ ndị ajụwo anyị isi ihe dugara n’inwe ihe ịga ọma dị otú ahụ n’ịzụ ụmụ. N’ezie, e nweghị usoro ọ bụla a kapịrị ọnụ maka ịzụ ụmụ, ma anyị ji ịdị uchu gbalịa ịkụnye ịhụnanya n’ebe Jehova na ndị agbata obi nọ n’obi ha. (Deuterọnọmi 6:6, 7; Matiu 22:37-39) Ụmụ anyị mụtara na anyị apụghị ịgwa Jehova na anyị hụrụ ya n’anya ọ gwụla ma àgwà anyị ọ̀ na-egosipụta na anyị hụrụ ya n’anya.

Otu ụbọchị n’izu, ọ na-abụkarị na Saturday, anyị na-ekere òkè n’ozi dị ka ezinụlọ. Anyị na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya n’uhuruchi Monday nile mgbe anyị risịrị nri abalị, anyị na-amụrụ nwa nke ọ bụla Bible. Mgbe ụmụ anyị ka dịtụ obere, anyị na-amụrụ nwa nke ọ bụla ihe ruo mkpirikpi oge ọtụtụ ugboro n’izu, ka ha na-etolitekwa, anyị na-enwe ọmụmụ ihe katụ ogologo otu ugbo n’izu. N’oge ọmụmụ ihe ndị a, ụmụ anyị na-ekwupụta ihe dị ha n’obi, sorokwa anyị na-ekwurịta nsogbu ha n’enweghị ihe mgbochi.

Anyị na-enwekwa ntụrụndụ na-ewuli elu dị ka ezinụlọ. Anyị na-enwe mmasị ịkpọkọ ngwá egwú ọnụ, nwa nke ọ bụla na-enwekwa mmasị ịkpọ abụ ndị kasị atọ ya ụtọ. Ná ngwụsị izu ụfọdụ, anyị na-akpọ ezinụlọ ndị ọzọ òkù iji nwee mkpakọrịta na-ewuli elu. Anyị mekwara njem ezumike dị iche iche dị ka ezinụlọ. N’otu n’ime njem ndị dị otú ahụ, anyị ji izu abụọ gagharịa n’ugwu ndị dị na Colorado ma soro ọgbakọ ndị dị n’ógbè ahụ rụọ ọrụ n’ozi ubi. Ụmụ anyị na-eji mmasị echeta ọrụ ndị ha rụrụ ná ngalaba dị iche iche ná mgbakọ distrikti, na-enyekwa aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe dị iche iche. Mgbe anyị kpọ ụmụ anyị gaa Gris iji hụ ndị ikwu ha, ha zutekwara ọtụtụ Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nọworo n’ụlọ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha. Nke a nwere mmetụta miri emi n’ebe ha nọ, na-enyere ha aka ikpebi ịnọgide na-akwụsi ike ma na-enwe obi ike maka eziokwu ahụ.

N’ezie, mgbe ụfọdụ, ụfọdụ n’ime ụmụ anyị kpara àgwà na-adịghị mma ma ọ bụ mee nhọrọ na-adịghị mma banyere ndị ha na ha na-akpakọrịta. N’oge ndị ọzọ, anyị wetaara ha nsogbu ikekwe site n’igbochibiga ha ókè n’akụkụ ụfọdụ. Ma iji “ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị,” dị ka ọ dị na Bible mee ihe, nyeere anyị nile aka ime ka ihe guzozie.—Ndị Efesọs 6:4; 2 Timoti 3:16, 17.

Oge M Kasị Nwee Obi Ụtọ ná Ndụ

Mgbe ụmụ anyị malitesịrị ozi oge nile, mụ na Ekaterini malitere ichesi echiche ike banyere ihe anyị pụrụ ime iji mụbaa òkè anyị na-ekere n’ọrụ a na-azọpụta ndụ. N’ihi ya, na 1994, mgbe m lasịrị ezumike nkà n’oge, anyị abụọ malitere ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Ozi anyị gụnyere ileta kọleji na mahadum ndị dị n’ógbè ahụ, bụ́ ebe anyị na-agbara ụmụ akwụkwọ àmà ma na-amụrụ ụfọdụ n’ime ha Bible. Ebe ọ bụ na m pụrụ ịmara ihe isi ike ha na-enwe—ebe ọ bụ na m nọbu n’ọnọdụ yiri nke ha n’afọ ndị na-etebeghị oké aka—enwewo m ihe ịga nke ọma dị ukwuu n’inyere ha aka ịmụta banyere Jehova. Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ ịmụworo ụmụ akwụkwọ ndị si Bolivia, Brazil, Chile, China, Ijipt, Etiopia, Mexico, Thailand, na Turkey ihe! Ana m anụkwa ụtọ iji telifon agba àmà, karịsịa nye ndị na-asụ asụsụ ala m.

N’agbanyeghị na m nwere ọtụtụ erughị eru n’ihi ụda olu Grik m na-eji ekwu okwu na ịka nká, anọwo m mgbe nile na-agbalị iwepụta onwe m ma nwee àgwà nke Aịsaịa, bụ́ onye kwupụtara, sị: “Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) Anyị enwewo ọṅụ nke inyere ihe karịrị mmadụ isii aka ịrara ndụ ha nye Jehova. N’ezie, nke a abụwo oge kasị enye anyị obi ụtọ.

N’otu oge, ndụ m dabeere n’ịrụpụta ngwá agha ndị dị egwu e ji egbu ụmụ mmadụ ibe m. Otú ọ dị, Jehova, site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ, megheere mụ na ezinụlọ m ụzọ ịghọ ndị ohu ya a raara nye na itinye ndụ anyị n’iwegara ndị mmadụ ozi ọma nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ka m na-atụgharị uche ná mkpebi ndị tara akpụ m mere, ana m echeta okwu Malakaị 3:10: “Biko, nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma M gaghị emeghere unu windo nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.” N’ezie, o mewo otú ahụ—n’ụzọ dị anyị mma n’obi!

[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]

Christos: Enwewo m ekele nke ukwuu n’ihi nguzosi ike n’ihe nke nne na nna m ji mkpụrụ obi ha dum na-enwe n’ebe Jehova nọ na nrara siri ike ha raara onwe ha nye n’ọrụ ha dị ka nne na nna. Dị ka ezinụlọ, anyị mekọrọ ihe nile ọnụ—site n’ozi anyị ruo n’ezumike anyị. Ọ bụ ezie na nne na nna m pụrụ itinyewo aka n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ha mere ka ndụ ha dị mfe ma lekwasị anya n’ozi ahụ. Taa, amaara m na m ga-enwe obi ụtọ kasịnụ mgbe m mikpuru onwe m n’ozi Jehova.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]

Lakes: Nna m kpọrọ omume ihu abụọ asị. Ọ gbalịsiri ike ịghara ịbụ onye ihu abụọ, karịsịa n’isetịpụrụ ezinụlọ ya ihe nlereanya ziri ezi. Ọ na-agwakarị anyị, sị: “Ọ bụrụ na unu arara ndụ unu nye Jehova, ọ chọrọ unu ihe n’aka. Unu kwesịrị ịdị njikere ịchụrụ Jehova àjà. Nke ahụ bụ ihe ịbụ onye Kraịst pụtara.” Okwu ndị a adịgidewo n’obi m, o nyewokwara m aka ịgbaso ihe nlereanya ya n’ịchụrụ Jehova àjà.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]

Gregory: E wezụga okwu agbamume ndị nne na nna m na-agwa m ka m gbasawanye ozi m, ihe nlereanya ha na ihe àmà nke ọṅụ ha na-enwe n’ozi Jehova kwaliri m ịtụleghachi ọnọdụ m, wepụ nchekasị na nchegbu ọ bụla m nwere banyere ịmalite ozi oge nile, ma mikpuo onwe m n’ụzọ zuru ezu karị n’ọrụ Jehova. Ana m ekele nne na nna m maka inyere m aka ịchọta ọṅụ nke na-esite n’ịrụsi ọrụ ike m.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]

Toula: Nne na nna m na-emesi ya ike mgbe nile na mmekọrịta anyị na Jehova bụ ihe kasị oké ọnụ ahịa anyị pụrụ inwe nakwa na nanị ụzọ anyị pụrụ isi nwee obi ụtọ mgbe ọ bụla bụ site n’inye Jehova ihe kasị mma anyị pụrụ inye. Ha mere ka Jehova dị adị n’ezie nye anyị. Nna m na-agwakarị anyị na a na-enwe mmetụta a na-apụghị ịkọwa akọwa banyere inwe ike ịlakpu ụra n’abalị na-enwe akọ na uche dị ọcha, na-amara na ị gbalịrị ike gị ime Jehova obi ụtọ.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mgbe m bụ soja na Gris, 1951

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na Ekaterini na 1966

[Foto dị na peeji nke 26]

Ezinụlọ m na 1996: (site n’aka ekpe gaa n’aka nri, n’azụ) Gregory, Christos, Toula; (n’ihu) Lakes, Ekaterini, na mụ onwe m