Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Bụ Onye Kraịst “Tozuru Okè”?

Ị̀ Bụ Onye Kraịst “Tozuru Okè”?

Ị̀ Bụ Onye Kraịst “Tozuru Okè”?

“MGBE m bụrịị nwa ọhụrụ, ana m ekwu dị ka nwa ọhụrụ, ana m atụkwasị uche n’ihe dị ka nwa ọhụrụ, ana m agụ ihe dị ka nwa ọhụrụ.” Otú ahụ ka Pọl onyeozi dere. N’ezie, ọ dị mgbe anyị nile bụ ụmụ ọhụrụ na-enweghị enyemaka. Otú ọ dị, anyị anọgideghị n’ọnọdụ ahụ mgbe nile. Pọl kwuru, sị: “Ugbu a mgbe m ghọworo okenye, emewo m ka omume nwa ọhụrụ ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrint 13:11.

N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Kraịst nile na-amalite dị ka ụmụ ọhụrụ ime mmụọ. Ma ka oge na-aga, ha nile pụrụ “[iru] ịdị n’otu nke okwukwe na nke mmazu nke Ọkpara Chineke, ruo ịbụ nwoke tozuru okè, ruo ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogologo nke ozuzu nke Kraịst.” (Ndị Efesọs 4:13) Ná 1 Ndị Kọrint 14:20, a na-agba anyị ume, sị: “Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị n’uche unu: . . . ma n’uche unu bụrụnụ ndị tozuru okè.”

Ọnụnọ nke ndị Kraịst tozuru okè nọ ya bụụrụ ndị Chineke taa ngọzi, karịsịa n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị ọhụrụ. Ndị Kraịst tozuru okè na-atụnye ụ̀tụ̀ ná nkwụsi ike nke ọgbakọ. Ha na-enwe mmetụta dị mma n’ụzọ e si eme ihe, ma ọ bụ n’àgwà kasị pụta ìhè dị n’ọgbakọ ọ bụla ha nọ na ya.

Ọ bụ ezie na uto anụ ahụ na-abịara onwe ya, uto ime mmụọ na-abịa nanị site n’itinye oge na mgbalị. Ọ bụghị ihe ijuanya na laa azụ n’oge Pọl, ụfọdụ ndị Kraịst jụrụ ‘itozu okè,’ n’agbanyeghị na ha ejeworo Chineke ozi ruo ọtụtụ afọ. (Ndị Hibru 5:12; 6:1) Gịnị banyere gị onwe gị? Ma ì jeworo Chineke ozi ruo ọtụtụ afọ ma ọ bụ ruo nanị oge dị nnọọ mkpirikpi, ọ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị iji ezi obi nyochaa onwe gị. (2 Ndị Kọrint 13:5) Ì so ná ndị a pụrụ ịkpọ ndị Kraịst tozuru okè n’ezie? Ọ bụrụ na i soghị, olee otú ị pụrụ isi soro?

‘Ndị Tozuru Okè n’Uche’

Ọ na-adị mfe nwa ọhụrụ ime mmụọ ịbụ onye “ifufe nile ọ bụla nke ozizi na-efegharị na-ebugharịkwa, n’ime ịtụ ntụ nke mmadụ, n’ime aghụghọ, nke ha ji ezupụta nduhie.” N’ihi ya, Pọl gbara ume, sị: “Ka anyị wee na-eso . . . ịhụnanya, wee too eto ruo n’ime Ya n’ihe nile, Onye bụ́ isi anyị, bụ́ Kraịst.” (Ndị Efesọs 4:14, 15) Olee otú mmadụ si eme nke ahụ? Ndị Hibru 5:14 na-asị: “Nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.”

Rịba ama na a na-anwa nghọta nke ndị tozuru okè site n’omume ha na-eme, ma ọ bụ ahụmahụ ha nwere n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Mgbe ahụ, o doro anya na mmadụ adịghị etozu okè na mberede; ọ na-ewe oge iji tolite n’ụzọ ime mmụọ. Ya bụrụgodị otú ahụ, ị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji mee ka uto ime mmụọ gị ka mfe site n’ọmụmụ ihe onwe onye—karịsịa nke ihe ndị ka mie emi nke Okwu Chineke. N’oge ndị na-adịbeghị anya, Ụlọ Nche atụlewo ọtụtụ isiokwu miri emi. Ndị tozuru okè adịghị ezere isiokwu ndị dị otú ahụ n’ihi na ha nwere “ihe ụfọdụ nke dị ike ịghọta.” (2 Pita 3:16) Kama nke ahụ, ha na-eji oké mmasị erichapụ nri siri ike dị otú ahụ!

Ndị Nkwusa na Ndị Ozizi Na-anụ Ọkụ n’Obi

Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ pụkwara ịkwalite uto ime mmụọ gị. Gịnị ma ị gbalịsie ike ikere òkè na ya ruo n’ókè ọnọdụ kwere gị?—Matiu 13:23.

Mgbe ụfọdụ, nrụgide ndị a na-enwe ná ndụ pụrụ ime ka iwepụta oge iji mee nkwusa bụrụ ihe ịma aka. Ma, site ‘n’ijisi ike’ dị ka onye nkwusa, ị na-egosipụta otú i jiruru “ozi ọma” ahụ kpọrọ ihe. (Luk 13:24; Ndị Rom 1:16) N’ụzọ dị otú ahụ, a pụrụ ile gị anya dị ka onye “bụụrụ ndị kwere ekwe ihe atụ.”—1 Timoti 4:12.

Ndị Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe

Itozu okè na-agụnyekwa itinye mgbalị iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe. Dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 26:1, Devid kwupụtara, sị: “Kpee m ikpe, Jehova, n’ihi na mụ onwe m ejewo ije [n’iguzosi ike n’ezi ihe m, NW].” Iguzosi ike n’ezi ihe bụ izi ezi nke omume, izu ezu. Otú ọ dị, ọ pụtaghị izu okè. Devid n’onwe ya mere ọtụtụ mmehie dị njọ. Ma n’ihi na ọ naara ịdọ aka ná ntị ma gbanwee ụzọ ya, o gosipụtara na ya ka nwere ezi ịhụnanya n’ebe Jehova Chineke nọ. (Abụ Ọma 26:2, 3, 6, 8, 11) Iguzosi ike n’ezi ihe na-agụnye ozuzu, ma ọ bụ izu ezu nke ofufe si n’obi. Devid gwara nwa ya nwoke bụ́ Solomọn, sị: “Mara Chineke nke nna gị, were obi zuru okè, . . . fee Ya ofufe.”—1 Ihe E Mere 28:9.

Iguzosi ike n’ezi ihe na-agụnye “esiteghị n’ụwa,” ịnọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mba dị iche iche nakwa n’agha ha. (Jọn 17:16) Ị ghaghịkwa iguzogide omume ndị na-emerụ emerụ, dị ka ịkwa iko nile, na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Ndị Galetia 5:19-21) Otú ọ dị, iguzosi ike n’ezi ihe na-agụnye ihe karịrị izere ihe ndị ahụ. Solomọn dọrọ aka ná ntị, sị: “Ijiji nwụrụ anwụ na-eme ka mmanụ onye na-asụgwa mmanụ otite nke na-esi ísì ụtọ sie ísì ọjọọ, reekwa ure: otú a ka nzuzu nta dị arọ karịa amamihe, karịakwa nsọpụrụ.” (Eklisiastis 10:1) Ee, ọbụna “nzuzu nta,” dị ka mmadụ ịgwa onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya okwu egwuregwu na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ imeso ya omume na-egosi ime mfegharị, pụrụ imebi ezi aha nke onye nwere “amamihe.” (Job 31:1) Ya mere, gosipụta ntozu okè gị site n’ịchọ ịbụ ihe nlereanya n’omume gị nile, na-ezere ọbụna “ọdịdị ihe ọjọọ.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:22, King James Version.

Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe

Onye Kraịst tozuru okè na-eguzosikwa ike n’ihe. Dị ka anyị na-agụ ná Ndị Efesọs 4:24, Pọl onyeozi na-agba ndị Kraịst ume, sị: “Unu yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na [iguzosi ike n’ihe, NW].” N’Akwụkwọ Nsọ Grik, okwu mbụ e ji mee ihe maka “iguzosi ike n’ihe” bu echiche nke ịdị nsọ, ezi omume, nsọpụrụ. Onye na-eguzosi ike n’ihe na-eji ofufe akpọrọ ihe, ọ na-eme ihe n’ụzọ dị nsọ; ọ na-eji nlezianya arụzu ọrụ nile Chineke nyere ya.

Olee ụzọ ụfọdụ ị pụrụ isi zụlite nguzosi ike n’ihe dị otú ahụ? Otu ụzọ ga-abụ site n’ịdị na-ekwenyere ndị okenye ọgbakọ unu. (Ndị Hibru 13:17) Ka ndị Kraịst tozuru okè na-amata na Kraịst bụ onye a họpụtara ịbụ Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst, ha na-eguzosi ike n’ihe nye ndị a họpụtara “[ịzụ] nzukọ Chineke dị ka atụrụ.” (Ọrụ 20:28) Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ịma ikike ndị okenye a họpụtara ahọpụta aka ma ọ bụ ledaa ya anya! I kwesịkwara iguzosi ike n’ihe nye “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na usoro ndị e ji eme ihe n’ikesa ‘nri ime mmụọ n’oge ya.’ (Matiu 24:45) Dị ngwa n’ịgụ na n’itinye ihe ọmụma ndị dị n’Ụlọ Nche nakwa ná mbipụta ndị ibe ya n’ọrụ.

Igosipụta Ịhụnanya Site n’Omume Gị

Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka akwụkwọ, sị: “Ịhụnanya ahụ unu nile n’otu n’otu na-ahụrịta ibe unu na-ehikwa nne.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:3) Inwekwu ịhụnanya bụ kpọmkwem akụkụ dị mkpa nke uto ime mmụọ. Jisọs kwuru, dị ka e dekọrọ na Jọn 13:35, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” Ọ bụghị mmetụta nkịtị ka e ji amata ịhụnanya dị otú ahụ. Akwụkwọ bụ́ Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words na-ekwu, sị: “A pụrụ ịmata ịhụnanya nanị site n’omume ọ kpaliri mmadụ ime.” Ee, ọ bụ site n’igosipụta ịhụnanya ka ị ga-esi aga n’ihu ruo ntozu okè n’akụkụ a!

Dị ka ihe atụ, ná Ndị Rom 15:7, anyị na-agụ, sị: “Na-akpọbatanụ ibe unu.” Otu ụzọ ị ga-esi na-egosipụta ịhụnanya bụ site n’ikele ndị kwere ekwe ibe gị na ndị ọhụrụ ná nzukọ ọgbakọ—n’ụzọ na-ekpo ọkụ! Mara ha n’onwe gị. Nwee “mmasị onwe onye” n’ebe ndị ọzọ nọ. (Ndị Filipaị 2:4, NW) Ikekwe ị pụrụ ọbụna igosipụta afọ ọma ma kpọọ ndị dị iche iche ka ha bịa n’ebe obibi gị. (Ọrụ 16:14, 15) Mgbe ụfọdụ, ezughị okè nke ndị ọzọ pụrụ ile ókè ịhụnanya gị ruru ule, ma ka ị na-amụta ‘ịnagide ha n’ime ịhụnanya,’ ị na-egosipụta na i tozuwela okè.—Ndị Efesọs 4:2.

Iji Ihe Onwunwe Anyị Na-eme Ihe Iji Kwalite Ofufe Dị Ọcha

N’oge ochie, ọ bụghị ndị Chineke nile rụzuru ọrụ dịịrị ha iji kwadoo ụlọ nsọ Jehova. N’ihi ya, Chineke zigara ndị amụma, dị ka Hagaị na Malakaị, ịkwali ndị Ya n’akụkụ a. (Hagaị 1:2-6; Malakaị 3:10) Ndị Kraịst tozuru okè taa na-eji ọṅụ eji ihe onwunwe ha akwado ofufe Jehova. Ṅomie ndị dị otú ahụ site n’ịgbaso ụkpụrụ ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 16:1, 2, ‘na-edebe ihe’ mgbe nile iji na-enye onyinye maka ọrụ ọgbakọ na ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. Okwu Chineke na-ekwe nkwa, sị: “Onye weerekwa ngọzi na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa ngọzi na-ewe ihe ubi.”—2 Ndị Kọrint 9:6.

Elegharala ihe ndị ọzọ i nwere anya, dị ka oge na ike gị. Gbalịa ‘ịzụchapụta oge’ site n’ihe omume ndị na-adịchaghị mkpa. (Ndị Efesọs 5:15, 16; Ndị Filipaị 1:10) Mụta ịdịkwu nkọ n’otú i si eji oge eme ihe. Ime otú ahụ pụrụ ime ka o kwe gị omume ikere òkè n’ọrụ ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze na ọrụ ndị ọzọ yiri ya bụ́ ndị na-akwalite ofufe Jehova. Iji ihe onwunwe gị na-eme ihe n’ụzọ dị otú a ga-agbakwu akaebe na ị ghọwala onye Kraịst tozuru okè.

Gaa n’Ihu Ruo Ntozu Okè!

Ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị na-amụsi ihe ike ma nwee ihe ọmụma, ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi, ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’enweghị ntụpọ, ndị na-eguzosi ike n’ihe ma na-ahụ n’anya, ndị dịkwa njikere ịkwado ọrụ Alaeze ahụ n’ụzọ anụ ahụ na n’ụzọ ihe onwunwe, bụ ngọzi dị ukwuu n’ezie. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi ji gbaa ume, sị: “Ka anyị hapụ okwu nke mmalite nke Kraịst, ka a na-eburukwa anyị ruo n’itozu okè”!—Ndị Hibru 6:1.

Ị̀ bụ onye Kraịst tozuru okè? Ka ị̀ ka yiri nwa ọhụrụ ime mmụọ, n’ụzọ ụfọdụ? (Ndị Hibru 5:13) N’agbanyeghị nke ị bụ, kpebisie ike imikpu onwe gị n’ọmụmụ ihe onwe onye, n’ime nkwusa, na n’igosipụta ịhụnanya n’ebe ụmụnna gị nọ. Nabata ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị ọ bụla ndị tozuru okè na-enye gị. (Ilu 8:33) Buru ibu ọrụ nile dịịrị gị dị ka onye Kraịst. Site n’itinye oge na mgbalị, gị onwe gị kwa pụrụ “[iru] ịdị n’otu nke okwukwe na nke mmazu nke Ọkpara Chineke, ruo ịbụ nwoke tozuru okè, ruo ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogologo nke ozuzu nke Kraịst.”—Ndị Efesọs 4:13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Ndị Kraịst tozuru okè na-atụnye ụ̀tụ̀ ná nkwụsi ike nke ọgbakọ. Ha na-enwe mmetụta dị mma n’ụzọ e si eme ihe, ma ọ bụ n’àgwà kasị pụta ìhè dị na ya

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Ndị tozuru okè na-atụnye ụ̀tụ̀ n’ime ka ọgbakọ na-ekpo ọkụ site n’inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ