Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nanị Ụzọ A Ga-esi Ewepụ Ịkpọasị

Nanị Ụzọ A Ga-esi Ewepụ Ịkpọasị

Nanị Ụzọ A Ga-esi Ewepụ Ịkpọasị

“Ịkpọasị na egwu na-aga ụkwụ na ụkwụ. . . . Anyị na-akpọ ihe anyị na-atụ egwu asị, n’ihi ya kwa, ebe ọ bụla ịkpọasị dị, egwu makpu ebe ahụ.”—CYRIL CONNOLLY, ONYE NKATỌ EDEMEDE NA ONYE NCHỊKỌTA AKỤKỌ.

ỌTỤTỤ ndị ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze kweere na ịkpọasị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ime mmadụ. “Akụkụ ka ukwuu n’ime ya pụrụ ọbụna ịbụ nke e bu pụta ụwa,” nke e kenyere kpọmkwem n’ime ụmụ mmadụ, ka otu ọkà mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwuru.

O kwere nghọta ihe mere ndị na-amụ banyere ọdịdị mmadụ ji ruo nkwubi okwu ndị dị otú ahụ. Nanị ihe ndị ha na-amụ banyere ha bụ ndị ikom na ndị inyom a mụrụ “n’ajọ omume” nakwa “ná mmehie,” dị ka ihe ndekọ Bible e dere n’ike mmụọ nsọ si kwuo. (Abụ Ọma 51:5) Ọbụna Onye Okike n’onwe ya, ka ọ na-enyocha ụmụ mmadụ na-ezughị okè ọtụtụ narị afọ iri gara aga, “[hụrụ] na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.”—Jenesis 6:5.

Ajọ mbunobi, ịkpa ókè, na ịkpọasị ha na-akpata bụcha ihe ndị si n’ezughị okè na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị ndị ụmụ mmadụ bu pụta ụwa. (Deuterọnọmi 32:5) Ọ dị mwute ikwu na ọ dịghị òtù ma ọ bụ ọchịchị mmadụ, n’agbanyeghị usoro ime ihe ya, nweworo ike ime iwu ndị ga-eme ka ụmụ mmadụ gbanwee obi ha n’okwu ndị dị otú ahụ. Onye na-achụ nta akụkọ ná mba ọzọ bụ́ Johanna McGeary na-ekwu, sị: “Ọ dịghị òtù ndị uwe ojii, n’agbanyeghị otú ha siruru n’ike, pụrụ ịbata ma kpochapụ ịkpọasị ndị meworo ka Bosnia, Somalia, Liberia, Kashmir, Caucasus kwafuo ọbara dị ukwuu.”

Otú ọ dị, tupu anyị achọwa ihe ngwọta, anyị aghaghị ịghọta isi ihe na-akpali ngosipụta dị iche iche nke ịkpọasị.

Ịkpọasị nke Egwu Kpaliri

A na-ahụ ịkpọasị mgbe nile n’ụzọ na n’ụdị dị nnọọ ọtụtụ. Onye edemede bụ́ Andrew Sullivan chịkọtara okwu ahụ n’ụzọ dị mma, sị: “E nwere ịkpọasị nke egwu na-akpali, na ịkpọasị nke mmadu iche nanị na a na-elelị ya na-akpali; e nwere ịkpọasị nke e ji egosipụta ike, na ịkpọasị nke adịghị ike na-akpali; e nwere ịbọ ọ́bọ̀, e nwekwara ịkpọasị nke anyaụfụ na-akpali. . . . E nwere ịkpọasị nke onye na-emegbu mmadụ, nweekwa ịkpọasị nke onye a na-emegbu emegbu. E nwere ịkpọasị nke na-eji nwayọọ nwayọọ ebilite, nweekwa ịkpọasị nke na-emesị pụọ n’anya. E nwekwara ịkpọasị nke na-apụta ìhè, na ịkpọasị nke na-adịghị apụta ìhè.”

Obi abụọ adịghị ya na ụfọdụ n’ime ihe ndị bụ́ isi na-akpali ọgụ a na-alụ n’oge anyị n’ihi ịkpọasị bụ ihe ndị metụtara mmekọrịta mmadụ na ibe ya nakwa akụ̀ na ụba. Ebe a na-ahụkarị ajọ mbunobi siri ike na ntiwapụ nke ịkpọasị bụ n’ógbè ebe ndị aka ji akụ̀ na-ebughị ibu. Ọzọkwa, ịkpọasị na-adịkarị n’ebe nnubata nke ndị si mba ọzọ na-eyi ọnọdụ ibi ndụ nke otu akụkụ nke obodo egwu.

Ụfọdụ pụrụ iche na ndị a bịara ọhụrụ ga-eso ha sọọ mpi maka ọrụ, na-arụ ọrụ n’ọnụ ego dị ala, ma ọ bụ na ha ga-eme ka ọnụ ahịa ihe onwunwe dalata. E kwuwebeghị ma egwu ndị dị otú ahụ hà ziri ezi ma ọ bụ na ha ezighị. Egwu nke ịbụ onye akụ̀ na ụba ga-efunahụ na ịtụ egwu na ọnọdụ ógbè ma ọ bụ ọnọdụ ibi ndụ ga-adalata bụ ihe ndị siri ike na-akpali ajọ mbunobi na ịkpọasị.

Gịnị kwesịrị ịbụ nzọụkwụ mbụ n’iwepụ ịkpọasị? Ọ bụ mgbanwe omume.

Ịgbanwe Omume

“A pụrụ inwe ezi mgbanwe nanị ma ọ bụrụ na ndị o metụtara ekpebie ime otú ahụ,” ka McGeary kwuru. Oleekwanụ otú a pụrụ isi gbanwee mkpebi ndị mmadụ? Ahụmahụ egosiwo na mmetụta kasị ike, nke kasị akwali akwali, na nke kasị adịte aka megide ịkpọasị na-esite n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Nke a bụ n’ihi na “okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi.”—Ndị Hibru 4:12.

N’eziokwu, iwepụ ajọ mbunobi na ịkpọasị abụghị ihe na-emere onwe ya, ọ dịghịkwa eme na mberede. Ma a pụrụ ime ya. Jisọs Kraịst, bụ́ onye ukwu na-akpali obi ma na-eme ka akọ na uche mmadụ rụọ ọrụ, kwaliri ndị mmadụ ime mgbanwe. Ọtụtụ nde mmadụ enweela ihe ịga nke ọma n’ịgbaso ndụmọdụ amamihe nke Jisọs Kraịst, bụ́: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu.”—Matiu 5:44.

N’ikwekọ n’ozizi ya, Jisọs gụnyere Matiu, onye bụbu onye ọna ụtụ ọha ndị Juu kpọrọ asị, n’ime ndị enyi ọ tụkwasịrị obi. (Matiu 9:9; 11:19) Ọzọkwa, Jisọs guzobere ụzọ ofufe dị ọcha bụ́ nke ga-emesị gụnye ọtụtụ puku ndị Jentaịl ahụ e kewapụburu ma kpọọ asị. (Ndị Galetia 3:28) Mmadụ ndị si gburugburu ụwa a maara n’oge ahụ ghọrọ ụmụazụ Jisọs Kraịst. (Ọrụ 10:34, 35) A bịara mara mmadụ ndị a n’ihi ịhụnanya ha dị nnọọ ukwuu. (Jọn 13:35) Mgbe ndị ikom ịkpọasị sụjuru obi ji nkume tụgbuo onye na-eso ụzọ Jisọs bụ́ Stifen, okwu ikpeazụ ndị o kwuru bụ: “Onyenwe anyị, atụkwasịla mmehie a n’isi ha.” Stifen chọrọ ihe kasị mma maka ndị kpọrọ ya asị.—Ọrụ 6:8-14; 7:54-60.

N’otu aka ahụ, ezi ndị Kraịst nke oge a emeghachiwo omume n’ụzọ dị mma nye ndụmọdụ Jisọs nke imere, ọ bụghị nanị ụmụnna ha bụ́ ndị Kraịst ihe ọma, kamakwa ọbụna ndị kpọrọ ha asị. (Ndị Galetia 6:10) Ha na-agba mbọ iwepụ ajọ ịkpọasị ná ndụ ha. Ka ha na-amata ikike ndị siri ike, ndị pụrụ ịkpali ịkpọasị n’obi ha, ha na-eme ihe kwesịrị ekwesị ma jiri ịhụnanya dochie ịkpọasị. Ee, dị ka nwoke nwere amamihe n’oge ochie si kwuo, “ịkpọasị na-akpọte iseokwu dị iche iche: ma njehie nile ka ịhụnanya na-ekpuchi.”—Ilu 10:12.

Jọn onyeozi kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ: unu matakwara na ọ dịghị ogbu mmadụ ọ bụla nwere ndụ ebighị ebi na-adịgide n’ime ya.” (1 Jọn 3:15) Ndịàmà Jehova kweere nke ahụ. N’ihi ya, a na-achịkọta ha ọnụ ugbu a—site n’agbụrụ, ọdịbendị, okpukpe, na ọchịchị nile—bata n’otu mba dị n’otu, nke ịkpọasị na-adịghị, ezigbo òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ.—Lee igbe ndị so isiokwu a.

A Ga-ewepụ Ịkpọasị!

‘Ma,’ ka ị pụrụ ikwu, ‘nke ahụ pụrụ ịbụ ihe ngwọta nye ndị ahụ so na ya. Otú ọ dị, nke a agaghị eme ka ịkpọasị kwụsị kpam kpam n’ụwa anyị.’ Ọ bụ eziokwu, ọ bụrụgodị na ịkpọasị adịghị gị n’obi, ị ka pụrụ ịbụ onye a kpọrọ asị. Ya mere, anyị aghaghị ilegara Chineke anya maka ezi ngwọta nye nsogbu a zuru ụwa ọnụ.

Chineke na-ezube na n’isi nso a ga-ewepụ ụdị nile nke ịkpọasị n’ụwa. Nke a ga-ewere ọnọdụ n’okpuru ịchịisi nke ọchịchị eluigwe ahụ nke Jisọs kụziiri anyị ikpe ekpere maka ya, sị: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:9, 10.

Mgbe a zara ekpere ahụ n’ụzọ zuru ezu, ọnọdụ ndị na-akwalite ịkpọasị agaghịzi adị. A ga-ewepụwo ọnọdụ ndị na-akpata ya. A ga-ejiwo nghọta, eziokwu, na ezi omume dochie mkpọsa ụgha, amaghị nke a na-akọ, na ajọ mbunobi. N’ezie, mgbe ahụ, Chineke ‘ga-ehichapụwo anya mmiri nile ọ bụla; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.’—Mkpughe 21:1-4.

Ọ bụ ozi ka mma ọbụna ugbu a! E nwere ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ.” N’ihi ya, anyị pụrụ inwe obi ike na n’isi nso, anyị ga-ahụ ka e mere ka ịkpọasị bụ́ nke megidere iwu Chineke, kwụsị n’ụwa a. (2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3-14) N’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa, a ga-enwe ezigbo mmụọ nke ịbụ ụmụnna n’ihi na a ga-eweghachiwo ihe a kpọrọ mmadụ n’izu okè.—Luk 23:43; 2 Pita 3:13.

Ma ọ dịghị mkpa ka i chere ruo mgbe ahụ tupu i sonye n’ezi òtù ụmụnna ahụ. N’ezie, dị ka ihe ndekọ ndị so isiokwu a na-egosi, ịhụnanya ndị Kraịst abanyelarị n’ọtụtụ nde obi bụ́ ndị ịkpọasị pụrụ ijupụtawo ma a sị na ọ bụghị ya. A na-akpọkwa gị onwe gị isonye n’òtù ụmụnna ahụ na-ahụ n’anya!

[Igbe dị na peeji nke 5]

“Gịnị Ka Jisọs Gaara Eme?”

Na June 1998, ndị ikom atọ bụ́ ndị ọcha n’obodo Texas dị na United States wakporo James Byrd, Jr., bụ́ onye isi ojii. Ha duuru ya gaa n’ebe dịpụrụ adịpụ, nke mmadụ na-anọghị, tie ya ihe, tụọkwa ya ị́gà n’ụkwụ. E mesịa, ha kegidere ya n’ụgbọala pikọp ma dọkpụrụ ya ruo kilomita ise n’ogologo ụzọ ahụ ruo mgbe ahụ ya kụrụ n’ebe a wụrụ kọnkịrị. A kpọrọ nke a mpụ ịkpọasị kasị awụ akpata oyi e mere n’iri afọ (ndị 1990) a.

Ụmụnne nwanyị atọ nke James Byrd bụ Ndịàmà Jehova. Olee mmetụta ha nwere banyere ndị mere ajọ mpụ a? N’okwu ha gbakọrọ ọnụ kwuo, ha sịrị: “Onye a hụrụ n’anya ịbụ onye e mekpọrọ ọnụ ma gbuo na-eme ka e nwee mmetụta nke mfu na ihe mgbu a na-apụghị ichetụ n’echiche. Olee otú mmadụ si emeghachi omume nye omume obi ọjọọ dị otú ahụ? Ọ dịghị mgbe imegwara, ikwu okwu ịkpọasị, ma ọ bụ ịkwalite mkpọsa nke ịkpọasị kpaliri batara anyị n’uche. Anyị chere echiche, sị: ‘Gịnị ka Jisọs gaara eme? Olee otú ọ gaara esiwo meghachi omume?’ Azịza ya doro nnọọ anya. Ozi ya gaara abụwo nke udo na olileanya.”

Ndị Rom 12:17-19 so n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị nyeere ha aka ịghara ikwe ka ịkpọasị bilite n’obi ha. Pọl onyeozi dere, sị: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. . . . A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọ́bọ̀; Mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị kwuru.”

Ha gara n’ihu ikwu, sị: “Anyị na-echeta eziokwu ndị ahụ e kwuru ná mbipụta anyị dị iche iche nke bụ́ na ụfọdụ ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ mpụ bụ ndị na-awụ nnọọ akpata oyi nke na ịsị ‘Agbagharala m gị’ ma chefuo ya ga-esi ike karị. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, mgbaghara pụrụ ịbụ mmadụ ịkwụsị iwe iwe ka o wee nwee ike ịdịrị ndụ gawa ma ghara ịda ọrịa n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’ụzọ uche n’ihi ibu iwe n’obi.” Lee akaebe doro anya nke a bụ nye ikike Bible nwere ime ka ajọ ịkpọasị ghara ịgbanye mkpọrọgwụ!

[Igbe dị na peeji nke 6]

Site n’Ibu Iro Gaa n’Ọbụbụenyi

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ puku ndị si mba ọzọ akwabawo na Gris ịchọ ọrụ. Otú ọ dị, ọnọdụ akụ̀ na ụba ndị na-akawanye njọ emewo ka ohere e nwere ịchọta ọrụ belata, nke a emewokwa ka mbọ a na-agba iji nweta ọrụ takwuo akpụ. N’ihi nke a, e nwere oké ibu iro n’etiti agbụrụ dị iche iche. Otu ihe atụ pụtara ìhè bụ asọmpi dị n’etiti ndị si Albania na ndị si Bulgaria kwabata. N’ọtụtụ ógbè dị na Gris, asọmpi kpụ ọkụ n’ọnụ ewerewo ọnọdụ n’etiti ndị si n’ìgwè abụọ a.

N’obodo Kiato, nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Peloponnisos, otu ezinụlọ bụ́ ndị Bulgaria na otu nwoke bụ́ onye Albania malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible ma bịa mara ibe ha. Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ mere ka ọtụtụ ndị si n’agbụrụ abụọ a kwụsị iburịta iro. O nyekwara aka mee ka mmadụ ndị a bụrụ ezigbo ndị enyi dị ka ụmụnna. Ọbụna Ivan, bụ́ onye Bulgaria, nyeere Loulis, bụ́ onye Albania, aka ịchọta ụlọ n’akụkụ ụlọ Ivan. Mgbe mgbe, ezinụlọ abụọ ahụ na-ekerịta ihe oriri na ihe onwunwe ole na ole ha nwere. Ndị ikom abụọ ahụ bụ Ndịàmà Jehova e mere baptism ugbu a, ha na-emekọkwa ihe ọnụ n’ikwusa ozi ọma ahụ. O doro anya na ndị agbata obi ha hụrụ ọbụbụenyi ndị Kraịst a.

[Foto dị na peeji nke 7]

N’okpuru Alaeze Chineke a ga-ewepụ ụdị nile nke ịkpọasị n’ụwa