Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú I Si Edozi Esemokwu?

Olee Otú I Si Edozi Esemokwu?

Olee Otú I Si Edozi Esemokwu?

ANYỊ na ụdị mmadụ dị iche iche na-emekọrịta ihe kwa ụbọchị. Nke a na-ewetakarịrị anyị ọṅụ na echiche ọhụrụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-akpalitekwa esemokwu, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-esi ike ebe ndị ọzọ na-abụ nanị obere nghọtahie ndị anyị na-enwe ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. Ụdị ọ bụla ha bụ, otú anyị si edozi esemokwu na-emetụta uche, mmetụta uche, na ọnọdụ ime mmụọ anyị.

Ime ihe anyị pụrụ ime iji dozie esemokwu n’ụzọ dị mma ga-atụnye ụtụ n’ime ka anyị na-adịkwu ndụ n’ezi ahụ ike ma na-esokwu ndị ọzọ enwe mmekọrịta udo. Otu ilu oge ochie na-asị: “Ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.”—Ilu 14:30.

Eziokwu ahụ doro anya bụ́: “Obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ,” dị nnọọ iche na nke a. (Ilu 25:28) Ònye n’ime anyị ga-achọ ka echiche ọjọọ ndị pụrụ ime ka o mee ihe n’ụzọ ndị na-ezighị ezi—ụzọ ndị pụrụ imerụ ya onwe ya na ndị ọzọ ahụ—bata ya n’obi? Mmeghachi omume ndị e ji iwe a na-achịkwaghị achịkwa mee pụrụ nnọọ ime nke ahụ. N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jisọs tụrụ aro ka anyị nyochaa àgwà anyị, bụ́ nke pụrụ imetụta otú anyị si edozi esemokwu ọ bụla anyị na ndị ọzọ pụrụ inwe. (Matiu 7:3-5) Kama ịdị na-akatọ ndị ọzọ, anyị kwesịrị iche echiche banyere otú anyị pụrụ isi soro ndị nwere echiche na nzụlite dịgasị iche zụlite ma nọgide na-enwe ọbụbụenyi.

Àgwà Anyị

Nzọụkwụ mbụ n’idozi ihe e chere na ọ bụ ma ọ bụ ihe bụ́ esemokwu n’ezie bụ ịghọta na anyị pụrụ iche echiche ma ọ bụ kpaa àgwà ndị na-ezighị ezi. Akwụkwọ Nsọ na-echetara anyị na anyị nile na-emehie emehie, anyị “adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Tụkwasị na nke ahụ, nghọta pụrụ ikpughe na ọ bụghị onye nke ọzọ kpataara anyị nsogbu. Banyere nke a, ka anyị tụlee ahụmahụ Jona.

Site ná ntụziaka Jehova nyere ya, Jona gawara obodo Nineve ikwusa banyere ikpe Chineke nke gaje ịbịakwasị ndị bi n’obodo ahụ. Ihe na-enye obi ụtọ si n’ime ya pụta bụ na obodo Nineve dum chegharịrị ma nwee okwukwe n’ebe ezi Chineke ahụ nọ. (Jona 3:5-10) Jehova chere na o kwesịrị ekwesị ka a gbaghara ha n’ihi àgwà nchegharị ha, ya mere, ọ gbaghaara ha. “O wee jọọ Jona ajọ njọ nke ukwuu, iwe ya ewee dị ọkụ.” (Jona 4:1) Mmeghachi omume Jona n’ebe ebere Jehova dị bụ ihe ijuanya. N’ihi gịnị ka Jona ga-eji ewesa Jehova iwe? Ihe àmà na-egosi na Jona tinyere uche ya ná mmetụta nke onwe ya, na-eche na ya ereela ùgwù ya n’obodo ahụ. O nweghị ekele maka ebere Jehova. Jehova ji obiọma kụziere Jona ihe gbara ọkpụrụkpụ bụ́ nke nyeere ya aka ịgbanwe àgwà ya ma hụ ọkịka nke ebere Chineke. (Jona 4:7-11) O doro anya na ọ bụ àgwà Jona chọrọ mgbanwe, ọ bụghị nke Jehova.

N’otu aka ahụ, ọ̀ pụrụ ịdị anyị mkpa mgbe ụfọdụ ịgbanwe àgwà anyị banyere otu ihe? Pọl onyeozi na-adụ anyị ọdụ, sị: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10, NW) Gịnị ka o bu n’uche? N’otu akụkụ, ọ na-agba anyị ume inwe ezi uche na iji nsọpụrụ na ùgwù miri emi na-emeso ndị Kraịst ndị ọzọ ihe. Nke a na-agụnye ịghọta na onye ọ bụla nwere ihe ùgwù nke nnwere onwe ime nhọrọ. Pọl na-echetakwara anyị, sị: “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” (Ndị Galetia 6:5) N’ihi ya, tupu esemokwu akpata nkewa, lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe amamihe ịtụle ma ọ̀ dị mkpa ka anyị gbanwee àgwà anyị! Anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji gosipụta echiche Jehova ma chekwaa udo nke anyị na ndị ọzọ bụ́ ndị hụrụ Chineke n’anya n’ezie.—Aịsaịa 55:8, 9.

Mmeghachi Omume Anyị

See onyinyo ụmụaka abụọ na-azọ otu nwa bebi, nke ọ bụla n’ime ha ana-azọsikwu ya nnọọ ike iji nweta ya. Okwu iwe pụrụ isochi ndọrọ ndọrọ ahụ ruo mgbe otu n’ime ha mesịrị hapụ ya ma ọ bụ ruo mgbe mmadụ bịara gboo ha.

Ihe ndekọ Jenesis na-agwa anyị na Abraham nụrụ na esemokwu adapụtawo n’etiti ndị na-azụ anụ ụlọ ya na ndị na-azụ anụ ụlọ nwa nwanne ya bụ́ Lọt. Abraham butere ụzọ n’ijekwuru Lọt, ma sị: “Biko, ka iseokwu ghara ịdị n’etiti mụ na gị, na n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ nke m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ nke gị; n’ihi na nwanne ka anyị bụ.” Ọ bụ mkpebi Abraham ịghara ikwe ka nsogbu ọ bụla mebie mmekọrịta ha. Gịnị ka o furu ya? Ọ dị njikere ịchụ ihe ùgwù ime nhọrọ ya dị ka onye ka okenye n’àjà; ọ dị njikere ịhapụ ihe ruuru ya. Abraham kwere ka Lọt họrọ ebe ọ chọrọ ịkpọrọ ezinụlọ ya na ìgwè atụrụ ya gaa. Lọt mesịrị họtara onwe ya ala jupụtara n’ahịhịa ndụ nke dị na Sọdọm na Gọmọra. Abraham na Lọt kewara n’udo.—Jenesis 13:5-12.

Ka anyị na ndị ọzọ wee nọgide na-enwe mmekọrịta udo, ànyị dị njikere ime ihe n’ụdị mmụọ ahụ Abraham ji mee ihe? Akụkọ Bible a na-esetịpụrụ anyị ihe nlereanya ọma iṅomi mgbe anyị na-edozi esemokwu. Abraham rịọrọ sị: “Ka iseokwu ghara ịdị.” Ezi ọchịchọ nke Abraham bụ ka e dozie ihe nile n’udo. N’ezie, agbamume dị otú ahụ nke ịnọgide na-enwe mmekọrịta udo ga-enye aka n’idozi nghọtahie ọ bụla. Abraham jizi okwu bụ́, “n’ihi na nwanne ka anyị bụ,” mechie okwu ya. N’ihi gịnị ka a ga-eji mebie mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa dị otú ahụ n’ihi ihe na-amasị mmadụ ma ọ bụ nganga? Abraham lekwasịrị anya nke ọma n’ihe dị mkpa. O ji ùgwù onwe onye na nsọpụrụ mee nke ahụ, n’otu oge ahụ, na-akwanyere nwa nwanne ya ùgwù.

Ọ bụ ezie na ọnọdụ pụrụ ibilite nke na a ga-achọ onye ọzọ iji dozie esemokwu, lee otú ọ ga-esi ka mma ma ọ bụrụ na a pụrụ idozi esemokwu na nzuzo! Jisọs na-agba anyị ume ibute ụzọ n’isoro nwanna anyị mee udo, na-arịọ mgbaghara ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. * (Matiu 5:23, 24) Ọ ga-achọ ịdị umeala n’obi, ma ọ bụ obi dị umeala, ma Pita dere, sị: “Unu nile were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi: n’ihi na Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” (1 Pita 5:5) Otú anyị si emeso ndị ofufe ibe anyị ihe na-emetụta nnọọ mmekọrịta anyị na Chineke.—1 Jọn 4:20.

N’ime ọgbakọ ndị Kraịst, a pụrụ ịchọ ka anyị hapụ ihe ruuru anyị iji mee ka udo dịgide. Ọtụtụ ndị so Ndịàmà Jehova na-akpakọ ugbu a batara n’ezinụlọ Chineke nke ndị na-efe ezi ofufe n’ime afọ ise gara aga. Lee ọṅụ nke a na-ewetara anyị! Otú anyị si akpa àgwà na-emetụta ndị a na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ n’ezie. Nke a bụ ezi ihe mere anyị ga-eji chee echiche nke ọma banyere nhọrọ anyị na-eme ná ntụrụndụ, n’ihe omume egwuregwu, n’ihe omume ọha na eze, ma ọ bụ n’ọrụ, na-atụle otú ndị ọzọ pụrụ isi lee anyị anya. Ọ̀ dị omume ma ọ bụ okwu anyị a pụrụ ịghọtahie ma si otú a mee ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ?

Pọl onyeozi na-echetara anyị, sị: “Ihe nile ziri ezi n’iwu; ma ọ bụghị ihe nile bara uru. Ihe nile ziri ezi n’iwu; ma ọ bụghị ihe nile na-ewuli mmadụ elu dị ka ụlọ. Ka onye ọ bụla ghara ịchọ ọdịmma nke aka ya, kama ọdịmma nke mmadụ ibe ya.” (1 Ndị Kọrint 10:23, 24) Dị ka ndị Kraịst, ihe bụ́ nchegbu anyị n’ezie bụ iwulite ịhụnanya na ịdị n’otu nke òtù ụmụnna ndị Kraịst.—Abụ Ọma 133:1; Jọn 13:34, 35.

Okwu Ndị Na-agwọ Agwọ

Okwu ọnụ pụrụ inwe mmetụta dị ike n’ụzọ dị mma. “Ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ka okwu ọnụ ụtọ nile bụ, nke na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.” (Ilu 16:24) Akụkọ banyere otú Gideọn siri zere nsogbu gaara adapụta n’etiti ya na ndị Efraim, gosiri eziokwu dị n’ilu a.

Gideọn, bụ́ onye nọ na-ebu agha kpụ ọkụ n’ọnụ megide ndị Midian, kpọrọ ebo Efraim ka ha bịa nye aka. Otú ọ dị, mgbe a lụsịrị agha ahụ, Efraim ji iwe bịakwute Gideọn ma mee mkpesa dị ilu na ọ kpọghị ha mgbe agha ahụ malitere. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na ‘ha sooro ya isesi okwu ike.’ Gideọn zaghachiri, sị: “Gịnị ka m meworo ugbu a dị ka nke unu mere? Ntụtụkọ mkpụrụ ubi vine fọdụrụ nke Efraim, ọ̀ dịghị mma karịa ọghụghọ mkpụrụ vine nke Abieza? N’aka unu ka Chineke nyeworo ndị isi Midian, bụ́ Oreb na Zeeb: ma gịnị ka m pụrụ ime dị ka nke unu mere?” (Ndị Ikpe 8:1-3) Site n’okwu ndị na-ajụrụ obi ọ họọrọ nke ọma, Gideọn zeere ihe gaara abụ agha agbụrụ dị oké njọ. Ọ pụrụ ịbụ na nsogbu ebo Efraim nwere bụ ịdị mkpa n’anya onwe ha na nganga. Otú ọ dị, nke ahụ egbochighị Gideọn ime ihe iji mee ka udo dịrị. Ànyị pụrụ ime otú ahụ?

Ndị ọzọ pụrụ iwe oké iwe ma buso anyị iro. Mata mmetụta ha, ma rụọ ọrụ iji ghọta echiche ha. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ dị ụzọ ụfọdụ anyị siworo kpata mmetụta ha? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ma anyị kweta ihe anyị meworo n’ịkpata ihe isi ike ahụ ma gosi mwute maka ịtụkwasị ihe ná nsogbu ahụ. Okwu ole na ole e chere echiche nke ọma wee kwuo pụrụ imezi mmekọrịta mebiri emebi. (Jemes 3:4) Ụfọdụ ndị iwe na-ewe pụrụ nanị ịchọ ka anyị jiri obiọma mesighachi ha obi ike. Bible na-ekwu na “mgbe nkụ na-adịghị ọkụ ga-anyụ.” (Ilu 26:20) Ee, okwu ndị a họọrọ nke ọma na ndị e ji mmụọ kwesịrị ekwesị kwuo pụrụ ‘ime ka ọnụma laghachi azụ’ ma bụrụ ihe na-agwọ agwọ.—Ilu 15:1.

Pọl onyeozi na-atụ aro, sị: “A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu ha, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:18) Ọ bụ eziokwu na anyị apụghị ịchịkwa mmetụta nke ndị ọzọ, ma anyị pụrụ ime òkè anyị n’ịkwalite udo. Kama ikwe ka mmeghachi omume nke anyị onwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ mere n’ihi ezughị okè chịkwaa anyị, anyị pụrụ ime ihe ugbu a iji tinye ụkpụrụ ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na Bible n’ọrụ. Idozi esemokwu n’ụzọ Jehova na-atụziri anyị isi mee ya ga-apụtara anyị udo na obi ụtọ ebighị ebi.—Aịsaịa 48:17.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Lee isiokwu ndị bụ́ “Gbaghara Site n’Obi Gị” na “Ị Pụrụ Irite Nwanna Gị n’Uru,” ndị dị n’Ụlọ Nche nke October 15, 1999.

[Foto dị na peeji nke 24]

Ànyị na-esi ọnwụ ka e mee ihe n’ụzọ anyị si chọọ?

[Foto dị na peeji nke 25]

Abraham setịpụrụ ihe nlereanya ọma banyere ikwenye ekwenye iji dozie esemokwu